Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst

Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst

Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst

“Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”​—LUK 9:18.

IHE mere Jizọs ji jụọ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ a bụ na ọ maara na e nwere ihe dị iche iche ndị mmadụ na-ekwu banyere ya, ụfọdụ kwuru gaa elu, ụfọdụ ekwuru gaa ala. Ma, o kwesịghị ịdị otú ahụ n’ihi na Jizọs anaghị agbara ndị mmadụ ọsọ, ọ naghịkwa arụ ọrụ ya na nzuzo. Kama nke ahụ, ọ na-agakwuru ndị mmadụ n’obodo ha dị iche iche, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụzi ihe n’ebe ndị mmadụ ga-ahụ ya n’ihi na ọ chọrọ ka ha mata nke bụ́ eziokwu banyere ya.—Luk 8:1.

Ọ bụ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn ka e dere ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. Akwụkwọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị anyị na-ajụ banyere Jizọs. *Jọn 17:17.

AJỤJỤ: Ọ̀ bụ eziokwu na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa a?

AZỊZA: Ee. Josephus, Tacitus, na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị ọzọ, bụ́ ndị dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, kwuchara na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa a. Ma nke ka nke bụ na akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn gosiri na Jizọs abụghị onye a kọrọ n’akụkọ ifo, kama ọ bụ onye dịrị ndụ n’ụwa a. Akwụkwọ ndị a kwuru kpọmkwem oge ihe ndị ha kọrọ banyere Jizọs mere nakwa ebe ndị ha mere. Dị ka ihe atụ, Luk, bụ́ onye dere akwụkwọ Luk, kpọrọ aha mmadụ asaa na-achị n’afọ Jizọs bidoro ozi ọma ya. Akwụkwọ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme dere kwukwara na mmadụ asaa ahụ Luk kpọrọ aha chịrị n’oge ahụ o kwuru.—Luk 3:1, 2, 23.

E nwere ọtụtụ ihe gosiri na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa a. Akwụkwọ bụ́ Evidence for the Historical Jesus kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na nwoke a na-akpọ Jizọs onye Nazaret dịrị ndụ n’ụwa a n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga.”

AJỤJỤ: Ọ̀ bụ Jizọs bụ Chineke?

AZỊZA: Mba. O nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya na Chineke hà. Kama nke ahụ, Jizọs kwuru ugboro ugboro na Jehova ka ya. * Dị ka ihe atụ, Jizọs kpọrọ Jehova “Chineke m,” kwuokwa na ọ bụ ‘naanị Jehova bụ ezi Chineke.’ (Matiu 27:46; Jọn 17:3) A sị na Jehova na Jizọs hà, Jizọs agaraghị akpọ Jehova “Chineke m” ma ọ bụkwanụ sị na ọ bụ ‘naanị Jehova bụ ezi Chineke.’ Ọ bụrụ na mmadụ na-akpọ onye were ya n’ọrụ “nna m ukwu” ma ọ bụ “ọga,” o doro anya na ọ ma na onye ahụ ọ na-arụrụ ọrụ ka ya.

Jizọs gosikwara na ya na Chineke abụghị otu onye. O nwere mgbe Jizọs gwara ndị na-ekwugide ya, sị: “E dekwara n’Iwu unu, sị, ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m, Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.” (Jọn 8:17, 18) Ọ bụrụ na Jizọs na Jehova bụ otu onye, o doro anya na Jizọs agaraghị ekwu na ya na-agba àmà banyere onwe ya, kwuokwa na Nna ya na-agba àmà banyere ya. *

AJỤJỤ: Jizọs ọ̀ bụ ezigbo mmadụ nkịtị biri n’ụwa a?

AZỊZA: Mba. Ọ bụghị naanị ezigbo mmadụ nkịtị. Jizọs ma na e nwere ọtụtụ ọrụ dị mkpa ọ na-arụ iji mezuo uche Chineke. Lee ụfọdụ n’ime ha:

“Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Jọn 3:18) Jizọs ma ebe o si bịa. Ọ nọbu n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa. Ọ sịrị: “Esi m n’eluigwe bịa.” (Jọn 6:38) Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere, ya enyeziere Chineke aka kee ihe ndị ọzọ. Ebe ọ bụ ya bụ naanị onye Chineke kere n’onwe ya, e nwere ike ikwu na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.”—Jọn 1:3, 14; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

