Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kọvadel Onye Sụgharịrị Baịbụl Bekee Mbụ Zuru Ezu E Bipụtara

Kọvadel Onye Sụgharịrị Baịbụl Bekee Mbụ Zuru Ezu E Bipụtara

Kọvadel Onye Sụgharịrị Baịbụl Bekee Mbụ Zuru Ezu E Bipụtara

NA BAỊBỤL mbụ zuru ezu e bipụtara n’asụsụ Bekee, e deghị aha onye sụgharịrị ya. Ma aha onye ahụ bụ Maịlz Kọvadel, ọ bụkwa n’afọ 1535 ka e bipụtara Baịbụl ahụ. N’oge ahụ, enyi ya nwoke bụ́ Wiliam Tindel nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Baịbụl ọ sụgharịrị. E gburu Tindel n’afọ 1536.

Kọvadel si na Baịbụl Tindel sụgharịrị nweta ụfọdụ ihe o ji sụgharịa Baịbụl nke ya. Ebe ọ bụ na a nọ na-egbu ndị ọzọ na-asụgharị Baịbụl n’oge ahụ, olee otú Kọvadel si mee ka e bipụta Baịbụl ọ sụgharịrị ma a ghara igbu ya? Olee Baịbụl ndị Kọvadel mechara sụgharịa?

Otú O Si Nwee Mmasị n’Ịsụgharị Baịbụl

Ọ ga-abụ n’afọ 1488 ka a mụrụ Maịlz Kọvadel n’obodo Yọkshịa, nke dị n’Ingland. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Kembrij, e chie ya ụkọchukwu chọọchị Katọlik n’afọ 1514. Ọ bụ onye nkụzi ya, bụ́ Rọbọt Banz, mere o ji soro ná ndị na-ekwu ka chọọchị Katọlik gbanwee ihe ụfọdụ na-adịghị mma ha na-eme. Rọbọt Banz si n’Ingland gbapụ n’afọ 1528. Mgbe afọ iri na abụọ gafere, ndị isi chọọchị kpọrọ Rọbọt Banz ọkụ n’elu osisi.

N’ihe dị ka afọ 1528, Kọvadel malitere ịkụziri ndị bịara chọọchị na ihe ụfọdụ chọọchị Katọlik na-eme adịghị mma, dị ka iji ihe oyiyi efe ofufe, ime nkwupụta, na ido Mas. Ebe ọ ma na e nwere ike igbu ya, ọ gbapụrụ n’Ingland gaa ebe ọzọ nọọ ihe dị ka afọ asaa.

Mgbe Kọvadel ruru Hambọg, nke dị na Jamanị, ya na Wiliam Tindel nọrọ. Ha abụọ rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ihi na ha chọrọ ka ha sụgharịa Baịbụl ndị mmadụ ga na-agụ. N’oge ahụ, Kọvadel si n’aka Tindel mụta ọtụtụ ihe banyere otú e si asụgharị Baịbụl.

Otú Ihe Si Malite Ịgbanwe

Ka ihe ndị a na-eme, ọtụtụ ihe nọ na-agbanwe n’Ingland. N’afọ 1534, Eze Henri nke Asatọ nọ n’ihu ọha kwuo na ya agaghịzi eme ihe poopu Katọlik, bụ́ onye nọ na Rom, kwuru. Eze a chọkwara ka e bipụta Baịbụl n’asụsụ Bekee ka onye ọ bụla nwee ike ịgụ ya. O mechara bụrụ Kọvadel sụgharịrị Baịbụl onye ọ bụla ga na-agụ n’asụsụ Bekee. Kọvadel ma asụsụ Bekee nke ọma, ma ọ machaghị asụsụ Hibru na Grik otú enyi ya Tindel maara. Kọvadel degharịrị ihe na Baịbụl Tindel sụgharịrị, o leere anya na Baịbụl ndị e nwere n’asụsụ Latịn na n’asụsụ Jaman degharịa ya.

Ọ bụ n’afọ 1535 ka a nọ n’obodo ọzọ dị na Yurop bipụta Baịbụl ahụ Kọvadel sụgharịrị. Ọ bụkwa n’afọ so ya ka e gburu Tindel. Ná mbido Baịbụl ahụ, Kọvadel jara Eze Henri mma gafee ókè. Ọ gwara Henri na ya edenyeghị ihe ndị Tindel dere n’ala ala peeji Baịbụl ya. Ihe ndị ahụ Tindel denyere na Baịbụl ya na-ewe ọtụtụ ndị iwe n’ihi na ha gbara ọtụtụ ihe ndị chọọchị Katọlik na-akụzi n’anwụ bụ́ ndị na-esighị na Baịbụl. N’ihi ya, Henri kwadoro ka e bipụtawa Baịbụl ahụ. Ọ bụ otú a ka ihe si malite ịgbanwe n’Ingland.

N’afọ 1537, a nọzi n’Ingland bipụtaghachi Baịbụl ahụ ugboro abụọ ọzọ. N’afọ ahụkwa, a nọ n’obodo Antwep bipụta Baịbụl a kpọrọ Baịbụl Matiu. Otú e si nweta Baịbụl a bụ na e wetara ihe ụfọdụ Tindel sụgharịrị, wetakwa nke Kọvadel sụgharịrị, jikọta ha, ha aghọọ otu Baịbụl. Ọ bụ Eze Henri kwadoro ka e bipụta ya.

