Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmadụ Chọrọ Ịma Onye Jizọs Bụ

Ndị Mmadụ Chọrọ Ịma Onye Jizọs Bụ

Ndị Mmadụ Chọrọ Ịma Onye Jizọs Bụ

“Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ụwa nwere ihe ọ ga-ekwu banyere [Jizọs]. Ma ànyị kweere na Jizọs ma ọ bụ na anyị ekweghị, mgbe ụfọdụ, anyị na-ajụ, sị, ‘Ònyedị ka Jizọs bụ?’”—STAN GUTHRIE, ONYE NA-EDE AKWỤKWỌ.

ỌTỤTỤ ndị chọrọ ịmata onye Jizọs bụ. Akwụkwọ ndị kọrọ akụkọ ya so n’akwụkwọ ndị kacha ewu ewu. Fim ndị kọrọ banyere ya na-ewukwa ewu. Ma, a ka nwere ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ banyere Jizọs. E nwere ihe dị iche iche ndị mmadụ chere banyere onye Jizọs bụ.

Afọ ole na ole gara aga, ndị nta akụkọ abụọ jụrụ ndị mmadụ n’Ịntanet, sị: “Ònye bụ Jizọs?” Lee ihe ụfọdụ ndị zara:

● “Ọ dị ka ọ̀ bụ onye nkụzi ndị Juu nke ji ndụ ya niile meere ndị mmadụ ihe ọma.”

● “Ọ bụ mmadụ nkịtị nke biri ndụ pụrụ iche.”

● “O nweghị ihe gosiri na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa a.”

● “Jizọs bụ Ọkpara Chineke nke a mụrụ, ya anwụọ, ma si n’ọnwụ bilie ka o wee zọpụta anyị ná mmehie anyị. Ọ dị ndụ ugbu a, ọ ga-abịakwa ọzọ n’ụwa.”

● “Ekweere m na Jizọs Kraịst bụ ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, ọ bụ mmadụ, bụrụkwa Chukwu.”

● ‘Akụkọ Jizọs bụ akụkọ ụmụaka.’

O doro anya na ihe a niile ndị mmadụ kwuru banyere Jizọs agaghị abụcha eziokwu. Ò nwere otu ebe anyị nwere ike isi nweta ezigbo azịza nke ajụjụ niile anyị na-ajụ banyere Jizọs? Ndị na-ebipụta magazin a kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, kwerekwa na ọ bụ naanị ya nwere ike ịgwa anyị nke bụ́ eziokwu banyere Jizọs. *2 Timoti 3:16.

N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị banyere Jizọs na otú Baịbụl si zaa ha. Jizọs n’onwe ya kwuru na “onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya” ga-enweta nzọpụta. (Jọn 3:16) Biko leba anya n’ihe ndị a Baịbụl zara ma jiri aka gị kpebie ma ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere Jizọs, matakwa otú ị ga-esi enwe okwukwe na ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere anyị ji kwuo na Baịbụl bụ Okwu Chineke, gụọ isiokwu bụ́ “Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.