“Nwa nke mmadụ.” (Matiu 8:20) Jizọs kpọrọ onwe ya “nwa nke mmadụ” ọtụtụ ugboro. Na Matiu, Mak, Luk, na Jọn, okwu ahụ bụ́ “nwa nke mmadụ” pụtara ihe dị ka ugboro iri asatọ. Nke a na-egosi na Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ bụghị Chineke bịara n’ụdị mmadụ. Olee otú Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya si bịa n’ụwa wee ghọọ mmadụ? Jehova ji mmụọ nsọ ya bufee ndụ Jizọs n’afọ Meri, bụ́ nwa agbọghọ n’amaghị nwoke bụ́ onye Juu, o wee dịrị ime. N’ihi nke a, Jizọs enweghị mmehie ọ bụla mgbe a mụrụ ya n’ụwa, o zuru okè.—Matiu 1:18; Luk 1:35; Jọn 8:46.

“Onye Ozizi.” (Jọn 13:13) Jizọs kwuru hoo haa na ọrụ Chineke zitere ya ka ya rụọ bụ ‘izi ihe na ikwusa ozi ọma’ Alaeze Chineke. (Matiu 4:23; Luk 4:43) Jizọs kọwaara ndị mmadụ ihe Alaeze Chineke bụ otú doro anya ma dị mfe nghọta, kọwaakwara ha otú Alaeze ahụ ga-esi emezu uche Jehova.—Matiu 6:9, 10.

“Okwu ahụ.” (Jọn 1:1) Jizọs bụ Ọnụ Na-ekwuchitere Chineke, ya bụ, onye Chineke si n’ọnụ ya mee ka ndị mmadụ mata ihe ọ chọrọ. Jehova ji Jizọs gwa ndị bi n’ụwa ihe ndị ọ chọrọ ka ha mara.—Jọn 7:16, 17.

AJỤJỤ: Ọ̀ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwuru na ọ ga-abịa?

AZỊZA: Ee. Baịbụl buru amụma banyere ọbịbịa Mesaya, ma ọ bụ Kraịst, nke pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Mesaya a e buru amụma na ọ ga-abịa ga-arụ ọrụ dị mkpa iji mezuo uche Jehova. O nwere otu oge otu nwaanyị Sameria gwara Jizọs, sị: “Amaara m na Mesaya na-abịa, bụ́ onye a na-akpọ Kraịst.” Jizọs gwaziri ya hoo haa, sị: “Ọ bụ mụ onwe m nke na-agwa gị okwu bụ ya.”—Jọn 4:25, 26.

Ò nwere ihe ndị gosiri na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ n’eziokwu? E nwere ụzọ ihe atọ a na-anaghị agbagha agbagha gosiri na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ụzọ ihe atọ ahụ mere ka o doo anya na o nweghị onye ọzọ bụ Mesaya ahụ ma ọ́ bụghị Jizọs. Ha bụ:

Ezinụlọ o si. Baịbụl buru amụma na Mesaya ahụ ga-esi n’ezinụlọ Ebreham nakwa n’ezinụlọ Devid. (Jenesis 22:18; Abụ Ọma 132:11, 12) Jizọs si n’ezinụlọ ha abụọ.—Matiu 1:1-16; Luk 3:23-38.

Amụma ndị mezuru n’isi ya. Akwụkwọ Nsọ Hibru buru ọtụtụ amụma banyere otú Mesaya ga-esi ebi ndụ n’ụwa, kwuokwa ọtụtụ ihe banyere ọmụmụ ya na ọnwụ ya. Amụma niile ahụ mezuru n’isi Jizọs. Lee ụfọdụ n’ime ha: A mụrụ ya na Betlehem (Maịka 5:2; Luk 2:4-11), e si n’Ijipt kpọpụta ya (Hosia 11:1; Matiu 2:15), a ga-egbu ya, ma o nweghị otu n’ime ọkpụkpụ ya ga-agbaji (Abụ Ọma 34:20; Jọn 19:33, 36). O nweghị otú Jizọs gaara esi eji aka ya mee ka amụma niile e buru banyere Mesaya ahụ mezuo n’isi ya. *

Ihe Chineke n’onwe ya kwuru. Mgbe a mụrụ Jizọs, Chineke zipụrụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa gwa ndị na-azụ atụrụ na a mụọla Mesaya. (Luk 2:10-14) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o nwere oge ndị Chineke si n’eluigwe kwuo na Jizọs bụ Ọkpara ya, onye ihe ya masịrị ya. (Matiu 3:16, 17; 17:1-5) Jehova nyekwara Jizọs ike o ji rụọ ọrụ ebube dị iche iche, bụ́ ndị so gosi na Jizọs bụ Mesaya ahụ.—Ọrụ 10:38.

