Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ

O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ

Ṅomie Okwukwe Ha

O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ

OTU ụbọchị na Betlehem, mgbe ndị mmadụ na-etetabeghị ụra, Josef bupụtara akpa dọkwasị n’elu ịnyịnya ibu ya. Weregodị ya na ị na-ahụ ya ka o legharịrị anya ma ò nwere onye na-ahụ ya ma dọkwasị akpa n’ịnyịnya ibu ahụ, hịatụkwa ịnyịnya ibu ahụ aka n’ahụ́. O doro anya na ebe uche ya dị bụ n’ogologo njem ya na ezinụlọ ya chọrọ ịga. Ha chọrọ ịgbaga Ijipt, bụ́ ebe a na-asụ asụsụ dị iche, otú ndị ebe ahụ si eme ihe dịkwa iche na nke ha. Olee otú ọ ga-adị ya na ndị ezinụlọ ya n’ebe ahụ?

Mgbe a gwara Josef na a chọrọ igbu nwa ya, ọ maghị otú ọ ga-esi akọrọ ya nwunye ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Meri. Ma ọ katara obi kọọrọ ya. Ọ kọọrọ ya ihe mmụọ ozi Chineke gwara ya ná nrọ. Mmụọ ozi ahụ sịrị na Eze Herọd chọrọ igbu obere nwa ha, gwakwa ya ka ọ kpọrọ nwunye ya na nwa ya gbapụ ozugbo. (Matiu 2:13, 14) Ụjọ jidere Meri. Ọ ghọtaghị ihe mere mmadụ ga-eji achọ igbu obere nwa ha na-enweghị onye o mejọrọ. Ihe a juru Meri na Josef anya. Ma ha tụkwasịrị Jehova obi, ha wee kwadowe ịgbapụ.

Ndị bi na Betlehem ka na-arahụ ụra mgbe Josef na Meri kpọ Jizọs gbapụ. Ka ha na-aga, ọ ga-abụ na Josef nọ na-eche otú ụwa ga-adị ha. Ọ nọ na-eche ma yanwa, bụ́ ọkwá nkà ọ na-enweghị otú ọ hà ya, ya ga-echebelikwa ndị ezinụlọ ya ka aka ghara ịkpara ha? Ọ nọkwa na-eche ma ya ga-enwekwa ike igboro ha mkpa ha, ma ya ga-arụlikwa nnukwu ọrụ a Jehova Chineke nyere ya, nke bụ́ ịzụ na ilekọta nwa a pụrụ iche? Ọrụ ndị a Josef nwere abụghị obere ọrụ. Ka anyị na-atụle otú Josef si rụọ ọrụ niile ahụ o nwere, anyị ga-ahụ ihe mere o ji dị mkpa ka ndị bụ́ nna n’oge a, nakwa anyị niile, ṅomie okwukwe Josef.

Josef Chebere Ezinụlọ Ya

Ọ bụ ihe dị ka afọ abụọ gara aga, mgbe Josef nọ n’obodo ya bụ́ Nazaret, ka ihe niile gbanwere ná ndụ ya n’oge o kwere nkwa na ya ga-alụ ada Hilaị. Josef maara na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke hụrụ Chineke n’anya. Ma Meri gwaziri ya na ya dị ime. Josef kpebiri na ya ga-agba ya alụkwaghịm ná nzuzo ka ndị mmadụ ghara iji Meri mere ihe akụkọ. * Ma otu mmụọ ozi gwara ya okwu ná nrọ, kọwaara ya na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova mere ka Meri dịrị ime. Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya na nwa Meri ga-amụ “ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” Ọ gwakwara Josef okwu mere ka obi ruo Josef ala. Ọ sịrị ya: “Atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa.”—Matiu 1:18-21.

