Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezumike Kacha Ụtọ M Gatụrụla!

Ezumike Kacha Ụtọ M Gatụrụla!

Akwụkwọ Ozi Si Ayaland

Ezumike Kacha Ụtọ M Gatụrụla!

OTU ụbọchị, ndị mụrụ m gwara m, sị: “Ọ ga-adị mma ka i metụ ihe ọzọ ga-eme ka i wepụtụ obi gị n’ule a ị chọrọ ile. Ka anyị gaa leta ụmụnne anyị bi n’Ayaland ka anyị soro ha gaa ozi ọma n’ebe ndị a na-anaghị ezikarị ozi ọma.”

Mgbe ha kwuru ihe a, achọghị m ịga. Ihe kpatara ya bụ na m na-akwadebe ile ule, ihe ọzọ abụrụ na obi na-amapụ m ịga n’ihi na esitụbeghị m Ingland gaa ebe ọzọ, ma ya fọdụzie ịba ụgbọelu. M kwuru n’obi m, sị, Olee otú mụnwa bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa, onye bi na Lọndọn bụ́ obodo na-ekwo ekwo, ga-esi gaa nọọ n’otu ime ime obodo dị n’Ayaland?

O nweghịdị uru ọ bara na m nọ na-echegbu onwe m n’ihi na ozugbo ụgbọelu anyị rutere Ayaland, ihe niile m hụrụ masịrị m. Ma, ebe ọ bụ na chi abọchabeghị mgbe anyị hapụrụ Ingland, ụra buuru m ozugbo anyị banyere ụgbọala ga-eburu anyị ebe anyị na-aga. Etetara m ugboro ugboro legharịa anya hụ na obodo a mara mma.

Mgbe chi jiwere, anyị rutere n’obodo a na-akpọ Skiberin bụ́ ebe anyị na otu ezinụlọ nọrịrị n’abalị ahụ. Ezinụlọ a kwatara n’Ayaland ka ha nye aka kwusaara ndị mmadụ ozi ọma. Anyị na ndị ezinụlọ ahụ gwuriri egwuregwu tọrọ anyị niile ụtọ. N’egwuregwu ahụ, otu onye na-ewere otu kaadị e dere aha onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Ihe onye ahụ weere kaadị ahụ na-emezi bụ imewe ka onye ahụ e dere aha ya na kaadị ahụ. Ndị na-ekiri ya ekwuzie onye ọ na-eme ka ya.

N’echi ya, mụ na ndị mụrụ m, nwanne m nwoke, ụmụnne anyị ahụ, na otu ezinụlọ ọzọ so banye ụgbọ epeepe bugara anyị n’otu obere obodo mmiri gbara gburugburu. Ndị bi n’ebe ahụ erughị mmadụ iri atọ. N’eziokwu, Jizọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma n’ebe niile ndị mmadụ bi n’ụwa. Ọ bụ ya mere anyị ji bịa n’obodo a mara ezigbo mma ka anyị zie ndị bi na ya ozi ọma. Ha nabatakwara anyị nke ọma.

N’ụbọchị ahụ, ihu eluigwe gbachapụrụ agbachapụ. Ebe niile na-esi ísì ọma n’ihi ahịhịa na okooko osisi mara mma ndị dị n’ebe ahụ. E nwere ebe dị apịtị apịtị n’ebe ahụ, ma okooko osisi ndị na-akwụ n’ala kpuchiri ebe ahụ ma chọọ ya mma. N’akụkụ nnukwu mmiri dị n’ebe ahụ, e nwere ọtụtụ nnukwu nkume ebe nnụnụ dị iche iche kpara akwụ ma nọrọ na-elekọta ụmụ ha. Ọ bụrụ na mmadụ elepụ anya, ọ ga-ahụ ụmụ obere ala ndị dị n’osimiri ahụ, ma ndị mmadụ ebighị n’ọtụtụ n’ime ha. Ihe a niile anyị hụrụ mere ka anyị jaa Jehova mma maka ihe ndị o kere!

