Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ịrara Ibe Ya Nye Na-egosi na Anyị Bi n’Oge Ikpeazụ!

Mmadụ Ịrara Ibe Ya Nye Na-egosi na Anyị Bi n’Oge Ikpeazụ!

Mmadụ Ịrara Ibe Ya Nye Na-egosi na Anyị Bi n’Oge Ikpeazụ!

‘Anyị guzosiri ike n’ebe unu nọ, bụrụkwa ndị ezi omume na ndị a na-apụghị ịta ụta.’—1 TESA. 2:10.

GỊNỊ BỤ AZỊZA NKE AJỤJỤ NDỊ A?

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Delaịla, Absalọm, na Judas Iskarịọt mere?

Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jọnatan na Pita n’ikwesị ntụkwasị obi?

Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịhapụ Jehova na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị?

1-3. (a) Gịnị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ, gịnịkwa ka ọ pụtara? (b) Olee ajụjụ atọ anyị ga-aza?

GỊNỊ jikọrọ Delaịla, Absalọm, na Judas Iskarịọt? Ha niile gbara mmadụ mgba okpuru. Delaịla gbara Samsịn, bụ́ nwoke hụrụ ya n’anya, mgba okpuru. Absalọm gbara nna ya, bụ́ Eze Devid, mgba okpuru. Judas raara Jizọs Kraịst, bụ́ Nna ya ukwu, nye. Ihe onye ọ bụla n’ime ha mere kpataara ndị ọzọ nsogbu! Oleekwanụ otú ihe ha mere si gbasa anyị?

2 Otu onye na-ede akwụkwọ dere na ịgba mmadụ mgba okpuru so n’ihe ọjọọ ndị mmadụ na-emekarị taa. O kwesịghị iju anyị anya. Mgbe Jizọs buru amụma banyere ihe ga-egosi na “ọgwụgwụ usoro ihe a” eruola nso, o kwuru, sị: ‘Ọtụtụ ndị ga-arara ibe ha nye.’ (Mat. 24:3, 10) ‘Ịrara mmadụ nye’ pụtara “iji aghụghọ nyefee mmadụ n’aka onye iro ya ma ọ bụ ịgba mmadụ mgba okpuru.” Ụdị omume ahụ na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ” dị ka Pọl buru n’amụma. O kwuru na ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe” na “ndị na-arara mmadụ nye.” (2 Tim. 3:1, 2, 4) Ndị na-ede akwụkwọ na ndị na-eme fim na-emekarị ka ịghọ aghụghọ yie ihe ọchị na ihe dị mma n’akwụkwọ ha nakwa na fim ha. Ma, ịrara mmadụ nye na ịgba mmadụ mgba okpuru na-agbawa obi, na-emekwa ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. N’eziokwu, ụdị omume ndị ahụ na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ!

3 Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị gbara mmadụ mgba okpuru n’oge ochie? Olee ndị anyị nwere ike iṅomi otú ha si jiri obi ha niile kwado ndị ọzọ? Ònyekwa ka anyị kwesịrị iji obi anyị niile kwado? Ka anyị chọpụta.

IHE NDỊ MERE N’OGE OCHIE BỤ́ NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA HA MỤTA IHE

4. Olee otú Delaịla si rara Samsịn nye, gịnị mere ihe ahụ ji jọgbuo onwe ya?

4 Onye mbụ anyị ga-atụle bụ Delaịla onye aghụghọ, bụ́ onye Samsịn onyeikpe hụrụ n’anya. Samsịn chọsiri ike ịlụso ndị Filistia agha iji zọpụta ndị Chineke. O nwere ike ịbụ na ndị isi ndị Filistia ise chọpụtara na Delaịla ejighị obi ya niile hụ Samsịn n’anya. N’ihi ya, ha gwara ya na ha ga-enye ya ego buru ibu ma ọ chọpụtara ha ebe oké ike Samsịn si ka ha wee gbuo ya. Ebe Delaịla bụ onye anyaukwu, o kwetara. Ma, mgbalị ya kụrụ afọ n’ala ugboro atọ. Ọ nọ na-enye Samsịn nsogbu ‘site n’okwu ọ na-agwa ya mgbe dum, na-arịọsikwa ya ike.’ N’ikpeazụ, “mkpụrụ obi [Samsịn] enweghị ike idi ya ma ọlị.” N’ihi ya, ọ gwara Delaịla na a kpụtụbeghị ya isi nakwa na a kpụọ ya isi, ike ga-agwụ ya. * Mgbe Delaịla matara ebe ike Samsịn si, ọ kpọrọ otu nwoke ka ọ kpụọ Samsịn isi mgbe ọ na-arahụ ụra n’ikpere ụkwụ ya. O mesịziri nyefee Samsịn n’aka ndị iro ya ka ha mee ya ihe ha chọrọ. (Ikpe 16:4, 5, 15-21) Ihe ahụ Delaịla mere jọgburu onwe ya! Anyaukwu mere ka ọ rara onye hụrụ ya n’anya nye n’aka ndị iro.

