Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”

Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”

Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”

“N’ezie, Chineke unu bụ Chi kasị chi niile na Onyenwe ndị eze na Onye na-ekpughe ihe nzuzo.”—DAN. 2:47.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee ihe ndị Jehova mere ka anyị mata banyere ọdịnihu?

Olee mba ndị isi isii mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ha?

Gịnị jikọrọ anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe na ihe oyiyi ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ?

1, 2. Olee ihe Jehova mere ka anyị mata, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

OLEE ọchịchị ndị ga na-achị ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ? Anyị ma azịza ajụjụ a n’ihi na Jehova Chineke bụ “Onye na-ekpughe ihe nzuzo.” O mere ka anyị mata ọchịchị ndị ahụ n’ihe Daniel onye amụma na Jọn onyeozi dere.

2 Jehova gosiri ha abụọ ọhụụ ndị gbasara anụ ọhịa dị iche iche. Ná nrọ Nebukadneza rọrọ, ọ hụrụ otu nnukwu ihe oyiyi e ji ọla na ígwè kpụọ. Jehova mere ka Daniel ghọta ihe ihe oyiyi ahụ pụtara, meekwa ka e dee ihe ndị ahụ na Baịbụl ka ha baara anyị uru. (Rom 15:4) Ihe mere o ji mee ya bụ ka o mee ka olileanya anyị sie ike na Alaeze ya ga-egwepịa ọchịchị ụmụ mmadụ niile n’oge na-adịghị anya.—Dan. 2:44.

3. Olee ihe anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta tupu anyị aghọta amụma Baịbụl nke ọma, n’ihi gịnịkwa?

3 Amụma Daniel na ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi mere ka anyị mata eze ma ọ bụ ọchịchị asatọ, nakwa nke ga-achị ma ibe ya chịchaa. Ma, naanị otú anyị ga-esi ghọta amụma ndị ahụ nke ọma bụ ịghọta amụma mbụ e dere na Baịbụl. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe niile e kwuru na Baịbụl gbasara amụma mbụ ahụ. Amụma ahụ dị ka ihe jikọtara amụma ndị ọzọ niile e buru na Baịbụl.

MKPỤRỤ AGWỌ AHỤ NA ANỤ ỌHỊA AHỤ

4. Ole ndị bụ mkpụrụ nwaanyị ahụ, gịnịkwa ka mkpụrụ ahụ ga-arụ?

4 Obere oge ka Adam na Iv nupụchara isi n’Iden, Jehova kwere nkwa na otu “nwaanyị” ga-enwe “mkpụrụ.” * (Gụọ Jenesis 3:15.) Mkpụrụ ahụ ga-emecha gwepịa agwọ ahụ, bụ́ Setan, isi. Jehova mechara mee ka a mata na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Ebreham, na ọ ga-esi ná mba Izrel, na ọ ga-abụ onye Juda, bụrụkwa nwa nwa Eze Devid. (Jen. 22:15-18; 49:10; Ọma 89:3, 4; Luk 1:30-33) Onye bụ́ isi sekpụ ntị ná mkpụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst. (Gal. 3:16) Ndị so ya bụrụ mkpụrụ ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Gal. 3:26-29) Ọ bụ Jizọs na ndị a e tere mmanụ ga-achị n’Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị Chineke ga-eji zọpịa Setan.—Luk 12:32; Rom 16:20.

5, 6. (a) Ọchịchị ole kpara ike n’ụwa ka Daniel na Jọn kwuru banyere ha? (b) Gịnị ka isi anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe nọchiri anya ya?

5 Amụma mbụ ahụ e buru n’Iden kwuru na Setan ga-enwe “mkpụrụ.” Mkpụrụ Setan ga-ebuso mkpụrụ nwaanyị ahụ iro, ma ọ bụ kpọọ ya asị. Ole ndị bụ mkpụrụ agwọ ahụ? Ọ bụ ndị niile kpọrọ Chineke asị ma na-emegide ndị ya otú ahụ Setan na-eme. Kemgbe ụwa, Setan ahaziela mkpụrụ ya ka ọ bụrụ ọchịchị ma ọ bụ alaeze dị iche iche. (Luk 4:5, 6) Ma ọ bụ naanị alaeze ole na ole bụ ndị kpagburu ndị Chineke, ya bụ, ndị Izrel oge ochie ma ọ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị buru ihe a n’obi? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghọta ihe mere ọhụụ Daniel na Jọn ji kwuo banyere naanị ọchịchị asatọ kpara ike n’ụwa.

