Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Iwere Ozi Jehova Ka Ihe Kacha Mkpa?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Iwere Ozi Jehova Ka Ihe Kacha Mkpa?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Iwere Ozi Jehova Ka Ihe Kacha Mkpa?

“Ọnụ m ga-akọ ezi omume gị, kọọkwa nzọpụta gị ogologo ụbọchị dum.” —ỌMA 71:15.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Gịnị mere Noa, Mozis, Jeremaya, na Pọl ji were ozi Jehova ka ihe kacha mkpa?

Olee ihe ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eji ndụ gị mee?

Gịnị mere i ji kpebisie ike na ị ga-ewere ozi Jehova ka ihe kacha mkpa?

1, 2. (a) Gịnị ka mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova na-egosi? (b) Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị tụlee ihe Noa, Mozis, Jeremaya, na Pọl mere?

MGBE ị raara onwe gị nye Jehova, e mee gị baptizim ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs, i kpebiela ime ihe dị ezigbo mkpa. Ịrara onwe gị nye Chineke bụ ihe kacha mkpa i kpebiri iji ndụ gị mee. Ọ dị ka à ga-asị na ị gwara Jehova, sị: ‘Achọrọ m ka ị bụrụ Nna m ukwu n’ihe niile m na-eme. Abụ m ohu gị. Achọrọ m ka ị na-agwa m ihe m ga-eji oge m na-eme, ihe kwesịrị ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ m, na ihe m ga-eji akụ̀ m na amamihe m na-eme.’

2 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst e mere baptizim, ọ bụ ihe ahụ ka i kwere Jehova ná nkwa. I mere ezigbo mkpebi, nke gosikwara na ị ma ihe. Ma, olee otú ihe i ji oge gị eme ga-esi gosi na ị ghọtara na Jehova bụ Nna gị ukwu? Ihe Noa, Mozis, Jeremaya, na Pọl onyeozi mere ga-enyere anyị aka ichebara ihe anyị ji oge anyị eme echiche. Ha niile ji obi ha dum jeere Jehova ozi. E nwere ike iji oge anyị a tụnyere oge ha. Ihe ndị ha kpebiri ime gosiri ihe ndị kacha mkpa ná ndụ ha. Ịtụle ihe ndị ahụ kwesịrị ime ka anyị chebara ihe anyị ji oge anyị eme echiche.—Mat. 28:19, 20; 2 Tim. 3:1.

TUPU IJU MMIRI

3. Olee otú oge anyị si yie oge Noa?

3 Jizọs ji oge anyị tụnyere oge Noa. O kwuru, sị: ‘Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. Ha nọ na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.’ (Mat. 24:37-39) Taa, ọtụtụ ndị achọghị ige ntị n’ozi ndị ohu Chineke ji na-adọ ha aka ná ntị. Ha achọghị ịma na oge agwụla agwụ. Ọtụtụ ndị ekwetaghị na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume otú ahụ ndị biri n’oge Noa na-ekwetaghị. Ha jidị ya eme ihe ọchị. (2 Pita 3:3-7) Ma, gịnị ka Noa ji oge ya mee n’agbanyeghị na ndị bi n’oge ya egeghị ya ntị?

4. Gịnị ka Noa ji oge ya mee mgbe Jehova nyechara ya ọrụ, maka gịnị?

4 Chineke gwara Noa na ya ga-ebibi ndị ajọ omume niile, nyekwa Noa ọrụ pụrụ iche. Noa rụrụ ụgbọ a ga-eji zọpụta ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ. (Jen. 6:13, 14, 22) Noa gwakwara ndị mmadụ ihe Jehova chọrọ ime. Pita onyeozi kpọrọ Noa “onye na-ekwusa ezi omume,” nke gosiri na Noa gbalịrị ime ka ndị agbata obi ya mata na agwọ nọ n’akịrịka. (Gụọ 2 Pita 2:5.) Ì chere na ọ gaara adị mma ka Noa na ezinụlọ ya jiri oge ha niile na-achụ ego, na-agbalị ka ha nwee akụ̀ karịa ndị ọzọ, ma ọ bụ na-akpakọta ihe ha ga-eji na-ekpori ndụ? Mbanụ! Ebe ọ bụ na ha maara ihe ga-eme, ha ekweghị ka ihe ọ bụla megharịa ha anya.

