Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-echebe Anyị Maka Nzọpụta

Jehova Na-echebe Anyị Maka Nzọpụta

Jehova Na-echebe Anyị Maka Nzọpụta

“Ike Chineke na-echebe [unu] site n’okwukwe maka nzọpụta a na-aga ikpughe n’oge ikpeazụ.”—1 PITA 1:4, 5.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú Jehova si dọta anyị n’ezi ofufe?

Olee otú anyị nwere ike isi kwe ka Jehova jiri ndụmọdụ ya na-edu anyị?

Olee otú Jehova si agba anyị ume?

1, 2. (a) Gịnị na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-enyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi? (b) Olee otú Jehova maruuru onye ọ bụla n’ime anyị?

“Ọ BỤ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 24:13) Ihe ahụ Jizọs kwuru gosiri na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị mgbe Chineke ga-eme ụwa Setan ihe o kpere n’ikpe, anyị ga-ekwesịrịrị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. Ma, ọ pụtaghị na Jehova na-atụ anya na ọ bụ naanị amamihe anyị na ike anyị ka anyị ga-eji na-atachi obi. Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Kọr. 10:13) Olee ihe okwu ndị ahụ pụtara?

2 Ihe ga-eme ka Jehova ghara ikwe ka ọnwụnwa karịrị anyị bịara anyị bụ na ọ ma ihe niile banyere anyị, ma nsogbu ndị anyị nwere, ma adịghị ike anyị, ma ihe anyị ga-edili. Chineke ọ̀ maara anyị nke ọma otú ahụ? Eenụ. Akwụkwọ Nsọ na-eme ka anyị mara na Jehova ma onye ọ bụla n’ime anyị nke ọma. Ọ ma àgwà anyị na ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. O nwedịrị ike ịghọta ihe anyị na-eche n’obi anyị.—Gụọ Abụ Ọma 139:1-6.

3, 4. (a) Olee otú ihe Chineke meere Devid si egosi na Jehova na-eche banyere ndị mmadụ n’otu n’otu? (b) Olee ihe pụrụ iche Jehova na-eme taa?

3 Ò yiri ihe na-agaghị ekwe omume na Chineke ga-enwe ụdị mmasị ahụ n’ebe ụmụ mmadụ efu nọ? Ọbụ abụ bụ́ Devid tụgharịrị uche n’ajụjụ ahụ, gwa Jehova, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ, nke mere i ji na-echeta ya?” (Ọma 8:3, 4) O nwere ike ịbụ na ihe mere Devid ji jụọ ajụjụ ahụ bụ ihe Chineke meere ya. N’agbanyeghị na ọ bụ ọdụ nwa Jesi, Jehova kwuru na ọ bụ “nwoke obi ya nabatara” ma ‘si n’ebe ọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye ndú’ Izrel. (1 Sam. 13:14; 2 Sam. 7:8) Cheedị otú obi dị Devid mgbe ọ ghọtara na Onye kere eluigwe na ụwa na-atụle ihe ndị ọ na-eche mgbe ọ nọ naanị ya, bụ́ ihe ndị ọ na-atụgharị n’uche mgbe ọ bụ nwata na-azụ atụrụ!

4 Ọ bụkwa otú ahụ ka o si eju anyị anya na Jehova nwere mmasị pụrụ iche taa n’ebe anyị nọ. Ọ na-achịkọta “ihe a na-achọsi ike nke mba niile” ka ha bịa fee ya ezi ofufe, na-enyekwara ndị ohu ya aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Hag. 2:7) Iji ghọtakwuo otú Jehova si enyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi, ka anyị tụlee otú o si adọta ndị mmadụ ịbịa fee ya ezi ofufe.

