Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Ji Alụmdi Na Nwunye, Bụ́ Onyinye Si N’aka Chineke, Kpọrọ Ihe n’Ezie?

Ì Ji Alụmdi Na Nwunye, Bụ́ Onyinye Si N’aka Chineke, Kpọrọ Ihe n’Ezie?

Ì Ji Alụmdi Na Nwunye, Bụ́ Onyinye Si N’aka Chineke, Kpọrọ Ihe n’Ezie?

“Ka Jehova nye unu onyinye, ka onye ọ bụla n’ime unu nwetakwa ebe izu ike n’ụlọ di ya.”—RUT 1:9.

CHỌỌ AZỊZA NKE AJỤJỤ NDỊ A:

Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ndị fere Chineke n’oge ochie ji alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọ ihe?

Olee otú anyị si mara na onye anyị kpebiri ịlụ gbasara Jehova?

Olee ihe Baịbụl kwuru banyere alụmdi na nwunye nke i bu n’obi ime?

1. Gịnị ka Adam mere mgbe Chineke nyere ya nwunye?

“EHEE! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m. A ga-akpọ onye a Nwaanyị, n’ihi na e si n’ahụ́ nwoke wepụta ya.” (Jen. 2:23) Obi dị Adam bụ́ nwoke mbụ ezigbo ụtọ mgbe Chineke nyere ya nwunye. Ka a sịkwa ihe mere o ji kwuo ihe ahụ o kwuru! Mgbe Jehova mere ka oké ụra buru Adam, O ji otu ọgịrịga ya kee nwaanyị ahụ mara mma. Adam mechara kpọọ ya Iv. Chineke jikọrọ ha ka ha bụrụ di na nwunye obi dị ụtọ. Ebe ọ bụ ọgịrịga Adam ka Jehova ji kee nwaanyị ahụ, Adam na Iv bụ otu anụ ahụ́ karịa di na nwunye ọ bụla.

2. Gịnị mere nwoke na nwaanyị ji ahụ ibe ha n’anya?

2 N’ihi amamihe dị ukwuu Jehova nwere, o kere nwoke na nwaanyị ka ha na-ahụ ibe ha n’anya, nke ga-eme ka ha abụọ dịrị n’otu. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Nwoke na nwaanyị lụọ, ha abụọ ga-atụ anya ịna-enwe mmekọahụ, na-ahụkwa ibe ha n’anya mgbe niile.” Ọtụtụ ndị na-efe Jehova emeela otú ahụ.

NDỊ JI ALỤMDI NA NWUNYE KPỌRỌ IHE

3. Olee otú Aịzik si lụta nwaanyị?

3 Onye ezi omume ahụ bụ́ Ebreham ji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe. N’ihi ya, ọ gwara onye kasị mee okenye n’ime ndị na-ejere ya ozi ka ọ gaa Mesopotemia lụtara Aịzik nwaanyị. Ekpere onye ahụ na-ejere Ebreham ozi kpere mere ka Chineke gọzie ije ya. Ọ lụtaara Aịzik Ribeka, bụ́ nwaanyị na-atụ egwu Chineke. Ribeka so ná ndị e si n’aka ha mezuo nkwa Jehova kwere banyere ịmụta mkpụrụ Ebreham. (Jen. 22:18; 24:12-14, 67) Ma, ọ pụtaghị na anyị kwesịrị ịchọwara onye ọzọ onye ọ ga-alụ ma ọ bụrụ na onye ahụ agwaghị anyị mee otú ahụ. Taa, ọtụtụ ndị na-eji aka ha achọta onye ha ga-alụ. N’eziokwu, Chineke anaghị achọtara mmadụ onye ọ ga-alụ. Ma, ọ ga-enyere Onye Kraịst aka ịchọta onye ọ ga-alụ, nyekwara ya aka n’ihe ndị ọzọ ọ na-eme ma ọ bụrụ na onye ahụ arịọ Chineke ka o nyere ya aka, kwekwa ka mmụọ nsọ na-edu ya.—Gal. 5:18, 25.

4, 5. Gịnị mere i ji kweta na nwa agbọghọ Shulem na nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ hụrụ ibe ha n’anya?

4 Ọmarịcha nwa agbọghọ Shulem, bụ́ onye Izrel oge ochie, achọghị ka ndị enyi ya mee ka o soro n’ọtụtụ ndị nwunye Eze Sọlọmọn. O kwuru, sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, emewo m ka unu ṅụọ iyi na unu agaghị akpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.” (Abụ Sọlọ. 8:4) Nwa agbọghọ Shulem ahụ hụrụ otu nwa okorobịa na-azụ atụrụ n’anya. O kwuru n’obi umeala, sị: “Abụ m okooko safrọn nke puru n’ụsọ oké osimiri, bụrụkwa okooko lili nke puru na ndagwurugwu.” Nwa okorobịa ahụ hụkwara ya n’anya. Ọ gwara nwa agbọghọ Shulem, sị: “Dị ka okooko lili nke puru n’etiti ahịhịa ogwu, otú ahụ ka enyi m nwaanyị dị n’etiti ụmụ nwaanyị”! (Abụ Sọlọ. 2:1, 2) Ha hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu.

