Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbalịsie Ike Ka Gị Na Di Gị Ma Ọ bụ Nwunye Gị Ghara Itisa

Gbalịsie Ike Ka Gị Na Di Gị Ma Ọ bụ Nwunye Gị Ghara Itisa

Gbalịsie Ike Ka Gị Na Di Gị Ma Ọ bụ Nwunye Gị Ghara Itisa

“Ana m enye ndị lụrụ di na nwunye ntụziaka, ma ọ bụghị m, kama ọ bụ Onyenwe anyị.”—1 KỌR. 7:10.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ Chineke kekọtara di na nwunye?

Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-anaghị ebi n’udo aka?

Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele alụmdi na nwunye anya?

1. Olee otú Ndị Kraịst si ele alụmdi na nwunye anya, maka gịnị?

N’ỤBỌCHỊ Ndị Kraịst na-agba akwụkwọ, ha na-ekwe nkwa n’ihu Chineke. Ha ekwesịghị iji nkwa ahụ gwurie egwu. (Ekli. 5:4-6) Ebe ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, o ‘kekọtala’ mmadụ abụọ ahụ ka ha bụrụ di na nwunye. (Mak 10:9) Chineke ekekọtala ha n’agbanyeghị ihe iwu obodo ha kwuru. Ndị na-efe Jehova kwesịrị ile alụmdi na nwunye ha anya ka ihe ga-adịgide adịgide ọ bụrụgodị na ha amalitebeghị ife Jehova mgbe ha gbara akwụkwọ.

2. Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ọ bụrụ na di na nwunye na-ebi n’udo, ọ ga-eme ka obi na-adị ha ezigbo ụtọ. Ma, gịnị ka e nwere ike ime ma ọ bụrụ na di na nwunye na-enwe nsogbu? È nwere ihe a ga-eme ka ha abụọ biwekwa n’udo? Ọ bụrụ na di na nwunye anaghị ebi n’udo, olee otú e nwere ike isi nyere ha aka?

ALỤMDI NA NWUNYE Ọ̀ GA-ABỤ IHE OBI ỤTỌ, KA Ọ̀ GA-AKPATA OBI MGBAWA?

3, 4. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na Onye Kraịst eleghara iwu Jehova anya mgbe ọ na-ahọrọ onye ọ ga-alụ?

3 Ọ bụrụ na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-ebi n’udo, ọ ga-eme ha obi ụtọ, nyekwa Jehova otuto. Ọ bụrụ na ha etisaa, ọ na-akpata obi mgbawa na nsogbu ndị ọzọ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst nke chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye erube isi n’iwu Chineke, ọ ga-eme ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-ebi n’udo. Ma, onye leghaara iwu Chineke anya mgbe ọ na-ahọrọ onye ọ ga-alụ nwere ike ịkwa mmakwaara. E nwekwara ike obi agaghị adị ya mma. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ ndị na-adịbeghị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye na-enwe onye ha na ha na-akpa. Ụfọdụ ndị na-aga n’Ịntanet chọta onye ha ga-alụ ma lụọ ya n’egbughị oge, e mechaa ha na ya agaghị na-ebi n’udo. E nwekwara ndị na-eme mmehie dị oké njọ mgbe ha na-akpa, nke na-eme ka ha ghara ịna-akwanyere ibe ha ùgwù. N’ihi ya, ha lụọ, e nwere ike ha agaghị na-ebi n’udo.

4 E nwere ụfọdụ Ndị Kraịst na-alụghị “n’ime Onyenwe anyị,” obi anaghịkwa adị ha mma n’ihi na onye ha lụrụ anaghị efe Jehova. (1 Kọr. 7:39) Ọ bụrụ na i mere otú ahụ, rịọ Chineke ka ọ gbaghara gị ma nyere gị aka. Jehova anaghị ewepụrụ mmadụ nsogbu ọ kpataara onwe ya, ma ọ na-enyere onye chegharịrịnụ aka idi nsogbu ya. (Ọma 130:1-4) Jiri obi gị niile na-eme ihe dị Jehova mma ugbu a, na-emekwa ya ruo mgbe ebighị ebi, ‘ọṅụ Jehova ga-abụkwa ebe gị e wusiri ike.’—Nehe. 8:10.

MGBE O YIRI KA DI NA NWUNYE HÀ GA-ETISA

5. Ọ bụrụ na di na nwunye anaghị ebi n’udo, gịnị ka ha na-ekwesịghị ịna-eche?