6 N’ọgwụgwụ narị afọ mbụ O.A., Jizọs gosiri Jọn onyeozi ụfọdụ ọhụụ dị egwu. (Mkpu. 1:1) N’otu n’ime ha, Jọn hụrụ dragọn, nke nọchiri anya Ekwensu, ka o guzo n’elu ájá nke oké osimiri. (Gụọ Mkpughe 13:1, 2.) Jọn hụkwara otu anụ ọhịa dị egwu nke si n’oké osimiri na-apụta, Ekwensu enyekwa ya ikike dị ukwuu. Otu mmụọ ozi mechara gwa Jọn na isi asaa nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, nke bụ́ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1, nọchiri anya “ndị eze asaa” ma ọ bụ ọchịchị asaa. (Mkpu. 13:14, 15; 17:3, 9, 10) Mgbe Jọn na-ede akwụkwọ Mkpughe, ise n’ime ndị eze ahụ adaala, otu na-achị mgbe ahụ, nke ọzọ “abịabeghị.” Olee ọchịchị ndị eze ndị ahụ nọchiri anya ha? Ka anyị tụlee isi nke ọ bụla anụ ọhịa ahụ a kọwara ná Mkpughe nwere. Anyị ga-atụlekwa otú akwụkwọ Daniel si kọwakwuo ọtụtụ n’ime alaeze ndị ahụ, mgbe ụfọdụ, ọtụtụ narị afọ tupu ha amalite ịchị.

IJIPT BỤ ISI NKE MBỤ, ASIRIA ABỤRỤ ISI NKE ABỤỌ

7. Gịnị ka isi nke mbụ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa mere anyị ji kwuo otú ahụ?

7 Isi nke mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Ijipt. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Ijipt bụ mba mbụ chịrị ụwa nke kpọrọ ndị Chineke asị ma lụso ha ọgụ. Chineke kwere Ebreham nkwa na a ga-esi n’ezinụlọ ya nweta mkpụrụ nwaanyị ahụ. Ndị Izrel bụ ụmụ Ebreham. Mgbe ha bi n’Ijipt, ha mụbara, ndị Ijipt malitekwara imegbu ha. Setan chọrọ igbukpọ ndị Chineke tupu a mụọ mkpụrụ ahụ. Olee otú o si chọọ ime ya? O mere ka Fero nye iwu ka e gbuo nwa ọhụrụ Izrel ọ bụla bụ́ nwoke. Jehova kụghasịrị ihe ahụ Fero chọrọ ime ma napụta ndị ya n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọpụ. 1:15-20; 14:13) Jehova mechara nye ndị Izrel Ala Nkwa ahụ.

8. Gịnị ka isi nke abụọ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa ka ọ gbalịrị ime?

8 Isi nke abụọ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Asiria. Alaeze ukwu ahụ gbalịkwara igbukpọ ndị Chineke. N’eziokwu, Jehova si n’aka Asiria taa alaeze ebo iri Izrel ahụhụ n’ihi na ha nọ na-ekpere arụsị, na-enupụkwara Chineke isi. Ma, Asiria gbalịrị ibibi Jeruselem. O nwere ike ịbụ na Setan chọrọ igbukpọ ezinụlọ ndị eze na Jeruselem, bụ́ ebe a ga-emecha mụọ Jizọs. Jehova achọghị ka e bibie Jeruselem. Ọ bụ ya mere o ji bibie ndị agha Asiria ma zọpụta ndị ya.—2 Eze 19:32-35; Aịza. 10:5, 6, 12-15.

