Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Mmụọ Nsọ Duru Ha’

‘Mmụọ Nsọ Duru Ha’

‘Mmụọ Nsọ Duru Ha’

“Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 PITA 1:21.

IHE NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Olee otú Chineke si jiri mmụọ nsọ mee ka ndị dere Baịbụl nweta ozi ha dere?

Olee ihe ndị gosiri na Baịbụl bụ Okwu Chineke?

Gịnị ka ị ga na-eme kwa ụbọchị iji gosi na i ji Okwu Chineke kpọrọ ihe?

1. Gịnị mere Okwu Chineke ji dị anyị mkpa?

N’ỤWA niile, ọtụtụ ndị na-ajụ ajụjụ ndị dị ka: Olee otú ndụ anyị si malite? Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa a? Ebee ka anyị na-aga? Gịnị mere ụwa ji dị otú a ọ dị? Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ? A sị na e nweghị Okwu Chineke, olee otú anyị ga-esi mata azịza ajụjụ ndị ahụ na ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa? E wepụ Akwụkwọ Nsọ, ihe ga-eme ka anyị mụta ihe bụ ihe ndị mere anyị. A sị na ọ dị otú ahụ, ànyị ga-enwe ike ikwu ụdị ihe ahụ ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru banyere “iwu Jehova”?—Gụọ Abụ Ọma 19:7.

2. Gịnị ga-enyere anyị aka iji Baịbụl, bụ́ onyinye si n’aka Chineke, kpọrọ ihe mgbe niile?

2 Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị ejighịzi eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe. (Tụlee Mkpughe 2:4.) Ha anaghịzi eme ihe Jehova kwuru. (Aịza. 30:21) Anyị ekwesịghị ime ka ha. Anyị nwere ike ịgbalịsi ike ka anyị jiri Baịbụl na ihe ọ na-akụzi kpọrọ ihe mgbe niile, anyị kwesịkwara ime otú ahụ. Baịbụl bụ onyinye dị mkpa Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya nyere anyị. (Jems 1:17) Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka anyị jiri “okwu Chineke” kpọrọkwuo ihe? Otu ihe ga-enyere anyị aka bụ iche echiche banyere otú Chineke si duzie ndị dere Baịbụl. Anyị kwesịkwara ịtụle ihe ndị gosiri na Baịbụl si n’aka Chineke. Ime otú ahụ kwesịrị ime ka anyị chọọ ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-eme ihe anyị mụtara na ya.—Hib. 4:12.

OLEE OTÚ ‘MMỤỌ NSỌ SI DUO HA’?

3. Olee otú ‘mmụọ nsọ si duo’ ndị amụma na ndị dere Baịbụl?

3 Ide Baịbụl were otu puku afọ na narị isii na iri, malite n’afọ 1513 T.O.A. ruo n’afọ 98 O.A. Ndị dere ya dị ihe dị ka ndị ikom iri anọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị amụma, bụ́ ndị ‘mmụọ nsọ duru.’ (Gụọ 2 Pita 1:20, 21.) Okwu Grik e si na ya sụgharịta “na-edu” pụtara “isi n’otu ebe buru ihe gaa n’ebe ọzọ.” ‘Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ya bụ: inuga mmadụ ebe ọzọ, iduzi mmadụ, ma ọ bụ mmadụ ikwe ka e nuga ya ebe ọzọ.’ * N’Ọrụ Ndịozi 27:15, e ji okwu ahụ kọwaa ụgbọ ifufe bu na-aga. ‘Mmụọ nsọ duru’ ndị amụma na ndị dere Baịbụl n’ihi na Chineke ji ike ya nọ n’ọrụ gwa ha okwu, kpalie ha, duziekwa ha. N’ihi ya, ihe ha dere bụ echiche Chineke, ọ bụghị nke ha. Mgbe ụfọdụ, ndị amụma na ndị dere Baịbụl aghọtaghịdị ihe ha buru n’amụma ma ọ bụ ihe a gwara ha dee. (Dan. 12:8, 9) N’eziokwu, “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,” ọ bụghị echiche mmadụ ka e dere na ya.—2 Tim. 3:16.

4-6. Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si mee ka ndị dere Baịbụl nweta ozi ha dere? Nye ihe atụ.

4 Ma olee otú Chineke si jiri mmụọ nsọ ya mee ka ndị dere Baịbụl nweta ozi ha dere? À gwara ha kpọmkwem okwu ndị ha ga-ede, ka à gwara ha ihe ha ga-ede ka ha dee ya n’okwu nke ha? Chegodị otú ọchụnta ego si ede akwụkwọ ozi. Mgbe ọ dị mkpa ka e dee okwu ụfọdụ n’akwụkwọ ozi ọ chọrọ ka e dee, ọ na-eji aka ya ede ya ma ọ bụkwanụ ya agwa odeakwụkwọ ya okwu ndị ọ ga-ede. Odeakwụkwọ ahụ na-ede akwụkwọ ozi ahụ, ọchụnta ego ahụ abịanye aka na ya. N’oge ndị ọzọ, o nwere ike ịgwa odeakwụkwọ ya ihe ndị ọ chọrọ ka o dee, hapụzie ya ka o dee ya n’okwu nke ya. Ọchụnta ego ahụ nwere ike ịgụ akwụkwọ ozi ahụ ma gwa odeakwụkwọ ahụ ka o degharịa ihe ụfọdụ. E dechaa akwụkwọ ozi ahụ, ọchụnta ego ahụ na-abịanye aka na ya. Onye a ga-ezigara ya ga-ama na ọ bụ ọchụnta ego ahụ dere ya.

