Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Bara Uru Anyị Mụtara n’Ozi Dị Nsọ Anyị Jere

Ihe Bara Uru Anyị Mụtara n’Ozi Dị Nsọ Anyị Jere

Akụkọ Ndụ

Ihe Bara Uru Anyị Mụtara n’Ozi Dị Nsọ Anyị Jere

AKỤKỌ OLIVIER RANDRIAMORA KỌRỌ

“Amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị ụkọ, amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị n’ụba. N’ihe niile nakwa n’ọnọdụ niile, amụtawo m ma otú e si eriju afọ ma otú e si anọ agụụ . . . N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Fil. 4:12, 13.

Ọ DỊLA anya okwu ndị a Pọl onyeozi kwuru gbawara mụ na nwunye m, bụ́ Oly, ume. Dị ka Pọl, anyị amụtala ịtụkwasị Jehova obi anyị niile ka anyị na-ejere ya ozi na Madagaska ebe a.

Mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ mama Oly Baịbụl n’afọ 1982, mụ na Oly ekwela ibe anyị nkwa na anyị ga-alụ. Emechara m malite ịmụ Baịbụl, Oly mechakwara soro mụwa Baịbụl. Anyị lụrụ n’afọ 1983, e mee anyị baptizim n’afọ 1985, anyị amalitekwa ịsụ ụzọ inyeaka ozugbo. N’ọnwa Julaị 1986, anyị ghọrọ ndị ọsụ ụzọ oge niile.

N’ọnwa Septemba afọ 1987, anyị ghọrọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ebe mbụ e kenyere anyị ọrụ bụ n’otu obere obodo na-enweghị ọgbakọ, nke dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Madagaska. Na Madagaska, e nwere agbụrụ iri na asatọ a ma ama na ọtụtụ ọnụmara, nweekwa omenala dị iche iche. Asụsụ obodo a bụ Malagasi, ma e nwekwara olumba ndị ọzọ ha na-asụ. N’ihi ya, anyị malitere ịmụ olumba nke a na-asụ n’obodo ebe anyị na-eje ozi. Nke a mere ka ndị obodo ahụ nabata anyị ngwa ngwa.

Ná mmalite, m na-ekwu okwu ihu ọha ụbọchị Sọnde ọ bụla, m kwuchaa, Oly akụọrọ m aka. Ọ bụ naanị anyị abụọ na-abịa ọmụmụ ihe. Anyị na-emekwa ihe omume niile a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Oly na-eme ka ò nwere onye ọ na-agwa okwu. N’ihi ya, obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe onye nlekọta sekit tụụrụ anyị aro ka anyị ghara ịna-emecha ihe omume niile!

Ebe ọ bụ na ndị na-ebute akwụkwọ ozi anaghị abịa mgbe niile, ọ bụghị n’ọnwa niile ka anyị na-enweta ego mmachi akpa anyị. N’ihi ya, anyị mụtara otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị ụkọ. O nwere mgbe anyị na-enweghị ego anyị ga-eji gbara ụgbọ gaa mgbakọ sekit a ga-eme n’ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri atọ site n’ebe anyị bi. Anyị chetara ọmarịcha ndụmọdụ nke otu nwanna nyere anyị, nke bụ́, “Gwanụ Jehova mkpa unu. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ya ka unu na-arụrụ ọrụ.” N’ihi ya, anyị kpere ekpere ma kpebie iji ụkwụ gawa. Ma mgbe anyị na-akwado ịpụ, otu nwanna bịara na nke anyị ma nye anyị ego. Ego ahụ o nyere anyị bụ ego ole anyị ga-eji gbara ụgbọ gaa!

ỌRỤ SEKIT

Na Febụwarị 1991, e mere m onye nlekọta sekit. N’oge ahụ, anyị eruola ndị nkwusa itoolu, e meekwala mmadụ atọ n’ime anyị baptizim. Ọtụtụ mgbe, ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị na-adị ihe dị ka mmadụ iri ise. Mgbe a zụchara m n’ọrụ sekit, anyị letara sekit dị n’isi obodo Madagaska, bụ́ Antananarivo. N’afọ 1993, e kenyere anyị ileta sekit ọzọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ mba ahụ. Otú ihe dị n’ebe ahụ dị nnọọ iche n’otú ihe dị n’obodo mepere emepe.