CHINEKE DỌTARA ANYỊ

5. Olee otú Jehova si adọta ndị mmadụ n’ebe Ọkpara ya nọ? Nye ihe atụ.

5 Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” (Jọn 6:44) Ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara na ọ bụ enyemaka Chineke ga-eme ka anyị ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Olee otú Jehova si adọta ndị yiri atụrụ n’ebe Ọkpara ya nọ? Ọ na-eji mmụọ nsọ ya na ozi ọma a na-ekwusa taa eme ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na ndị ozi ala ọzọ ibe ya nọ na Filipaị, ha hụrụ otu nwaanyị aha ya bụ Lidia ma zie ya ozi ọma. Baịbụl kọrọ, sị: “Jehova wee meghee nnọọ obi ya ịnabata ihe Pọl nọ na-ekwu.” N’eziokwu, Chineke nyere ya mmụọ nsọ ya ka o nwee ike ịghọta ozi ọma a na-ezi ya, e mechakwara mee ya na ezinụlọ ya baptizim.—Ọrụ 16:13-15.

6. Olee otú Chineke si dọta anyị niile n’ezi ofufe?

6 Ọ̀ bụ naanị Lidia ka ụdị ihe ahụ metụrụla? Mbanụ. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst e merela baptizim, ọ bụ Chineke dọtara gị n’ezi ofufe. Otú ahụ Nna anyị nke eluigwe hụrụ ezi ihe n’obi Lidia ka ọ hụkwara ezi ihe n’obi gị. Mgbe ị malitere ige ntị n’ozi ọma, Jehova nyere gị mmụọ nsọ ya ka i nwee ike ịghọta ihe a na-akụziri gị. (1 Kọr. 2:11, 12) Mgbe ị gbawara mbọ ime ihe ndị ị na-amụta, ọ gọziri mbọ ndị ị na-agba ime uche ya. Mgbe ị raara ndụ gị nye ya, ọṅụ juru ya obi. N’eziokwu, kemgbe ị malitere ije ije n’ụzọ nke ndụ, Jehova nọ na-enyere gị aka.

7. Olee otú anyị si mara na Chineke ga-enyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi?

7 Ebe Jehova nyeere anyị aka ka anyị malite iso ya na-eje ije, ọ naghị ahapụzi anyị ka anyị chepụta otú anyị ga-esi na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ maara na otú ahụ anyị na-ejighị aka anyị bata n’eziokwu, anyị agaghị anọgide na ya n’ike anyị. Mgbe Pita onyeozi na-edegara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ, o kwuru, sị: “Ike Chineke na-echebe [unu] site n’okwukwe maka nzọpụta a na-aga ikpughe n’oge ikpeazụ.” (1 Pita 1:4, 5) Ihe ahụ o kwuru gbasara Ndị Kraịst niile, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ichebara ya echiche taa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na enyemaka Chineke ga-eme ka anyị kwesị ntụkwasị obi n’ofufe ya.

CHINEKE NWERE IKE IME KA ANYỊ GHARA ỊZỌHIE ỤKWỤ

8. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ka anyị ghara ịzọhie ụkwụ?

8 Nsogbu ndị na-abịara anyị na ezughị okè anyị nwere ike ime ka anyị ghara ile ihe anya otú Jehova si ele ya, meekwa ka anyị zọhie ụkwụ n’amaghị ama. (Gụọ Ndị Galeshia 6:1.) Ihe mere Devid gosiri na ihe a bụ eziokwu.

9, 10. Olee otú Jehova si gbochie Devid ka ọ ghara ime ihe ọjọọ, gịnị ka Jehova na-emere anyị taa?