5 Nwa agbọghọ Shulem na nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ ga-ebi n’udo n’ihi na ha abụọ hụrụ Chineke n’anya. N’eziokwu, nwa agbọghọ Shulem gwara nwa okorobịa ahụ na-azụ atụrụ, sị: “Kanye m dị ka akara n’elu obi gị, dị ka akara n’ogwe aka gị; n’ihi na ịhụnanya siri ike dị ka ọnwụ, ọ naghị ekwe ekwe dị ka Shiol, ọ na-achọsi ikwesị ntụkwasị obi ike. Ọ na-enwu dị ka ọkụ, bụ́ ire ọkụ nke Jaa [n’ihi na o si n’aka ya]. Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri apụghịkwa ibupụ ya. Ọ bụrụ na mmadụ enye ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ụlọ ya iji nweta ịhụnanya, ndị mmadụ ga-eleghara ha anya.” (Abụ Sọlọ. 8:6, 7) Onye na-efe Jehova chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ̀ bụ na o kwesịghị ịtụ anya ụdị ihe ahụ n’aka onye ọ ga-alụ?

IHE I KPEBIRI IME GBASARA CHINEKE

6, 7. Olee otú anyị si mara na onye anyị kpebiri ịlụ gbasara Chineke?

6 Onye i kpebiri ịlụ gbasara Jehova. O nyere ndị Izrel iwu banyere ndị bi na Kenan, sị: “Gị na ha agọkwala ọgọ. Akpọrọla nwa gị nwaanyị kpọnye nwa ya nwoke, alụtarala nwa gị nwoke nwa ya nwaanyị. N’ihi na ọ ga-eme ka nwa gị nwoke kwụsị iso m, ha ga-efekwa chi ọzọ dị iche iche; Jehova ga-ewesokwa unu iwe dị ọkụ, ọ ga-alakwa gị n’iyi ọsọ ọsọ.” (Diut. 7:3, 4) Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Ezra kwuru, sị: “Unu emewo omume ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihi na unu lụbatara ndị inyom mba ọzọ iji tụkwasị ihe n’ikpe ọmụma Izrel.” (Ezra 10:10) Pọl onyeozi gwakwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Iwu ji nwunye n’oge niile di ya dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya adaa n’ụra ọnwụ, o nweere onwe ya ịlụ onye ọ chọrọ, naanị n’ime Onyenwe anyị.”1 Kọr. 7:39.

7 Ọ bụrụ na onye raara ndụ ya nye Jehova alụọ onye na-ekweghị ekwe, o nupụrụla Chineke isi. N’oge Ezra, ndị Izrel “lụbatara ndị inyom mba ọzọ,” nke bụ́ inupụrụ Jehova isi. Anyị ekwesịghị ịchọwa ihe anyị ga-akụdo aka mee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru hoo haa na ọ dịghị mma. (Ezra 10:10; 2 Kọr. 6:14, 15) Onye Kraịst nke lụrụ onye na-ekweghị ekwe akpaala àgwà ọjọọ, gosikwa na ya ejighị alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọ ihe. Ụdị omume ahụ nwere ike ime ka a napụ onye ahụ ihe ùgwù ndị o nwere n’ọgbakọ. Ọ ga-abụ iberiibe ma ọ bụrụ na mmadụ na-atụ anya ka Chineke gọzie ya, ma ihe ọ na-ekpe n’ekpere abụrụ: ‘Jehova, akpachaara m anya nupụrụ gị isi, ma, biko, gọzie m.’

NNA ANYỊ NKE ELUIGWE MA IHE NIILE

8. Kọwaa ihe mere anyị ji kwesị iso ndụmọdụ Chineke nyere banyere alụmdi na nwunye.

8 Onye rụrụ ekwe ntị ma otú ekwe ntị si arụ ọrụ. O nwere ike ide ihe ga-enyere onye zụrụ ya aka ịma ihe ọ ga-eji ya na-eme. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị eleghara ihe o dere anya? Ekwe ntị ahụ nwere ike imebi! N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-ebi n’udo, anyị kwesịrị iso ndụmọdụ Jehova nyere. Ọ bụ ya malitere alụmdi na nwunye.

9. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na Jehova ma otú obi na-adị onye naanị ya nọ nakwa ụdị obi ụtọ di na nwunye nwere ike inwe?

