Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ mere otu nwoke nke na-akọ ahịhịa ụtaba ji kwụsị ịkọ ahịhịa a ma gbanwee okpukpe ọ na-ekpe kemgbe ọ bụ nwata? Gịnị nyeere otu nwaanyị, bụ́ onye aṅụrụma, aka ịgbanwe ndụ ọjọọ ya? Gụọ ihe ha kwuru.

“Obi dị m ụtọ na m so ná ndị a na-efe Chineke.”—DINO ALI

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1949

ABỤ M ONYE: ỌSTRELIA

NDỤ M BIRI: M NA-AKỌ AHỊHỊA ỤTABA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: N’afọ 1939, papa m na mama m si ná mba Albenia kwaga n’obere obodo a na-akpọ Mariba, nke dị na Kwịnzland, n’Ọstrelịa. E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ si Bọznia, Gris, Ịtali, Sebia, na ebe ndị ọzọ kwafeta n’obodo a. Ha na-eme omenala ha, na-ekpekwa okpukpe ha n’ebe a ha kwafetara. A na-akọ ahịhịa ụtaba na Mariba, n’ihi ya, papa m na mama m malitere ịkọ ya.

Obere oge papa m na mama m kwafetara Mariba, ha mụrụ nwa mbụ ha, bụ́ nwa nwaanyị, mụzie ụmụ nwoke abụọ, ma mechazie mụọ m. Mgbe m dị naanị otu afọ, obi kụchiri papa m, ya anwụọ. Mama m lụziri nwoke ọzọ ma mụọ ụmụ nwoke anọ ọzọ. Anyị niile bi n’ugbo ebe nwoke ahụ mama m lụrụ na-akọ ahịhịa ụtaba. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka anyị niile nọ too.

M si n’ụlọ anyị kwapụ mgbe m na-erubeghị afọ iri abụọ. Mgbe m gbara afọ iri abụọ na atọ, m lụrụ Saime. Ebe anyị abụọ bụ ndị Alakụba, anyị nọ n’ụlọ okpukpe ndị Alakụba gbaa akwụkwọ. Ndị ikwu m niile bụkwa ndị Alakụba. M gụrụ Koran na akwụkwọ ọzọ kọrọ akụkọ ndụ onye amụma a na-akpọ Muhammad. N’oge ahụ, m gụkwara otu obere Baịbụl. Koran kọrọ banyere ndị amụma a kpọrọ aha ha na Baịbụl, ma, ọ bụ Baịbụl mere ka m ghọta mgbe ndị amụma ahụ dịrị ndụ.

Ndịàmà Jehova na-abịa n’ụlọ m, ha na-enyekwa m magazin ha na akwụkwọ ha ndị ọzọ. Mụ na nwunye m na-agụkwa akwụkwọ ndị ahụ. M ka na-echeta otú mụ na Ndịàmà Jehova na-esi akparịta ihe gbasara Chineke. Mgbe ọ bụla mụ na ha na-ekwurịta okwu, ha na-eji Baịbụl aza m ihe ọ bụla m jụrụ ha kama ịgwa m ihe ha chere. Ihe a ha na-eme ruru m n’obi.

Ndịàmà Jehova gwara m na ha ga-achọ ka mụ na ha mụwa Baịbụl, gwakwa m ka m bịawa ọmụmụ ihe ha, ma mgbe ọ bụla ha gwara m ya, anaghị m ekwe. Ihe bụ́ mkpa m bụ inwe ugbo nke m na ịmụ ọtụtụ ụmụ. Emechaghị m nwee ugbo nke m, ma obi dị m ụtọ na m mechara mụọ ụmụ ise.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’agbanyeghị na afọ itoolu agaala kemgbe mụ na Ndịàmà Jehova matara, m ka kwụ ebe m kwụ. Ma, m na-anata ha akwụkwọ niile ha bipụtara, m na-agụkwa ha. Mụ na nwunye m na-ewepụta oge gụọ akwụkwọ ndị ahụ n’ụbọchị Sọnde ọ bụla. N’oge niile ahụ, anyị anaghị atụfu magazin ọ bụla anyị natara ha. Magazin ndị ahụ anyị na-edebe mechara baara m ezigbo uru mgbe ndị mmadụ malitere nyewe m nsogbu ka m hapụ ihe ndị m na-amụta.