9 Mgbe Eze Sọl na-achụgharị Devid, Devid jidere onwe ya ma ghara igbu Sọl mgbe o nwetara ohere igbu ya. (1 Sam. 24:2-7) Ma n’oge na-adịghị anya, ezughị okè Devid kpara ya aka ọjọọ. Mgbe ya na ndị ikom ya na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ rịọrọ Nebal bụ́ onye Izrel ibe ya ka o nyere ha aka. Nebal kparịrị Devid, o kweghị enye ha ihe ọ bụla. Ezigbo iwe were Devid, nke mere ka o kpebie ịga gbuo nwoke ahụ na ndị ezinụlọ ya. Devid echetaghị na igbu ndị ezinụlọ nwoke ahụ bụ́ ndị na-enweghị ihe ha mere nwere ike ime ka ọ bụrụ onye ikpe ọbara mara n’anya Chineke. Ma, Abigel bụ́ nwunye Nebal mere ihe n’egbughị oge, nke mere ka Devid ghara ime ihe gaara eme ka ọ kwaa mmakwaara. Ebe Devid chọpụtara na Jehova si n’aka Abigel mee ka ọ ghara ịba ná nsogbu, ọ gwara Abigel, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, bụ́ onye zitere gị taa ka ị bịakwute m, bụrụ onye a gọziri agọzi! Ka ezi uche gị bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka gị onwe gị, bụ́ onye gbochiri m taa ịba n’ikpe ọmụma ọbara na iji aka m zọpụta onwe m, bụrụkwa onye a gọziri agọzi.”—1 Sam. 25:9-13, 21, 22, 32, 33.

10 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a? Jehova si n’aka Abigel mee ka Devid ghara ịzọhie ụkwụ. Ọ na-emekwara anyị otú ahụ taa. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ anya na mgbe ọ bụla anyị chọrọ imejọ ihe na Chineke ga-ezitere anyị onye ga-egbochi anyị ime ya; anyị amaghịkwa otú Chineke ga-esi enyere anyị aka mgbe ihe ụfọdụ mere ma ọ bụkwanụ ihe o nwere ike ikwe ka o mee iji mezuo nzube ya. (Ekli. 11:5) Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma nsogbu ọ bụla bịaara anyị nakwa na ọ ga-enyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi. O kwere anyị nkwa, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” (Ọma 32:8) Olee otú Jehova si enye anyị ndụmọdụ? Olee otú anyị nwere ike isi rite uru na ya? Gịnịkwa mere o ji doo anyị anya na Jehova na-edu ndị ya taa? Ka anyị hụ otú akwụkwọ Mkpughe si zaa ajụjụ ndị a.

NDỤMỌDỤ NA-ECHEBE ANYỊ

11. Olee otú Jehova maruru ihe na-eme n’ọgbakọ dị iche iche nke ndị ya?

11 N’ọhụụ e dere ná Mkpughe isi nke 2 na nke 3, Eze bụ́ Jizọs Kraịst na-ahụ ihe na-eme n’ọgbakọ asaa dị n’Eshia Maịnọ. Ọhụụ ahụ na-egosi na Jizọs na-ahụ ma ihe na-eme n’ọgbakọ ma ndị na-eme ya. E nwedịrị ebe ndị ọ kpọrọ ụfọdụ ndị aha, jaa ha mma n’ebe ha metara ma dụọ ha ọdụ n’ebe ha na-emetaghị. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọgbakọ asaa ahụ nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ kemgbe afọ 1914, ndụmọdụ Jizọs nyere ọgbakọ asaa ahụ gbasakwara ọgbakọ niile nke ndị Chineke n’ụwa taa. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na Jehova si n’aka Ọkpara ya na-edu ndị ya. Olee otú idu ndú ya nwere ike isi baara anyị uru?

