Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

OLEE otú otu nwa okorobịa nke ndị mụrụ ya ji Baịbụl zụọ, ma ya ahapụ ihe niile a kụziiri ya biwe ndụ ọjọọ, si bidokwa ife Chineke? Olee otú otu nwa okorobịa nke ọ na-agụ agụụ inweta onye ọ ga-ewere ka nna si nweta ezigbo nna? Biko, gụọ ihe ha kwuru.

“Achọpụtara m na m kwesịrị ịlọghachikwute Jehova.”​—ELIE KHALIL

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1976

ABỤ M ONYE: SAỊPRỌS

NDỤ M BIRI: ABỤ M NWA MMEFU

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m na Saịprọs, ma e toro m n’Ọstrelia. Ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova, ha gbalịkwara ike ha niile ịkụziri m Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, nakwa ime ka m hụ Jehova n’anya. Ma mgbe m ruru ihe dị ka afọ iri na atọ, ebidoro m ime isi ike. N’abalị, m na-esi n’ụlọ mịpụ ma gakwuru ụmụaka ibe m. Anyị na-ezu ụgbọala, na-emekwa ihe ndị ọzọ na-etinye anyị ná nsogbu.

Mgbe m bidoro ime ihe ndị a, ana m ezoro ezo eme ha maka na m ma na ọ ga-ewute ndị mụrụ m ma ha mata. Ma ka oge na-aga, achọghịzi m ịma ma ọ̀ ga-ewute ha ma ọ bụ na ọ gaghị ewute ha. Emeteziri m ọtụtụ ndị tọrọ m enyi, ha duhiekwara m n’ihi na ha anaghị efe Jehova. Emechakwara m gwa ndị mụrụ m na achọghịzi m iso ha na-efe Jehova. Ha gbalịrị ka ha nyere m aka, ma mgbalị ha niile dị ka ebe a wụsara mmiri n’okwute. Nke a gbawara ndị mụrụ m obi.

Mgbe m si n’ụlọ ndị mụrụ m kwapụ, ebidoro m ịṅụ ọgwụ ike, ana m akọkwa ahịhịa wii wii ma na-ere ya. Ana m ebi ndụ rụrụ arụ, na-agakarịkwa oriri na nkwari n’abalị. Aghọkwara m onye iwe ọkụ. Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo ma ọ bụ mee ihe na-adịghị m mma, iwe ga-eju m obi ozugbo, ana m ebidokwa ịbara onye ahụ mba ma ba ya ọgụ. Enwere m ike ikwu na m na-eme ihe niile m ma na Onye Kraịst ekwesịghị ime.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Otu nwa okorobịa nke na-aṅụkwa ọgwụ ike ghọrọ ezigbo enyi m. Papa enyi m ahụ nwụrụ mgbe enyi m ahụ dị obere. Ọtụtụ mgbe, mụ na enyi m ahụ na-akparịta ụka ruo n’ime ime abalị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akọrọ m otú ọnwụ papa ya si ewute ya. Ebe ọ bụ na m mụtara mgbe m dị obere na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ, akọọrọ m ya na Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ nakwa na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. (Jọn 5:28, 29) Ihe m na-agwazi ya bụ: “Chegodị otú obi ga-adị gị mgbe ị ga-ahụ papa gị ọzọ. Anyị niile nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa.” Ihe ndị a m na-agwa enyi m ruru ya n’obi.

N’oge ndị ọzọ, enyi m ahụ na-ajụ m ajụjụ gbasara oge ikpeazụ na Atọ n’Ime Otu. Ana m eji Baịbụl ya egosi ya ebe dị iche iche e kwuru banyere Jehova Chineke na Jizọs nakwa banyere oge ikpeazụ. (Jọn 14:28; 2 Timoti 3:1-5) Ka m na-akọwakwuru ya banyere Jehova, achọpụtara m na m na-echekarịzi banyere Jehova.