Ebe ọ bụ na Josef na-erubere Chineke isi ma bụrụ onye ezi omume, o mere ihe ahụ mmụọ ozi gwara ya. Ọ malitere ịrụ nnukwu ọrụ ahụ Chineke nyere ya, ya bụ, ilekọta na ịzụ nwa na-abụghị nke ya, bụ́ onye Chineke kacha hụ n’anya. Josef mechara kpọrọ nwunye ya ahụ dị ime gaa Betlehem n’ihi na Siza Ọgọstọs nyere iwu ka onye ọ bụla gaa n’obodo a mụrụ ya deba aha ya n’akwụkwọ. Ọ bụ na Betlehem ka Meri nọzi mụọ nwa ahụ. *

Josef akpọrọghị ezinụlọ ya laghachi Nazaret, kama ha nọwaziri na Betlehem, bụ́ nke na-adịghị anya na Jeruselem. Josef na ezinụlọ ya bụ ndị ogbenye, ma o mere ihe niile o nwere ike ime iji hụ na Meri na Jizọs ataghị ahụhụ. Ha mechara nweta ụlọ ebe ha biweziri. Otu ụbọchị, mgbe Jizọs na-abụghịzi nwa ọhụrụ, mgbe ọ ga-abụ na ọ karịala otu afọ, ndụ ha gbanwere na mberede.

E nwere ụmụ nwoke si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa na nke ha. O nwere ike ịbụ na ha si Babịlọn. Ha bụ ndị na-agụ kpakpando. Ha so otu kpakpando rute n’ụlọ Josef na Meri. Ha kwuru na ha na-achọ otu nwatakịrị nke ga-aghọ eze ndị Juu ka ha wee kwanyere ya ùgwù.

Ma ndị ahụ hà ma ma ọ bụ na ha amaghị, ije a ha bịara nwere ike ịkpatara Jizọs ọnwụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na kpakpando ahụ bu ụzọ duga ha Jeruselem, na nke Eze Herọd, kama iduru ha gawa Betlehem. Ha gwara Herọd na ha na-achọ nwa ga-aghọ eze ndị Juu. Ihe a ha kwuru mere ka eze ahụ mewere nwa ahụ anyaụfụ ma chọọ igbu ya.—Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . . Ònye Zitere ‘Kpakpando’ Ahụ?” Ọ dị na peeji nke 29.

Ma e nwere onye karịrị Herọd nke na-enyere ezinụlọ Josef aka. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ndị ahụ bịara ileta nwa ahụ nyere ha onyinye buru ibu. Ha nyere ha “ọlaedo na frankinsens na mea.” O doro anya na o juru Josef na Meri anya na e nyere ha onyinye ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ndị ahụ na-agụ kpakpando bu n’obi ịgaghachi kọọrọ Eze Herọd ebe ha hụrụ nwa ahụ, ma Jehova ekweghị ka ha gaa. O si ná nrọ gwa ha ka si ụzọ ọzọ laa.—Matiu 2:1-12.

Obere oge ha lawara, mmụọ ozi Jehova gwara Josef, sị: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya gbaga n’Ijipt, nọrọkwa n’ebe ahụ ruo mgbe m ga-enye gị iwu; n’ihi na Herọd ga-achọ nwatakịrị a ka o gbuo ya.” (Matiu 2:13) Dị ka anyị kwuru ná mmalite isiokwu a, Josef mere ihe a gwara ya ozugbo. Ọ kpọọrọ ezinụlọ ya gbaga Ijipt n’ihi na ọ chọghị ka ihe ọ bụla mee nwa ahụ. Ebe ọ bụ na ndị ahụ na-agụ kpakpando nyere ha onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa, ha enweela ihe ha ga-esi na ya nweta ego ha ga-eji elekọta onwe ha n’Ijipt.

E mechara nwee akụkọ ifo ndị kọrọ otú Josef na ezinụlọ ya si gaa Ijipt. N’akụkọ ndị ahụ, a sịrị na obere nwa ahụ bụ́ Jizọs rụrụ ọrụ ebube nke mere ka ha ruo Ijipt ngwa ngwa, meekwa ka ndị ọjọọ nọ n’ụzọ ghara ime ha ihe ọ bụla, nakwa ka osisi det dị iche iche hụlata ka nne ya ghọrọ mkpụrụ ha. * Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ịgaru Ijipt adịghịrị ha mfe, o wekwara ha ogologo oge.

E nwere ọtụtụ ihe ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’aka Josef. Mgbe a gwara ya ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya gbapụ, ọ hapụrụ ọrụ ya na ihe ndị ọzọ o nwere ime ozugbo ma kpọrọ ha gbapụ. O doro anya na o weere ilekọta ezinụlọ ya ka ọrụ dị mkpa Jehova nyere ya. Ndị nne na nna taa na-azụ ụmụ ha n’ụwa a ihe ọjọọ juru, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị nwere ike imebi ụmụaka ma ọ bụdị kpatara ha ọnwụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na e nwere ndị nne na nna ndị na-eme ka Josef taa. Ha na-agbalị ike ha niile ịhụ na ha chebere ụmụ ha ka ihe ọjọọ ndị juru n’ụwa a ghara imebi ha.