AJỤJỤ: Gịnị mere Jizọs ji taa ahụhụ ma nwụọ?

AZỊZA: Ebe ọ bụ na Jizọs emeghị mmehie ọ bụla, o kwesịghị ịta ahụhụ. E kwesịghịkwa ịkpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ ka ọ̀ bụ onye omekome ma hapụ ya ka ọ nwụọ ọnwụ ihere. Jizọs maara na ọ bụ otú ahụ ka a ga-esi egbu ya ma kweta ka e si otú ahụ gbuo ya.—Matiu 20:17-19; 1 Pita 2:21-23.

Amụma dị iche iche e buru banyere Mesaya ahụ kwuru na Mesaya ahụ ga-ata ahụhụ ma nwụọ n’ihi mmehie ndị ọzọ. (Aịzaya 53:5; Daniel 9:24, 26) Jizọs kwuru na ya bịara n’ụwa ‘inye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Ndị niile nwere okwukwe n’àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ nwere olileanya na a ga-agbapụta ha ná mmehie na ọnwụ, ha nwekwara olileanya na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe a ga-eme ka ọ bụrụ paradaịs. *Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9, 10.

AJỤJỤ: Ànyị kwesịrị ikwere na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

AZỊZA: Ee. Jizọs maara na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. (Matiu 16:21) Ma, o nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya ga-akpọlite onwe ya n’ọnwụ, ndị so dee Baịbụl ekwughịkwa otú ahụ. O nweghị otú onye nwụrụ anwụ ga-esi akpọlite onwe ya. Kama Baịbụl sịrị: “Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ site n’ịtọpụ agbụ nke ọnwụ.” (Ọrụ 2:24) Ọ bụrụ na anyị kweere na Chineke dị, kwerekwa na ọ bụ Ya kere ihe niile, ọ gaghị esiri anyị ike ikwere na ọ ga-akpọliteli Ọkpara ya n’ọnwụ.—Ndị Hibru 3:4.

È nwere ezigbo ihe ndị gosiri na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ? E nwere. Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha.

Ihe ndị ji anya ha hụ mgbe a kpọlitere ya kwuru. Ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ Jizọs nwụrụ, Pọl onyeozi dere na ihe karịrị narị mmadụ ise ji anya ha hụ Jizọs mgbe o si n’ọnwụ bilie, kwuokwa na ọtụtụ n’ime ndị ahụ ka nọ ndụ mgbe ahụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:6) Ọ bụrụ na ọ bụ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ hụrụ Jizọs mgbe o si n’ọnwụ bilie, mmadụ nwere ike isi na ọ bụghị eziokwu, ma ebe ndị hụrụ ya karịrị narị mmadụ ise, o nweghị otú a ga-esi agbagha ihe ha niile kwuru.

Ihe ha hụrụ doro ha anya. Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs, bụ́ ndị hụrụ ihe merenụ, ji obi ike kwusaa na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. (Ọrụ 2:29-32; 3:13-15) Ha kweere na mmadụ ga-ekwetarịrị na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịbụ Onye Kraịst. (1 Ndị Kọrịnt 15:12-19) Ọ kaara ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs mma ịnwụ kama ịkwụsị inwe okwukwe na Jizọs. (Ọrụ 7:51-60; 12:1, 2) Ì chere na ndị ahụ na-eso ụzọ Kraịst gaara ekweta ịnwụ ma ọ bụrụ na ihe ha kwuru abụghị eziokwu?

Anyị ahụla otú Baịbụl si zaa ajụjụ isii dị mkpa ndị mmadụ na-ajụkarị banyere Jizọs. Azịza ndị ahụ emeela ka anyị ghọta onye Jizọs bụ. Ma ihe ndị ahụ Baịbụl zara hà dị mkpa? E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, mmadụ ò nwere ike ikwere ihe ọ bụla dị ya mma ma a bịa n’okwu banyere Jizọs?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe dị iche n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn na akwụkwọ ndị ọzọ na-esoghị na Baịbụl, bụ́ ndị kọrọ banyere Jizọs, gụọ isiokwu bụ́ “Akwụkwọ Apọkrịfa Ndị Kọrọ Banyere Jizọs—Ihe Ha Kọrọ Ọ̀ Bụ Eziokwu?” Ọ dị na peeji nke 18-19.

^ par. 9 Baịbụl kwuru na Jehova bụ aha Chineke.

^ par. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe dị iche na Jizọs na Chineke, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?” nke dị na peeji nke 20-22.

^ par. 21 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu amụma ndị ọzọ mezuru n’isi Jizọs, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 200.

^ par. 25 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ, gụọ isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?