Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Mkpụrụ Obi Gị Ga-ehulata n’Ebe M Nọ’

‘Mkpụrụ Obi Gị Ga-ehulata n’Ebe M Nọ’

Bịaruo Chineke Nso

‘Mkpụrụ Obi Gị Ga-ehulata n’Ebe M Nọ’

MMADỤ ịdị umeala n’obi amaka. Anyị hụ onye dị umeala n’obi, ọ na-amasị anyị ka anyị na onye ahụ na-akpa. Ma ọ dị mwute na ọtụtụ ndị n’ụwa taa adịghị umeala n’obi, karịchaa, ndị isi ma ọ bụ ndị nọ n’ọkwá dị elu. Oleekwanụ maka Jehova Chineke, bụ́ Onye na-enweghị onye ya na ya hà, ma n’eluigwe ma n’ụwa? Ọ̀ dị umeala n’obi? Ka anyị hụ ihe Jeremaya onye amụma kwuru n’Abụ Ákwá 3:20, 21.—Gụọ.

Jeremaya dere Abụ Ákwá n’oge ụmụ Izrel nọ n’ahụhụ. O dere akwụkwọ a obere oge ndị Babịlọn bibichara Jeruselem bụ́ obodo ya. Mbibi a e bibiri obodo ya wutekwara ya nke ukwuu. Onye amụma ahụ ma na ihe mere Chineke ji kwe ka e bibie obodo ụmụ Izrel bụ mmehie ha. Ma Jeremaya ò chere na olileanya adịghịzi? Ò chere na Jehova nọ ebe dị anya ma ọ bụ na ọ gbakụtala ha azụ nke na ọ naghị ahụ ndị chegharịrịnụ ka o nyere ha aka? Ka anyị hụ ihe Jeremaya kwuru. O kwuru ya ka à ga-asị na ọ na-ekwuchite ọnụ ndị obodo ya.

N’agbanyeghị na ha nọ ná mwute, obi siri Jeremaya ike na Jehova ga-enyere ha aka. O besaara Jehova ákwá, sị: “Mkpụrụ obi gị * [ya bụ, Jehova] aghaghị icheta m wee hulata n’ebe m nọ.” (Amaokwu nke 20) Jeremaya enweghị obi abụọ. Ọ maara na Jehova agaghị echefu ya ma ọ bụ onye Izrel ọ bụla chegharịrịnụ. Ma, gịnị ka Chineke onye pụrụ ime ihe niile ga-eme?—Mkpughe 15:3.

O doro Jeremaya anya na Jehova ‘ga-ehulata’ n’ebe ndị ya ji obi ha niile chegharịa nọ. Okwu ndị a na-eme ka anyị ghọta na Jehova dị obiọma. Ihe ọ pụtara bụ na Jehova, “Onye Kasị Elu n’ụwa niile,” ga-ehulata ma si n’ọnọdụ ọjọọ ndị na-efe ya nọ kulite ha, meekwa ka ya na ha dịghachi ná mma. (Abụ Ọma 83:18) Olileanya Jeremaya nwere kasiri ya obi. N’ihi ya, onye amụma a kpebisiri ike ịtachi obi ma chere Jehova ruo mgbe Jehova ga-anapụta ndị Ya chegharịrị echegharị.—Amaokwu nke 21.

E nwere ụzọ ihe abụọ ihe ahụ Jeremaya dere na-akụziri anyị banyere Jehova. Nke mbụ bụ na Jehova dị umeala n’obi. (Abụ Ọma 18:35) N’agbanyeghị na ‘ike Jehova dị ukwuu,’ ọ na-ewetu onwe ya ala ka o nyere anyị aka mgbe anyị nọ ná mwute. (Job 37:23; Abụ Ọma 113:5-7) Ọ̀ bụ na nke a anaghị eme gị obi ụtọ? Ihe nke abụọ ọ na-akụziri anyị bụ na Jehova na-eme ebere; ọ ‘dịkwa njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ mmehie’ ha ma nabata ha ka ha na ya dịghachi ná mma. (Abụ Ọma 86:5) Àgwà abụọ a, ya bụ, ịdị umeala n’obi na ebere, na-agakọ.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova adịghị ka ndị ọchịchị, bụ́ ndị mpako na-anaghị ekwe ka ihe banyere ndị ọzọ metụ ha n’obi. Ị́ gaghị achọ ịmụtakwu banyere Chineke anyị bụ́ onye dị umeala n’obi, onye dị njikere ‘ihulata’ ka o wee kulite ndị na-efe ya, bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ, ma mee ka ha nwee olileanya?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Jun:

Jeremaya 51-52Ezikiel 1-5

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 N’oge ochie, ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị depụtaghachiri Baịbụl, gbanwere ihe n’amaokwu a ma dee ya “mkpụrụ obi m,” ka à ga-asị na Jeremaya na-ekwu maka onwe ya. Ọ ga-abụ na ha chere na ịkpọ Chineke mkpụrụ obi bụ ịkparị ya akparị ebe ọ bụ na ọ bụ ụmụ mmadụ na anụmanụ ka Baịbụl na-akpọ mkpụrụ obi. Ma n’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e ji okwu ndị ga-enyere ụmụ mmadụ aka ịghọta onye Chineke bụ kọwaa Chineke. Ebe ọ bụ na okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtakwara “ndụ” anyị, “mkpụrụ obi gị” pụtara “gịnwa.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Jehova na-ewetu onwe ya ala ka o nyere anyị aka mgbe anyị nọ ná mwute