Dị ka ihe atụ, ahụrụ m otu pastọ bụ́ onye chọrọ ịmanye m ka m nabata Jizọs dị ka Onye Nzọpụta m. O meela ka nwanne nwunye m na otu nwanne m nke nne ji mụ na ya malite ịga chọọchị ya. Obere oge, ndị enyi m bụ́ ndị si n’okpukpe dị iche iche malitere ịgwa m ka m soro ha kpewe okpukpe ha. Ụfọdụ n’ime ha nyere m akwụkwọ na-ekwujọ Ndịàmà Jehova. M gwara ndị ahụ na-ekwugide Ndịàmà Jehova ka ha gosi m ebe ihe hanwa na-akụzi si na Baịbụl, ma ha enwelighị ike igosi m ya.

Otú ahụ e si na-emegide m mere ka m mụsikwuo Baịbụl ike ma jiri akwụkwọ ndị m natara Ndịàmà Jehova chọpụtakwuo ihe ụfọdụ na-edoghị m anya. Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara na oge eruola ka m gbanwee otú m si ebi ndụ.

N’oge niile a, o nweghị Onyeàmà Jehova mụ na ya na-amụ Baịbụl, ma m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ m malitere ịga ọmụmụ ihe ha, ahụ́ anaghị eru m ala, ihere na-emekwa m. Ma ọtụtụ ndị m hụrụ ebe ahụ ji obi ha niile nabata m, ihe m na-amụta ebe ahụ na-atọkwa m ụtọ. Ekpebiziri m na m ga-aghọ Onyeàmà Jehova. N’afọ 1981, e mere m baptizim bụ́ nke gosiri na enyefeela m Chineke onwe m.

Nwunye m enyeghị m nsogbu mgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova, n’agbanyeghị na ọ na-adị ya mgbe ụfọdụ ka Ndịàmà Jehova hà na-emegharị m anya. Ma, ọ bịara hụ mgbe a na-eme m baptizim. M nọgidere na-akọrọ ya ọtụtụ ihe m na-amụta na Baịbụl. Ihe dị ka otu afọ e mechara m baptizim, ka mụ na nwunye m nọ n’ụgbọala na-alọta ezumike, ọ gwara m na ya chọrọ ịghọ Onyeàmà Jehova. Ọ fọrọ obere ka m nyara ụgbọala ahụ tinye isi n’ọhịa n’ihi na atụghị m anya na ọ ga-ekwu ụdị ihe a! E mere ya baptizim n’afọ 1982.

Ọ dịghịrị anyị mfe ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ anyị. Dị ka ihe atụ, akwụsịrị m ịkọ ahịhịa ụtaba n’ihi na Baịbụl gosiri na ụdị ọrụ ahụ adịghị mma. (2 Ndị Kọrịnt 7:1; Jems 2:8) Ma, o wetụrụ anyị oge tupu anyị achọta ọrụ ọzọ anyị ga-eji na-akpa afọ ezinụlọ anyị. Ihe ọzọ bụ na mgbe anyị ghọrọ Ndịàmà Jehova, ndị ikwu anyị ekweghị abịa n’ụlọ anyị ruo ọtụtụ afọ. Anyị mesoro ha omume ọma dị ka Baịbụl kwuru, si otú ahụ gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. Anyị na ha mechara dị ná mma, ha anaghịzi agbara anyị ọsọ.