BABỊLỌN BỤ ISI NKE ATỌ

9, 10. (a) Gịnị ka Jehova kwere ka ndị Babịlọn mee? (b) Ka amụma nwee ike imezu, gịnị kwesịrị ime?

9 Isi nke atọ nke anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ nọchiri anya alaeze nke isi obodo ya bụ Babịlọn. Jehova kwere ka ndị Babịlọn bibie Jeruselem ma dọrọ ndị Chineke n’agha. Ma, tupu Jehova ekwe ka ihe a mee ndị Izrel na-enupụ isi, ọ dọrọ ha aka ná ntị na ụdị ọdachi ahụ ga-adakwasị ha. (2 Eze 20:16-18) O buru amụma na a ga-ewepụ ndị eze Izrel, bụ́ ndị na-anọ “n’ocheeze Jehova” na Jeruselem. (1 Ihe 29:23) Ma, Jehova kwere nkwa na onye si n’agbụrụ Eze Devid, bụ́ “onye o ruuru,” ga-abịa were ọchịchị ahụ.—Ezik. 21:25-27.

10 Amụma ọzọ gosiri na ndị Juu ka ga na-efe Chineke n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem mgbe Mesaya, ma ọ bụ Onye E Tere Mmanụ, ga-abịa. (Dan. 9:24-27) Amụma ọzọ e buru tupu a dọrọ ndị Izrel n’agha laa Babịlọn kwuru na a ga-amụ Mesaya na Betlehem. (Maị. 5:2) Amụma ndị a agaghị emezu ma ọ bụrụ na a hapụghị ndị Juu ka ha laghachi n’ala ha ma wughachi ụlọ nsọ ahụ. Ma ndị Babịlọn anaghị ahapụ ndị ha dọọrọ n’agha. Oleekwanụ otú ndị Chineke ga-esi laghachi n’ala ha? Jehova kpugheere ndị amụma ya azịza ajụjụ a.—Emọs 3:7.

11. Olee ihe Daniel na Jọn ji mee ihe atụ Alaeze Ukwu Babịlọn? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji a.)

11 Daniel onye amụma so ná ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. (Dan. 1:1-6) Jehova si n’aka ya mee ka a mata alaeze ndị ọzọ ga-achị mgbe Babịlọn chịchara. O ji ihe atụ dị iche iche gosi Daniel ọchịchị ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehova mere ka Eze Nebukadneza nke Babịlọn rọọ nrọ ma hụ otu nnukwu ihe oyiyi e ji ọla na ígwè kpụọ. (Gụọ Daniel 2:1, 19, 31-38.) Jehova si n’aka Daniel mee ka a mata na isi ihe oyiyi ahụ e ji ọlaedo kpụọ nọchiri anya Alaeze Ukwu Babịlọn. * Obi ya na ogwe aka ya nọchiri anya mba ga-achị ụwa ma Babịlọn chịchaa. Olee mba ọ ga-abụ, oleekwa otú ọ ga-esi emeso ndị Chineke?

ISI NKE ANỌ BỤ MIDIA NA PESHIA

12, 13. (a) Gịnị ka Jehova kpughere banyere mmeri a ga-emeri Babịlọn? (b) Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na isi nke anọ nke anụ ọhịa ahụ bụ Midia na Peshia?

12 Ihe karịrị otu narị afọ tupu oge Daniel, Jehova kpugheere Aịzaya onye amụma ihe dị iche iche banyere ọchịchị ga-emeri Babịlọn. Jehova mere ka a mata ma otú a ga-esi merie Babịlọn ma aha onye ga-emeri ya. Onye ahụ meriri ya bụ Saịrọs onye Peshia. (Aịza. 44:28–45:2) Jehova gosiri Daniel ọhụụ abụọ ọzọ banyere Midia na Peshia. N’otu n’ime ha, Daniel hụrụ anụ ọhịa bea nke weliri otu akụkụ ya elu, nke a gwakwara ka o “rie anụ buru ibu.” (Dan. 7:5) N’ọhụụ ọzọ, Daniel hụrụ otu ebule nwere mpi abụọ, bụ́ nke nọchiri anya Midia na Peshia.—Dan. 8:3, 20.