12. Olee otú anyị nwere ike isi kwe ka Jehova na-eduzi nzọụkwụ anyị?

12 Otu ụzọ anyị nwere ike isi rite uru n’otú Jehova si jiri ịhụnanya na-edu ndị ya taa bụ inwe ọmụmụ ihe onwe onye. Jehova na-eji akwụkwọ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-ebipụta enye anyị ndụmọdụ. (Mat. 24:45) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ irite uru na ha, anyị ga-ewepụtarịrị oge mụọ ha ma mee ihe anyị mụtara. Ọmụmụ ihe onwe onye bụ otu ụzọ Jehova nwere ike isi ‘chebe anyị ka anyị ghara ịsụ ngọngọ.’ (Jud 24) Ò nwetụla mgbe ị gụrụ ihe n’akwụkwọ anyị, ya adị gị ka ọ̀ bụ gị ka e bu n’obi dee ya? Lee ya anya ka ndụmọdụ si n’aka Jehova. Otú ahụ enyi gị nwere ike ịkụtụ gị aka ma e nwee ihe ọ chọrọ ịgwa gị, Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya mee ka ị hụ àgwà ị na-akpa nke i kwesịrị ịgbanwe. O nwekwara ike ịbụ na ọtụtụ ndị ọzọ dị ka gị kwesịrị ime otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị, ọ pụtara na anyị na-ekwe ka Jehova na-eduzi nzọụkwụ anyị. (Gụọ Abụ Ọma 139:23, 24.) N’ihi ya, anyị kwesịrị ilebara otú anyị si amụ ihe anya.

13. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị lebara otú anyị si amụ ihe anya?

13 Iji oge karịrị akarị na-atụrụ ndụ nwere ike ime ka anyị ghara inwe oge anyị ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ọ dị mfe mmadụ ileghara ọmụmụ ihe onwe onye anya. Ugbu a, e nwere ihe ndị e ji atụrụ ndụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ha dịkwa ọnụ ala. Ntụrụndụ juru ebe niile taa, ma na tiivi ma na kọmputa ma n’ekwe ntị.” Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ selatawa aka n’ọmụmụ ihe onwe onye ruo mgbe anyị ga-akwụsị inwe ya kpamkpam. (Efe. 5:15-17) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ugboro ole ka m na-ewepụta ezigbo oge mụọ Okwu Chineke? Ọ̀ bụ naanị mgbe m nwere ihe omume?’ Ọ bụrụ otú ahụ, anyị nwere ike iji mgbede anyị wepụtara maka Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụ maka ọmụmụ ihe onwe onye chọọ amamihe Jehova nke ga-eme ka anyị nweta nzọpụta.—Ilu 2:1-5.

AGBAMUME NA-ENYERE ANYỊ AKA ỊTACHI OBI

14. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si gosi na Jehova na-ahụ otú obi dị anyị?

14 Devid nwere ọtụtụ nsogbu ná ndụ ya. (1 Sam. 30:3-6) Ihe o si n’ike mmụọ nsọ dee gosiri na Jehova ma otú obi dị ya. (Gụọ Abụ Ọma 34:18; 56:8.) Chineke makwa otú obi dị anyị. Mgbe obi anyị “tiwara etiwa” ma ọ bụ mgbe “e gburu mmụọ anyị,” ọ na-anọ anyị nso. Naanị nke a nwedịrị ike ịkasitụ anyị obi otú ahụ ọ kasiri Devid, nke mere o ji bụọ abụ, sị: “M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’obiọma gị, n’ihi na ị hụwo mmekpa ahụ́ m; ị marawo ahụhụ mkpụrụ obi m na-ata.” (Ọma 31:7) Ma, ihe Jehova na-eme abụghị naanị ịhụ ahụhụ anyị na-ata. Ọ na-akasi anyị obi ma na-agba anyị ume, nke na-enyere anyị aka ịtachi obi. Ọmụmụ ihe ọgbakọ bụ otu ụzọ o si eme ya.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Esaf?

15 Ihe mere ọbụ abụ bụ́ Esaf mere ka anyị mata otu uru ịga ọmụmụ ihe bara. Mgbe Esaf nọ na-eche banyere otú ndị ezi omume si ata ahụhụ, ya eyie ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ajọ omume, ọ jụwara ma ife Chineke ọ̀ bara uru. Obi dara Esaf mbà. Ọ kọwara otú obi dị ya, sị: “Obi adịghị m mma, akụrụ m gburu m oké mgbu.” N’ihi ya, ọ fọrọ obere ka ọ kwụsị ife Jehova. Olee ihe nyeere Esaf aka inweta onwe ya? O kwuru, sị: “M batara ná nnukwu ebe nsọ Chineke.” Mgbe ahụ ya na ndị ọzọ na-efe Jehova nọ, ọ malitere ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ ghọtara na ọ bụ naanị nwa oge ka ihe ga-agaziri ndị ajọ omume, na Jehova ga-emecha dozie ihe niile. (Ọma 73:2, 13-22) Ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime anyị. Anyị nwere ike ịda mbà n’ihi otú ihe si esiri ndị ezi omume ike na otú o si yie ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ajọ omume n’ụwa Setan. Anyị na ụmụnna anyị izukọ na-akasi anyị obi ma na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ n’ofufe anyị na-efe Jehova.

