Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Anyị

Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Anyị

Ka Anyị Na-aṅụrị Ọṅụ n’Olileanya Anyị

“[Anyị nwere] olileanya ndụ ebighị ebi, nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe dị anya gara aga.”—TAỊ. 1:2.

NTỤLEGHACHI

․․․․․

Olee otú anyị si mara na a na-enwe ọṅụ n’eluigwe mgbe onye e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ?

․․․․․

Olee otú olileanya atụrụ ọzọ si gbasa olileanya ndị e tere mmanụ?

․․․․․

Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihe anyị na-atụ anya ya, olee “àgwà dị nsọ” anyị kwesịrị ịna-akpa, na “omume ịsọpụrụ Chineke” anyị kwesịrị ịna-eme?

1. Olee otú olileanya Jehova nyere anyị nwere ike isi mee ka anyị na-atachi obi?

PỌL onyeozi kwuru na Jehova bụ “Chineke onye na-enye olileanya.” O kwukwara na Jehova nwere ike ‘ime ka anyị jupụta n’ọṅụ niile na udo niile n’ihi na anyị kwere ekwe, ka anyị wee jupụta n’olileanya n’ike mmụọ nsọ.’ (Rom 15:13) Ọ bụrụ na anyị na-echeta olileanya anyị, anyị ga-enwe ike idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị, ọṅụ na udo ejukwa anyị obi. Dị ka e kwuru banyere olileanya Ndị Kraịst e tere mmanụ, olileanya Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-abụ “arịlịka maka mkpụrụ obi.” Ọ bụ olileanya “e ji n’aka, nke guzosikwara ike.” (Hib. 6:18, 19) Olileanya anyị ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị bịaara anyị, mee ka anyị ghara inwewe obi abụọ, meekwa ka okwukwe anyị sie ike.—Gụọ Ndị Hibru 2:1; 6:11.

2. Olee olileanya abụọ Ndị Kraịst nwere taa, gịnịkwa mere “atụrụ ọzọ” ji nwee mmasị n’olileanya nke ndị e tere mmanụ?

2 Ndị Kraịst bi n’oge ọgwụgwụ a nwere olileanya abụọ. Ndị fọdụrụ ‘n’ìgwè atụrụ nta,’ bụ́ ndị e tere mmanụ, nwere olileanya inweta anwụghị anwụ n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-eso Kraịst bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’Alaeze ya. (Luk 12:32; Mkpu. 5:9, 10) “Atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị dị ọtụtụ karịa ìgwè atụrụ nta, nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’elu ụwa mgbe Alaeze Mesaya ga na-achị. (Mkpu. 7:9, 10; Jọn 10:16) Atụrụ ọzọ ahụ ekwesịghị ichefu na ihe ga-eme ka a zọpụta ha bụ iji obi ha niile na-akwado “ụmụnna” Jizọs e tere mmanụ, bụ́ ndị ka nọ n’ụwa. (Mat. 25:34-40) Ndị e tere mmanụ ga-enweta ụgwọ ọrụ ha, ma atụrụ ọzọ ahụ ga-enwetakwa nke ha. (Gụọ Ndị Hibru 11:39, 40.) Ka anyị burugodị ụzọ tụlee olileanya Chineke nyere ndị e tere mmanụ.

“OLILEANYA DỊ NDỤ” NDỊ KRAỊST E TERE MMANỤ NWERE

3, 4. Olee otú e si ‘mụọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ọzọ ka ha nwee olileanya dị ndụ,’ gịnịkwa bụ olileanya ahụ?

3 Pita onyeozi degaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi abụọ. N’akwụkwọ ozi nke mbụ, ọ kpọrọ ha “ndị a họọrọ.” (1 Pita 1:1) Ọ kọwara olileanya magburu onwe ya ìgwè atụrụ nta ahụ nwere. O dere n’akwụkwọ ozi mbụ ya, sị: “Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na dị ka ebere ya si dị ukwuu, ọ mụrụ anyị ọzọ ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ site n’ime ka Jizọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ka anyị wee nweta ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi. E debeere ya unu n’eluigwe, unu ndị ike Chineke na-echebe site n’okwukwe maka nzọpụta a na-aga ikpughe n’oge ikpeazụ. Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi ihe a.”—1 Pita 1:3-6.

