Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Biko, Kwe Ka Anyị Lọghachikwute Gị”

“Biko, Kwe Ka Anyị Lọghachikwute Gị”

Bịaruo Chineke Nso

“Biko, Kwe Ka Anyị Lọghachikwute Gị”

Ị̀ na-efebu Jehova ma mechaa kwụsị ife ya? Ò nwetụla mgbe ị chọrọ ibidokwa ife Jehova ma ya adị gị ka ọ gaghị anabata gị? Biko, gụọ isiokwu a na nke na-eso ya nke ọma. Ọ bụ gị ka e bu n’obi dee ha.

OTU nwaanyị nke hapụrụ ihe ọma ndị a kụziiri ya mgbe ọ bụ nwata ma biwe ndụ ọjọọ kwuru, sị: “Arịọrọ m Jehova n’ekpere ka o kwe ka m lọghachikwute ya nakwa ka ọ gbaghara m ihe ọjọọ niile m mere ya.” Ị̀ na-emetere nwaanyị a ebere? Ò nwere mgbe ị na-ajụ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ na-efebu Chineke ma mechaa kwụsị ife ya, olee otú Chineke si ele onye ahụ anya? Ọ̀ ka na-echeta onye ahụ? Ọ̀ chọrọ ka onye ahụ “lọghachikwute ya”?’ Ihe Jeremaya dere ga-enyere anyị aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị a. N’eziokwu, ihe o dere ga-eme gị obi ụtọ.—Gụọ Jeremaya 31:18-20.

Ka anyị lebagodị anya n’ihe ndị na-eme mgbe Jeremaya dere ihe ahụ. N’afọ 740 Tupu Oge Anyị, nke bụ́ ihe dị ka afọ iri itoolu tupu Jeremaya abụrụ onye amụma, Jehova gbara nkịtị ka ndị Asiria merie alaeze ebo iri nke Izrel ma dọrọ ha n’agha. * Chineke gbara nkịtị ka ihe a mee ndị ya n’ihi na ọ chọrọ iji ya dọọ ha aka ná ntị maka ihe ọjọọ ndị ha na-eme. Chineke chọkwara iji ya dọọ ha aka ná ntị maka na ha ekweghị ege ndị amụma ya ntị, bụ́ ndị gwara ha ugboro ugboro ka ha kwụsị ihe ọjọọ ndị ha na-eme. (2 Ndị Eze 17:5-18) Ugbu a ha na Chineke na-adịkwaghị ná mma, ahụhụ ha na-ata ò meela ka ha chegharịa? Jehova ò chefuola ha? Ọ̀ ga-anabata ha ma ha lọghachikwute ya?

“M Kwara Ụta”

Mgbe ndị Izrel nọ n’ebe ahụ a kpụgara ha, ha ghọtara ihe ha mere onwe ha ma chegharịa. Jehova chọpụtakwara na ha ji obi ha niile chegharịa. Gụọ otú Jehova si kọwaa otú obi dị ụmụ Izrel ahụ, bụ́ ndị a kpọrọ Ifrem.

Jehova sịrị: “Anụwo m ka Ifrem na-akwa ákwá arịrị.” (Amaokwu nke 18) Ọ nụrụ ka ndị Izrel na-ebe ákwá n’ihi nsogbu mmehie ha kpataara ha. Ha dị ka nwa mmefu nke kpudoro ihu n’ala na-efufe isi ya mgbe ọ na-echeta ahụhụ ọ kpataara onwe ya na otú ihe si kara ya mma mgbe ọ nọ n’ụlọ nna ya. (Luk 15:11-17) Gịnị ka ndị Izrel ahụ nọ na-ekwu?

“Ị gbaziwo m . . . dị ka nwa ehi a na-azụghị azụ.” (Amaokwu nke 18) Ndị Izrel ahụ kwetara na ọ bụ ha metere ihe e ji tawa ha ahụhụ. Ha dị ka nwa ehi a na-azụghị azụ. Otu akwụkwọ kwuru na ihe nke a pụtara bụ na ha dị ka oké ehi nke onye nwe ya “na-agaraghị adụ ndụdụ e ji achị ehi ma a sị na ehi ahụ rụrụ ọrụ a chọrọ ka ọ rụọ.”

“Kpọghachite m, m ga-alọghachikwa, n’ihi na ị bụ Jehova bụ́ Chineke m.” (Amaokwu nke 18) Ebe ọ bụ na ha echegharịala, ha kpọkuru Chineke. Ha nọ na-eme mmehie kemgbe, ma ugbu a, ha na-arịọzi ya ka o nyere ha aka ka ha lọghachikwute ya. Otu e si sụgharịa amaokwu a n’otu Baịbụl bụ: “Ị bụ Chineke anyị, biko, kwe ka anyị lọghachikwute gị.”—Baịbụl bụ́ Contemporary English Version.

“M kwara ụta. . . . Ihere wee jide m, m wee bụrụ onye e mechuru ihu.” (Amaokwu nke 19) Mmehie ha wutere ha. Ha kwetara na ha mere ihe ọjọọ. Ihere onwe ha mewere ha, ha nọkwa ka ndị na-eru uju.—Luk 15:18, 19, 21.