16. Olee otú ihe Hana mere nwere ike isi baara anyị uru?

16 Ọ́ bụrụkwanụ na ihe mere n’ọgbakọ mere ka ọ na-esiri gị ike ịga ọmụmụ ihe? Ikekwe, a napụrụ gị ihe ùgwù ije ozi, ya ana-emekwa gị ihere, ma ọ bụ ya abụrụ na o nwere nwanna gị na ya nwere nghọtahie. Ọ bụrụ otú ahụ, ihe Hana mere nwere ike inyere gị aka. (Gụọ 1 Samuel 1:4-8.) Cheta na nwunye di ya, bụ́ Penina, mere ka obi na-ajọ ya njọ. Ihe na-aka njọ kwa afọ mgbe ezinụlọ ha na-aga achụrụ Jehova àjà na Shaịlo. Ihe ahụ na-ewute Hana nke ukwuu nke na “ọ na-akwa ákwá ma ghara iri nri.” Ma, o kweghị ka o mee ka ọ kwụsị iso na-aga efe Jehova. Jehova hụrụ na o kwesịrị ntụkwasị obi ma gọzie ya.—1 Sam. 1:11, 20.

17, 18. (a) Olee otú anyị si enweta agbamume n’ọmụmụ ihe ọgbakọ? (b) Olee otú obi dị gị maka otú Jehova si eji ịhụnanya elekọta anyị iji nyere anyị aka inweta nzọpụta?

17 E nwere ezigbo ihe mere Ndị Kraịst taa ji kwesị iṅomi Hana. Anyị kwesịrị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya. Anyị niile ma na ọmụmụ ihe na-agba anyị ume. (Hib. 10:24, 25) Mkpakọrịta anyị na ụmụnna anyị n’ọmụmụ ihe na-akasi anyị obi. Obere ihe e kwuru mgbe a na-aza ajụjụ ma ọ bụ mgbe a na-eme ihe omume nwere ike iru anyị n’obi. Tupu a malite ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbe a gbasara, nwanna nwere ike ige anyị ntị ma ọ bụ kwuo ihe ga-akasi anyị obi. (Ilu 15:23; 17:17) Obi na-atọ anyị ụtọ mgbe anyị na-abụku Jehova abụ otuto. Agbamume anyị na-enweta n’ọmụmụ ihe dị anyị mkpa, karịsịa mgbe anyị nwere “nchegbu n’ime obi” anyị, n’ihi na n’ọmụmụ ihe, Jehova ‘na-akasi anyị obi’ ma na-enyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi.—Ọma 94:18, 19.

18 Ịhụnanya Chineke na-eme ka obi ruo anyị ala, obi na-adịkwa anyị otú ahụ ọ dị Esaf, bụ́ onye bụkuru Jehova abụ, sị: “I jidewo aka nri m. Ị ga-eji ndụmọdụ gị na-edu m.” (Ọma 73:23, 24) Anyị na-ekele Jehova na ọ na-echebe anyị maka nzọpụta!

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Jehova dọtakwara gị n’ezi ofufe

[Foto dị na peeji nke 30]

Ime ihe Chineke dụrụ anyị n’ọdụ na-echebe anyị

[Foto dị na peeji nke 31]

Agbamume anyị na-enweta na-enyere anyị aka ịtachi obi