5 Di na nwunye na-anaghị ebi n’udo nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ò nwere ezigbo uru ọ ga-abara m ma m gbalịwa ka mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ghara itisa? A sị nnọọ na m ga-amalitekwa n’isi, lụọ onye ọzọ!’ O nwere ike ịna-agụsi ha agụụ ike ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha, ha ana-eche, sị: ‘Achọrọ m inwere onwe m! Ọ́ gaghị akara m mma ịgba alụkwaghịm? Ọ bụrụgodị na agaghị m agbali alụkwaghịm Akwụkwọ Nsọ kwadoro, ọ́ gaghị aka mma ka m hapụtụ di m ma ọ bụ nwunye m?’ Kama ichewe otú ihe gaara adị, Ndị Kraịst kwesịrị ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime ma rube isi n’iwu Chineke n’agbanyeghị nsogbu ha nwere.

6. Kọwaa ihe Jizọs kwuru na Matiu 19:9.

6 Onye Kraịst gbaa alụkwaghịm, o nwere ike ịbụ na Akwụkwọ Nsọ kwadoro ka ọ lụgharịa di ma ọ bụ nwunye. O nwekwara ike ịbụ na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ka o mee otú ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Mat. 19:9) Ịkwa iko Jizọs kwuru okwu ya bụ ma mmekọahụ mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya nwere ma ụdị mmekọahụ ndị ọzọ jọgburu onwe ha. Ọ bụrụ na Onye Kraịst nke na-akwaghị iko, nke di ya ma ọ bụ nwunye ya na-akwaghịkwa iko, na-eche echiche ịgba alụkwaghịm, o kwesịrị ichebara ya echiche nke ọma ma kpee ekpere banyere ya.

7. Gịnị ka ndị mmadụ nwere ike iche ma di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst tisaa?

7 Ọ bụrụ na di na nwunye etisaa, o nwere ike igosi na e nwere onye n’ime ha ya na Chineke na-adịghị ná mma. Pọl onyeozi jụrụ ajụjụ a dị mkpa, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla amaghị otú ọ ga-esi lekọta ezinụlọ nke ya, olee otú ọ ga-esi lekọta ọgbakọ Chineke?” (1 Tim. 3:5) N’eziokwu, di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst tisaa, ndị mmadụ nwere ike iche na ha anaghị eme ihe ha na-akụziri ndị ọzọ.—Rom 2:21-24.

8. Ọ bụrụ na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ekpebie itisa, gịnị nwere ike ịbụ nsogbu ha?

8 Ọ bụrụ na di na nwunye e mere baptizim chọrọ ịhapụ ibe ha ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ọ ga-abụrịrị na ha na Jehova adịchaghị ná mma. O nwere ike ịbụ na otu onye ma ọ bụ ha abụọ anaghị eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ọ bụrụ na ha abụọ ‘ji obi ha dum tụkwasị Jehova obi,’ ha agaghị eche na o nweghị ihe ha ga-eme ka ha ghara itisa.—Gụọ Ilu 3:5, 6.

9. Olee otú Chineke sirila gọzie Ndị Kraịst nwere ndidi mgbe ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enwe nsogbu?

9 E nwere ọtụtụ di na nwunye o yiri ka hà ga-etisasịrị, ma ha emechaa biwe n’udo. Di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst nwee nsogbu, Chineke ga-agọzi ha ma ọ bụrụ na ha ekpebie na ha agaghị ahapụ ibe ha. Chegodị ụdị ihe nwere ike ime n’ezinụlọ ebe di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Onye Kraịst. Pita onyeozi dere, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.” (1 Pita 3:1, 2) N’eziokwu, di na-abụghị Onye Kraịst nwere ike ịnata eziokwu n’ihi àgwà ọma nwunye ya! Ụdị di na nwunye ahụ na-etisaghị ga-eme ka e too Chineke. O nwekwara ike ime ka Chineke gọzie ha na ụmụ ha mụtara.

10, 11. Olee nsogbu ndị a na-atụghị anya ha di na nwunye nwere ike inwe, ma olee ihe kwesịrị imesi Onye Kraịst obi ike?

10 Ọtụtụ Ndị Kraịst kpebie ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ha na-ahọrọ Onye Kraịst ibe ha n’ihi na ha chọrọ ime ihe dị Jehova mma. Ma mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ịgbanwe otú ha na-atụghị anya ya. Mgbe ụfọdụ, isi nwere ike ọ gaghị akpakọchazi di ma ọ bụ nwunye ọnụ. Di ma ọ bụ nwunye nwekwara ike ịkwụsị ịga ozi ọma mgbe ha lụchara. Ụdị ihe ahụ mere Linda, * bụ́ nwanna nwaanyị mụrụla ụmụ nke na-anaghị eji ezinụlọ ya egwuri egwu. Ọ maghị ihe ọ ga-eme mgbe ọ hụrụ ka di ya, bụ́ onye e merela baptizim, malitere ịkpa àgwà megidere Akwụkwọ Nsọ, e mechaakwa chụọ ya n’ọgbakọ. Onye Kraịst nke di ya ma ọ bụ nwunye ya mere ụdị ihe ahụ nwere ike iche na olileanya adịkwaghị. Gịnị ka o kwesịrị ime?