Ihe ndị ahụ niile ndị mụrụ m kụziiri m mgbe m dị obere ji nnọọ nwayọọ nwayọọ na-amị mkpụrụ n’obi m. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ọ na-abụ mụ na ndị enyi m nọrọ na-aṅụ ọgwụ ike, mụ ebido chewe banyere Jehova. Ọtụtụ n’ime ndị enyi m sịrị na ha hụrụ Chineke n’anya, ma omume ha gosiri na o nweghị ihe ha ji Chineke kpọrọ. Ebe ọ bụ na achọghị m ịdị ka ha, achọpụtara m na o nwere ihe m kwesịrị ime. Ekwesịrị m ịlaghachikwuru Jehova.

Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ịma ihe o kwesịrị ime abụghị ebe okwu biri, ihe dị mkpa bụ ime ya eme. O nwere ihe ụfọdụ na-esighịrị m ike ịkwụsị, dị ka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike. Ahapụkwara m ndị enyi ọjọọ m ma kweta ka otu okenye ọgbakọ mụwara m Baịbụl.

Ma e nwere ihe ndị siiri m ezigbo ike ịkwụsị. Otu n’ime ha bụ ịkwụsị iwe iwe ọkụ. O nwere mgbe m na-akwụsị iwe iwe ọkụ, ma m nọkatakwa mụ ewee iwe ọkụ. Ihe ndị a na-eme ka m chewe na agaghịzi m enwe ike ichegharị. Ma, m na-agakwuru okenye ahụ na-akụziri m Baịbụl mgbe ọ bụla ụdị ihe a batara m n’obi. Ebe ọ bụ na o nwere ndidi, dịkwa obiọma, ọ na-agwa m okwu na-agba m ume. E nwere mgbe ọ gwara m gụọ otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche nke kwuru banyere ihe mere o ji dị mkpa ka mmadụ jisie ike n’ihe ọ na-eme. * Mụ na ya kwurịtara ihe ndị m nwere ike ime mgbe iwe bidoro iwe m. Mgbe m mewere ihe ndị m gụtara n’Ụlọ Nche ahụ ma na-ekpesi ekpere ike ka Jehova nyere m aka, eji m nwayọọ nwayọọ kwụsịwa iwe iwe ọkụ. N’Eprel afọ 2000, e mere m baptizim iji gosi na mụ aghọọla Onyeàmà Jehova. Agaghị m akọwali ụdị obi ụtọ ndị mụrụ m nwere.

URU NDỊ M RITERELA: Obi eruola m ala ugbu a, akọnuche m adịkwala ọcha n’ihi na anaghịzi m ebi ndụ rụrụ arụ ma ọ bụ na-eji ọgwụ ike na-emebi ahụ́ m. Obi na-atọ m ụtọ ugbu a n’ihe ọ bụla m na-eme, ma mgbe m na-arụ ọrụ ma mgbe m na-aga ọmụmụ ihe, ma mgbe m na-atụrụ ndụ. Ndụ m na-atọ m ụtọ ugbu a.

Ana m ekele Jehova na o nyere m ezigbo nne na nna, bụ́ ndị na-enweghị mgbe ha chefuru m. Ana m echetakwa ihe Jizọs kwuru na Jọn 6:44. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” Obi na-atọ m ụtọ na Jehova dọtara m n’ebe ọ nọ ma nyere m aka ka m lọghachikwute ya.

“Ọ gụrụ m ezigbo agụụ inwe onye m ga-ewere ka nna.”​—MARCO ANTONIO ALVAREZ SOTO

A MỤRỤ N’AFỌ: 1977

ABỤ M ONYE: CHILE

NDỤ M BIRI: ANA M AKỤ EGWÚ RỌK NA-ADA OKÉ ỤDA

NDỤ M BIRI NA MBỤ: Ọ bụ mama m zụrụ m. Anyị biri na Punta Arenas, bụ́ obodo mara mma dị ná mba Chile. Mama m na papa m kewara mgbe m dị afọ ise, nke a mekwara ka ọ na-adị m ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ. Ọ na-agụsi m agụụ ike inwe papa mụ na ya ga-ebi.