9 Jehova ma ihe niile banyere ndị mmadụ nakwa alụmdi na nwunye. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ ‘mụọ ọmụmụ, baakwa ụba.’ Ọ bụ ya mere o ji mee ka mmekọahụ na-agụ ha. (Jen. 1:28) Chineke ma otú obi na-adị onye naanị ya nọ. N’ihi ya, tupu ya ekee Iv bụ́ nwaanyị mbụ, o kwuru, sị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” (Jen. 2:18) Jehova makwa nke ọma ụdị obi ụtọ di na nwunye nwere ike inwe.—Gụọ Ilu 5:15-18.

10. Gịnị ka di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’obi gbasara mmekọahụ?

10 N’ihi mmehie na ezughị okè mmadụ niile ketara n’aka Adam, e nweghị alụmdi na nwunye zuru okè ugbu a. Ma di na nwunye ndị na-efe Jehova nwere ike inwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ana-eme ihe Okwu Chineke kwuru. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ndụmọdụ ahụ doro anya Pọl nyere di na nwunye banyere mmekọahụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:1-5.) Akwụkwọ Nsọ ekwughị na naanị ihe mere di na nwunye ga-eji na-enwe mmekọahụ bụ ka ha mụta ụmụ. Inwe mmekọahụ nwere ike ime ka obi dị di na nwunye ụtọ, ahụ́ eruokwa ha ala. Ma Chineke achọghị ka ha na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ. N’okwu a dị ezigbo mkpa, o doro anya na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iji obiọma na-emeso ibe ha ihe, nke ga-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu. Ma, ha ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-akpasu Jehova iwe.

11. Olee otú Jehova si gọzie Rut n’ihi na o rubeere ya isi?

11 Alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ ihe obi ụtọ na ọṅụ, ọ bụghị ihe na-agbawa obi ma ọ bụ ihe na-agwụ ike. Ezinụlọ Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ebe udo dị nakwa ebe obi na-eru onye ọ bụla ala. Chegodị ihe mere n’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga. Neomi, bụ́ agadi nwaanyị, na ndị nwunye ụmụ ya abụọ, bụ́ Ọpa na Rut, bụ ụmụ nwaanyị isi mkpe. Mgbe ha si Moab na-alọta Juda, Neomi gwara Rut na Ọpa ka ha laghachikwuru ndị obodo ha. Ma, Rut, bụ́ nwaanyị Moab, ekweghị ahapụ Neomi. Ọ tụkwasịrị ezi Chineke obi. Ọ bụ ya mere Boaz ji mesie ya obi ike na ‘Jehova bụ́ onye ọ gbabara n’okpuru nku ya ga-enye ya ụgwọ ọrụ zuru okè.’ (Rut 1:9; 2:12) Rut ji alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ihi ya, ọ lụrụ Boaz katarala ahụ́, bụ́ nwoke na-efe Jehova. Mgbe Chineke ga-akpọlite Rut n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ, obi ga-adị Rut ụtọ ịmata na ya bụ nne ochie Jizọs Kraịst. (Mat. 1:1, 5, 6; Luk 3:23, 32) Jehova gọziri ya n’ihi na o rubeere ya isi!

EZIGBO NDỤMỌDỤ GA-EME KA DI NA NWUNYE NA-EBI N’UDO

12. Olee ebe mmadụ ga-esi nweta ezigbo ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye?

12 Onye ahụ malitere alụmdi na nwunye gwara anyị ihe ga-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. E nweghị onye ma ihe ka ya. Ihe niile Baịbụl kwuru ziri ezi. N’ihi ya, onye ọ bụla nke chọrọ inye mmadụ ezigbo ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” (Efe. 5:33) O nweghị ihe e kwuru na ndụmọdụ a Ndị Kraịst tozuru okè na-agaghị aghọta. Ajụjụ bụzi, Hà ga-eme ihe a Baịbụl kwuru? Ha ga-eme ya ma ọ bụrụ na ha ji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe. *

13. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na di emeghị ihe 1 Pita 3:7 kwuru?

13 Di bụ́ Onye Kraịst kwesịrị iji ịhụnanya na-emeso nwunye ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ndị bụ́ di, ka unu na ndị nwunye unu na-ebi otú ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, na-enyenụ nwaanyị nsọpụrụ dị ka arịa na-esighị ike, ebe unu na ha bụ ndị nketa nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke bụ́ ndụ, ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Ọ bụrụ na di anaghị eme ihe Jehova kwuru, o nwere ike ime ka Chineke ghara ịnụ ekpere ya. O nwekwara ike ime ka di na nwunye na Chineke ghara ịdịzi ná mma, meekwa ka ha na-echegbu onwe ha, na-esekarị okwu, na-emesikwa ibe ha ike.