IHE NWA ADAEZE IJIPT KPEBIRI IME

5, 6. (a) Gịnị nwere ike ịbụ ihe mere e ji zụọ Mozis n’amamihe ndị Ijipt? (b) Gịnị mere Mozis ji jụ ihe ndị ọ gaara enweta n’Ijipt?

5 Ihe ọzọ anyị ga-atụle bụ ihe Mozis mere. O toro n’obí eze Ijipt n’ihi na e weere ya ka nwa ada Fero. A kụziiri ya “ihe n’amamihe niile nke ndị Ijipt.” (Ọrụ 7:22; Ọpụ. 2:9, 10) Ihe mere e ji kụziere ya ihe ahụ nwere ike ịbụ ka o nwee ike iji ndụ ya niile na-eje ozi n’obí Fero. Ọ gaara abụ onye a ma ama n’ọchịchị kacha ike n’oge ahụ, nwee ọtụtụ ihe e ji ekpori ndụ, ihe ùgwù dị iche iche, na ihe ndị ọzọ a na-enye ndị nọ n’ọkwá dị elu. Ma, ọ̀ bụ ihe ndị ahụ bụ mkpa Mozis?

6 N’ihi ọzụzụ nne na nna Mozis nyere ya mgbe ọ bụ nwata, ọ ga-abụ na ọ ma nkwa Jehova kwere ndị nna nna ya bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Mozis kweere na nkwa ndị ahụ ga-emezu. Ọ ga-abụrịrị na o chere echiche nke ọma banyere ọdịnihu ya na otú ọ ga-esi rubere Jehova isi. N’ihi ya, gịnị ka o kpebiri ime mgbe oge ruru ka o kpebie ma ọ̀ ka ga-abụ nwa adaeze Ijipt ka ọ̀ ga-abụ onye Izrel na-agba ohu? Mozis họọrọ “ka e megbukọta ya na ndị Chineke kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.” (Gụọ Ndị Hibru 11:24-26.) O mechara bie ndụ ya otú tọrọ Jehova ụtọ. (Ọpụ. 3:2, 6-10) Gịnị mere Mozis ji mee otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o kweere na nkwa Chineke ga-emezu. Ọ ghọtara na ihe ọ bụla ọ ga-enweta n’Ijipt agaghị adịru mgbe ebighị ebi. N’eziokwu, Chineke ji ihe otiti iri nyụọ obodo ahụ ịkpakwụ n’oge na-adịghị anya. Ị̀ ghọtara ihe ndị raara onye ha nye Jehova kwesịrị ịmụta n’ihe Mozis mere? Kama iji ndụ anyị niile na-achụ ihe ndị a na-enweta n’ụwa ochie a, mkpa anyị kwesịrị ịbụ ijere Jehova ozi.

JEREMAYA MA IHE GA-EMENỤ

7. Olee otú oge Jeremaya si yie oge anyị?

7 Onye ọzọ ji ozi Jehova kpọrọ mkpa bụ Jeremaya onye amụma. Jehova họọrọ Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma ya ma nye ya ọrụ pụrụ iche, ya bụ, ịgwa ndị bi na Jeruselem na Juda na Jehova ga-ekpe ha ikpe n’ihi na ha na-ekpere arụsị. Anyị nwere ike ikwu na Jeremaya dịrị ndụ “n’oge ikpeazụ.” (Jere. 23:19, 20) Ọ ghọtara na a ga-ebibi obodo ha n’oge na-adịghị anya.