4 Jehova mụrụ Ndị Kraịst ole na ole ọzọ. Ọ bụ ha ka ọ họọrọ ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe. O ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ ka ha soro Kraịst bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà. (Mkpu. 20:6) Pita kwuru na ‘ịmụ ọzọ’ ahụ mere ka ha nwee “olileanya dị ndụ” nke ọ kpọrọ “ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi,” nke e debeere ha “n’eluigwe.” Ka a sịkwa ihe mere ndị e tere mmanụ ji “na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu” n’ihi olileanya dị ndụ ha nwere! Ma ihe ga-eme ka ha nweta ihe ha na-ele anya ya bụ ikwesị ntụkwasị obi.

5, 6. Gịnị mere Ndị Kraịst e tere mmanụ ji kwesị ịgbalịsi ike ime ka òkù a kpọrọ ha bụrụ ihe ha ji n’aka?

5 N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pita dere, ọ gbara Ndị Kraịst e tere mmanụ ume ka ha ‘gbalịsie ike ka ha mee ka òkù a kpọrọ ha na nhọrọ a họọrọ ha bụrụ ihe ha ji n’aka.’ (2 Pita 1:10) Ha ga-agbalịsi ike inwe àgwà e ji mara Ndị Kraịst, dị ka okwukwe, nsọpụrụ Chineke, ịhụnanya ụmụnna, na ịhụnanya. Pita kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ihe ndị a adịrị n’ime unu ma jubiga ókè, ha ga-eme ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ.”—Gụọ 2 Pita 1:5-8.

6 Kraịst zigaara ndị okenye e tere mmanụ nọ n’ọgbakọ Filadelfịa dị n’Eshia Maịnọ ozi, sị: ‘N’ihi na unu debere okwu banyere ntachi obi m, m ga-echebe unu n’oge awa nke ule, bụ́ nke ga-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, iji lee ndị bi n’elu ụwa ule. Ana m abịa ọsọ ọsọ. Jidesienụ ihe unu nwere ike, ka onye ọ bụla wee ghara iwere okpueze unu.’ (Mkpu. 3:10, 11) Chineke kwere nkwa inye ndị ọ họọrọ ‘okpueze ebube nke na-adịghị emebi emebi’ ma ha kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Ọ bụrụ na onye e tere mmanụ ekwesịghịzi ntụkwasị obi, ọ gaghị enweta okpueze ahụ.—1 Pita 5:4; Mkpu. 2:10.

ỊBA N’ALAEZE CHINEKE

7. Olee olileanya dị ebube Jud kwuru banyere ya n’akwụkwọ ozi ya?

7 Ihe dị ka n’afọ 65 O.A., Jud, bụ́ nwanne Jizọs, degaara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ ozi. Ọ kpọrọ ha “ndị a kpọrọ.” (Jud 1; tụlee Ndị Hibru 3:1.) Ọ chọburu idere ha banyere olileanya nzọpụta dị ebube nke Ndị Kraịst a kpọrọ inweta Alaeze Chineke n’eluigwe “nwekọrọ ọnụ.” (Jud 3) Kama ime otú ahụ, o deere ha banyere ihe ndị ọzọ dị ezigbo mkpa. Ma n’ọgwụgwụ akwụkwọ ozi ahụ dị nkenke, o dere banyere olileanya dị ebube Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere, sị: “Onye ahụ nke nwere ike ichebe unu ka unu ghara ịsụ ngọngọ, onye nwekwara ike iche unu n’ihu ebube ya dị ka ndị na-enweghị ntụpọ n’oké ọṅụ, onye naanị ya bụ Chineke bụ́ Onye Nzọpụta anyị site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị, ka ebube, ịdị ukwuu, ike na ịbụisi dịrị ya site na mgbe niile ebighị ebi gara aga ruo ugbu a, ruokwa mgbe niile ebighị ebi.”—Jud 24, 25.

8. Dị ka e kwuru na Jud 24, gịnị gosiri na a na-enwe ọṅụ n’eluigwe mgbe otu n’ime ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ?