5. (a) Olee otú Absalọm si gbaa Devid mgba okpuru, gịnịkwa ka ihe ahụ o mere gosiri? (b) Olee otú obi dị Devid maka mgba okpuru Ahitofel gbara ya?

5 Onye ọzọ anyị ga-atụle bụ Absalọm onye aghụghọ. Oké ọchịchọ mere ka o kpebie ịnara nna ya bụ́ Eze Devid ọchịchị n’ike. Ihe mbụ Absalọm mere bụ ‘izuru obi ndị Izrel.’ O mere ka à ga-asị na ọ hụrụ ha n’anya, na-ekwekwa ha nkwa ụgha. Ọ na-amakụ ha, na-esusukwa ha ọnụ ka à ga-asị na ọ chọrọ inyere ha aka. (2 Sam. 15:2-6) Absalọm nwetadịrị Ahitofel bụ́ ezigbo enyi Devid, mee ka o soro ya gbaa Devid mgba okpuru. (2 Sam. 15:31) N’Abụ Ọma nke 3 na nke 55, Devid kọwara otú obi dị ya n’ihi mgba okpuru ahụ a gbara ya. (Ọma 3:1-8; gụọ Abụ Ọma 55:12-14.) Nkata ọjọọ ahụ Absalọm kpara megide eze Jehova họpụtara gosiri na ọ dịghị ihe o ji ọchịchị Chineke kpọrọ. (1 Ihe 28:5) Nkata ahụ Absalọm kpara mechara kụọ afọ n’ala, Devid aka bụrụkwa Eze Jehova họpụtara.

6. Olee otú Judas si rara Jizọs nye, oleekwa ụdị onye ndị mmadụ na-akpọ Judas?

6 Ka anyị tụlezie ihe onye aghụghọ, bụ́ Judas Iskarịọt, mere Kraịst. Mgbe Jizọs na ndịozi ya iri na abụọ mere Ememme Ngabiga ikpeazụ, Jizọs gwara ha, sị: “N’ezie, ana m asị unu, Otu onye n’ime unu ga-arara m nye.” (Mat. 26:21) N’abalị ahụ, mgbe Jizọs, Pita, Jems, na Jọn nọ n’ogige Getsemeni, Jizọs mechara gwa ha, sị: “Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.” Ozugbo ahụ, Judas na oké ìgwè mmadụ bịara n’ogige ahụ, “o wee gakwuru Jizọs kpọmkwem, sị: ‘Ndeewo, Rabaị!’ o wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.” (Mat. 26:46-50; Luk 22:47, 52) Judas “raara ọbara ezi omume nye,” ma nyefee Jizọs n’aka ndị iro ya. Maka ego ole ka Judas, onye akpịrị ego, ji mee ihe ahụ? Maka naanị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ! (Mat. 27:3-5) Kemgbe ahụ, a na-akpọzi onye ọ bụla gbara mmadụ mgba okpuru Judas, karịsịa onye raara onye ya na ya dị ná mma nye n’aka ndị iro. *

7. Olee ihe ndị anyị mụtara n’akụkọ (a) Absalọm na Judas na (b) Delaịla?

7 Gịnị ka anyị mụtara n’ihe atụ atọ a? Absalọm nwụrụ ọnwụ ihere n’ihi na ọ gbara onye Jehova tere mmanụ mgba okpuru. Judas nwụkwara ọnwụ ihere n’ihi na ọ raara onye Jehova tere mmanụ nye. (2 Sam. 18:9, 14-17; Ọrụ 1:18-20) Mgbe ọ bụla ndị mmadụ nụrụ aha Delaịla, ha ga-echeta na ọ bụ onye aghụghọ na onye na-ejighị obi ya hụ Samsịn n’anya. (Ọma 119:158) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị nwee anyaukwu ma ọ bụ nwee oké ọchịchọ, bụ́ ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma! Ihe atụ ndị a ó kwesịghị ime ka anyị zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị gbaa mmadụ mgba okpuru?