13 Jehova ji Alaeze Ukwu Midia na Peshia merie Babịlọn ma mee ka ndị Izrel laghachi n’ala ha, otú ahụ o buru n’amụma. (2 Ihe 36:22, 23) Ma, alaeze ahụ mechara gbalịa ibibi ndị Chineke. Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Esta kọrọ otú praịm minista ndị Peshia, bụ́ Heman, si kpaa nkata igbu ndị Juu niile n’alaeze ukwu ahụ n’ụbọchị a kara aka. Ma, Jehova zọpụtara ndị ya ọzọ n’aka ndị bụ́ mkpụrụ Setan. (Esta 1:1-3; 3:8, 9; 8:3, 9-14) N’ihi ya, Midia na Peshia bụ isi nke anọ nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe.

ISI NKE ISE BỤ GRIS

14, 15. Olee ihe ụfọdụ Jehova kpughere banyere Alaeze Ukwu Gris oge ochie?

14 Isi nke ise nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe nọchiri anya Gris. Ná nrọ ahụ Daniel kọwaara Nebukadneza, afọ ihe oyiyi ahụ na apata ụkwụ ya, nke e ji ọla kọpa kpụọ, nọchikwara anya alaeze ahụ. Jehova mekwara ka Daniel hụ ọhụụ abụọ ndị kọwakwuru alaeze ukwu ahụ na onye ọchịchị ya kasị ike.

15 N’otu n’ime ọhụụ ndị ahụ, Daniel hụrụ otu agụ owuru nwere nku anọ, nke nọchiri anya Gris. Agụ owuru ahụ ga-emeri mba ndị ọzọ n’egbughị oge. (Dan. 7:6) N’ọhụụ ọzọ, Daniel kọwara otú mkpi nke nwere otu nnukwu mpi si gbuo ebule nwere mpi abụọ n’egbughị oge. Ebule ahụ bụ Midia na Peshia. Jehova gwara Daniel na mkpi ahụ nọchiri anya Gris nakwa na nnukwu mpi ahụ nọchiri anya otu n’ime ndị eze ya. Daniel dekwara na a ga-agbaji nnukwu mpi ahụ, obere mpi anọ anọchie ya. Ihe niile ahụ e buru n’amụma mezuru n’agbanyeghị na e dere ya ihe dị ka narị afọ abụọ tupu Gris amalite ịchị ụwa. Alegzanda Onye Ukwu bụ eze kacha kpaa ike n’alaeze Gris oge ochie, ọ bụkwa ya du ndị agha gaa merie Midia na Peshia. Ma, a gbajiri mpi ahụ mgbe eze ukwu ahụ nwụrụ n’ike mgbe ọ dị naanị iri afọ atọ na abụọ. Ndị ọchịagha ya anọ mechara kewaa alaeze ukwu ya ahụ.—Gụọ Daniel 8:20-22.

16. Gịnị ka Antiokọs nke Anọ mere?

16 Mgbe ndị Gris merichara Peshia, ha chịrị ndị Izrel. N’oge ahụ, ndị Juu alaghachila n’Ala Nkwa ahụ, wughachikwa ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ha ka bụ ndị Chineke, ụlọ nsọ ahụ ha wughachiri ka bụkwa ebe ha nọ na-efe Chineke. Ma, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ abụọ tupu a mụọ Kraịst, Gris nke bụ́ isi nke ise nke anụ ọhịa ahụ, lụsoro ndị Chineke ọgụ. Antiokọs nke Anọ, bụ́ otu n’ime ndị ọchịagha ahụ ketara alaeze Alegzanda, rụrụ ebe a na-achụrụ arụsị àjà n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma kwuo na a ga-egbu onye ọ bụla kpere okpukpe ndị Juu. Mkpụrụ Setan alusowakwala ndị Chineke ọgụ! Ma n’oge na-adịghị anya, alaeze ọzọ nọchiri Gris ma chịwa ụwa. Olee alaeze ga-abụ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ?