8, 9. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka a gbazie echiche Barọk? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

8 Gịnị ka Jeremaya mere n’ihi ihe ahụ ọ ghọtara? Ọ chọghị ịtụkwasị obodo ahụ a na-aga ibibi ebibi obi na ọ ga-enyere ya aka. Ò nwere uru ọ gaara abara ya? Ma, odeakwụkwọ Jeremaya, bụ́ Barọk, aghọtachaghị ihe na-aga imenụ. N’ihi ya, Chineke gwara Jeremaya ka ọ gwa odeakwụkwọ ya, sị: “Lee! M ga-etida ihe m wuru, m ga-efopụkwa ihe m kụrụ, bụ́ ala a dum. Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya. N’ihi na, lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ niile, . . . ma m ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụụrụ gị ihe nkwata n’ebe niile ị ga-aga.”—Jere. 45:4, 5.

9 Anyị amaghị ihe ndị bụ́ “ihe ukwu” ahụ Barọk na-achọrọ onwe ya. * Ma, anyị maara na ha bụ ihe ndị na-agaghị adịte aka, ihe ndị ga-ala n’iyi mgbe ndị Babịlọn ga-ebibi Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ọ̀ dị ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ? Anyị kwesịrị ime atụmatụ maka ọdịnihu ka anyị nwee ike ịna-egbo mkpa anyị. (Ilu 6:6-11) Ma, olee uru ọ ga-abara anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị na ike anyị na-achụ ihe ndị a ga-ala n’iyi n’oge na-adịghị anya? N’eziokwu, nzukọ Jehova ka na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, alaka ụlọ ọrụ, na ụlọ ndị ọzọ na-enyere anyị aka n’ozi anyị na-ejere Chineke. Ma, ihe a niile agaghị ala n’iyi n’ihi na e ji ha na-akwado ihe gbasara Alaeze Chineke. Mgbe onye raara onwe ya nye Jehova na-ekpebi ihe ọ ga-eme, ọ ga-adị mma ka o gosi na ọ ghọtara na ihe ndị dị otú ahụ bụ ihe kacha mkpa. Obi ò siri gị ike na i ‘bu ụzọ na-achọ alaeze Jehova na ezi omume ya’?—Mat. 6:33.

‘ANA M AGỤ HA DỊ KA NNUKWU IHE E KPOFURU EKPOFU’

10, 11. (a) Gịnị ka Pọl na-achụbu tupu ya aghọọ Onye Kraịst? (b) Gịnị mere Pọl ji gbanwee ihe ọ na-achụ?

10 Ka anyị tụlezie ihe Pọl onyeozi mere. Tupu ọ ghọọ Onye Kraịst, ọtụtụ ndị chere na ọ ga na-arụ ezigbo ọrụ n’ọdịnihu. Ọ mụrụ iwu ndị Juu n’aka otu n’ime ndị nkụzi a kacha akwanyere ùgwù n’oge ya. Nnukwu onye nchụàjà ndị Juu nyere ya ikike. Ọ nọ na-enwe ọganihu n’okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ ya. (Ọrụ 9:1, 2; 22:3; 26:10; Gal. 1:13, 14) Ma, ihe niile ahụ gbanwere mgbe Pọl ghọtara na Jehova anaghịzi agọzi mba ndị Juu.

11 Pọl ghọtara na iji oge ya niile na-arụrụ ndị Juu ọrụ abaghị uru n’anya Jehova; a gaje ibibi obodo ahụ. (Mat. 24:2) N’agbanyeghị na Pọl bụbu onye Farisii, o mechadịrị kwuo na ihe ya matara banyere nzube Chineke na ihe ùgwù ya nwere n’ozi Ndị Kraịst mere ka ya lee ihe ndị ahụ o cheburu dị mkpa anya ka “nnukwu ihe e kpofuru ekpofu.” Pọl hapụrụ ihe ndị ọ na-achụ n’okpukpe ndị Juu ma jirizie ndụ ya niile kwusawa ozi ọma.—Gụọ Ndị Filipaị 3:4-8, 15; Ọrụ 9:15.