ṄOMIE NDỊ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI

8, 9. (a) Gịnị mere Jọnatan ji kwado Devid? (b) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jọnatan?

8 Baịbụl kọkwara banyere ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ka anyị tụlee banyere mmadụ abụọ n’ime ha ma hụ ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ha. Onye nke mbụ anyị ga-ekwu banyere ya bụ Jọnatan, bụ́ onye kwadoro Devid. Jọnatan bụ ọkpara Eze Sọl, ma eleghị anya, ọ gaara anọchi nna ya ma e wepụ otu ihe. Jehova họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel ma Sọl chịchaa. Jọnatan kwadoro onye Chineke họọrọ. O mereghị Devid anyaụfụ. Kama, “e kekọtara mkpụrụ obi Jọnatan na mkpụrụ obi Devid,” Jọnatan kwekwara Devid nkwa na ọ ga-akwado ya. Ọ chịnyere Devid uwe mwụda ya, nyekwa ya mma agha ya, ụta ya, na ájị̀ ya iji gosi na o kwetara na ọ bụ Devid kwesịrị ịbụ eze. (1 Sam. 18:1-4) Jọnatan mere ihe ọ bụla o nwere ike ime iji ‘mee ka Devid nwee ike.’ O nwedịrị mgbe nna ya, Sọl, gaara egbu ya n’ihi na ọ na-azọ Devid. Jọnatan dụnyeere Devid úkwù ma gwa ya, sị: “Gị onwe gị ga-abụ eze Izrel, mụ onwe m ga-abụkwa osote gị.” (1 Sam. 20:30-34; 23:16, 17) Ka a sịkwa ihe mere Devid ji bụọrọ Jọnatan abụ iru uju mgbe Jọnatan nwụrụ iji gosi na ọ hụrụ ya n’anya, na-erukwara ya uju.—2 Sam. 1:17, 26.

9 Jọnatan ma onye o kwesịrị ịkwado. O ji obi ya niile kwado Ọkaakaa, bụ́ Jehova, kwadokwa Devid, bụ́ onye Chineke tere mmanụ. Taakwa, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ihe ùgwù pụrụ iche n’ọgbakọ, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado ụmụnna ndị a họpụtara idu ndú n’etiti anyị.—1 Tesa. 5:12, 13; Hib. 13:17, 24.

10, 11. (a) Gịnị mere Pita ji jiri obi ya niile kwado Jizọs? (b) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Pita, oleekwa ihe nke ahụ kwesịrị ime ka anyị mee?

10 Onye ọzọ anyị ga-amụta ihe n’aka ya bụ Pita onyeozi, bụ́ onye ji obi ya niile kwado Jizọs. Mgbe Jizọs Kraịst ji ihe atụ gwa ndị na-eso ụzọ ya na ọ dị mkpa ka ha nwee okwukwe n’ahụ́ ya na n’ọbara ya nke ọ ga-eji chụọ àjà n’oge na-adịghị anya, ihe atụ ahụ wụrụ ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya akpata oyi, ha wee kwụsị iso ya. (Jọn 6:53-60, 66) Jizọs jụziri ndịozi ya iri na abụọ, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Ọ bụ Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi. Anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.” (Jọn 6:67-69) Ihe a Pita kwuru ọ̀ pụtara na ọ ghọtara ihe niile Jizọs ka kwupụrụ banyere iji onwe ya chụọ àjà? Ikekwe ọ ghọtachaghị ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita kpebisiri ike ịkwado Ọkpara Chineke tere mmanụ.

11 Pita echeghị na ọ ga-abụrịrị na Jizọs ekwuteghị ihe ahụ o kwuru nakwa na Jizọs ga-emecha gbanwee ihe ahụ o kwuru. Kama, Pita dị obi umeala, ọ makwa na Jizọs “nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” Taakwa, olee ihe anyị na-eme ma anyị gụta ihe siiri anyị ike nghọta ma ọ bụ ihe anyị chere na ọ bụghị otú ahụ ka o kwesịrị ịdị n’akwụkwọ “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi” bipụtara? Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịghọta ihe ahụ kama ịnọ na-eche na a ga-agbanwe ya ka ọ dị otú anyị chọrọ.—Gụọ Luk 12:42.

AHAPỤLA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ

12, 13. Gịnị nwere ike ime ka mmadụ ghọọ di ya ma ọ bụ nwunye ya aghụghọ, gịnịkwa mere o ji bụrụ ihe ọjọọ n’agbanyeghị afọ ole mmadụ dị?