URU NDỊ M RITERELA: Otú m si merie nsogbu ndị m nwerela emeela ka m mata na Jehova Chineke na-enyere m aka ma na-enwere m ndidi. Ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ bụ ime ihere, ụkọ ego, na nsogbu ndị ezinụlọ m nọ na-enye m. Dị ka ihe atụ, abụ m otu n’ime ndị na-elekọta ọgbakọ Ndịàmà Jehova, m na-anọkarịkwa n’ihu ọgbakọ ezi ihe. Ebe ọ bụ na m na-asụ nsụ maka na ahụ́ anaghị erucha m ala, ịnọ n’ihu ha na-ezi ihe anaghị adịchara m mfe. Ma, m ka na-ezi ihe n’ọgbakọ n’ihi na Jehova na-aza m ekpere m na-ekpe mgbe niile ka o nyere m aka.

Mụ na nwunye m adịkwuola ná mma, otú anyị si hụ ibe anyị n’anya enweghị atụ. Anyị ma na o nwere ihe ndị anyị na-emetaghị mgbe anyị na-azụ ụmụ anyị, ma anyị gbalịsiri ike kụziere ha ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl. (Diuterọnọmi 6:6-9) Ọkpara m na nwunye ya bi ná mba ọzọ ugbu a na-ekwusa ozi ọma.

Echetara m ihe mere otu ụbọchị mgbe ọ na-adịchabeghị anya mụ na ezinụlọ m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Akwụsịrị m ụgbọala anyị n’èzí ma lee anya n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova bụ́ ebe anyị na-anọ amụ Baịbụl. Mgbe m hụrụ ndị zukọrọ n’ebe ahụ, ajụrụ m ndị ezinụlọ m, “Gịnị ka unu na-ahụ n’ụlọ nzukọ ahụ?” Ndị nọ n’ime ụlọ nzukọ ahụ si ná mba dị iche iche, ha na-asụkwa asụsụ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Albenia, ndị Ọstrelia, ndị Kroeshia, na ndị si ná mba ndị ọzọ. Ma, ha niile na-emekọ ihe ọnụ n’enweghị nsogbu. Obi dị m ụtọ na m so ná ndị a na-efe Chineke bụ́ ndị nọ ma n’Ọstrelia ma n’ụwa niile.—1 Pita 5:9.

“Ike agwụghị nwanne m nwaanyị inyere m aka.”—YELENA VLADIMIROVNA SYOMINA

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1952

ABỤ M ONYE: RỌSHỊA

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE AṄỤRỤMA, O NWEKWARA MGBE M CHỌRỌ IGBU ONWE M

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m na Krasnogọsk, bụ́ obere obodo dị nso na Mọsko. A naghị enwe ọgba aghara n’obodo a. Papa m na mama m bụ ndị nkụzi, enwekwara m isi akwụkwọ. N’ụlọ akwụkwọ, m mụtara otú e si agụ egwú na otú e si akụ egwú. N’ihi ya, echere m na ihe ga-agaziri m ná ndụ.

Mgbe m lụrụ di, mụ na di m kwagara n’obodo ebe ndị mmadụ na-akpọkarị ibe ha iyi, na-aṅụ oké mmanya na sịga. Mgbe m na-amala ihe na-emenụ, m malitela ime ihe ndị ahụ ha na-eme. Mgbe m malitere ịga oriri na nkwari, ihe mere m ji aga bụ naanị ka m gụọrọ ndị mmadụ egwú ma kpọọrọ ha ụbọ. Ma, mgbe ọ bụla m gara ebe ahụ, ndị mmadụ na-akpọ m ka m bịa soro ha ṅụọ mmanya na sịga. Obere oge, aghọrọ m onye aṅụrụma.

Mmanya ahụ m na-aṅụ malitere ịkpa m aka ọjọọ. O mechara chọọ ịta isi m. N’oge ahụ, ọ na-esiri m ike iri ihe ọ bụla. Ọnwụ bịaziri gụwa m. O nwedịrị mgbe m nwara igbu onwe m. Ma obi dị m ụtọ na egbughị m onwe m n’oge ahụ.

