Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Zitere “Kpakpando” Ahụ?

Ònye Zitere “Kpakpando” Ahụ?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ònye Zitere “Kpakpando” Ahụ?

▪ Ị̀ hụtụla ebe e sere ihe ndị mere n’oge a mụrụ Jizọs ma ọ bụ kirie fim kọrọ ihe mere mgbe a mụrụ ya? Ihe a na-egosikarị bụ ebe ndị eze atọ, ma ọ bụ ndị amamihe atọ, bịara ileta Jizọs mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ e nyiwere n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. A na-ekwukarị na ọ bụ Chineke ji kpakpando duru ndị ahụ ruo n’ụlọ anụ dị na Betlehem, bụ́ ebe Jizọs nọ. N’ọtụtụ mba, a na-akụziri ụmụaka na aha ndị eze atọ ahụ bụ Melchior, Caspar, na Baltazar. Ma ajụjụ bụ, akụkọ a a na-akọkarị banyere Jizọs ọ̀ bụ otú Baịbụl si kọọ ya? Azịza ya bụ mba. E nwere ọtụtụ ihe gosiri na ọ bụghị otú ahụ ka Baịbụl si kọọ ya.

Nke mbụ, ndị ahụ bịara leta Jizọs hà bụ ole ndị? N’asụsụ Grik e ji dee Baịbụl, a kpọghị ndị ahụ ndị eze ma ọ bụ ndị amamihe. Ha bụ ndị na-agụ kpakpando. O yiri ka hà bụ ndị ọgọ mmụọ ndị na-eji otú kpakpando si aga n’eluigwe akọ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Baịbụl ekwughị aha ha, o kwughịkwa ole ha dị.

Nke abụọ, olee mgbe ndị ahụ gara leta Jizọs? Ọ bụghị mgbe Jizọs bụ nwa ọhụrụ e nyiwere n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị mgbe ahụ? Matiu, bụ́ onye so dee Baịbụl, dere, sị: “Mgbe ha banyere n’ụlọ, ha hụrụ nwatakịrị ahụ na nne ya bụ́ Meri.” (Matiu 2:11) Ị̀ hụrụ na Jizọs abụghịzi nwa ọhụrụ, kama ọ bụ “nwatakịrị.” Meri na Josef anọghịzi n’ụlọ anụ, kama ha bizi n’ụlọ.

Nke atọ, ònye zitere “kpakpando” ahụ du ndị ahụ na-agụ kpakpando garuo n’ebe Jizọs nọ? Ndị ndú okpukpe na-akụziri ndị mmadụ na ọ bụ Chineke zitere “kpakpando” ahụ. Ma, ọ̀ bụ eziokwu na ọ bụ Chineke? Cheta na “kpakpando” ahụ edugaghị ha Betlehem ozugbo. O bu ụzọ duga ha Jeruselem, na nke Eze Herọd. Ha gwara eze ọjọọ ahụ banyere Jizọs ma gwadị ya na Jizọs ga-abụ “eze ndị Juu.” Nke a mere ka Herọd chọwa otú ọ ga-esi gbuo Jizọs. (Matiu 2:2) Herọd jizi aghụghọ gwa ha ka ha gaa chọpụta ebe nwa ahụ nọ ma bịa kọọrọ ya. Ọ sịrị na ya ga-achọkwa ịga kpọọrọ nwa ahụ isiala. “Kpakpando” ahụ mechara duru ndị ahụ na-agụ kpakpando gawa n’ebe Josef na Meri nọ. Nke a pụtara na ije ahụ ha bịara gaara akpatara Jizọs ọnwụ ma a sị na Chineke gbara nkịtị. Ma Chineke agbaghị nkịtị, o mere ka ndị ahụ ghara ịgaghachi na nke Herọd. Iwe juru Herọd obi na ndị ahụ abịaghachighị na nke ya. O nyeziri iwu ka e gbuo ụmụaka nwoke niile a mụrụ na Betlehem na n’obodo ndị dị ya gburugburu, malite ná ndị dị afọ abụọ gbadawa.—Matiu 2:16.

Jehova mechara kpọọ Jizọs “Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:17) Chebagodiri ihe a echiche: Nna ahụ hụrụ nwa ya n’anya, onye bụ́kwa onye ezi omume, ọ̀ ga-achọcha ndị ọ ga-edunye ozi, ya abụrụ ndị na-eme mgbaasị, nke bụ́kwanụ ihe o nyere n’iwu ka ndị mmadụ ghara ime? (Diuterọnọmi 18:10) Ọ̀ ga-eji kpakpando duga ndị ahụ na nke eze ọjọọ e nwere n’obodo ahụ ka ha zie ya ozi ga-eme ka o mewere Jizọs anyaụfụ? Chineke ọ̀ ga-ejikwa otu kpakpando ahụ na ndị ahụ na-agụ kpakpando mee ka a mata ebe nwa ya nke ọ ma na ọ gaghị echebeli onwe ya nọ?

Iji maa atụ: Ọ bụrụ na otu ọchịagha zigara onye agha ya ọ kacha hụ n’anya n’obodo ndị iro ha, ọ̀ ga-agwa ndị iro ahụ ebe onye agha ya ahụ nọ? Mbanụ! Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova, o zitere Ọkpara ya n’ụwa ọjọọ a. Ọ̀ ga-eme ka eze ọjọọ bụ́ Herọd mara ebe Ọkpara ya bụ́ obere nwa nke na-enweghị ike ichebe onwe ya nọ? Ọ gaghị eme ụdị ihe ahụ.

Ònyezi zitere “kpakpando” ahụ ma ọ bụ ihe ahụ yiri kpakpando? Ònye ka i chere na ọ bụ ya kacha chọọ ka e gbuo Jizọs, onye na-achọghị ka o too ma rụọ ọrụ mere o ji bịa n’ụwa? Ònye na-agbalị iduhie ụmụ mmadụ, na-eme ka ha na-agha ụgha, na-eme ihe ike, ma na-egburịta ibe ha? Jizọs mere ka anyị mata na onye ahụ bụ ‘onye ụgha na nna ụgha,’ bụrụkwa “ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.” Onye ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu.—Jọn 8:44.