Emetere m ọtụtụ ndị enyi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Skiberin, meekwa ụfọdụ ihe ndị m na-emetụbeghị. Otu ihe m mere kacha tọọ m ụtọ bụ ịkwọ ụgbọ epeepe. O nweghị ihe dị ka ịnọ n’ụgbọ epeepe kirie ụsọ oké osimiri ahụ dị n’Ayaland! Mgbe anyị gara igbute azụ̀ anyị ga-eji mere nri abalị, anụ sil ndị dị na mmiri ahụ bịara na-akpụrụ azụ̀ ndị anyị chọrọ igbu. Anyị gwuru ọtụtụ egwuregwu a na-egwu n’akụkụ mmiri, agbalịdịrị m ịgba egwú ndị Ayaland.

Anyị matakwuru ihe ụfọdụ banyere obodo Skiberin. N’ihe dị ka afọ 1845 ruo afọ 1850, poteto a kọrọ ná mba Ayaland emeghị nke ọma. Ọ bụ Skiberin na obodo ndị ọzọ nọ ya gburugburu ka nsogbu a kacha kpaa aka ọjọọ. Agụụ gburu ọtụtụ puku mmadụ, e likwara ihe dị ka puku mmadụ itoolu n’otu ili. Ihe kasiri anyị obi n’akụkọ a bụ na anyị maara na Alaeze Chineke ga-abịa n’oge na-adịghị anya, nakwa na ụnwụ nri agaghị adịzi, ndị nwụrụ n’ihi ụnwụ nri ahụ ga-esikwa n’ọnwụ bilie ma biri n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.

Anyị na Ndịàmà Jehova bi ebe ahụ so gaa ozi ọma n’ebe ha na-anaghị agakarị ozi ọma. Anyị ji ụgbọala garuo n’ụlọ ndị dị n’elu elu otu ugwu. Mmadụ nọrọ n’ugwu ahụ, ọ ga na-ahụ Osimiri Ayaland. Ndị anyị hụrụ ebe ahụ nabatakwara anyị nke ọma. Dị ka anyị mere n’ebe ndị ọzọ anyị gara ozi ọma, anyị bu ụzọ gwa ha na anyị bịara ezumike n’Ayaland, ma anyị ji ohere a bịa ịkọrọ ha ihe ụfọdụ na-akasi obi e kwuru na Baịbụl.

E nwere otu nwaanyị mama m ziri ozi ọma, ya anarakwa ya magazin anyị bụ́ Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ụbọchị ole na ole gafere, anyị hụrụ nwaanyị ahụ ọzọ, ya ekwuo na ya agụọla magazin ndị ahụ nakwa na ha tọrọ ya ụtọ.

Nwaanyị ahụ gwara anyị, sị: “Biko, bịanụ oge ọzọ ka mụ na unu kparịta, wetakwaranụ m magazin ndị ọzọ.” Anyị gwara ya na anyị achọwala ịlaghachi ebe anyị si bịa, ma na anyị ga-agwa Onyeàmà Jehova ọzọ ka ọ bịa na nke ya.

Ihe nwaanyị ahụ gwaziri mama m bụ: “Nsogbu adịghị, mgbe ọzọ ị bịara Ayaland, ahapụkwala ịbịa na nke m. M ga-anabata gị mgbe ọ bụla ị bịara.”

N’ụbọchị ikpeazụ anyị nọrọ n’obodo ahụ, anyị na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ebe ahụ gara nọrịa n’akụkụ osimiri. Anyị tụtụkọtara osisi ndị mmiri butere, bukọta nnukwu okwute mete ekwú anyị ji mịa azụ̀ ndị mmiri bupụtara n’ụsọ osimiri ahụ. N’agbanyeghị na m bi n’obodo mepere emepe, ebe ahụ anyị gara tọrọ m ezigbo ụtọ!

A jụọ m ihe m chere banyere otu izu ahụ m nọrọ n’Ayaland, m ga-asị na ọ bụ ezumike kacha ụtọ m gatụrụla! Ọ bụghị naanị na ihe niile anyị mere n’ebe ahụ tọrọ m ụtọ, ihe kacha m ụtọ bụ na m ji oge ahụ mee ihe dị Jehova mma ma wetara ya otuto. Ijere Jehova ozi na-atọ m ụtọ, ọ na-akacha atọ ụtọ ma ọ bụrụ na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị bụ ndị ijere Jehova ozi na-atọkwa ụtọ. Mgbe anyị lọtara, m kelere Jehova na o nyere m ọtụtụ ndị enyi hụrụ m n’anya ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ekelekwara m ya maka ebe a m gara nke m na-agaghị echefu echefu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 25]

An Post, Ireland