TỤLEE IHE NDỊ KACHA MKPA NÁ NDỤ GỊ

12. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, olee ihe kacha ya mkpa?

12 Noa, Mozis, Jeremaya, Pọl, na ọtụtụ ndị ọzọ dị ka ha ji oge ha na ike ha jeere Chineke ozi. Anyị kwesịrị iṅomi ha. N’eziokwu, ọ bụ Jizọs kacha jiri ndụ ya niile jeere Jehova ozi. (1 Pita 2:21) Mgbe e mechara Jizọs baptizim n’ụwa, o ji ndụ ya niile kwusaa ozi ọma ma sọpụrụ Jehova. Onye Kraịst ọ bụla nke ghọtara na Jehova bụ Nna ya ukwu kwesịrị ịma na ife Jehova kwesịrị ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. Ọ̀ bụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị? Olee otú anyị ga-esi wepụtakwuo oge maka ozi Jehova, nweekwa ike ịna-eme ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime?—Gụọ Abụ Ọma 71:15; 145:2.

13, 14. (a) Gịnị ka a na-agba Ndị Kraịst niile e mere baptizim ume ịtụle? (b) Gịnị ga-eme ka ndị Chineke nwee obi ụtọ?

13 Kemgbe ọtụtụ afọ, nzukọ Jehova agbaala Ndị Kraịst ume ugboro ugboro ka ha kpesie ekpere ike ma kpebie ma hà ga-abụli ndị ọsụ ụzọ. E nwere ndị ji obi ha niile na-efe Jehova, ma n’ihi nsogbu, ha agaghị enwe ike inye iri awa asaa ndị ọsụ ụzọ na-enye kwa ọnwa. Obi ekwesịghị ịna-ama ha ikpe. (1 Tim. 5:8) Gịnwa kwanụ? Ọ̀ bụ eziokwu na ị gaghị abụli ọsụ ụzọ?

14 Chegodị banyere otú ọṅụ si ju ọtụtụ ndị obi n’oge e chetara ọnwụ Jizọs n’afọ a. N’ọnwa Mach, e mere ndokwa pụrụ iche ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka kpebie ma hà ga-enye iri awa atọ ka hà ga-enye iri awa ise. (Ọma 110:3) Ọtụtụ nde mmadụ sụrụ ụzọ inyeaka, ọṅụ jukwara ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche obi n’ọnwa ahụ. Ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike ịna-enwe ụdị ọṅụ ahụ n’oge ndị ọzọ? Ọ bụrụ na Onye Kraịst e mere baptizim na-asụ ụzọ, obi ga-adị ya ezigbo ụtọ ma ọ gachaa ozi ọma n’ụbọchị, ọ ga-enwekwa ike ikwu, sị, “Jehova, emere m ihe niile m nwere ike ime n’ozi gị taa.”

15. Gịnị ka Onye Kraịst na-eto eto kwesịrị ibu n’obi banyere ịgụ akwụkwọ?

15 Ọ bụrụ na ị gụchawala akwụkwọ, o nwere ike ịbụ na ahụ́ siri gị ike, i nweghịkwa ọtụtụ mkpa. Ì chesiela echiche ike ịmalite ịsụ ụzọ oge niile? Ndị nkụzi nwere ike iche na ịga mahadum bụ ụzọ kacha mma ị ga-esi kwado maka ọdịnihu. Ihe ha tụkwasịrị obi bụ ego na òtù ụmụ mmadụ, bụ́ ihe ndị na-agaghị adịte aka. Ma, ọ bụrụ na i jiri ndụ gị niile jeere Chineke ozi, ọ pụtara na ị na-achụ ihe bara ezigbo uru nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ị na-esokwa ihe nlereanya zuru okè Jizọs hapụụrụ anyị. Ezigbo mkpebi dị otú ahụ ga-eme gị obi ụtọ. Ọ ga-echebe gị. Ọ ga-emekwa ka a mata na i kpebisiri ike ibi ndụ ga-egosi na ị raara ndụ gị nye Jehova.—Mat. 6:19-21; 1 Tim. 6:9-12.