Ndịàmà Jehova na-akụziri mama m Baịbụl. Mama m na-akpọkwa m aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ́ ebe Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ma ịga ọmụmụ ihe ahụ na-ewe m iwe. Ọ na-abụkwa anyị gawa mụ ebido isi ọnwụ. Mgbe m dị afọ iri na atọ, akwụsịchara m iso mama m aga ọmụmụ ihe ahụ.

N’oge ahụ, enwewela m mmasị n’ịkụ egwú, achọpụtakwara m na o sighịrị m ike ịmụta ya. Mgbe m dị afọ iri na ise, esowela ndị na-akụ egwú rọk na-ada oké ụda na-akụ egwú n’ebe ndị a na-eme ememme, n’ụlọ oriri, nakwa n’ebe e nwere nnọkọ. Ana m eso ndị ịkụ egwú doro anya, nke a mekwara ka m nwewe mmasị n’egwú ndị na-anaghị ada oké ụda. Ebidoro m ịmụ otú e si akụ egwú n’otu ụlọ akwụkwọ dị n’ebe m bi. Mgbe m dị afọ iri abụọ, akwagara m Santiego, bụ́ isi obodo Chile, ka m nwee ike ịgakwu akwụkwọ. N’oge ahụ, m ka na-esokwa ndị na-akụ egwú rọk.

N’oge a niile, obi anaghị adị m mma, ọ na-adịkwa m ka ò nwere ihe kọrọ m ná ndụ. Ihe m na-eme ka obi nwee ike ịdị m mma bụ iso ndị mụ na ha na-akụ egwú na-aṅụ oké mmanya na ọgwụ ike. Eweere m ha ka ndị mụ na ha si n’otu ezinụlọ. Otú m si ejike na otú m na-adị n’anya na-egosi na m bụ onye isi ike. Ana m eyi uwe ojii mgbe niile, afọ ọnụ m tojukwara etoju, ọ fọkwara obere ka ntutu isi m toruo m n’úkwù.

Ebe m bụ onye isi ike, mụ na ndị mmadụ na-alụkarị ọgụ, ndị uwe ojii na-ejidekarịkwa m. O nwere oge m gara lụso ndị na-ere ọgwụ ike ọgụ mgbe mmanya na-egbu m. Ha nọ na-enye mụ na ndị enyi m nsogbu. Ma, ha tikasịrị m ahụ́ nke na ha kụwara m agba.

Ma ihe kacha wute m bụ ihe ndị enyi m mere m. Otu ụbọchị, achọpụtara m na enyi m nwaanyị na ezigbo enyi m nwoke na-enwe mmekọahụ kemgbe ọtụtụ afọ. Amaghị m ihe na-aganụ, ma ndị enyi m ndị ọzọ ma, ha ekweghịkwanụ agwa m. Ihe a gbawara m obi.

Akwagaghachiri m Punta Arenas ma bidozie ịkụzi otú e si akụ egwú. Ọrụ ọzọ m na-arụ bụ ịkpọ ụbọ. Ma m ka na-esokwa ndị na-akụ egwú rọk akụ egwú. Mụ na otu nwa agbọghọ mara mma aha ya bụ Sussan bidoro ịkpa, mụ na ya mechakwara biri. Otu ụbọchị, Sussan chọpụtara na mama ya kweere n’Atọ n’Ime Otu, ma mụnwa ekweghị. Ọ jụziri m: “Olee nke bụ́ eziokwu?” Agwara m ya na m ma na nkụzi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu, ma amaghị m ebe m ga-agụrụ ya na Baịbụl. Agwara m ya na ọ bụ Ndịàmà Jehova ga-egosi ya ebe ọ dị na Baịbụl. Emeziri m ihe m na-emebeghị kemgbe ọtụtụ afọ. Ekpere m ekpere rịọ Chineke ka o nyere m aka.