Anyị na-eji ụkwụ aga ihe dị ka otu narị kilomita na iri anọ na ise n’ime oké ọhịa, rịakwa ugwu iji ruo ọgbakọ ndị anyị chọrọ ileta. Anyị anaghị ebu ọtụtụ ihe. Ma mgbe ọ bụla e kwesịrị igosi ihe nkiri slaịd n’okwu ihu ọha onye nlekọta sekit ga-ekwu, dị ka a na-eme mgbe ụfọdụ n’oge ahụ, anyị na-ebu ihe ndị dị arọ. Oly na-ebu ihe e ji egosi ihe nkiri slaịd, mụnwa agbụgbara batrị ụgbọala.

Anyị chọọ ịga leta ọgbakọ ọzọ, anyị na-eji ụkwụ aga ihe dị ka iri kilomita anọ n’ụbọchị. O nweghị ụdị ebe anyị na-anaghị eji ụkwụ agafe, ma ugwu ma osimiri ma ebe apịtị juru. Mgbe ụfọdụ, anyị na-arahụ n’akụkụ ụzọ, ma anyị na-agbalịkarị inweta obodo ebe anyị ga-arahụ n’abalị. E nwekwara mgbe anyị na-arịọ ndị anyị na-amaghị ka anyị rahụ n’ụlọ ha. Anyị chọta ebe anyị ga-arahụ, anyị na-amalite isi ihe anyị ga-eri. Oly na-arịọta ite, jiri ya gaa chute mmiri n’iyi kacha nso. Mụnwa na-arịọta anyụike ma jiri ya waa nkụ anyị ga-eji sie nri. Ihe a niile na-ewe oge. Ụbọchị ụfọdụ, anyị na-azụta ọkụkọ, gbuo ya ma tụchaa ya.

Anyị richaa nri, anyị na-aga echute mmiri anyị ga-eji saa ahụ́. Oge ụfọdụ, anyị na-arahụ n’usekwu. Ọ bụrụ na ụlọ ahụ na-ehi mmiri, anyị na-adabere n’ahụ́ ụlọ ahụ hie ụra ka mmiri ghara ịna-ata anyị.

Anyị na-agbalị izi ndị anyị rahụrụ n’ụlọ ha ozi ọma. Mgbe anyị ruru ebe anyị na-aga, otú ụmụnna na-esi eji obiọma ele anyị ọbịa na-eme anyị obi ụtọ. Obi ụtọ ha na-enwe na anyị bịara na-eme ka anyị chefuo ahụhụ niile anyị tara n’ụzọ.

Ọ bụrụ na e nyere anyị ụlọ na nke ụmụnna, obi na-adị anyị ụtọ inyere ha aka ịrụ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ. Nke a na-eme ka ha nwee ohere iso anyị gaa ozi ọma. Anyị anaghị atụ anya ka ụmụnna ndị ahụ nye anyị ihe ndị dara oké ọnụ ma ọ bụ nri pụrụ iche, bụ́ ihe aka ha na-agaghị eru.

ILETA ỤMỤNNA NDỊ NỌ N’EBE A NA-ENWEGHỊ ỌGBAKỌ

Obi na-adị anyị ụtọ ileta ụmụnna ndị bi n’ime ime obodo ebe a na-enweghị ọgbakọ. Ụmụnna ndị ahụ na-enwe ọtụtụ ihe anyị na ha ga-eme. Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị enwe efe ‘izurutụ ike.’ (Mak 6:31) N’otu ebe, ụmụnna abụọ bụ́ di na nwunye gwara mmadụ iri anọ ha na-amụrụ ihe ka ha bịa n’ụlọ ha ka anyị soro mụọrọ ha ihe. Oly na nwanna nwaanyị ahụ mụụrụ ihe dị ka mmadụ iri abụọ ihe, mụ na nwanna nwoke ahụ amụọrọ mmadụ iri abụọ ndị nke ọzọ. Anyị mụchaara otu onye, anyị amalite ịmụrụ onye ọzọ ozugbo. Mgbe e mechara, anyị kwụsịtụrụ ma gaa ọmụmụ ihe. Mgbe anyị gbasara, anyị malitere ịmụrụ ndị fọrọnụ. Anyị nwere ike ịmụgidere ndị mmadụ ihe ruo mgbe ọ gafere elekere asatọ nke abalị!