8 N’eziokwu, ezi Ndị Kraịst e tere mmanụ chọrọ ka Chineke chebe ha ka ha ghara ịsụ ngọngọ, nke ga-eme ka e bibie ha. Ha nwere olileanya na Jizọs Kraịst ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ka ha bụrụ ndị mmụọ zuru okè, nke ga-eme ka ha nwee ike iji oké ọṅụ gaa n’ihu Chineke. Ọ bụrụ na onye e tere mmanụ ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, o doro anya na ‘a ga-akpọlite ya dị ka ahụ́ nke mmụọ,’ ‘n’ereghị ure, n’ebube.’ (1 Kọr. 15:42-44) Ọ bụrụ na e nwere “ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ,” chegodị ụdị ọṅụ a ga-enwe n’eluigwe mgbe otu n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ jechara ozi ya n’ikwesị ntụkwasị obi n’ụwa. (Luk 15:7) Jehova na ndị mmụọ ozi ga-eso onye e tere mmanụ ṅụrịa ọṅụ mgbe onye ahụ ga-eji ‘oké ọṅụ’ nata ụgwọ ọrụ ya.—Gụọ 1 Jọn 3:2.

9. Olee otú a ga-esi mee ka ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi banye n’Alaeze “n’ụzọ dị ebube,” oleekwa otú olileanya ahụ na-eme ka obi dị ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa?

9 N’otu aka ahụ, Pita degakwaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi na ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi, nke ga-eme ka ha jide òkù a kpọrọ ha n’aka, ‘a ga-eme ka ha banye n’ụzọ dị ebube n’alaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.’ (2 Pita 1:10, 11) Chineke ga-eme ka ha nweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe “n’ụzọ dị ebube,” àgwà ọma ha e ji mara Ndị Kraịst apụtakwa ìhè. “Ụzọ dị ebube” o kwuru okwu ya nwekwara ike ịpụta ụdị ngọzi magburu onwe ya ndị ahụ gbasiri mbọ ike n’ọsọ ndụ ahụ ga-enweta. Ha na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ha cheta otú ha si kwesị ntụkwasị obi. O doro anya na olileanya a na-eme ka obi sie Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa ike ‘ike ájị̀ n’ume maka ọrụ’ ha ga-arụ.—1 Pita 1:13.

IHE MERE ATỤRỤ ỌZỌ ‘JI NWEE OLILEANYA’

10, 11. (a) Olee olileanya Chineke nyere atụrụ ọzọ ahụ? (b) Olee otú olileanya ibi n’ụwa si gbasa ‘mkpughe a ga-ekpughe ụmụ Chineke’?

10 Pọl onyeozi dere banyere olileanya dị ebube nke “ụmụ Chineke” e tere mmanụ nwere, ya bụ na ha ‘ga-eso Kraịst chịa.’ O kwuziri banyere olileanya dị ebube Jehova nyere atụrụ ọzọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke [bụ́ mmadụ] na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke [bụ́ ndị e tere mmanụ]. N’ihi na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya, kama site n’aka onye ahụ nke doro ya, ka o nwee olileanya na a ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Rom 8:14-21.

11 Jehova nyere ụmụ mmadụ ihe ga-eme ‘ka ha nwee olileanya’ mgbe o kwere nkwa na ya ga-anapụta ha n’aka “agwọ mbụ ahụ,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, site n’aka “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa. (Mkpu. 12:9; Jen. 3:15) Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ isi sekpụ ntị ná “mkpụrụ” ahụ. (Gal. 3:16) Ọnwụ Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya mere ka ndị mmadụ nwee olileanya na a ga-anapụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. Mmezu olileanya ahụ gbasara ‘mkpughe a ga-ekpughe ụmụ Chineke.’ Ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị e mere ka ha dị ebube, so ná “mkpụrụ” ahụ. A ‘ga-ekpughe’ ha mgbe ha ga-eso Kraịst bibie ụwa ọjọọ Setan. (Mkpu. 2:26, 27) Nke a ga-eme ka a zọpụta ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.—Mkpu. 7:9, 10, 14.

12. Olee uru dị ebube ụmụ mmadụ ga-erite ná mkpughe a ga-ekpughe ndị e tere mmanụ?

12 N’Otu Puku Afọ ahụ Kraịst ga-achị, ahụ́ ga-eru ndị mmadụ Chineke ‘kere eke’ ala! N’oge ahụ, ụzọ ọzọ a ga-esi ‘kpughee’ “ụmụ Chineke” e mere ka ha dị ebube bụ na ha ga-eso Kraịst bụrụ ndị nchụàjà, nyere ndị mmadụ aka irite uru n’àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ. Mgbe Alaeze eluigwe ga na-achị ndị mmadụ, a ga-amalite ịnapụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. A ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị na-erubere Chineke isi ‘nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.’ Ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi na Puku Afọ ahụ nakwa mgbe a ga-ele ha ule ikpeazụ ná ngwụcha puku afọ ahụ, a ga-edenye aha ha ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ’ ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Mkpu. 20:7, 8, 11, 12) N’eziokwu, ọ bụ olileanya dị ebube!