14. Olee ihe ọma nwaanyị hụrụ di ya n’anya ga na-emere ezinụlọ ya?

14 Ọ bụrụ na nwunye na-eme ihe Baịbụl kwuru, kwekwa ka mmụọ nsọ Chineke na-edu ya, ọ ga-agbalịsi ike ime ka udo na ọṅụ dị n’ezinụlọ ya. Ọ bụrụ na di na-atụ egwu Chineke, ọ ga-ahụ nwunye ya n’anya. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla merụọ nwunye ya ahụ́ ma ọ bụ mee ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma. Nwunye bụ́ Onye Kraịst chọrọ ka di ya hụ ya n’anya. N’ihi ya, o kwesịrị ịna-akpa àgwà ga-eme ka di ya hụ ya n’anya. Ilu 14:1 kwuru, sị: “Nwaanyị nke maara ihe n’ezie ewulitewo ụlọ ya, ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya akwatu ya.” Nwaanyị nke maara ihe ma hụ di ya n’anya na-agbalịsi ike ka udo na ọṅụ dị n’ezinụlọ ya. Ọ ga-egosikwa na o ji alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọ ihe n’ezie.

15. Olee ndụmọdụ dị ná Ndị Efesọs 5:22-25?

15 Otú di na nwunye ga-esi gosi na ha ji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe bụ iṅomi otú Jizọs si emeso ọgbakọ ya. Ha ga-ahụ ibe ha n’anya, na-akwanyekwara ibe ha ùgwù. (Gụọ Ndị Efesọs 5:22-25.) Di na nwunye ndị hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu na-adị obi umeala, ha anaghị akwụsị ịtụpụrụ ibe ha ọnụ ma ọ bụ kwe ka àgwà ọjọọ ndị ọzọ mebie alụmdi na nwunye ha. Jehova na-agọzikwa ha!

MMADỤ ATỌSALA HA

16. Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst ji anọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye?

16 Ọtụtụ ndị bu n’obi na ha ga-alụ di ma ọ bụ nwunye otu ụbọchị. Ma e nwere ndị na-efe Jehova na-alụbeghị n’ihi na ha ahụbeghị onye dị ha mma nakwa onye hụrụ Jehova n’anya. E nwekwara ndị Chineke nyere onyinye alụghị di ma ọ bụ nwunye, nke mere ka ha na-ewepụtakwu oge ijere Jehova ozi n’enweghị ihe ga-adọpụ ha uche. Ma, ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịna-erube isi n’iwu Jehova nyere banyere omume ọma.—Mat. 19:10-12; 1 Kọr. 7:1, 6, 7, 17.

17. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru banyere alụmdi na nwunye, bụ́ ihe anyị kwesịrị ịna-echeta? (b) Agụụ nwunye mmadụ ma ọ bụ di mmadụ gụwa Onye Kraịst, gịnị ka o kwesịrị ime n’egbughị oge?

17 Ma ànyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na anyị alụghị, anyị niile kwesịrị ịna-echeta ihe Jizọs kwuru, nke bụ́: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:4-6) Agụụ nwunye mmadụ ma ọ bụ di mmadụ ịgụ anyị bụ mmehie. (Diut. 5:21) Ọ bụrụ na agụụ nwunye mmadụ ma ọ bụ di mmadụ amalite ịgụ Onye Kraịst, o kwesịrị ime ihe ọ bụla o nwere ike ime ozugbo iji wepụ echiche ahụ n’obi ya. O kwesịrị ime otú ahụ ọ bụrụgodị na ọ ga-ewute ya nke ukwuu n’ihi na o kwere ka ọchịchọ ọjọọ bata ya n’obi. (Mat. 5:27-30) Onye ahụ kwesịrị ịgbanwe echiche ya ma jide onwe ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ na-agụ obi ya dị aghụghọ.—Jere. 17:9.

18. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, anya?

18 Ọtụtụ ndị na-amaghị Jehova Chineke na iwu o nyere banyere alụmdi na nwunye na-akwanyetụrụ alụmdi na nwunye ùgwù. Anyịnwa kwanụ? Anyị kwesịrị igosi na anyị ji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe karịa ka ndị ahụ na-eme, ebe ọ bụ na anyị raara onwe anyị nye Jehova, bụ́ ‘Chineke onye obi ụtọ.’ Obi kwesịkwara ịdị anyị ụtọ n’ihi onyinye niile o nyere anyị!—1 Tim. 1:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ọ bụrụ na di na nwunye na-ebi n’udo, ọ ga-eme ka a sọpụrụ Jehova, meekwa ka obi dị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ezigbo ụtọ

[Foto dị na peeji nke 5]

Rut gosiri na o ji alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọ ihe

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị̀ na-egosi na i ji alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye si n’aka Jehova, kpọrọ ihe n’ezie?