Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Apọkrịfa Ndị Kọrọ Banyere Jizọs—Ihe Ha Kọrọ Ọ̀ Bụ Eziokwu?

Akwụkwọ Apọkrịfa Ndị Kọrọ Banyere Jizọs—Ihe Ha Kọrọ Ọ̀ Bụ Eziokwu?

Akwụkwọ Apọkrịfa Ndị Kọrọ Banyere Jizọs​—Ihe Ha Kọrọ Ọ̀ Bụ Eziokwu?

MGBE a chọtara otu akwụkwọ a kpọrọ “Oziọma Judas,” ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru, sị: “Akwụkwọ a a chọtara bụ nnukwu ihe. Ihe e dere na ya ga-akpasụ ọtụtụ ndị iwe.” “Akwụkwọ a ga-eme ka otú anyị si ele Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anya gbanwee.” A sịrị na o ruola otu puku afọ na narị afọ isii akwụkwọ ahụ furu (ọ bụ ya ka e sere n’elu peeji a).

Ọtụtụ ndị ebidola inwe mmasị n’akwụkwọ apọkrịfa ndị kọrọ banyere Jizọs. Ụfọdụ ndị sịrị na akwụkwọ ndị ahụ kọrọ ọtụtụ ihe dị mkpa Jizọs kụziri nakwa ihe ndị ọ mere, bụ́ ndị a na-achọghị ka ndị mmadụ mara. Ma gịnị bụ akwụkwọ apọkrịfa? Akwụkwọ ndị a hà nwere ike ịkụziri anyị eziokwu banyere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, ya bụ, ịkụziri anyị ihe ndị a na-akọghị na Baịbụl?

Akwụkwọ Ndị So na Baịbụl na Ndị nke Apọkrịfa

N’agbata afọ 41 na afọ 98 Oge Anyị, Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere “akụkọ banyere Jizọs Kraịst.” (Matiu 1:1) A na-akpọkwa akụkọ ndị a ozi ọma banyere Jizọs Kraịst.—Mak 1:1.

N’ime akwụkwọ niile kọrọ banyere Jizọs, ọ bụ naanị akwụkwọ anọ a bụ ndị e weere na e dere n’ike mmụọ nsọ, ọ bụkwa ya mere ha ji soro n’Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ anọ a kọrọ ihe ndị bụ́ “eziokwu” banyere otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa na ihe ndị ọ kụziri. (Luk 1:1-4; Ọrụ 1:1, 2; 2 Timoti 3:16, 17) N’ebe niile e depụtara akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’oge ochie, Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn dịcha na ha. A naghị ajụkwa ajụ ma hà so n’akwụkwọ ndị e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ndị a na-akpọ Okwu Chineke.

Ma ka oge na-aga, a bịaziri nwee akwụkwọ ndị ọzọ a sịrị na ha kọrọ banyere Jizọs na ndịozi ya. Ihe a na-akpọ akwụkwọ ndị a bụ apọkrịfa. *

N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, otu nwoke aha ya bụ Irenaeus, bụ́ onye Liyọn, dere na ndị kwụsịrị ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst “dere ọtụtụ akwụkwọ apọkrịfa na akụkọ ndị na-emeghị eme.” Ụfọdụ n’ime ha bụ akụkọ banyere Jizọs bụ́ ndị “ha chepụtara n’onwe ha iji ghọgbuo ndị na-amaghị ihe.” Ọ bụ ya mere e ji were akwụkwọ apọkrịfa ndị ahụ kọrọ banyere Jizọs ka akwụkwọ a na-ekwesịghị ịgụ agụ, ma ya fọdụzie inwe ha enwe.

Ma, ndị mọnk oge ochie na ndị odeakwụkwọ achọghị ka akwụkwọ ndị ahụ mebichaa, n’ihi ya, ha nọ na-edepụtaghachi ha. N’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, ndị mmadụ bidoro nwewe nnọọ mmasị n’akwụkwọ apọkrịfa ndị ahụ. A bịaziri hụwa ọtụtụ akwụkwọ apọkrịfa dị iche iche e tinyere nnu na ose. Taa, e nwere ọtụtụ n’ime ha a sụgharịrị n’ọtụtụ asụsụ ndị a na-asụ n’oge a.

