Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ekwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ekwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Ji Ekwusa Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ?

▪ Na Baịbụl, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: ‘Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-ezi ha ihe.’ (Matiu 28:19, 20) Ọ̀ bụ Ndị Kraịst niile ka Jizọs nyere iwu a? Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs ghọtara na ọ bụ Ndị Kraịst niile ka e nyere iwu a. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi kwuru, sị: “[Jizọs] nyekwara anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma.” (Ọrụ 10:42) Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ọ bụ mkpa nke dịịrị m. N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na ezisaghị m ozi ọma!”—1 Ndị Kọrịnt 9:16.

Ọ bụghị naanị Pọl na Pita mere ihe ahụ Jizọs kwuru, ndị niile bụ́ Ndị Kraịst n’oge gboo mekwara otú ahụ. Ihe e ji mara ha bụ ikwusa ozi ọma. (Ọrụ 5:28-32, 41, 42) Ndịàmà Jehova taa na-agbalịkwa ike ha niile ime ihe ahụ Jizọs kwuru. Ha na-ekwusa ozi ọma nke “alaeze eluigwe” otú ahụ Jizọs mere.—Matiu 10:7.

Ole ndị ka e kwesịrị ikwusara ozi ọma Alaeze ahụ? Jizọs kwuru na ndị a ga-ekwusara ya bụ ndị bi n’ebe niile n’ụwa. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Unu ga-abụ ndị àmà m ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:8) Jizọs kwudịrị na tupu Chineke ebibie ndị ajọ omume, ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’ (Matiu 24:14) Ọ bụ ya mere Ndị Kraịst oge gboo ji gbaa mbọ kwusaara mmadụ niile ozi ọma, ọ bụghị naanị ndị ha maara ma ọ bụ ndị na-enweghị okpukpe ha na-ekpe. (Ndị Kọlọsi 1:23; 1 Timoti 2:3, 4) Taa, Ndịàmà Jehova na-agbakwa mbọ ka ha kwusaara mmadụ niile ozi ọma. *

Olee otú kacha mma isi kwusaara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke? Jizọs maara otú e nwere ike isi nweta ọtụtụ ndị a ga-ekwusara ozi ọma, ọ bụ ya mere o ji zipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa n’obodo ukwu, n’obodo nta, nakwa n’ụlọ ndị mmadụ. (Matiu 10:7, 11, 12) Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya nọgidere na-ekwusa ozi ọma “site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” (Ọrụ 5:42) Ha kwusakwaara ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha hụrụ ha, ha gakwara n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị otú ahụ Jizọs mere. (Jọn 4:7-26; 18:20; Ọrụ 17:17) Taa, Ndịàmà Jehova sikwa otú ahụ ekwusara ndị mmadụ ozi ọma.

Jizọs kwuru na ọ bụghị mmadụ niile ga-ege ntị n’ozi ọma. (Matiu 10:14; 24:37-39) Nke a ò kwesịrị ime ka Ndị Kraịst kwụsị ikwusa ozi ọma? Legodị ihe atụ a: Ọ bụrụ na i so ná ndị gara ịzọpụta ndị mmadụ n’ebe e nwere ala ọma jijiji, ị̀ ga-akwụsị ịchọ ndị mmadụ maka na ọ bụ mmadụ ole na ole ka unu na-ahụzi? Mba. Ị gaghị akwụsị ịchọ ruo mgbe o doro gị anya na o nwekwaghị onye fọrọnụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma ọ bụrụhaala na a ka nwere ndị ga-ege ha ntị. (Matiu 10:23; 1 Timoti 4:16) Mgbe Ndịàmà Jehova na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-achọ ndị ga-ege ntị, ha na-egosi na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya n’ihi na ha maara na ọ bụrụ na ndị mmadụ egee ntị n’ozi ọma ma mee ihe ha mụtara, ha ga-enweta ndụ.—Matiu 22:37-39; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:8.

Magazin a ị na-agụ na-ekwu banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na o nwere ihe ndị ọzọ ị chọrọ ịmatakwu, biko jụọ ya Onyeàmà Jehova ọzọ bịara na nke gị, ma ọ bụ gị edetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ozi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ugbu a na narị mba abụọ na iri atọ na isii. N’afọ gara aga, ha ji otu ijeri awa na narị nde awa asaa kwusaara ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile. Ha kụzikwaara nde mmadụ asatọ na narị puku mmadụ ise Baịbụl.