Ndị Izrel ahụ echegharịala. Ihe ndị ha mere wutere ha, ha kwupụtakwara mmehie ha n’ihu Chineke ma kwụsị ihe ọjọọ niile ha na-eme. Nchegharị ha ò metụrụ Chineke n’obi? Ọ̀ ga-ekwe ka ha lọghachikwute ya?

“Aghaghị M Inwere Ya Ọmịiko”

Jehova ejighị ndị Izrel egwuri egwu. Ọ sịrị: “Aghọworo m Izrel Nna; Ifrem bụkwa ọkpara m.” (Jeremaya 31:9) Ò nwere nna hụrụ ụmụ ya n’anya nke na-agaghị anabata nwa ya mejọrọ ya ma ọ hụ na nwa ahụ ji obi ya niile chegharịa? Legodị ihe Jehova gwara ndị ya iji gosi otú obi dị ya n’ebe ha nọ.

“Ọ̀ bụ na Ifrem abụghị nwa m hụrụ n’anya na nwa m na-apa apa? N’ihi na ruo n’ókè m kwuru okwu megide ya, ruo n’ókè ahụ ka m na-aghaghị icheta ya.” (Amaokwu nke 20) N’eziokwu, okwu ndị a na-eru n’obi! Chineke dị ka nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya, nke na-atakwa nwa ya ahụhụ ma o mee ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo okwu “megide” ụmụ ya, dọọkwa ha aka ná ntị ugboro ugboro ka ha kwụsị mmehie ha. Mgbe ha gbara isi akwara, ọ hapụrụ ha ka a dọrọ ha n’agha laa mba ọzọ. N’agbanyeghị na ọ tara ha ahụhụ, o chefughị ha. O nweghị ihe ga-eme ka o chefuo ha. Ezigbo nna anaghị echefu ụmụ ya. Ma, olee otú obi dị Jehova mgbe ọ hụrụ na ụmụ ya echegharịala n’eziokwu?

“Ọ bụ ya mere eriri afọ m ji eme mkpọtụ n’ihi ya. * Aghaghị m inwere ya ọmịiko.” (Amaokwu nke 20) Ọ gụrụ Jehova agụụ ka ụmụ ya lọghachikwute ya. Otú ha si jiri obi ha niile chegharịa metụrụ ya n’obi. Jehova dị ka nna ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’akụkọ nwa mmefu. Jehova ‘nwere ọmịiko’ n’ebe ụmụ ya nọ, ọ na-agụkwa ya agụụ ịnabata ha.—Luk 15:20.

“Jehova Kwere Ka M Lọghachikwute Ya!”

Ihe ahụ e dere na Jeremaya 31:18-20 enyerela anyị aka ịghọta otú ebere na ọmịiko Jehova haruru. Chineke anaghị echefu ndị feburu ya ma mechaa kwụsị ife ya. Ọ bụrụ na ha chọrọ ịlọghachikwute Jehova, ọ̀ ga-anabata ha? Chineke dị “njikere ịgbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ọ gaghị ajụ ndị ji obi ha niile chegharịa ma lọghachikwute ya. (Abụ Ọma 51:17) Kama ịjụ ha, ọ ga-eji obi ụtọ nabata ha.—Luk 15:22-24.

Nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a gosiri na ọ chọrọ ịlọghachikwute Jehova. Ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị nso n’ebe o bi. Ọ dịrịghị ya mfe ná mmalite n’ihi na ọ na-adị ya ka Jehova emekataghị gbaghara ya. Ọ sịrị: “N’oge ahụ, ọ dị m ka Jehova agaghịzi anabata m.” Ma ndị okenye ọgbakọ gbara ya ume ma nyere ya aka ka ya na Chineke dịwakwa ná mma. O ji obi ụtọ kwuo, sị, “Obi atọgbuola m na Jehova kwere ka m lọghachikwute ya!”

Ọ bụrụ na ị na-efebu Jehova ma mechaa kwụsị ife ya, ya abụrụkwa na ị chọrọ ibidokwa ife ya, anyị na-agba gị ume ka ị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị gị nso. Cheta na ebe ọ bụ na Jehova nwere ọmịiko ma na-eme ebere, ọ na-anabata ndị mmehie chegharịrịnụ ma ọ bụrụ na ha akpọkuo ya, sị, “Biko, kwe ka anyị lọghachikwute gị.”

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Eprel:

Jeremaya 17-31

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ihe dị ka narị afọ abụọ na iri ise tupu mgbe ahụ, ya bụ, n’afọ 997 Tupu Oge Anyị, e kewara alaeze Izrel ụzọ abụọ. Otu bụ alaeze ebo abụọ nke Juda. Ọ dị n’ebe ndịda. Nke ọzọ bụ alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu, bụ́ nke a na-akpọkwa Ifrem. Ihe mere e ji akpọ ya Ifrem bụ na ebo Ifrem bụ ebo a ma ama n’alaeze a.

^ par. 16 Otu akwụkwọ nke na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru ihe eriri afọ ime mkpọtụ pụtara. Ọ sịrị: “Ndị Juu weere ime afọ ka ebe mmadụ si egosi na ihe ruru ya n’obi.”