11 I nwere ike ichewe, sị: ‘M̀ kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ghara itisa n’agbanyeghị ihe merenụ?’ Ọ bụghị onye ọzọ kwesịrị ikpebiri gị ụdị ihe ahụ. Ma, ọ bụrụ na o yiri ka di na nwunye hà na-aga itisa, e nwere ezigbo ihe mere a ga-eji ghọta na olileanya ka dị. Ọ bụrụ na di mmadụ ma ọ bụ nwunye mmadụ na-enye ya nsogbu, ya ana-edi ya n’ihi akọnuche ya, Chineke agaghị eji onye ahụ egwuri egwu. (Gụọ 1 Pita 2:19, 20.) Ọ bụrụ na Onye Kraịst na-agbalịsi ike ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya ghara itisa, Jehova ga-eji Okwu ya na mmụọ nsọ ya nyere ya aka.

HA DỊ NJIKERE INYE AKA

12. Olee otú ndị okenye ga-esi lee anyị anya ma ọ bụrụ na anyị agwa ha ka ha nyere anyị aka?

12 Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị ebi n’udo, unu egbula oge ịgwa Ndị Kraịst ruru eru ka ha jiri Baịbụl nyere unu aka. Ndị okenye na-azụ ndị Chineke ka atụrụ, ha ga-ejikwa obi ụtọ nye unu ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 20:28; Jems 5:14, 15) Echela na ndị okenye ga-eledazi gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị anya ma ọ bụrụ na unu agwa ha ka ha nyere unu aka dozie nnukwu nsogbu unu na-enwe. Ha ga-ahụkwu unu n’anya ma na-akwanyekwuru unu ùgwù ma ọ bụrụ na ha achọpụta na unu chọsiri ike ime ihe dị Chineke mma.

13. Olee ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 7:10-16?

13 Ọ bụrụ na nwanna nke di ya ma ọ bụ nwunye ya na-abụghị Onye Kraịst arịọ ka ndị okenye nyere ha aka, ndị okenye na-agwa ha ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl, dị ka nke a Pọl nyere. O dere, sị: “Ana m enye ndị lụrụ di na nwunye ntụziaka, ma ọ bụghị m, kama ọ bụ Onyenwe anyị, na nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya; ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya n’ezie, ya nọrọ n’alụghị di, ma ọ́ bụghị otú ahụ, ka ya na di ya kpezie; di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya. . . . N’ihi na, gị nwunye, olee otú i si mara na ị gaghị azọpụta di gị? Ma ọ bụ, gị di, olee otú i si mara na ị gaghị azọpụta nwunye gị?” (1 Kọr. 7:10-16) Mmadụ ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma o nyere di ya ma ọ bụ nwunye ya aka ịbata n’ezi ofufe!

14, 15. Olee mgbe Onye Kraịst nwere ike ikpebi ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya, ma, gịnị mere o ji dị mkpa ka o chee echiche nke ọma ma kpee ekpere banyere ya?

14 Olee ihe nwere ike ime ka nwaanyị bụ́ Onye Kraịst “hapụ” di ya? Ụfọdụ ekpebiela ịhapụ di ha n’ihi na ọ kpachaara anya jụ ilekọta ha. E nwekwara ndị hapụrụ di ha n’ihi na ọ na-eti ha ihe ma ọ bụ n’ihi na o kweghị ha fee Chineke.

15 Ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ma ọ bụ na ọ gaghị ahapụ ya. Ma, Onye Kraịst e merela baptizim kwesịrị ichebara okwu ahụ echiche nke ọma ma kpee ekpere tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ naanị onye ahụ na-ekweghị ekwe na-egbochi Onye Kraịst ahụ ife Chineke, ka Onye Kraịst ahụ ọ̀ na-eleghara ọmụmụ Baịbụl anya, na-aga ọmụmụ ihe naanị mgbe ọ masịrị ya, ma ọ bụ ghara ịna-agachi ozi ọma anya?

16. Gịnị kwesịrị ime ka Ndị Kraịst ghara ikpebi ngwa ngwa ịgba di ha ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm?

16 Anyị ejighị adịm ná mma anyị na Chineke egwuri egwu. Anyị jikwa alụmdi na nwunye, nke bụ́ onyinye si n’aka ya, kpọrọ ihe. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikpebi ngwa ngwa na anyị ga-agba alụkwaghịm. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, ihe bụ́ mkpa anyị bụ ka e doo aha ya nsọ. N’ihi ya, anyị agaghị akpawa nkata ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’ihi na anyị chọrọ ịlụ onye ọzọ.—Jere. 17:9; Mal. 2:13-16.