Josef Gbooro Ezinụlọ Ya Mkpa Ha

O yiri ka Josef na ezinụlọ ya anọteghị aka n’Ijipt n’ihi na mmụọ ozi mechara gwa ya na Herọd anwụọla. Josef kpọziiri ezinụlọ ya laghachi obodo ha. Otu amụma e buru n’oge ochie kwuru na Jehova ga-esi “n’Ijipt” kpọpụta nwa ya. (Matiu 2:15) Josef so mee ka amụma ahụ mezuo. Ma, oleekwanụ ebe ọ ga-akpọrọ ezinụlọ ya gawa?

Josef achọghị ka ihe ọ bụla mee ndị ezinụlọ ya. Ebe ọ maara na ọ bụ Akeleyọs, nwa Herọd, bụzi eze, marakwa na ọ bụ eze ọjọọ dị ka nna ya, ọ tụrụ ụjọ ịlaghachi Betlehem. Chineke gwaziri ya ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya gawa n’obodo ya bụ́ Nazaret nke dị na Galili, kama ịgawa ebe dị nso na Jeruselem. Ọ bụzi na Nazaret ka ya na Meri nọ zụọ ụmụ ha.—Matiu 2:19-23.

Ọ bụ eziokwu na ihe siiri ha ike, o nweghị mgbe ha gbawara mbọ ka ha baa ọgaranya. Baịbụl kwuru na Josef bụ ọkwá nkà. Ọrụ ndị ọkwá nkà na-arụ n’oge ahụ bụ igbutu osisi, ibupụta osisi n’ebe ha ga-eji ya rụọ ọrụ, na ịkwadebe osisi ndị ahụ maka iji ha rụọ ụlọ, ụgbọ mmiri, obere àkwà mmiri, trọk a na-akwa akwa, na ihe ndị e ji arụ ọrụ ugbo. (Matiu 13:55) Ọrụ a bụ ọrụ e ji ọkpụkpụ aka arụ. Ndị ọkwá nkà e nwere n’oge Baịbụl na-anọkarị n’ihu ụlọ ha arụ ọrụ ha ma ọ bụ ha anọrọ n’ụlọ ọrụ ha rụrụ n’akụkụ ụlọ ha.

Josef nwere ọtụtụ ngwá ọrụ o ji arụ ọrụ, o nwekwara ike ịbụ nna ya hapụụrụ ya ụfọdụ n’ime ha. Ụfọdụ n’ime ngwá ọrụ ndị o ji rụọ ọrụ bụ: eriri e ji atụ ihe, ihe e ji aka akara n’osisi, anyụike, mma nkwọ, hama, chịzụl, ihe e ji akpọpụ osisi, mgbá e ji anyakọta osisi, na ntu, n’agbanyeghị na ha na-adị oké ọnụ.

Weregodị ya na ị na-ahụ Jizọs n’oge ọ dị obere ka ọ na-ekiri nna ya mgbe ọ na-arụ ọrụ. Ka ọ na-ele Josef anya, obi na-atọ ya ụtọ na nna ya dị ike ọrụ ma mara ọrụ nke ọma. O nwere ike ịbụ na Josef bidoro mgbe nwa ya nwoke dị obere kụziwere ya ụmụ obere ọrụ ọ ga-arụli, dị ka iji akpụkpọ azụ̀ kpọrọ nkụ na-akpụchasị osisi. Ọ ga-abụkwa na ọ kọwaara ya otú e si amata ụdị osisi ndị ha ji arụ ọrụ, dị ka osisi sịkamọ, osisi ook, osisi oliv, nakwa osisi ndị ọzọ.

Jizọs chọpụtakwara na nna ya a nke dị ike ọrụ bụkwa nwoke obiọma, onye na-eji obi ebere elekọta ya na nne ya na ụmụnne ya ndị ọzọ. N’eziokwu, Jizọs nwere ụmụnne. Josef na Meri mechara mụọ ihe dị ka ụmụ isii ọzọ. (Matiu 13:55, 56) Josef rụsikwuru ọrụ ike iji lekọta ezinụlọ ya ma gbooro ha niile mkpa ha.