N’oge ihe a niile na-eme, nwanne m nwaanyị na-abịa na nke m mgbe niile. Ọ ghọọla Onyeàmà Jehova mgbe ahụ, ọ na-agbalịkwa ime ka m ghọta na Baịbụl nwere ike ịgbanwe ndụ m. Achọghị m ịmụ Baịbụl, achọghịkwa m ka ọ na-abịa n’ụlọ m. Ma, ike agwụghị nwanne m nwaanyị inyere m aka. O nweere m ezigbo ndidi, ọ hụkwara m n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere m ji mechaa kweta ịmụ Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl, ekpebisiri m ike ịkwụsị ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Ọ bụ n’oge ahụ ka otu nwoke bụ́ onye agbata obi m mmanya na-egbu lụsoro m ọgụ ma tie m ezigbo ihe. O merụrụ m ezigbo ahụ́ nke na e bugara m ụlọ ọgwụ. Nwoke ahụ merụrụ m ahụ́ n’otu anya, gbajiekwa ọgịrịga m anọ. Ma, oge ahụ m nọrọ n’ụlọ ọgwụ mere ka ọ dịrị m mfe ịkwụsị ịṅụ mmanya na-aba n’anya.

Mgbe ahụ m nọ n’ụlọ ọgwụ, m na-ekpe ekpere mgbe niile. Otu ebe kasiri m obi nke ukwuu na Baịbụl bụ akwụkwọ Abụ Ákwá 3:55, 56, bụ́ ebe kwuru, sị: “Jehova, esiwo m n’ime ime olulu kpọkuo aha gị. Nụrụ olu m. Ewepụla ntị gị wee ghara ịnapụta m, wee ghara ịnụ mkpu enyemaka m na-eti.”

O doro m anya na Jehova zara ekpere m. O nyeere m aka ka m ghara ịga mewe omume ọjọọ m na-emebu. O nwere mgbe ọ fọrọ obere ka m maliteghachi ịṅụ mmanya. Ma, obi dị m ụtọ na mụ emechaghị ṅụwakwa mmanya na-aba n’anya.

Ka m na-amụkwu Baịbụl, amụtara m na m kwesịrị ịna-erubere di m isi ebe ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ anyị. (1 Pita 3:1, 2) Ọ dịghịrị m mfe ime otú ahụ ebe ọ bụ na ọ marala m ahụ́ ịna-atụrụ ya ihe ọ na-eme. M kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere m aka. M mechara jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee ma ghọọ ezigbo nwunye, na-enyekwara di m aka.

Mgbe di m ọma hụrụ na ndụ m agbanweela, o juru ya anya. Tupu mgbe ahụ, ọ chọghị ịmụ Baịbụl. Ma mgbe m kpebiri na mụ agakwaghị aṅụ sịga, ọ sịrị: “Ị kwụsịhaala ịṅụ sịga, m ga-amalite ịmụ Baịbụl!” Ọ bụ n’otu ụbọchị ka anyị abụọ kwụsịrị ịṅụ sịga.

URU NDỊ M RITERELA: Di m mere ihe o kwuru, ọ malitere ịmụ Baịbụl. Ugbu a, anyị na-agụkọ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị, na-echebarakwa ihe anyị gụtara echiche ma na-agbalị ime ihe anyị mụtara na Baịbụl.

Uru mgbanwe ndị a anyị mere baara ezinụlọ anyị abụghị ihe e ji ọnụ ekwu, ọ baakwarala mụnwa ezigbo uru. Ana m ekele Jehova maka otú o si mee ka m bịaruo ya nso. (Jọn 6:44) Ana m ekelekwa nwanne m nwaanyị n’ihi na ike agwụghị ya inyere m aka. Ejirila m ihe mere ná ndụ m mata na Baịbụl na-agbanwe ndụ ndị mmadụ n’eziokwu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

M chọpụtara na oge eruola ka m gbanwee otú m si ebi ndụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Nwanne m nwaanyị nweere m ezigbo ndidi, ọ hụkwara m n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere m ji mechaa kweta ịmụ Baịbụl