Mgbe ụbọchị ole na ole gara, ahụrụ m otu nwoke yiri onye m hụtụrụla, ajụkwara m ya ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ eziokwu na otú m dị tụrụ ya ụjọ, ọ zara ajụjụ niile m jụrụ ya banyere ọmụmụ ihe ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Ekwenyesiri m ike na ọ bụ Chineke mere ka mụ na nwoke ahụ hụ. Agara m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma nọrọ n’azụ azụ ka a ghara inwe onye ga-amata m. Ma ọtụtụ ndị ma m mgbe m dị obere matara onye m bụ. Ha nabatara m ma makụọ m nke na obi bịara ruo m ala. Ọ dị m nnọọ ka m̀ si esi lọta ụlọ. Mgbe m hụrụ nwoke kụziiri m Baịbụl mgbe m dị obere, m gwara ya ka ọ kụziwekwara m Baịbụl.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Otu ụbọchị, m gụrụ Ilu 27:11, bụ́ ebe sịrị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa.” O metụrụ m n’obi na mụnwa bụ́ mmadụ nkịtị nwere ike ime ka obi tọọ Onye kere eluigwe na ụwa ụtọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka o doro m anya na ihe ahụ m na-achọ kemgbe ụwa eruola m aka, na ọ bụ Jehova bụ Nna ahụ m kwesịrị inwe.

Achọrọ m ime ihe na-atọ Nna m nke eluigwe ụtọ, ma ịṅụ mmanya na ọgwụ ike eriela m ahụ́. Abịara m ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 6:24, bụ́ ebe sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ.” Mgbe m na-agbalị ka m kwụsị ihe ndị a m na-eme, ahụrụ m na ihe ahụ e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:33 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” Achọpụtara m na agaghị m akwụsịli ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme ma ọ bụrụ na mụ na ndị enyi ọjọọ akwụsịghị ịkpa ma kwụsịkwa ịga n’ebe a na-eme ihe ndị ahụ. Ndụmọdụ Baịbụl nyere doro anya: E nwere ihe ndị m ga-emerịrị ma ọ bụrụ na m chọrọ ịkwụsị ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme.—Matiu 5:30.

Otú egwú si atọ m ụtọ mere ka o siere m ike ịkwụsị iso akụ egwú rọk na ige ya ege. O nwetụbeghị ihe siiri m ike ka ya. Ma ndị enyi m nwere n’ọgbakọ nyeere m aka ịkwụsị ya. Akwụsịkwara m ịṅụ oké mmanya na ịṅụ ọgwụ ike. Akpụrụ m isi m na afọ ọnụ m ma kwụsị iyi naanị uwe ojii. Mgbe m gwara Sussan na m chọrọ ịkpụ isi m, o juru ya anya. Ọ sịrị m, “Aga m eso gị aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ka m mara ihe unu na-eme ebe ahụ!” Mgbe o so m gaa, ihe ọ hụrụ tọrọ ya ụtọ, ọ dịghị anya, ya na Ndịàmà Jehova amalitekwa ịmụ Baịbụl. Mụ na Sussan mechara lụọ. N’afọ 2008, e mere anyị abụọ baptizim. Obi dị anyị ụtọ na anyị esorola mama m na-efe Jehova.

URU NDỊ M RITERELA: Chineke anapụtala m ná nsogbu niile ụwa a kpataara m nakwa n’aka ndị enyi ọjọọ. Egwú ka na-atọ m ụtọ, ma ana m akpachapụzi anya ahọrọ nke m ga-ege. Ana m akọrọ ndị ọzọ ihe ndị mere m, karịchaa ndị na-eto eto, ka ha mụta ihe n’ihe mere m. Achọrọ m ka ha ghọta na n’agbanyeghị na ihe ndị dị n’ụwa a na-ama mma n’anya, ha bụ naanị “ihe e kpofuru ekpofu.”—Ndị Filipaị 3:8.

Enweela m ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe ndị mmadụ hụrụ ibe ha n’anya ma dịrị n’udo. Nke ka nke bụ na ugbu a mụ na Jehova dị ná mma, enwetala m Nna ahụ m na-achọ kemgbe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Isiokwu ahụ bụ “Ihe Ịga nke Ọma Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche February 1, 2000, peeji nke 4-6.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

“Obi na-atọ m ụtọ na Jehova dọtara m n’ebe ọ nọ ma nyere m aka ka m lọghachikwute ya”