N’oge na-adịghị anya, Tọmas Cromwel, bụ́ nnukwu onye ndụmọdụ eze, nakwa Cranma, bụ́ Achịbishọp nke Kanteberi, chọpụtara na e kwesịrị idezigharị Baịbụl ahụ a kpọrọ Baịbụl Matiu. N’ihi ya, a gwara Kọvadel ka o dezigharịa Baịbụl ahụ ọzọ. N’afọ 1539, Eze Henri nyere ikike ka e bipụta Baịbụl ahụ Kọvadel dezigharịrị. N’ihi otú Baịbụl a si buo ibu, a kpọrọ ya Great Bible (ya bụ, Nnukwu Baịbụl). Henri kwuru ka e debe Baịbụl a na chọọchị dị iche iche ka ndị mmadụ gụwa ya. Obi tọrọ mmadụ niile nọ n’Ingland ụtọ mgbe ha hụrụ Baịbụl a.

Ihe Kọvadel Meere Anyị

Mgbe Eze Henri nwụrụ, Eze Edwọd nke Isii nọchiri ya, a họpụtazie Kọvadel ka ọ bụrụ bishọp nke obodo Eksita n’afọ 1551. Ma mgbe Eze Edwọd nwụrụ, Meri bụ́ onye Katọlik, malitere ịchị Ingland n’afọ 1553. Ọ bụzi mgbe ahụ ka Kọvadel gbagara Denmak. O sizi ebe ahụ kwaga Swizaland, bụ́ ebe ọ nọ sụgharịwakwa Baịbụl. O dezigharịkwara akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ. O dezigharịrị ha ugboro atọ ọzọ n’asụsụ Bekee ma bipụta ha. O denyere asụsụ Latịn na ha ka ndị ụkọchukwu jiri ha na-amụ ihe.

Otu ihe a tụrụ anya na Kọvadel ga-eme mgbe ọ na-asụgharị aha Chineke bụ na ọ ga-ede ya “Jehova,” ma o deghị ya otú ahụ, n’agbanyeghị na mgbe Tindel sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Hibru, o dere aha Chineke bụ́ “Jehova” ugboro iri abụọ. J. F. Mozley kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Coverdale and His Bibles, sị: ‘Na Baịbụl ahụ e bipụtara n’afọ 1535, Kọvadel edenyeghị aha Chineke bụ́ Jehova.’ Ma, o mechara denye aha ahụ bụ́ Jehova ugboro atọ na Baịbụl ahụ a kpọrọ Great Bible.

Ma Baịbụl ahụ Kọvadel sụgharịrị bụ Baịbụl Bekee mbụ e dere mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ndị nọchiri anya aha Chineke. E dere ya n’elu elu mbido peeji Baịbụl ahụ. Baịbụl a bụ Baịbụl mbụ a na-etinyekọtaghị akwụkwọ apọkrịfa n’akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, kama e debere akwụkwọ apọkrịfa niile n’azụ azụ Baịbụl ahụ.

E nwere ọtụtụ okwu Kọvadel dere mgbe ọ na-asụgharị Baịbụl, ndị ọzọ sụgharịrị Baịbụl mechakwara denye okwu ndị ahụ mgbe ha na-asụgharị nke ha. Otu n’ime ha bụ “ndagwurugwu onyinyo ọnwụ,” bụ́ nke dị n’Abụ Ọma isi 23, amaokwu nke 4. N’amaokwu nke 6, e nwere okwu Hibru ọ sụgharịrị n’asụsụ Bekee, nke bụ́ “ịhụnanya na-adịgide adịgide” n’asụsụ Igbo. Ọkachamara bụ́ S. L. Greenslade kwuru na okwu Hibru ahụ bụ “okwu pụrụ iche nke na-egosi otú Chineke hụruru ndị ya n’anya. Okwu a dị iche n’ịhụnanya nkịtị na ebere.” Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ala ala peeji na “obiọma” bụ “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”

Akwụkwọ bụ́ The Bibles of England kwuru na “ọ bụ mbọ niile a gbara ka e nweta Baịbụl n’asụsụ Bekee . . . malite n’ụbọchị Tindel bidoro ịsụgharị Agba Ọhụrụ gawazie mere e ji nwee ike ibipụta” Baịbụl ahụ Kọvadel sụgharịrị, bụ́ nke a kpọrọ Great Bible. Ma n’eziokwu, ọ bụ Baịbụl ahụ Kọvadel sụgharịrị mere ka ndị na-asụ asụsụ Bekee nwee ike ịgụ Baịbụl n’asụsụ ha n’oge ahụ.

[Foto dị na peeji nke 11]

N’aka ekpe: mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ nke nọchiri anya aha Chineke, e dere ya n’elu elu mbido peeji Baịbụl ahụ e bipụtara n’afọ 1537

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 10]

Foto a si n’akwụkwọ bụ́ Our English Bible: Its Translations and Translators

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 11]

Ebe e si nweta foto ndị a: The Holy Scriptures of the Olde and Newe Testamente With the Apocripha nke Maịlz Kọvadel dere