E nwere ụmụnna ndị bi n’ebe ọzọ a na-enweghị ọgbakọ. Anyị gaa ebe ahụ, anyị na ha na-eso aga ekwusa ozi ọma n’obodo nta ọzọ n’ihe dị ka elekere asatọ nke ụtụtụ. Anyị niile na-eyi uwe ochie. Anyị na-eji ụkwụ aga ọtụtụ kilomita n’ime ọhịa ruo mgbe anyị ruru n’obodo nta ahụ n’ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie. Anyị ruo ebe ahụ, anyị na-eyiri uwe dị mma ma malite izi ozi ọma ozugbo site n’ụlọ ruo n’ụlọ. E nweghị ọtụtụ ụlọ n’ebe ahụ, ma ndị nkwusa na-aga ozi ọma dị ọtụtụ. N’ihi ya, anyị na-arụcha ebe ahụ n’ihe dị ka nkeji iri atọ, gawazie n’obodo nta ọzọ. Anyị zichaa ozi ọma ebe ahụ, anyị ejirikwa ụkwụ lawa. Mgbe anyị gara ebe ahụ ọhụrụ, ịga ozi ọma ebe ahụ na-agwụ anyị ike n’ihi na anyị na-aga ije ọtụtụ awa ma zie ozi ọma naanị ihe dị ka otu awa. Ma ụmụnna anyị anaghị ekpesa mkpesa, kama obi na-adị ha ụtọ.

E nwere ụmụnna ndị bi n’ebe a na-enweghị ọgbakọ n’otu obodo a na-akpọ Taviranambo. Obodo ahụ dị n’akụkụ elu ugwu. N’ebe ahụ, anyị hụrụ otu nwanna ya na ezinụlọ ya bi n’otu ọnụ ụlọ. Ha na-amụ ihe n’otu obere ụlọ dị ha nso. Nwanna anyị bi n’ụlọ ya malitere ịkpọ ndị ọzọ, sị, “Ụmụnna!” Otu olu si n’ugwu ọzọ dị nso zaa, sị, “Ooo!” Nwanna ahụ anyị nọ n’ụlọ ya gwara ha, sị, “Onye nlekọta sekit anyị abịala!” Ha azaa ya, sị, “Ehee!” O doro anya na nwanna ọ bụla nụrụ ozi ahụ gwara ndị bi ya nso. N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ malitere izukọta. Mgbe ọmụmụ ihe malitere, ndị bịaranụ karịrị otu narị mmadụ.

INWETA ỤGBỌALA NA-ESIRI ANYỊ IKE

N’afọ 1996, e kenyere anyị sekit dị nso n’Antananarivo. Anyị nwere nsogbu ndị ọzọ na sekit ahụ. A naghị enwekarị ụgbọala ndị na-aga n’obodo ndị na-emepeghị emepe. Anyị bu n’obi ileta ụmụnna ndị nọ na Beankàna, bụ́ ebe dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ site n’Antananarivo. Anyị hụrụ ụgbọala na-aga obodo ahụ. Mgbe anyị na onye na-akwọ ụgbọala ahụ kwuchara ego ole anyị ga-enye ya, anyị banyere n’ụgbọala ahụ. Ihe dị ka mmadụ iri atọ nọ n’ime ya, ụfọdụ dina n’elu ya, ụfọdụ akwụrụ ọtọ ma jide aka n’azụ ya.

Ụgbọala ahụ mebiri mgbe anyị gatụrụ obere, anyị ejirizie ụkwụ gawa. Ụdị ihe ahụ na-emekarị. Mgbe anyị gatụrụ awa ole na ole, otu nnukwu ụgbọala gbafetara. Ndị mmadụ na ngwongwo juru na ya, ma ọ kwụsịrị. Anyị banyere n’agbanyeghị na anyị ga-akwụ ọtọ. Anyị mechara rute n’otu osimiri, ma a na-arụzi àkwà ya arụzi. Anyị rịturu, jirikwa ụkwụ gawa ruo mgbe anyị rutere n’otu obere obodo ebe ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche bi. Ọ bụ ezie na anyị ebughị n’obi ileta ndị ọsụ ụzọ ahụ, anyị so ha na-aga ozi ọma ka anyị na-eche ka a rụzie àkwà mmiri ahụ nakwa ka anyị nweta ụgbọala ọzọ ga-ebu anyị.