17. Olee mgbe e nwere ike ikwu na Chineke akpọọla Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ka ha nwee udo?

17 Onye Kraịst di ya ma ọ bụ nwunye ya bụ onye na-ekweghị ekwe kwesịrị ịgbalịsi ike ka ha ghara itisa. Ma, obi ekwesịghị ịmawa Onye Kraịst ikpe ma ọ bụrụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-ekweghị ekwe ekpebie ịhapụ ya n’agbanyeghị na yanwa mere ihe niile o nwere ike ime ka ha ghara itisa. Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe chọrọ ịpụ, ya pụwa; nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị anọghị n’agbụ n’ọnọdụ dị otú ahụ, kama Chineke akpọwo unu ka unu nwee udo.”—1 Kọr. 7:15. *

NWEE OLILEANYA N’EBE JEHOVA NỌ

18. Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ghara itisa, olee uru anyị ga-erite, ọ bụrụgodị na anyị mechara tisaa?

18 Ọ bụrụ na anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-enwe nsogbu, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị obi ike, anyị enweekwa olileanya n’ebe ọ nọ. (Gụọ Abụ Ọma 27:14.) Chegodị banyere Linda anyị kwuru banyere ya n’isiokwu a. Ya na di ya mechara gbaa alụkwaghịm n’agbanyeghị na ọ gbalịrị ọtụtụ afọ ka ha abụọ ghara itisa. Ò chere na mbọ niile ọ gbara enweghị isi? O kwuru, sị: “Mbanụ. Mbọ ahụ niile m gbara mere ka ndị mmadụ mara na m ji iwu Chineke kpọrọ ihe. Akọnuche m anaghị enye m nsogbu. Uru kachanụ bụ na afọ ndị ahụ nyeere nwa anyị nwaanyị aka ịnọsi ike n’eziokwu. Ọ malitere ịnụ ọkụ n’obi, rara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim.”

19. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ghara itisa?

19 Obi dị otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Marilyn ụtọ na ọ tụkwasịrị Chineke obi ma gbalịsie ike ka ya na di ya ghara itisa. O kwuru, sị: “Achọburu m ịhapụ di m n’ihi na ọ naghị egboro m mkpa m, ọ naghịkwa ekwe ka m fee Chineke. Ma, di m bụbu okenye ọgbakọ tupu ọ malite achụmnta ego na-adịghị mma. Ọ kwụsịrị ịgachi ọmụmụ ihe anya, anyị kwụsịkwara ịkparịta ụka. Mgbe ndị na-eyi ọha egwu kpara mkpamkpa n’obodo anyị, ụjọ tụrụ m nke ukwuu, nke mere ka m na-anọrọ onwe m. Ma, emechara m chọpụta na m so kpata nsogbu mụ na di m nwere. Anyị malitere ịkparịta ụka, na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Ndị okenye ji obiọma nyere anyị aka. Anyị malitekwara ibi n’udo. E mechara nye di m ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ. N’agbanyeghị na nsogbu ahụ wutere anyị, anyị mụtara ihe na ya.”

20, 21. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi ime banyere alụmdi na nwunye?

20 Ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na anyị alụbeghị, ka anyị na-enwe obi ike ma na-enwe olileanya n’ebe Jehova nọ. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-esere anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike kpezie, na-echeta na ndị lụrụ di na nwunye “abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu.” (Mat. 19:6) Anyị kwesịkwara icheta na ọ bụrụ na anyị ahapụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-abụghị Onye Kraịst n’agbanyeghị nsogbu anyị na-enwe, anyị nwere ike inyere ya aka ịmalite ife Jehova. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ.

21 N’agbanyeghị ihe anyị na ya na-alụ, ka anyị kpebisie ike ịna-akpa àgwà ọma nke ga-eme ka ndị na-abụghị Ndị Kraịst kwuo okwu ọma banyere eziokwu Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị, ka anyị kpesie ekpere ike, chebara ihe mere anyị ji chọọ ịhapụ ya echiche, tụgharịa uche nke ọma n’ihe anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ, gwakwa ndị okenye ọgbakọ ka ha nyere anyị aka. Karịchaa, ka anyị kpebisie ike ime ihe ga na-atọ Jehova Chineke ụtọ ma gosi na anyị ji alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye na-enweghị atụ nke si n’aka ya, kpọrọ ihe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ par. 17 Gụọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 219-221; Ụlọ Nche November 1, 1988, peeji nke 26-27; March 15, 1976, peeji nke 190.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

Onye Kraịst ga-erite uru ma ọ bụrụ na o meghị ngwa ngwa hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ya na ya na-anaghị ebi n’udo

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, rịọkwa ya ka o nye gị obi ike

[Foto dị na peeji nke 9]

Jehova na-agọzi Ndị Kraịst na-agba mbọ ka ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ebi n’udo

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọgbakọ nwere ike ịkasi di na nwunye obi ma mee ka ha na Chineke dị ná mma