Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ha Abụghị nke Ụwa”

“Ha Abụghị nke Ụwa”

“Ha Abụghị nke Ụwa”

“Ụwa kpọrọ ha asị, n’ihi na ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.”—JỌN 17:14.

Gịnị Ka Ihe A Jizọs Kwuru Pụtara? Jizọs etinyeghị aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’esemokwu ndị mmadụ na-ese n’oge ọ nọ n’ụwa n’ihi na ọ bụghị nke ụwa. O kwuru, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.” (Jọn 18:36) Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịna-eme omume rụrụ arụ ma na-ekwu okwu ndị Baịbụl kwuru na ha adịghị mma.—Matiu 20:25-27.

Ndị Kraịst Oge Mbụ Hà Mere Ka Jizọs? Otu nwoke nke na-ede ihe gbasara okpukpe, nke aha ya bụ Jonathan Dymond, kwuru na “ihe ọ sọkwara ndị mmadụ mee [Ndị Kraịst oge gboo], ma à kparịrị ha, ma à tụrụ ha mkpọrọ ma ọ bụ gbuo ha, ha ekweghị aga [agha].” Ọ na-akara ha mma ịta ahụhụ kama ha ga-aga agha. Omume ọma ha mekwara ka ha dị iche ná ndị ọzọ. A gwara Ndị Kraịst, sị: “Ebe ọ bụ na unu esoghị ha na-ebi ndụ ịla n’iyi a, ọ na-eju ha anya, ha ewee na-ekwujọ unu.” (1 Pita 4:4) Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Will Durant, dere na otú Ndị Kraịst oge gboo si “na-eme omume ọma nọ na-agbawa ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị ihe ọjọọ na-atọ ụtọ, obi.”

N’oge Anyị A, Ole Ndị Na-eme Ihe ahụ Jizọs Kwuru? Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru banyere Ndị Kraịst na-ekweghị aga agha, sị: “Mmadụ ịjụ ịga agha n’ihi na akọnuche ya anabataghị ya bụ ihe ọjọọ.” Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere agha a lụrụ na Rụwanda n’afọ 1994, bụ́ mgbe otu agbụrụ chọrọ igbukpọ agbụrụ ibe ya, kwuru na chọọchị niile so lụọ agha ahụ “ma e wezụga Ndịàmà Jehova.”

Mgbe otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị na-ekwu banyere otú ndị ọchịchị Nazi si chọọ igbuchapụ ndị Juu na ndị okpukpe ụfọdụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ sịrị na “ọ dịghị òtù ọ bụla kwuru na ụgha niile a ghara na arụrụala niile a rụrụ mgbe ahụ adịghị mma.” Ma mgbe onye nkụzi a kpọtụchaara otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka, bụ́ ebe e debere ihe ndị e ji echeta ihe mere n’oge ọchịchị ndị Nazi chọrọ igbuchapụ ndị Juu na ndị okpukpe ụfọdụ, ọ chọpụtara na n’agbanyeghị otú e si chie Ndịàmà Jehova ọnụ n’ala n’oge ahụ, ha akwadoghị ihe ndị ọchịchị Nazi na-eme. O deziri, sị: “Amatala m na o nwere ndị kwuru na ihe e mere n’oge ahụ adịghị mma.”

Oleekwanụ otú ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele omume rụrụ arụ anya? Otu magazin a na-akpọ U.S. Catholic kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ bụ́ ndị Katọlik ekweghị n’ihe chọọchị Katọlik kwuru banyere ịkwa iko na nwoke na nwaanyị ibi mgbe ha na-alụbeghị.” Magazin ahụ kwukwara na otu onye dikin na chọọchị ahụ kwuru, sị: “E kee ndị na-abịa ịgba akwụkwọ na chọọchị Katọlik ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ ise n’ime ha ebirila ebiri tupu ha abịa ịgba akwụkwọ.” Ma, akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru na Ndịàmà Jehova “anaghị etinye aka n’omume rụrụ arụ.”