Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Taa Hà Kwesịrị Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Ndị Kraịst Taa Hà Kwesịrị Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Ndị Kraịst Taa Hà Kwesịrị Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

EZIGBO Ndị Kraịst taa anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha na-eṅomi Jizọs. Jizọs kwuru na ya “abụghị nke ụwa.” O kwukwara banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19; 17:14) Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere na Ndị Kraịst ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

1. E nwere ihe ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ agaghị achịli onwe ha, nakwa na e keghị ha ka ha na-achị onwe ha. Jeremaya onye amụma dere, sị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jeremaya 10:23.

Otú ahụ Chineke na-ekeghị ndị mmadụ ka ha na-efe efe ka nnụnụ, ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-ekeghị ha ka ha na-achị ibe ha. N’akwụkwọ bụ́ The Question of Government, ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ David Fromkin kwuru ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Ọ sịrị: “Ndị ọchịchị bụ mmadụ nkịtị; ha nwere ike imehie ihe, e kwesịghịkwa ịtụkwasị ha obi na ha ga-eme ihe niile ha kwere nkwa na ha ga-eme n’ọdịnihu. Ha nwetụrụ ikike, ma ikike ha enweghị ebe o ruru.” Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ghara ịtụkwasị mmadụ obi!—Ọma 146:3.

2. Ndị mmụọ ọjọọ na-atụrụ ndị ọchịchị ihe ndị ha na-eme. Mgbe Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa, Jizọs ma na Ekwensu ga-emeli ya. Jizọs mechara kpọọ Setan “onye na-achị ụwa.” Mgbe afọ ole na ole gafere, Pọl onyeozi kpọrọ Setan “chi nke usoro ihe a.” (Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrịnt 4:4) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst ibe ya, ọ sịrị ha: “Anyị nwere mgba . . . megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Ndị mmadụ amaghị na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-achị ụwa a. Ugbu a anyị matara na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-achị ụwa, ànyị kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

Were dị ka ihe atụ: Oké ifufe na-eburu obere ụgbọ gawa ebe masịrị ya n’oké osimiri. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọchịchị ụmụ mmadụ. Ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị dị ike, na-ebugharị ha ka ebe ifufe na-ebugharị obere ụgbọ mmiri, na-atụrụ ha ihe ha ga-eme. Otú ahụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-agaghị akwụsịli oké ifufe na-ebugharị ụgbọ ha, ndị ọchịchị enweghị ike ịkwụsili ndị mmụọ ọjọọ ịtụrụ ha ihe ha na-eme. Ndị mmụọ ọjọọ kpebisiri ike ime ka ụmụ mmadụ na-eme naanị ihe ọjọọ, ha kpebisikwara ike ịkpatara ‘ụwa ahụhụ.’ (Mkpughe 12:12) N’ihi ya, ọ bụ naanị onye ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ike ga-anapụta ụmụ mmadụ. Onye ahụ bụ Jehova Chineke.—Abụ Ọma 83:18; Jeremaya 10:7, 10.

3. Ezigbo Ndị Kraịst na-akwado naanị Alaeze Chineke. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ma na Chineke nwere oge o bu n’obi ọ ga-abụ ya ruo ọchịchị ya amalite n’eluigwe. Ọ ga-esi n’ebe ahụ na-achị ụwa niile. Baịbụl kpọrọ ọchịchị a Alaeze Chineke. O kwukwara na Chineke họpụtara Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ahụ. (Mkpughe 11:15) Ebe ọ bụ na Alaeze ahụ ga-abara ụmụ mmadụ uru, ihe Jizọs kacha zie ndị mmadụ bụ “ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43) Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” Ọ̀ bụ maka gị? Ọ bụ maka na ọ bụrụ na Alaeze Chineke abịa, uche Chineke ga na-eme ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Matiu 6:9, 10.

Oleezi ihe ga-eme ọchịchị ụmụ mmadụ? Baịbụl kwuru na a ga-ebibi ọchịchị niile e nwere ‘n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Mkpughe 16:14; 19:19-21) Ọ bụrụ na mmadụ kwetara n’eziokwu na Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya, o kwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụrụ na onye ahụ na-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ nke a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya, ọ pụtara na ọ na-emegide Chineke.

Ebe ọ bụ na ezigbo Ndị Kraịst anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ̀ pụtara na ha anaghị eme ihe ga-abara ndị obodo ha uru? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7] 

Ndịàmà Jehova na-eme ihe ndị na-egosi na ha na-akwado Alaeze Chineke, ọ bụghị ịgbawa mbọ ka a gbanwee ihe n’ọchịchị