Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara ndị na-ege ya ntị ka ha gaa maịl abụọ?

Mgbe Jizọs na-ezi ihe n’Ugwu Oliv, ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: ‘Ọ bụrụ na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.’ (Matiu 5:41) O yiri ka ndị na-ege Jizọs ntị n’oge ahụ hà ghọtara na ihe Jizọs na-ekwu okwu ya bụ ọrụ ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị agha na-amanye ndị mmadụ ka ha rụọ.

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ ndị Rom na-achị Izrel. N’ihi ya, ha na-amanye ndị mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ka ha rụọrọ ha ọrụ. Ha na-ewerekwa ihe ọ bụla ọzọ ndị mmadụ nwe arụ ọrụ ha chọrọ ịrụ. Dị ka ihe atụ, ndị agha ndị Rom manyere Saịmọn onye Saịrini ka o buga osisi ịta ahụhụ a ga-eji akpọgbu Jizọs n’ebe a ga-anọ gbuo Jizọs. (Matiu 27:32) Otú ahụ ndị Rom si amanye ndị mmadụ ịrụrụ ha ọrụ na-ewe ndị Juu ezigbo iwe, ha wekwaara ya ka mmegbu.

Anyị amaghị ebe ha nwere ike ịmanye mmadụ ka o buru ibu ruo. Ma o doro anya na onye a manyere ka o buru ibu gaa otu maịl agaghị achọ ịga ihe karịrị otu maịl ahụ. N’ihi ya, mgbe Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị ka ha gaa maịl abụọ, ihe ọ na-agwa ha bụ ka ha jiri obi ha niile rụọ ọrụ ọ bụla a manyere ha ịrụ, ma ọ bụrụhaala na ọrụ ahụ emegideghị iwu Chineke.—Mak 12:17.

Anas ahụ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Luk na Jọn, ònye ka ọ bụ?

Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe, e kwuru na ọ bụ Anas (Ananus) bụ “onyeisi nchụàjà.” (Luk 3:2; Jọn 18:13; Ọrụ 4:6) Ọ bụkwa ya bụ nna nwunye Keyafas, onye bụ́ nnukwu onye nchụàjà Izrel n’oge ahụ. Tupu Valerius Gratus, bụ́ onye Rom chịrị Judia, achụtuo Anas, Anas bụbu nnukwu onye nchụàjà malite n’afọ 6 ma ọ bụ afọ 7 Oge Anyị ruo afọ 15 Oge Anyị. N’agbanyeghị na Anas abụghịzi nnukwu onye nchụàjà n’oge ahụ, ọnụ ka na-eru ya n’okwu n’Izrel. Ụmụ ya ndị nwoke ise na di nwa ya nwaanyị mechara bụrụ nnukwu ndị nchụàjà.

Mgbe mba Izrel na-achị onwe ha, onye ọ bụla bụ́ nnukwu onye nchụàjà na-abụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ. (Ọnụ Ọgụgụ 35:25) Ma mgbe ndị Rom chịwara Izrel, ọ bụ ndị gọvanọ bụ́ ndị Rom na ndị eze ndị Rom họpụtara na-ekpebi onye ga-abụ nnukwu onye nchụàjà, ha nwekwara ike ịchụtu onye bụ́ nnukwu onye nchụàjà. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus kwuru na Kwiriniọs, bụ́ gọvanọ Siria, chụturu otu nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Joazar n’ihe dị ka afọ 6 ma ọ bụ afọ 7 Oge Anyị ma mee Anas nnukwu onye nchụàjà. Ma o yiri ka ọ̀ bụ naanị ndị bụ́ ndị nchụàjà ka ndị ọchịchị ahụ na-ahọpụta ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà.

Ezinụlọ Anas bara ezigbo ọgaranya, e jikwa anyaukwu mara ha. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji baa ọgaranya bụ na ọ bụ naanị ha na-ahụ maka ire ihe ndị dị mkpa e ji achụ àjà n’ụlọ nsọ, dị ka nduru, atụrụ, mmanụ, na mmanya. Josephus kwuru na Ananus (Ananayas), bụ́ nwa Anas, nwere ‘ndị na-ejere ya ozi bụ́ ndị akpụ obi, ndị na-eji ike anara ndị nchụàjà otu ụzọ n’ụzọ iri; ha na-etikwa onye ọ bụla jụrụ inye nke ya ihe.’