Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Emegheela Anya m

Jehova Emegheela Anya m

Jehova Emegheela Anya m

AKỤKỌ PATRICE OYEKA KỌRỌ

N’ehihie otu ụbọchị, ekpebiri m igbu onwe m n’ihi na ike ụwa agwụla m. Kemgbe m kpuru ìsì, ihe m na-eme bụ ịnọ naanị m n’ime ụlọ na-ege redio ma na-eche ụwa m. N’ụbọchị ahụ, m tinyere nsí n’ime iko mmiri m chọrọ ịṅụ ma dọwa ya na tebụl dị m n’ihu. Achọrọ m ibu ụzọ saa ahụ́ ma jikere nke ọma tupu mụ aṅụọ ya ka ihe niile bie. Gịnị mere m ji chọọ igbu onwe m? Oleekwanụ otú m si nọrọ ndụ na-akọzi ihe a n’akụkọ?

A MỤRỤ M n’abalị abụọ n’ọnwa Febụwarị n’afọ 1958, n’obodo Kasaị Oriental, nke dị na Kongo Kinshasa. Papa m nwụrụ mgbe m dị afọ itoolu. Ọ bụzi nwanne m nwoke nke tọrọ m zụrụ m.

Mgbe m gụchara akwụkwọ, m nwetara ọrụ n’ọdọ rọba. Otu ụbọchị n’afọ 1989, mgbe m nọ n’ọfịs na-ede ihe, ebe niile gbara m itiri ozugbo. Ihe m chere mgbe ahụ bụ na ọkụ anyụọla, ma m ka na-anụ ụda ígwè na-enye ọkụ ka ọ na-asụ, ọ ka bụkwa ụtụtụ. Ụjọ tụrụ m n’ihi na o nweghịzi ihe m na-ahụ, anaghịdị m ahụ akwụkwọ ahụ m ji na-ede ihe.

M kpọrọ otu n’ime ndị ọrụ anyị ka ọ kpọga m n’ebe ndị ọrụ anyị na-anara ọgwụ. Dọkịta na-enye anyị ọgwụ n’ebe ahụ kwuru ka a kpọga m ná nnukwu obodo na nke dọkịta ma nke a na-akọ. Ma mgbe dọkịta ahụ na-enye anyị ọgwụ chọpụtaziri na e nwere ezigbo ihe mebiri n’anya m nakwa na ọ bụghị ihe ya ga-agwọli, o zigara m Kinshasa bụ́ isi obodo mba anyị.

Otú Ihe Si Gaa na Kinshasa

Na Kinshasa, agara m na nke ọtụtụ ndị dọkịta anya, ma o nweghị onye gwọrọ m. Mgbe m nọrọ abalị iri anọ na atọ n’ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta kwuru na agaghịzi m ahụ ụzọ ọzọ! Ndị ezinụlọ anyị kpọ m gaa chọọchị dị iche iche ka a mara ma à ga-agwọ m, ma ihe niile ha mere enweghị isi.

Ọ bịara doo m anya na aghọọla m onye ìsì. Ike ụwa gwụziri m. Ekpuola m ìsì, enweghịzi m ọrụ, nwunye m akwakọrọla ihe niile anyị nwere n’ụlọ gbaa ọsọ. Ihere anaghị ekwe m pụta ebe ndị mmadụ nọ. Ebidoro m ịgbara ndị mmadụ ọsọ, na-anọ naanị m n’ime ụlọ, ọ na-adịkwa m ka o nweghị uru m bara ná ndụ.

Anwara m ugboro abụọ igbu onwe m. Ihe ahụ m kọrọ ná mmalite isiokwu a bụ nke ugboro abụọ m chọrọ igbu onwe m. Otu nwatakịrị n’ezinụlọ anyị zọrọ m n’ụbọchị ahụ. Mgbe m nọ na-asa ahụ́, ọ bịara buru iko ahụ m tinyere nsí gaa wụfuo n’amaghị ama. Ekele dịrị Chineke na ọ ṅụghị ihe dị n’iko ahụ. Mgbe m sachaziri ahụ́ pụta, m chọrọ iko ahụ elu chọọ ya ala, ma ahụghị m ya. Ọ bụzi mgbe ahụ ka m gwara ndị ezinụlọ anyị ihe mere m ji achọ iko ahụ.

M na-ekele Chineke, na-ekelekwa ndị ezinụlọ anyị na ha ekweghị ka m gbuo onwe m.

