Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Akwụkwọ Nkịtị?

Ọ̀ Bụ Akwụkwọ Nkịtị?

Ọ̀ Bụ Akwụkwọ Nkịtị?

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru . . . , ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.” —2 TIMOTI 3:16, 17.

ỤFỌDỤ ndị ekweghị na ihe a e kwuru banyere Baịbụl bụ eziokwu. Gịnwakwanụ? N’ime ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a, olee nke i weere na Baịbụl bụ?

• Akwụkwọ mara mma ọgụgụ

• Otu n’ime akwụkwọ ndị dị nsọ e nwere n’ụwa

• Akwụkwọ e dere akụkọ ifo ndị e ji akụziri ndị mmadụ ihe

• Okwu Chineke

Ajụjụ ọzọ bụ, Ì nwere ike ikwere ihe ọ bụla masịrị gị banyere Baịbụl? Chebagodịrị ihe a Baịbụl kwuru echiche: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Ihe Baịbụl na-ekwu ebe a bụ na e dere ya iji nye anyị ntụziaka na iji kasie anyị obi ma mee ka anyị nwee olileanya.

Ma, ọ bụrụ na Baịbụl bụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị ma ọ bụ otu n’ime akwụkwọ ndị e weere na ha dị nsọ, obi ọ̀ ga-esili gị ike na ọ ga-enye gị ntụziaka ga-abara gị na ezinụlọ gị uru, karịchaa ma ọ bụrụ na ihe e dere na ya dị iche n’ihe i weere na ọ bụ ihe ziri ezi? Ọ bụrụ na ihe ndị e dere na Baịbụl bụ akụkọ ifo, ọ̀ ga-akasili gị obi ma mee ka i nwee olileanya?

Ọtụtụ nde mmadụ amụọla Baịbụl ma kwetasie ike na ọ bụ Okwu Chineke. Gịnị mere obi ji sie ha ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke? Gịnị mere Baịbụl ji dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ? Biko, gụọ ụzọ ihe ise mere o ji dị iche. A kọwara ha n’isiokwu ndị na-esonụ.