Ma, Josef ghọtara na ihe kacha mkpa ọ ga-emere ndị ezinụlọ ya bụ ime ka ha na Chineke dịrị ná mma. N’ihi ya, ọ na-ewepụta oge na-akụziri ụmụ ya banyere Jehova Chineke na iwu Ya. Ya na Meri na-akpọkarịkwa ụmụ ha aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu e nwere n’obodo ha, bụ́ ebe a na-agụpụta iwu Jehova ma na-akọwa ya. O nwere ike ịbụ na mgbe ọ bụla ha nụchara iwu Jehova, Jizọs na-ajụ ọtụtụ ajụjụ, Josef na-agbalịkwa ịza ha. Josef na-akpọkwa ezinụlọ ya aga ememme ndị a na-eme na Jeruselem, dị ka Ememme Ngabiga, nke a na-eme otu ugboro n’afọ. Ebe ọ bụ na Jeruselem dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri na abụọ ma e si n’obodo Josef gawa ya, o nwere ike ịbụ na ọ na-ewe ya na ezinụlọ ya izu abụọ iji garuo Jeruselem, mee ememme ahụ ma lọta.

Ndị nna bụ́ Ndị Kraịst taa na-emekwa ihe ndị ahụ Josef mere. Ha na-egboro ụmụ ha mkpa ha, ma ihe ka ha mkpa bụ inyere ụmụ ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ha na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji hụ na ụmụ ha na-agachi ọmụmụ ihe na mgbakọ Ndị Kraịst anya. Dị ka Josef, ha maara na o nweghị ihe karịrị ịzụ ụmụ ha nke ọma.

‘Ọ Chị Obi n’Aka’

Mgbe Jizọs gbara afọ iri na abụọ, Josef kpọ ezinụlọ ya gawa Jeruselem dị ka ọ na-emebu. Ha na-aga Ememme Ngabiga, ọtụtụ ezinụlọ ndị ọzọ sokwa na-aga. Mgbe ha ruwere Jeruselem, bụ́ nke dị n’ugwu, ọtụtụ n’ime ha na-abụ abụ a na-akpọ abụ nrịgo. (Abụ Ọma 120-134) Ọtụtụ puku mmadụ na-anọ na Jeruselem n’oge a n’ihi ememme ahụ. E mechaakwa ememme ahụ, mmadụ niile enuru lawa. Mgbe Josef na ezinụlọ ya na-ala, ya na Meri amaghị na Jizọs esoghị ha n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe na-emegharị ha anya. Ha chere na Jizọs so ìgwè mmadụ ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ndị ikwu ha. Ọ bụzi mgbe ha gara njem otu ụbọchị ka ha chọpụtara na Jizọs esoghị ha.—Luk 2:41-44.

Obi gbafuru ha, ha achọrọ ya gaghachiwe Jeruselem. Chegodị otú Jeruselem ga-adị ugbu a. Ka ha na-agagharị na-achọ nwa ha, ebe niile akụọla owu. Ebee ka nwa a nọ? Ebe ọ bụ na o ruola abalị atọ ha chọwara ya, ọ̀ ga-abụ na Josef bidoro iche na ya akụọla afọ n’ala n’ọrụ a pụrụ iche Jehova nyere? Ha mechara chọrọ ya banye n’ụlọ nsọ. Ha chọrọ ya ebe niile ruo mgbe ha rutere n’otu ọnụ ụlọ bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-akụzi Iwu Mozis nọ. Ha hụrụ Jizọs n’etiti ha. Chegodị otú obi dị Josef na Meri mgbe ahụ!—Luk 2:45, 46.

Jizọs nọ na-ege ndị nkụzi ahụ ntị ma na-ajụ ha ajụjụ. O juru ndị ahụ anya otú nwata ahụ si mara ihe na otú o si na-asa ha ajụjụ. Ma, ihe Meri na Josef hụrụ riri ha ọnụ. Baịbụl gosiri na o nweghị ihe ọ bụla Josef kwuru n’oge ahụ. Ma Meri kwuchitere ọnụ ha abụọ. Ọ sịrị: “Nwa m, gịnị mere i ji meso anyị otú a? Lee, mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị.”—Luk 2:47, 48.

