Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere ndị Juu ji achọ ịma agbụrụ ha si?

Ndị Juu na-esi n’akwụkwọ ndị e dere aha na ezinụlọ ndị Juu amata agbụrụ onye Juu nke ọ bụla si. A na-esikwa n’akwụkwọ ndị ahụ amata ndị nwe ala nke ha nwe ma ọ bụ ndị ketara ala ha ketara. Nke kacha ha mkpa bụ ịmata ezinụlọ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ga-esi. Ndị Juu maara na onye ga-abụ Mesaya ahụ ga-esi n’ezinụlọ Devid nakwa n’ebo Juda.—Jọn 7:42.

Otu ọkà mmụta nke aha ya bụ Joachim Jeremias kwuru na ‘ebe ọ bụ naanị ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà na ndị Livaị na-abụ ndị nchụàjà ma ọ bụ ndị Livaị, ndị Juu na-agbalịsi ike ka a ghara inwe onye si n’ezinụlọ ọzọ nke ga-abịa kwuo na ya si n’ezinụlọ ndị ahụ.’ Tupu nwaanyị Izrel ọ bụla alụọ onye nchụàjà, ọ ga-egosirịrị na ya si n’ezinụlọ ndị nchụàjà. Nke a ga-eme ka a ghara ‘inwe nwaanyị a ga-esi n’ezinụlọ ọzọ lụbata n’ezinụlọ ndị nchụàjà.’ N’oge Nehemaya, e nwere ezinụlọ ndị Livaị ndị a gụpụrụ n’ọrụ nchụàjà n’ihi na ha “chọrọ akwụkwọ e debara aha ha, iji gosi usoro ọmụmụ ha n’ihu ọha, ma ha ahụghị ya.”—Nehemaya 7:61-65.

Ihe ọzọ bụ na Iwu Mozis kwuru na “nwa ọ bụla a kwatara n’iko” na “onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ọ bụla agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.” (Diuterọnọmi 23:2, 3) Joachim Jeremias kwukwara na ọ bụ ihe a Iwu Mozis kwuru mere ‘nwoke Izrel ọ bụla ji egosirịrị ezinụlọ o si tupu ya enweta ihe ndị ruuru ya n’obodo, nke a mekwara ka o dokwuo anyị anya na onye Izrel ọ bụla ma ndị bụ́ ndị nna nna ya, marakwa ebo o si n’ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel.’

Olee otú ndị Juu si edeba aha ha n’akwụkwọ, oleekwa otú ha si edebe akwụkwọ ndị ahụ ka ihe ọ bụla ghara ime ha?

Matiu na Luk dere aha ndị bụ́ ndị nna nna Jizọs, malite ná mbido ruo n’isi. (Matiu 1:1-16; Luk 3:23-38) E nwekwara akwụkwọ ndị ọzọ e dere aha ndị si n’ezinụlọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ ndị Juu kwuru banyere Hilel, bụ́ onye rabaị nke dịrị ndụ n’oge Jizọs, sị: “E nwere akwụkwọ mpịakọta a hụrụ na Jeruselem nke kwuru na Hilel si n’ezinụlọ Devid.” Otu onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Fleviọs Josifọs, kwuru n’otu akwụkwọ ya na ndị nna nna ya bụ ndị nchụàjà nakwa na nne ya si “n’ezinụlọ ndị eze.” O kwuru na ya hụrụ ‘ebe e dere nke a n’akwụkwọ ebe a na-edeba aha ndị Juu.’

A bịa n’otú e si edebe akwụkwọ e dere aha ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà ka ihe ọ bụla ghara ime ya, Josifọs kwuru n’akwụkwọ ya ọzọ na ọ bụ ‘ndị ikom a tụkwasịrị obi ka ndị Izrel na-enye akwụkwọ ahụ ka ha jide.’ Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia kwuru, sị: “O yiri ka è nwere onye a na-enye akwụkwọ ndị ahụ ka o jide, e kwukwara na e nwere ndị nọ na Jeruselem a họpụtara ka ha na-aza ajụjụ ọ bụla ndị mmadụ nwere ịjụ banyere ezinụlọ ha si.” Ndị na-abụghị ndị nchụàjà na-aga n’obodo nna ha edeba aha ha n’akwụkwọ. (Luk 2:1-5) Ọ ga-abụ n’akwụkwọ ndị ahụ ndị Juu na-edeba aha ha ka Matiu na Luk si nweta aha ndị ezinụlọ ndị ahụ ha dere. O yikwara ka ezinụlọ ọ bụla ọ̀ na-edebe akwụkwọ ebe ha dere aha ndị niile a mụrụ n’ezinụlọ ha.