ROM BỤ ISI NKE ISII “NKE NA-EMENYE ỤJỌ MA DỊ EGWU”

17. Olee otú isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ si soro mezuo amụma dị na Jenesis 3:15?

17 Rom bụ mba na-achị ụwa mgbe Jọn hụrụ anụ ọhịa ahụ n’ọhụụ. (Mkpu. 17:10) Rom bụ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ, o sokwa mezuo amụma ahụ dị na Jenesis 3:15. Setan ji ndị ọchịchị Rom merụọ mkpụrụ ahụ ahụ́ “n’ikiri ụkwụ.” Olee otú o si mee ya? Ha kpere Jizọs ikpe n’ihi ebubo ụgha e boro ya na ọ na-agba ọchịchị ha mgba okpuru, mechaakwa gbuo ya. (Mat. 27:26) Ma, ahụ́ e merụrụ Jizọs lara n’oge na-adịghị anya n’ihi na Jehova kpọlitere ya.

18. (a) Olee mba ọhụrụ Jehova họọrọ ịbụ ndị ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú mkpụrụ nke agwọ ahụ si ka na-ebuso mkpụrụ nwaanyị ahụ iro mgbe ọnwụ Jizọs gachara?

18 Ndị ndú okpukpe Izrel na ndị Rom gbakọtara aka kpaa nkata igbu Jizọs, ọtụtụ ndị Izrel jụkwara ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ mba Izrel. (Mat. 23:38; Ọrụ 2:22, 23) Ọ họọrọ mba ọhụrụ ga-abụ ndị ya, ya bụ, “Izrel nke Chineke.” (Gal. 3:26-29; 6:16) Mba ahụ bụ ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, nke ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nọ na ya. (Efe. 2:11-18) Mgbe ọnwụ Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya gachara, mkpụrụ nke agwọ ahụ ka nọ na-akpọ mkpụrụ nwaanyị ahụ asị ma na-alụso ya ọgụ. Ndị Rom gbalịrị ugboro ugboro ikpochapụ ọgbakọ Ndị Kraịst, nke so bụrụ mkpụrụ nwaanyị ahụ. *

19. (a) Olee otú Daniel si kọwaa mba nke isii ga-achị ụwa? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu ọzọ?

19 Ná nrọ ahụ Daniel kọwaara Nebukadneza, ogwe ụkwụ ígwè nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya Rom. (Dan. 2:33) Daniel hụkwara ọhụụ kọwara Alaeze Ukwu Rom nke ọma nakwa mba ọzọ ga-esi na ya pụta, nke ga-anara ya ọchịchị ụwa. (Gụọ Daniel 7:7, 8.) Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị iro Rom na-ele ya anya ka anụ ọhịa “nke na-emenye ụjọ ma dị egwu.” Ma, amụma ahụ kwuru na “mpi iri” ga-epulite n’alaeze ukwu ahụ nakwa na mpi ọzọ ga-esi ezigbo ike ga-epulitekwa n’etiti ha. Olee ndị mpi iri ahụ nọchiri anya ha, oleekwa mba mpi ahụ nke dị ntakịrị nọchiri anya ya? Gịnị jikọrọ mpi ahụ dị ntakịrị na nnukwu ihe oyiyi ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ? Isiokwu dị na peeji nke 14 ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Nwaanyị ahụ nọchiri anya nzukọ Chineke yiri nwunye ya, nke ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.—Aịza. 54:1; Gal. 4:26; Mkpu. 12:1, 2.

^ par. 11 Isi ihe oyiyi ahụ dị n’akwụkwọ Daniel na isi nke atọ nke anụ ọhịa ahụ dị n’akwụkwọ Mkpughe nọchichara anya Babịlọn. Gaa na chaatị dị na peeji nke 12-13.

^ par. 18 Ọ bụ ezie na Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70 O.A., mbibi ahụ esoghị mezuo Jenesis 3:15. N’oge ahụ, mba Izrel abụkwaghị ndị Chineke họọrọ.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]