12 Anyị ekwesịghị ikwe ka ụdị ịgba mgba okpuru ọ bụla kpata nsogbu n’ezinụlọ ma ọ bụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi nọsie ike n’ofufe Chineke, gharakwa ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị.

13 Di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko so n’ụdị ịghọ aghụghọ kacha agbawa obi. Onye ahụ kwara iko ekwesịkwaghị ntụkwasị obi, uche ya dịzi n’ebe onye ọzọ nọ. Onye nke ahụ a ghọrọ aghụghọ ga-anọrọzi naanị ya, n’amaghịzi ma ọ̀ bụ ya gawa ihu ma ọ̀ bụ ya gawa azụ. Olee otú ụdị ihe ahụ si eme n’etiti mmadụ abụọ hụburu ibe ha n’anya? Ọ na-amalitekarị mgbe mmadụ na-achọghịzi ịma ihe di ya ma ọ bụ nwunye ya na-eche. Prọfesọ n’ihe banyere mmekọrịta ọhaneze bụ́ Gabriella Turnaturi kwuru na di na nwunye nwere ike ịghọ ibe ha aghụghọ ma ọ bụrụ na ha akwụsị ime ihe niile ha nwere ike iji mee ka ha hụkwuo ibe ha n’anya. Ụdị ihe a emeedịla ndị bụrụla di na nwunye ruo ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, otu nwoke dị afọ iri ise gbara nwunye ya ya na ya birila afọ iri abụọ na ise alụkwaghịm ka o nwee ike ịlụ nwaanyị ọzọ bụ́ onye o nweziri mmasị na ya. Ụfọdụ na-akpọ ya nsogbu ndị katatụrụla ahụ́. Ma, kama ime ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-enweghị ike izere ezere, ka anyị kpọọ ya ihe ọ bụ, ya bụ, aghụghọ ndị katatụrụla ahụ́ na-aghọ. *

14. (a) Olee otú Jehova si ele mmadụ ịghọ di ya ma ọ bụ nwunye ya aghụghọ anya? (b) Olee ihe Jizọs kwuru banyere di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko?

14 Olee ụdị anya Jehova na-ele ndị hapụrụ di ha ma ọ bụ nwunye ha n’abụghị n’ihi ịkwa iko? Chineke anyị “kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị,” o kwukwara ihe ndị gosiri na ọ kpọrọ ndị na-emegbu di ha ma ọ bụ nwunye ha ma gbaa ha alụkwaghịm asị. (Gụọ Malakaị 2:13-16.) Otú obi dị Jehova ka ọ dịkwa Jizọs banyere ndị na-aghọ di ha ma ọ bụ nwunye ha aghụghọ. N’ihi ya, Jizọs kụziri na mmadụ ekwesịghị ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ma mee ka à ga-asị na o nweghị ihe merenụ.—Gụọ Matiu 19:3-6, 9.

15. Olee ihe mmadụ ga-eme ka ọ ghara ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya?

15 Olee ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya? Okwu Chineke kwuru, sị: ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa ma ọ bụ di ị lụrụ n’agbọghọbịa,’ kwuokwa, sị, “Ka gị na nwunye gị [ma ọ bụ di gị] ị hụrụ n’anya kporie ndụ.” (Ilu 5:18; Ekli. 9:9) Ka di na nwunye na-aka nká, ha kwesịrị ịna-eme ihe niile ha nwere ike ime iji hụkwuo ibe ha n’anya. Ọ pụtara na ha ga na-ege ibe ha ntị, na-ewepụta oge ha abụọ ga-eji na-anọrị, na-anọkwukwa ibe ha nso. Ha ga-elekwasị anya n’ichebe alụmdi na nwunye ha na mmekọrịta ha na Jehova. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịna-amụkọ Baịbụl ọnụ, na-agakọ ozi ọma ọnụ mgbe niile, na-ekpekọkwa ekpere ọnụ ka Jehova gọzie ha.

AHAPỤLA JEHOVA

16, 17. (a) Olee ihe nwere ike ime ka anyị kwụsị iji obi anyị niile na-akwado Chineke n’ezinụlọ anyị nakwa n’ọgbakọ? (b) Olee ihe atụ gosiri na irube isi n’iwu Chineke nyere ka anyị na onye ikwu anyị a chụrụ n’ọgbakọ ghara ịkpakọ bara uru?