Baịbụl ji okwu ole na ole a Meri kwuru gosi na ịzụ nwa abụghị obere ọrụ, ọ sọkwa ya ya bụrụ nwa zuru okè. Ịzụ ụmụ n’ụwa ọjọọ a nwere ike ime ka ndị mụrụ ụmụ ‘chịrị obi n’aka’ mgbe niile, ma obi kwesịrị isi ndị nne na nna ike na Chineke ma na ịzụ ụmụ adịghị mfe.

Ọ dị mma ịhụ na ebe Jizọs nọ mgbe ahụ a na-achọgharị ya bụ n’ebe ga-eme ka ya na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, dịkwuo ná mma n’ihi na ọ nọ ebe ahụ na-amụ Okwu Chineke. Ọ bụ ya mere o ji were olu ọma zaa ndị mụrụ ya, sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”—Luk 2:49.

O doro anya na Josef chebaara ihe a Jizọs zara echiche ọtụtụ ugboro. O nwekwara ike ịbụ na obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla o chetara ya. A sị ka e kwuwe, ọ nọ kemgbe na-akụziri nwa ya ka o jiri ofufe Jehova Chineke kpọrọ ihe. N’agbanyeghị na Jizọs ka bụ nwata, ọ matala na nna ya nke eluigwe hụrụ ya n’anya, ihe nyeere ya aka ịmata nke a bụ otú Josef si lekọta ya.

Ọ bụrụ na ị bụ nna, ì nyerela ụmụ gị aka ka ha ghọta na Jehova bụ ezigbo nna nke nwere ike inyere ha aka ma chebe ha? Ọ bụrụkwa na ọ bụghị gị mụrụ ụmụ gị na ha bi, cheta otú Josef si lekọta Jizọs, gbalịakwa ka i lekọta ha otú ahụ ma were nke ọ bụla n’ime ha ka nwata dị oké ọnụ ahịa. Nyere ha aka ka ha na-abịarukwu Nna ha nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, nso.

Josef Rubeere Chineke Isi Ruo Ọnwụ

O nweghịzi oké ihe ọzọ Baịbụl kwuru banyere Josef, ma ihe ole na ole o kwuru baara anyị uru. Baịbụl gwaziri anyị na Jizọs “nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru [ndị mụrụ ya].” Baịbụl kwukwara na “Jizọs nọkwa na-eto, na-enwekwu amamihe na ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.” (Luk 2:51, 52) Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru na-agwa anyị banyere Josef? Ọ dị ọtụtụ. Ọ na-akụziri anyị na Josef nọgidere na-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ. Otú anyị si mara nke a bụ na nwa ya ahụ zuru okè nọgidere na-erubere ya isi ma na-edo onwe ya n’okpuru ya.

Ebe ahụ kwukwara na Jizọs nọ na-enwekwu amamihe. O doro anya na ọ bụ ihe ndị Josef kụziiri ya so n’ihe mere o ji nwekwuo amamihe. N’oge ahụ, e nwere ilu ndị Juu na-atụkarị nke sịrị na ọ bụ naanị ndị ọgaranya ga-abụli ndị amamihe, ma ndị ike kete o rie, dị ka ndị ọkwá nkà, ndị ọrụ ugbo, na ndị na-akpụ ụ́zụ́, ‘enweghị ike ịkụziri mmadụ aka nri na aka ekpe, ha enweghịkwa ike ikwu okwu amamihe.’ Mgbe Jizọs ghọrọ dimkpa, o gosiri na ilu ahụ abụghị eziokwu. O doro anya na mgbe ọ bụ nwata, ọ nụrụ ka nna ya na-akụzi iwu Jehova ugboro ugboro n’agbanyeghị na ọ bụ ọkwá nkà ọ na-enweghị ka ọ hà ya.

Ebe ahụ gosikwara na Josef sokwa mee ka Jizọs topụta mmadụ. Ọ bụ otú o si lekọta Jizọs mgbe ọ bụ nwata mere Jizọs ji ghọọ dimkpa ahụ́ gbasiri ike. Josef kụzikwaara Jizọs ọrụ ịkwa nkà. Ndị mmadụ na-akpọ Jizọs nwa ọkwá nkà, na-akpọkwa ya “ọkwá nkà.” (Mak 6:3) Nke a gosiri na Jizọs mụtara ọrụ ahụ Josef kụziiri ya. Ọ ga-adị mma ka ndị nna ṅomie Josef ma na-elekọta ụmụ ha anya nke ọma, hụkwa na ha mụtara ihe ga-enyere ha aka ilekọta onwe ha mgbe ha toro.