Ihe Ndị A Kọrọ Banyere Jizọs n’Akwụkwọ Apọkrịfa Abụtụghị Eziokwu

N’akwụkwọ apọkrịfa ndị kọrọ banyere Jizọs, ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha bụ ndị ọ na-enweghị oké ihe a kọrọ banyere ha ma ọ bụ ndị a na-ekwuteghịdị okwu ha n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ihe ndị ọzọ a kọrọ na ha bụ ihe ndị a sịrị na Jizọs mere mgbe ọ bụ nwata. Lee ụfọdụ n’ime ha.

▪ Akwụkwọ apọkrịfa a sịrị na ọ bụ “Oziọma Mbụ Jems Dere,” bụ́kwa nke a na-akpọ “Ọmụmụ Meri,” kọrọ otú e si mụọ Meri na ihe ndị mere mgbe ọ bụ nwata nakwa otú o si lụọ Josef. E nwere ọtụtụ ihe mere e ji kwuo na ọ bụ akụkọ ifo. Ihe a kọrọ na ya bụ na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ruo ebighị ebi, o dokwara anya na e dere ya iji nye Meri otuto.—Matiu 1:24, 25; 13:55, 56.

▪ Akwụkwọ apọkrịfa nke a sị na ọ bụ “Oziọma Tọmọs nke Kọrọ Banyere Jizọs Mgbe Ọ Bụ Obere Nwa” kọrọ ihe ndị mere mgbe Jizọs dị afọ ise ruo mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, kọọkwa na Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’oge ahụ. Ma o doro anya na akụkọ ndị ahụ emeghị eme. (Gụọ Jọn 2:11.) Akwụkwọ ahụ kọrọ na Jizọs bụ nwata isi ike nke na-ewe iwe ọkụ, nke na-anaghịkwa agbaghara onye ọ bụla mejọrọ ya. O kwuru na ọ na-eji ike o nwere na-emegwara ndị nkụzi ya, ndị agbata obi ha, na ụmụaka ibe ya ihe ọ bụla ha mere ya. A sịdịrị na o mere ka ụfọdụ n’ime ha kpuo ìsì, daa ngwọrọ, ma ọ bụdị nwụọ.

▪ Ụfọdụ akwụkwọ apọkrịfa, dị ka nke a kpọrọ “Oziọma Pita,” kọrọ ihe ndị mere n’oge a na-ekpe Jizọs ikpe, oge ọ nwụrụ, nakwa oge a kpọlitere ya n’ọnwụ. Akwụkwọ apọkrịfa ndị ọzọ, dị ka nke a kpọrọ “Ọrụ Paịlet,” bụ́ nke so na nke a na-akpọ “Oziọma Nikọdimọs,” kọrọ banyere ndị nọ mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe na mgbe ọ nwụrụ. Otú e si kọọ ihe ụfọdụ na-emeghị eme n’akwụkwọ ahụ ma kpọọ aha ndị ọ na-enweghị mgbe ha dịrị ndụ gosiri na ihe e dere na ya abụghị eziokwu. “Oziọma Pita” kọrọ ihe ga-eme ka mmadụ chee na e kwesịghị ịta Pọntiọs Paịlet ụta maka ọnwụ Jizọs, ihe ọ kọkwara banyere otú Jizọs si bilite n’ọnwụ bụ ihe onye na-agụ ya na-enweghị ike ikweta na o mere eme.

Ha Si n’Aka Ndị Kwụsịrị Iso Ụzọ Kraịst

Na Disemba afọ 1945, n’ebe dị nsọ n’obodo Nag Hamadi, nke dị n’Ijipt, ndị ọrụ ugbo ọ na-enweghị ka ọ hà ha hụrụ akwụkwọ papaịrọs iri na atọ na mberede. E nwere ụzọ ihe iri ise na abụọ e dere na ha. A sịrị na ọ bụ ndị Nọstik, bụ́ ndị dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga, dere akwụkwọ ndị ahụ. Ndị Nọstik bụ ndị okpukpe na-enweghị okwukwe na Chineke. Ha kweere ihe ụfọdụ Ndị Kraịst na-akụzi, kwerekwa nkụzi ụgha ndị ọkà mmụta, bụ́ ndị Gris, kụziri nakwa ihe ndị na-ekpere arụsị na-akụzi. Ndị Nọstik ji ihe ndị ahụ ha na-akụzi megharịa ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst anya.—1 Timoti 6:20, 21.