Otú M Si Malitekwa Inwe Obi Ụtọ ná Ndụ

Otu ụbọchị Sọnde n’afọ 1992, ka m nọ n’ụlọ na-aṅụ sịga, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ m mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ha chọpụtara na m kpuru ìsì, ha gụụrụ m Aịzaya 35:5, bụ́ ebe sịrị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri.” Ebe ahụ ha gụụrụ m tọrọ m ezigbo ụtọ. Na chọọchị ndị m gara, ha gwara m na ha ga-eme ka m hụwa ụzọ, ma Ndịàmà Jehova ekwughị na ha ga-eme ka m hụwa ụzọ. Kama, ha kụziiri m na ọ bụ n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa ka m ga-ebidokwa ịhụ ụzọ, ma ọ bụrụ na m mata onye Chineke bụ. (Jọn 17:3) Mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl ozugbo. Akwụkwọ ha ji akụziri m Baịbụl bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. M malitekwara ịga ọmụmụ ihe niile Ndịàmà Jehova na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, gbanweekwa ihe ụfọdụ ná ndụ m, kwụsịkwa ịṅụ sịga.

Ìsì ahụ m kpuru mere ka o siere m ike ịmụta Okwu Chineke ngwa ngwa. M gara ụlọ akwụkwọ ndị ìsì ka m mụta otú e si agụ na otú e si ede ihe ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Nke a mere ka m malite iso na-eme ihe omume ndị a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Ọ dịghị anya mụ amalite ikwusara ndị agbata obi m ozi ọma. Ndụ malitekwara ịtọ m ụtọ. M nọgidere na-eme nke ọma n’ofufe Chineke ma mechaa nyefee Jehova onwe m. E mere m baptizim n’abalị asaa n’ọnwa Mee n’afọ 1994.

Ka m nọ na-ahụkwu Jehova na ndị mmadụ n’anya, ọ gụwara m agụụ ịmalite ikwusa ozi ọma oge niile. Amalitere m ikwusa ozi ọma oge niile na Disemba 1, 1995. Kemgbe Febụwarị afọ 2004, abụ m okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Mgbe ụfọdụ, m na-aga n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ jiri Baịbụl gwa ọhaneze okwu. Ihe ndị a niile na-eme ka obi na-atọ m ezigbo ụtọ, o meekwala ka m ghọta na o nweghị nsogbu ga-egbochi mmadụ ijere Jehova Chineke ozi ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ.

Jehova Enyela M “Anya”

Dị ka m kwuru ná mbụ, nwunye m hapụrụ m gbaa ọsọ n’ihi na m kpuru ìsì. Ma, Jehova agọzikwuola m. M nwere ike ikwu na o nyela m anya m ji ahụ ụzọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anny Mavambu kwetara ka m lụọ ya, ọ ghọọkwarala m anya. Mụ na ya na-eso aga ozi ọma n’ihi na ọ bụ onye na-ekwusa ozi ọma oge niile. Ọ bụkwa ya na-agụpụtara m ebe e dere ihe m ga-ekwu mgbe ọ bụla m nwere ihe omume n’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ka m nwee ike dee ya ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Chineke ji nwunye m gọzie m. Ihe niile ọ na-emere m mere ka m kweta na ihe e kwuru n’Ilu 19:14 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Ihe nketa nke na-esi n’aka nna bụ ụlọ na akụ̀, ma nwaanyị nke nwere uche na-esi n’aka Jehova.”

Jehova jikwa ụmụ abụọ, ya bụ, otu nwoke na otu nwaanyị, gọzie mụ na nwunye m. M na-atụ anya ịhụ otú ihu ha dị mgbe m ga-ahụwa ụzọ na paradaịs. Ihe ọzọ Chineke meere m bụ na nwanne m nwoke nke tọrọ m, bụ́ onye nyere m ebe m bi, aghọọkwala Onyeàmà Jehova e mere baptizim. Anyị niile nọ n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova.

N’agbanyeghị na m kpuru ìsì, ọ na-agụ m agụụ ka m jekwuoro Chineke ozi n’ihi na o meerela m ọtụtụ ihe ọma. (Malakaị 3:10) Kwa ụbọchị, m na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa wepụ ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata n’ụwa. Kemgbe m matara Jehova, ahụla m n’eziokwu na “ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”—Ilu 10:22.

[Foro ndị dị na peeji nke 13]

Ebe m na-agwa ọhaneze okwu Baịbụl; mụ na nwanne m nwoke na ndị ezinụlọ m