16 E nwere ndị nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ, bụ́kwa ndị ‘a dọsiri aka ná ntị ike ka ha wee nọgidesie ike n’okwukwe.’ (Taị. 1:13) Ụfọdụ bụ ndị àgwà ha mere ka a chụọ ha n’ọgbakọ. Ịdọ aka ná ntị enyerela “ndị e ji ya zụọ” aka ime ka ha na Chineke dịghachi ná mma. (Hib. 12:11) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na o nwere onye ikwu anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị a chụrụ n’ọgbakọ? Ihe ọ bụla anyị mere ga-egosi ma ànyị ji obi anyị niile na-akwado onye ahụ ka ànyị ji obi anyị niile na-akwado Chineke. Jehova na-ele ma ànyị ga-erubere iwu ya isi, bụ́ nke kwuru ka anyị na onye ọ bụla a chụrụ n’ọgbakọ ghara imekọ ihe.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:11-13.

17 Ka anyị tụlee naanị otu ihe atụ nke na-egosi uru ezinụlọ nwere ike irite ma ha rube isi n’iwu Jehova nke kwuru ka anyị na onye ikwu anyị a chụrụ n’ọgbakọ ghara ịkpa. O ruola ihe karịrị afọ iri a chụrụ otu nwa okorobịa n’ọgbakọ. N’oge a niile, nne ya na nna ya, na ụmụnne ya ndị nwoke anọ ‘kwụsịrị ha na ya ịdị na-akpakọ.’ Mgbe ụfọdụ, ọ chọrọ isonyere ha n’ihe ha na-eme, ma o nweghị onye n’ime ndị ezinụlọ ahụ kwere ka ya na ya mekọọ ihe ọ bụla. Mgbe a nabatara ya n’ọgbakọ, o kwuru na ọ na-ewute ya mgbe niile na ya na ezinụlọ ya enweghị ike imekọ ihe, na ọ na-akachakwa ewute ya n’abalị mgbe ya nọ naanị ya. Ma, o kwuru na a sị na ha kwere ka ya na ha na-emekọtụ ihe, ọ gaara eju ya afọ. Ma, n’ihi na o nweghị onye ezinụlọ ya kwere ka ya na ya na-emekọtụ ihe, o mere ka ya na Jehova dịghachi ná mma n’ihi na ọ na-agụsi ya agụụ ike ka ya na ndị ezinụlọ ya mekọwakwa ihe. Mgbe ọ bụla a nwara gị ọnwụnwa inupụ isi n’iwu Chineke nyere ka gị na onye ikwu gị a chụrụ n’ọgbakọ ghara imekọ ihe, cheta ihe atụ a.

18. Ugbu a anyị tụlerela ọghọm ndị dị n’ekwesịghị ntụkwasị obi na uru ikwesị ntụkwasị obi bara, gịnị ka i kpebiri ime?

18 Anyị bi n’ụwa ebe aghụghọ na ekwesịghị ntụkwasị obi juru. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ọtụtụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi anyị nwere ike iṅomi n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. Àgwà ha na-agbara ha akaebe, ka à ga-asị na àgwà ha na-ekwu, sị: “Unu bụ ndị akaebe, Chineke bụkwa onye akaebe, banyere otú anyị si guzosie ike n’ebe unu bụ́ ndị kwere ekwe nọ, bụrụkwa ndị ezi omume na ndị a na-apụghị ịta ụta n’ebe unu nọ.” (1 Tesa. 2:10) Ka anyị jiri obi anyị niile na-akwado Chineke, na-akwadokwa ibe anyị mgbe niile.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụghị ntutu nkịtị mere ka Samsịn dị ike, kama ọ bụ ihe ntutu ahụ nọchiri anya ya, ya bụ, mmekọrịta pụrụ iche ya na Jehova nwere n’ihi na ọ bụ onye Naziraịt.

^ par. 6 N’ihi ya, n’asụsụ ụfọdụ, “nsusu ọnụ Judas” pụtara “ịrara mmadụ nye n’aka ndị iro ya.”

^ par. 13 Ị chọọ ịgụkwu banyere ihe mmadụ nwere ike ime mgbe di ya ma o bụ nwunye ya kwara iko, gụọ isiokwu bụ́ “Idi Ihe Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Mere Gị” n’Ụlọ Nche Jun 15, 2010, peeji nke 29-32.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

N’agbanyeghị na ndị ọzọ kwụsịrị iso Ọkpara Chineke tere mmanụ, Pita kwadoro ya