Akwụkwọ apọkrịfa ndị a na-akpọ “Oziọma Tọmas,” “Oziọma Filip,” na “Oziọma nke Eziokwu,” bụ́ ndị so n’akwụkwọ ndị ahụ a hụrụ n’ebe dị nso n’obodo Nag Hamadi, kọrọ ọtụtụ ihe ndị Nọstik kụziri ka à ga-asị na ọ bụ Jizọs kụziri ha. A sịrị na akwụkwọ apọkrịfa ahụ a na-akpọ “Oziọma Judas,” bụ́ nke a chọtara n’oge na-adịbeghị anya, so n’akwụkwọ ndị Nọstik dere. Akwụkwọ ahụ kọrọ ọtụtụ ihe ọma banyere Judas ma kwuo na ọ bụ naanị ya bụ onyeozi Jizọs nke ghọtara onye Jizọs bụ nke ọma. Otu ọkachamara nke ihe gbasara akwụkwọ a doro anya kwuru na akwụkwọ a sịrị na Jizọs “abụghị onye nzọpụta nke nwụrụ maka mmehie nke ụwa, kama ọ bụ onye nkụzi na onye na-eme ka ndị mmadụ nwee amamihe na ihe ọmụma.” Ma, Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuchara na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka mmehie nke ụwa. (Matiu 20:28; 26:28; 1 Jọn 2:1, 2) O doro anya na ndị Nọstik chọrọ iji akwụkwọ ndị ahụ ha dere mee ka ndị mmadụ kwụsị ikwere n’ihe ndị e dere na Baịbụl.—Ọrụ 20:30.

Ihe Mere Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn Ji Ka Akwụkwọ Apọkrịfa Mma

Ọ bụrụ na mmadụ eleruo akwụkwọ apọkrịfa ndị ahụ anya, ọ ga-achọpụta na ihe ha kwuru abụghị eziokwu. E jiri ha tụnyere akwụkwọ ndị nke ahụ dị na Baịbụl, o doro anya na e deghị ha n’ike mmụọ nsọ Chineke. (2 Timoti 1:13) Ebe ọ bụ na ndị dere ha bụ ndị na-ahụtụghịdị Jizọs ma ọ bụ ndịozi ya, o nweghị otú ha ga-esi akọrọ anyị eziokwu ndị Baịbụl na-akọghị banyere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Kama nke ahụ, ihe e dere na ha bụ akụkọ na-abụghị eziokwu ndị mmadụ chepụtara, bụ́ ndị na-agaghị enyere mmadụ aka ịmata onye Jizọs bụ na ihe ndị ọ kụziri.—1 Timoti 4:1, 2.

Ma, Matiu na Jọn so na mmadụ iri na abụọ bụ́ ndịozi Jizọs; ebe Mak na Pita onyeozi jekọrọ ozi, Luk na Pọl onyeozi ejekọọkwa ozi. Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke nyeere mmadụ anọ ahụ aka ide ihe ndị ha dere banyere Jizọs. (2 Timoti 3:14-17) N’ihi ya, akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ ihe niile ga-eme ka mmadụ kwere na “Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”—Jọn 20:31.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Okwu ahụ bụ́ “apọkrịfa” si n’okwu Grik nke pụtara “izochi ihe.” Na mbụ, okwu ahụ pụtara ihe e dere ede nke a na-achọghị ka ndị ọzọ gụọ ma e wezụga ndị kweere n’ihe ahụ. Ka oge na-aga, okwu ahụ pụtaziri akwụkwọ niile na-esoghị na Baịbụl, ya bụ, akwụkwọ ndị a na-edeghị n’ike mmụọ nsọ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 18]

Kenneth Garrett/National Geographic Stock