Otu izu gachara tupu ụgbọala ọzọ agafeta, anyị amalitekwa ije anyị. E nwere ọtụtụ ebe mebichara emebi n’ụzọ ahụ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-arịtu, nye aka kwafee ụgbọala ahụ ná mmiri ruru anyị n’ikpere. Anyị dara ugboro ugboro ka anyị na-akwa ya. Anyị ruru obodo nta ahụ n’isi ụtụtụ ma rịtuo. Anyị ji ụkwụ banye n’obere ụzọ dị n’ebe a na-akọ osikapa ma gawa ebe anyị na-aga. Mmiri apịtị dị n’ụzọ ahụ ruru anyị n’úkwù.

Ebe ọ bụ na anyị agatụbeghị ebe ahụ, anyị kpebiri izi ndị na-arụ ọrụ n’ubi osikapa ahụ ozi ọma ma jụọ ha otú anyị ga-esi ruo ebe ụmụnna bi. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị chọpụtara na ndị ahụ bụ ụmụnna anyị!

ANYỊ GBARA NDỊ ỌZỌ UME ỊMALITE OZI OGE NIILE

Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị agbaala ndị ọzọ ume ịmalite ozi oge niile. Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ihe ọma si na ya pụta. Mgbe anyị na-eleta otu ọgbakọ nwere ndị ọsụ ụzọ oge niile itoolu, anyị gbara ndị ọsụ ụzọ niile ahụ ume ka onye ọ bụla n’ime ha gbalịa nyere otu onye nkwusa aka ịmalite ịsụ ụzọ oge niile. Mgbe anyị letara ha ka ọnwa isii gachara, ndị ọsụ ụzọ oge niile ha nwere eruola iri abụọ na abụọ. E nwere ndị okenye abụọ ụmụ ha ndị nwaanyị bụ ndị ọsụ ụzọ. Ụmụ ha ndị ahụ gbara ha ume ịghọ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ndị okenye ahụ gbakwara okenye ọzọ ume ịghọ ọsụ ụzọ. Okenye ahụ ha gbara ume ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’oge na-adịghị anya. Ya na nwunye ya mechara banye n’ọrụ sekit. Ndị okenye abụọ ndị ọzọ ahụ kwanụ? Otu bụzi onye nlekọta sekit, onye nke ọzọ so ná ndị na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Kwa ụbọchị, anyị na-ekele Jehova maka enyemaka ya n’ihi na anyị ma na ọ dịghị ihe anyị ga-emeli n’ike aka anyị. N’eziokwu, ike na-agwụ anyị mgbe ụfọdụ, anyị na-arịakwa ọrịa, ma obi na-atọ anyị ụtọ mgbe anyị chetara ihe ndị anyị rụpụtara n’ozi anyị. Jehova na-eme ka ọrụ ya na-aga nke ọma. Obi dị anyị ụtọ na anyị so na-arụ ọrụ ahụ, anyị bụzikwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’eziokwu, anyị amụtala ihe bara uru n’ihi na anyị tụkwasịrị Jehova obi, bụ́ ‘onye ahụ nke na-enye anyị ike.’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Anyị amụtala ihe bara uru n’ihi na anyị tụkwasịrị Jehova obi

[Map/​Foto ndị dị na peeji nke 4]

Madagaska bụ agwaetiti nke anọ kacha ibu n’ụwa. A na-akpọkwa ya Nnukwu Agwaetiti Na-acha Ọbara Ọbara. Ájá dị na ya na-acha uhie uhie, anụmanụ na osisi dị iche iche a na-enweghị n’ebe ọzọ dịkwa na ya

[Foto dị na peeji nke 5]

Inweta ụgbọala so ná nsogbu ndị anyị nwere

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ịmụrụ ndị ọzọ Baịbụl na-atọ anyị ụtọ