Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”

“A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”

Bịaruo Chineke Nso

“A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”

MGBE ụfọdụ, obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị cheta ihe ndị mere n’oge gara aga. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma anyị cheta oge ndị anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nọrịrị. Ma, e nwere ihe ndị ọ na-abụ anyị cheta, obi ajọọ anyị njọ. Ò nwere ihe ndị na-agbawa gị obi ugbu a ma i cheta ha? Ọ bụrụ na e nwere, i nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ò nwekwara mgbe ihe ndị a ga-apụ m apụ n’obi?’ Aịzaya onye amụma zara ajụjụ a nke ọma. Ihe o kwuru ga-agba anyị ezigbo ume.—Gụọ Aịzaya 65:17.

Jehova bu n’obi iwepụ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu bụ́ ndị ọ na-abụ anyị cheta, obi ajọọ anyị njọ. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-ewepụ ajọ ụwa a na nsogbu niile dị na ya, ma were ụwa nke ka ya mma dochie ya. Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwe nkwa, sị: “Lee, m na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Ọ bụrụ na anyị aghọta nkwa a Chineke kwere, obi ga-atọ anyị ụtọ, ọ ga-emekwa ka anyị nwee olileanya.

Gịnị bụ eluigwe ọhụrụ ahụ? Baịbụl kwuru ihe abụọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ bụ. Nke mbụ bụ na mmadụ abụọ ọzọ so dee Baịbụl kwuru banyere eluigwe ọhụrụ ahụ, ihe ha kwuru gosiri na a ga-enwe ezigbo mgbanwe n’ụwa a. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4) Nke abụọ bụ na n’Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ “eluigwe” na-anọchi anya ọchịchị mgbe ụfọdụ. (Aịzaya 14:4, 12; Daniel 4:25, 26) N’ihi ya, eluigwe ọhụrụ ahụ bụ ọchịchị ọhụrụ nke ga-eme ka e nwee ezi omume n’ụwa. E nwere naanị otu ọchịchị nke nwere ike ime ihe a niile. Ọ bụ Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị eluigwe ahụ Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka ọ bịa. Alaeze ahụ ga-eme ka uche ezi omume Chineke mewe n’ụwa niile.—Matiu 6:9, 10.

Ma, gịnị bụ ụwa ọhụrụ ahụ? Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe abụọ Baịbụl kwuru bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịmata ihe ọ bụ n’eziokwu. Nke mbụ bụ na n’Akwụkwọ Nsọ, mgbe ụfọdụ, okwu bụ́ “ụwa” pụtara ndị mmadụ, ọ bụghị naanị ụwa nkịtị. (Jenesis 11:1; Abụ Ọma 96:1) Nke abụọ bụ na Akwụkwọ Nsọ buru amụma na ndị na-erubere Chineke isi ga-amụta ezi omume, ezi omume ahụ ga-ezukwa ụwa niile. (Aịzaya 26:9) N’ihi ya, ụwa ọhụrụ ahụ bụ ụmụ mmadụ ndị ga-erubere ọchịchị Chineke isi ma na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ.

Ị̀ ghọtawala otú Jehova ga-esi ewepụ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu, bụ́ ndị ọ na-abụ anyị cheta obi ajọọ anyị njọ? N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-emezu nkwa ahụ o kwere. Ọ ga-eme ka e nwee eluigwe ọhụrụ, meekwa ka e nwee ụwa ọhụrụ nke a ga-enwe ezi omume na ya. * N’ụwa ọhụrụ ahụ, Jehova ga-akwụsị ihe niile na-akpatara anyị obi mgbawa ma anyị cheta ha. Ndụ ga-atọ ndị niile na-erubere Jehova isi ụtọ, ihe ndị ha ga na-echeta kwa ụbọchị ga-abụ ihe ga na-eme ha obi ụtọ.

Oleekwanụ maka ihe ndị nwere ike ịna-agbawa anyị obi ugbu a? Jehova sikwa n’ọnụ Aịzaya kwe nkwa, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” Anyị ga-eji nwayọọ nwayọọ chefuo ihe na-enye anyị nsogbu n’obi n’ụwa ochie a. Nke a ọ̀ na-eme gị obi ụtọ? Ya bụrụ otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị chọpụta otú i nwere ike isi bịarukwuo Chineke nso bụ́ onye kwere nkwa na ya ga-emere anyị ihe ọma ndị ahụ n’ọdịnihu?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na ihe Alaeze ahụ ga-eme n’oge na-adịghị anya, gụọ isi nke 3, nke 8, na nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Mach:

Aịzaya 63-66Jeremaya 1-16

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Jehova bu n’obi iwepụ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu, bụ́ ndị ọ na-abụ anyị cheta obi ajọọ anyị njọ