NA-ECHETA OLILEANYA ANYỊ

13. Gịnị mere anyị ji nwee olileanya, oleekwa mgbe a ga-ekpughe Kraịst?

13 E nwere ọtụtụ ihe Pita kwuru n’akwụkwọ ozi abụọ ahụ o si n’ike mmụọ nsọ dee nke ga-enyere ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ aka ịna-echeta olileanya ha. O kwuru na ọ bụghị ihe ha rụrụ mere ka ha nwee olileanya, kama ọ bụ n’ihi obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ. O dere, sị: “Nweenụ uche ziri ezi; meenụ ka olileanya unu dịrị n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jizọs Kraịst.” (1 Pita 1:13) Mgbe a ga-ekpughe Kraịst bụ mgbe ọ ga-abịa ịkwụ ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ, meekwa ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke ihe Jehova kpere n’ikpe.—Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-10.

14, 15. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ilekwasị anya iji na-echeta olileanya anyị? (b) Gịnị ka Pita dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme?

14 Ihe anyị ga-eme iji na-echeta olileanya anyị bụ ịna-echeta na “ụbọchị Jehova” dị nso, na-akpakwa àgwà e ji mara Ndị Kraịst. Ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova ga-ebibi “eluigwe” dị ugbu a, ya bụ, ọchịchị ụmụ mmadụ, na “ụwa” dị ugbu a, ya bụ, ndị ajọ mmadụ na ‘ihe ndị dị n’ụwa.’ Pita dere, sị: “Chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche . . . , na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche, nke ga-eme ka eluigwe ree ọkụ wee gbazee, ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee!”—2 Pita 3:10-12.

15 A ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Ọchịchị Kraịst ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ, ndị ezi omume ọ ga-achị anọchie ndị ajọ omume niile. (2 Pita 3:13) Pita gwaziri anyị hoo haa ihe anyị ga-eme iji “na-echere” ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, ya bụ, ịna-echeta ya. Ọ sịrị: “Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, gbalịsienụ ike ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.”—2 Pita 3:14.

OMUME ANYỊ KWESỊRỊ IGOSI NA ANYỊ NA-ECHETA OLILEANYA ANYỊ

16, 17. (a) Olee “àgwà dị nsọ” anyị kwesịrị ịna-akpa, na “omume ịsọpụrụ Chineke” anyị kwesịrị ịna-eme? (b) Olee otú a ga-esi mezuo ihe anyị na-atụ anya ya?

16 Ọ bụghị naanị na anyị kwesịrị ịna-echeta olileanya anyị, kama omume anyị kwesịkwara igosi na anyị na-echeta ya. Anyị kwesịrị ilezi anya ka otú anyị si akpa àgwà na-atọ Jehova ụtọ. Ihe so ‘n’àgwà dị nsọ’ bụ ‘ime omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ’ ma na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke. (2 Pita 3:11; 1 Pita 2:12) Anyị kwesịrị ‘inwe ịhụnanya n’etiti onwe anyị.’ Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgbalịsi ike ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu, ma n’ọgbakọ anyị ma n’ebe ndị ọzọ. (Jọn 13:35) “Omume ịsọpụrụ Chineke” bụ ihe ndị na-egosi na anyị na Jehova dị ná mma, ya bụ, ihe ndị dị ka ime ka ekpere anyị ka mma, ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, ịmụsi ihe ike, ofufe ezinụlọ, na iji obi anyị dum na-ekwusa ‘ozi ọma alaeze’ Chineke.—Mat. 24:14.

17 Onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ịbụ ụdị onye Jehova hụrụ n’anya nakwa onye ọ ga-echebe mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a. Anyị ga-esi otú ahụ nweta ihe anyị na-atụ anya ya, ya bụ, “olileanya ndụ ebighị ebi, nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe dị anya gara aga.”—Taị. 1:2.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 22]

‘A na-amụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ọzọ ka ha nwee olileanya dị ndụ’

[Foto dị na peeji nke 24]

Na-enyere ndị ezinụlọ gị aka icheta olileanya ahụ