Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ị Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ ma Na-abakwuru Gị Uru

Ihe Ị Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ ma Na-abakwuru Gị Uru

Ihe Ị Ga-eme Ka Ịmụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ ma Na-abakwuru Gị Uru

Olee ihe anyị ga-eme ka ịmụ Baịbụl na-atọkwu anyị ụtọ? Olee ihe anyị ga-eme ka ịmụ Baịbụl na-abakwuru anyị uru? Ka anyị tụlee ná mkpirikpi ihe atọ dị mkpa ga-enye aka mee ka ọmụmụ ihe onwe onye anyị ji Baịbụl enwe na-abakwuru anyị uru.

1

1 KPEE EKPERE: Ihe mbụ anyị ga-eme bụ ikpe ekpere. (Ọma 42:8) N’ihi gịnị? Anyị kwesịrị iwere ịmụ Okwu Chineke ka otu ụzọ anyị si efe Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o mee ka ihe anyị ga-amụ bamie n’obi anyị nakwa ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ. (Luk 11:13) Barbara, bụ́ onye jeterela ozi ala ọzọ aka, kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere tupu mụ agụọ Baịbụl ma ọ bụ mụọ Baịbụl. Ọ na-abụ m kpechaa ekpere, ya adị m ka mụ na Jehova ọ̀ nọ, dịkwa m ka obi ọ̀ dị ya ụtọ n’ihe m na-eme.” Ikpe ekpere tupu anyị amụwa ihe na-eme ka uche anyị na obi anyị nabata ihe niile anyị ga-eji Baịbụl amụ.

2 TỤGHARỊA UCHE: Ụfọdụ na-ekwo maka na ha enwechaghị ohere, na-agụ Okwu Chineke n’atụgharịghị uche n’ihe ha gụrụ. Ma, ha anaghị erite uru mmadụ na-erite ma ya mụọ Baịbụl. Carlos, bụ́ onye jeerela Jehova ozi ruo ihe karịrị iri afọ ise, achọpụtala na ihe mmadụ na-amụ ga-abakwuru onye ahụ uru ma o wepụta oge tụgharịa uche n’ihe ọ mụrụ. Ọ sịrị: “M na-agụzi naanị peeji ole na ole na Baịbụl n’otu oge, ya bụ, ihe dị ka peeji abụọ kwa ụbọchị. M na-ewepụtakwuzi oge tụgharịa uche n’ihe m gụrụ iji mụtakwuo ihe ndị ga-abara m uru.” (Ọma 77:12) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-atụgharị uche, anyị na-amụtakwu ihe bụ́ uche Chineke ma na-aghọtakwu ya.—Kọl. 1:9-11.

3 NA-EME YA EME: Ọ bụrụ na anyị achọpụta n’onwe anyị uru ihe anyị na-eme bara, ihe ahụ na-abakwuru anyị uru. Otú ahụ ka ọ dị n’ịmụ Baịbụl. Gabriel, bụ́ nwanna nwoke na-eto eto nke na-amụchi Baịbụl anya, sịrị: “Ịmụ ihe na-enyere m aka idi nsogbu ndị m na-enwe kwa ụbọchị, ọ na-enyekwara m aka inyere ndị ọzọ aka.” O kwukwara, sị: “M na-agbalị ime ihe niile m mụtara eme.” (Diut. 11:18; Jọsh. 1:8) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’Okwu Chineke ma na-eme ha eme.—Ilu 2:1-5.

NÁ NCHỊKỌTA: Anyị nwere ezigbo ihe ùgwù ịghọta ihe ndị miri emi Jehova, bụ́ Onye na-enye amamihe, kwuru n’Okwu ya! (Rom 11:33) N’ihi ya, mgbe ọzọ ị chọrọ ịmụ ihe, hụ na i bu ụzọ kpee ekpere gwa Jehova ka o mee ka uche gị dịrị n’ihe ị na-amụ nakwa ka o nye gị mmụọ nsọ. Ka ị na-amụ ihe, na-akwụsịtụ iji tụgharịa uche n’ihe ị gụrụ. Gbalịakwa na-eme ihe ị mụtara eme ná ndụ gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a dị mkpa n’oge ị na-amụ Baịbụl, ị ga-achọpụta na ịmụ Baịbụl ga na-atọkwu gị ụtọ, na-abakwukwara gị uru.