16, 17. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ozi anyị na-ejere Jehova?

16 Taa, ọtụtụ ndị ohu Chineke na-arụ ọrụ ọtụtụ awa iji na-egbo mkpa ezinụlọ ha. Ma, o nwere ike ịbụ na awa ụfọdụ ji arụ ọrụ karịrị akarị. (1 Tim. 6:8) Ụwa a na-agbalịsi ike ime ka anyị chee na anyị agaghị ebi ezigbo ndụ ma ọ bụrụ na anyị azụghị ọtụtụ ihe a na-emepụta na ihe ọhụrụ ọ bụla dị n’ahịa. Ma, ezi Ndị Kraịst achọghị ka ọ bụrụ ụwa Setan na-ekpebiri ha ihe ha ga-ewere ka ihe kacha mkpa ná ndụ. (1 Jọn 2:15-17) Gịnịkwanụ ka ndị lara ezumike nká nwere ike ime? Ihe kacha mma ha ga-eji oge ha mee bụ ịsụ ụzọ na iji ozi Jehova kpọrọ mkpa.

17 Onye ọ bụla raara onwe ya nye Jehova kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: Gịnị ka m weere ka ihe kacha mkpa? M̀ bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? Èji m oge m na ike m na-ejere Chineke ozi otú ahụ Jizọs mere? M̀ na-eme ihe Jizọs kwuru ma na-eso ya mgbe niile? M̀ nwere ike ịhazigharị ihe m na-eme ka m nwee ike iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụ na-arụ ihe ndị ọzọ n’ozi Jehova? Ọ bụrụgodị na agaghị m abụli ọsụ ụzọ ugbu a, àna m agbalịsi ike ijikwu oge m na ike m na-eje ozi Jehova?

‘INWE ỌCHỊCHỌ NA IME IHE’

18, 19. Gịnị ka anyị nwere ike itinye n’ekpere? Gịnịkwa mere ụdị ekpere ahụ ga-eji tọọ Jehova ụtọ?

18 Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka ndị Chineke na-anụ ọkụ n’obi. Ma e nwere ụfọdụ ndị ga-arụli ọrụ ịsụ ụzọ ma ha echeghị na ha ruru eru ịrụ ya ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha achọghị ịbụ ndị ọsụ ụzọ. (Ọpụ. 4:10; Jere. 1:6) Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka i tinye ya n’ekpere? Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya na ‘Chineke na-arụ ọrụ n’ime ha n’ihi ihe dị ya ụtọ, ka ha wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.’ (Fil. 2:13) Ọ bụrụ na ị chọghị iwepụtakwu oge maka ozi Jehova, rịọ Jehova ka o mee ka i nwee ọchịchọ ime otú ahụ ma mee ya.—2 Pita 3:9, 11.

19 Noa, Mozis, Jeremaya, Pọl, na Jizọs ji obi ha niile jeere Chineke ozi. Ha ji oge ha na ike ha zisaa ozi Jehova iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Ha ekweghị ka ihe ọ bụla megharịa ha anya. Ọgwụgwụ ụwa ochie a adịla ezigbo nso. N’ihi ya, anyị niile bụ́ ndị raara ndụ anyị nye Chineke kwesịrị ijisi ike na-eṅomi ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. (Mat. 24:42; 2 Tim. 2:15) Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị Jehova ụtọ, ọ ga-agọzikwa anyị nke ukwuu.—Gụọ Malakaị 3:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Gụọ akwụkwọ bụ́ Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị, peeji nke 104-106.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị bi n’oge Noa egeghị ntị n’ozi ọ na-ezi ha

[Foto dị na peeji nke 24]

Ì chesiela echiche ike ma ì nwere ike ịmalite ozi ịsụ ụzọ oge niile?