Mgbe Baịbụl kọchara otú e si mee Jizọs baptizim mgbe ọ dị afọ iri atọ, o nweghịzi ihe ọzọ e kwuru banyere Josef. O yiri ka Josef ọ̀ nwụọla mgbe Jizọs malitere ikwusa ozi ọma. (Gụọ igbe bụ́ “Olee Mgbe Josef Nwụrụ?” Ọ dị na peeji nke 27.) N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Josef. Ọ bụ ezigbo nna nke chebere ezinụlọ ya, gbooro ha mkpa ha, ma rubere Chineke isi ruo ọnwụ. Onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst, ma ọ̀ bụ nna, ma ọ̀ bụ onyeisi ezinụlọ, ma ọ̀ bụ onye ọ bụla ọzọ, nwere ihe ọ ga-amụta n’aka Josef.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’oge ahụ, a na-ewere nwoke na nwaanyị kwere ibe ha nkwa na ha ga-alụ otú e si ewere di na nwunye.

^ par. 8 Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche October 1, 2008.

^ par. 14 Baịbụl kwuru hoo haa na Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya mgbe e mechara ya baptizim. (Jọn 2:1-11) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere akwụkwọ apọkrịfa ndị kọrọ banyere Jizọs, gụọ isiokwu bụ́ “Akwụkwọ Apọkrịfa Ndị Kọrọ Banyere Jizọs—Ihe Ha Kọrọ Ọ̀ Bụ Eziokwu?” Ọ dị na peeji nke 18.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Olee Mgbe Josef Nwụrụ?

O doro anya na Josef nọ ndụ mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ. Ụmụaka ndị Juu na-ebido mgbe ha dị afọ iri na abụọ mụwa aka ọrụ nna ha, ma mgbe ha na-erule afọ iri na ise, ha aghọọ nwa ọrụ nna ha ma na-amụtụkwu ọrụ ahụ. O yiri ka Jizọs ọ̀ mụtachaala ọrụ ịkwa nkà tupu Josef anwụọ. Josef ọ̀ ka dị ndụ mgbe Jizọs dị afọ iri atọ, bụ́kwanụ mgbe o bidoro ikwusa ozi ọma? O yighị ka ọ̀ ka dị ndụ mgbe ahụ. Mgbe Jizọs malitere ozi ya, Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ banyere nne ya, ụmụnne ya ndị nwoke, na ụmụnne ya ndị nwaanyị, ma o nweghị ihe o kwuru banyere Josef. E nwedịrị oge a kpọrọ Jizọs “nwa Meri,” ọ bụghị nwa Josef. (Mak 6:3) A kọkwara ihe ụfọdụ Meri mere n’ebughị ụzọ jụọ di ya ma ọ bụ gwa ya agwa tupu ya emewe ihe ndị ahụ. (Jọn 2:1-5) N’oge Baịbụl, ụmụ nwaanyị anaghị emekarị otú ahụ, ha na-ebu ụzọ agwa di ha ihe ha chọrọ ime, ọ gwụla ma di ha ọ̀ nwụọla. Ihe ọzọkwa bụ na tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara Jọn onyeozi ka o lekọtawa nne ya. (Jọn 19:26, 27) Ọ bụrụ na Josef ka dị ndụ, ọ garaghị agwa onye ọzọ ka o lekọta nne ya. Ihe ndị a niile gosiri na ọ dị ka Josef ọ̀ nwụrụ mgbe Jizọs ka bụ nwa okorobịa. Ebe ọ bụ na Jizọs bụ nwa mbụ, o yiri ka ọ̀ rụwaziri ọrụ ịkwa nkà ahụ nna ya na-arụbu ma si na ya na-elekọta ndị ezinụlọ ha ruo mgbe o mere baptizim.

[Foto dị na peeji nke 24]

Josef mere ihe ozugbo ka o wee chebe nwa ya

[Foto dị na peeji nke 25]

Josef rụsiri ọrụ ike ka o nwee ike igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha

[Foto dị na peeji nke 26]

Josef na-akpọ ndị ezinụlọ ya aga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem n’afọ ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 28]

Josef kụziiri nwa ya ọrụ ịkwa nkà