5 N’otu aka ahụ, e nwere ihe ụfọdụ Chineke ji ‘mkpịsị aka ya’ dee na Baịbụl. (Ọpụ. 31:18) Mgbe e nwere okwu ụfọdụ e kwesịrị ide, Jehova gwara onye ga-ede ya okwu ndị ọ ga-ede. Dị ka ihe atụ, Ọpụpụ 34:27 kwuru, sị: “Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: ‘Deere onwe gị okwu ndị a, n’ihi na ọ bụ dị ka okwu ndị a si dị ka mụ na gị na Izrel na-agba ndụ.’” Jehova gwakwara Jeremaya onye amụma, sị: “Dee okwu niile m ga-agwa gị n’akwụkwọ.”—Jere. 30:2.

6 Ma ọtụtụ mgbe, Chineke agwaghị ndị dere Baịbụl okwu ndị ha ga-ede, kama, o ji mmụọ nsọ ya tinye ihe ọ chọrọ ka ha dee n’obi ha nakwa n’uche ha ma hapụ ha ka ha jiri aka ha chọta okwu ndị ha ga-eji dee ya. Ekliziastis 12:10 kwuru, sị: “Onye mkpọkọta gbara mbọ ịchọta okwu dị ụtọ na ide okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.” Luk ‘si ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi ma dee ha n’usoro n’usoro.’ (Luk 1:3) Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ezughị okè mmadụ ghara ịgbanwe ozi ya.

7. Gịnị mere o ji dị mma na Chineke ji ndị mmadụ dee Baịbụl?

7 Otú Chineke si jiri ụmụ mmadụ dee Baịbụl gosiri na o nwere amamihe dị ukwuu. Ihe e dere ede na-enyere anyị aka ịghọta ihe a chọrọ ikwu, meekwa ka anyị mata otú obi dị onye dere ya. Gịnị gaara eme ma a sị na Jehova ji ndị mmụọ ozi dee Baịbụl? Hà gaara enwe ike ịkọwa ihe ndị dị ka egwu, iru uju, na mwute otú ndị mmadụ ga-aghọta ha? Okwu Chineke na-eru anyị n’obi n’ihi na Chineke kwere ka ndị mmadụ na-ezughị okè jiri aka ha chọta okwu ndị ha ga-eji dee ihe o kpugheere ha.

IHE NDỊ GOSIRI NA BAỊBỤL SI N’AKA CHINEKE

8. Gịnị mere a ga-eji kwuo na Baịbụl adịghị ka akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ?

8 E nwere ọtụtụ ihe gosiri na Baịbụl si n’aka Chineke. Baịbụl na-eme ka anyị mata Chineke. E nweghị akwụkwọ okpukpe ọzọ dị ka ya. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ okpukpe ndị Hindu kọrọ banyere ememme ndị Hindu, amamihe ndị mmadụ, akụkọ ọdịbendị, na iwu ndị gbasara omume. Akwụkwọ okpukpe ndị Buda kọwara iwu ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ ha kwesịrị ịna-edebe. Ha nwekwara akwụkwọ kọwara ihe ha kweere na ihe dị iche iche Buda kwuru. Buda ekwughị na yanwa bụ chi, o kwughịkwa ọtụtụ ihe banyere Chineke. Akwụkwọ ndị okpukpe Kọnfushọs kwuru banyere ihe ndị mere n’oge gara aga, iwu gbasara omume, anwansi na abụ. N’eziokwu, akwụkwọ ndị Alakụba na-akụzi na e nwere otu Chineke nakwa na ọ ma ihe niile, marakwa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, ma o meghịdị ka a mara na aha Chineke bụ Jehova. Aha ahụ pụtara ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl.

9, 10. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta na Baịbụl banyere Chineke?

9 N’agbanyeghị na e nweghị ezigbo ihe ọtụtụ akwụkwọ okpukpe kwuru banyere Chineke, Baịbụl na-eme ka anyị mata Jehova Chineke na ihe ndị ọ na-eme. Ọ na-enyere anyị aka ịmata àgwà ya dị iche iche. Baịbụl na-agwa anyị na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, nwee amamihe, na ike dị ukwuu. Ọ gwakwara anyị na Chineke hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Jọn 3:16; 1 Jọn 4:19.) Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) E nwere ike ikwu na otú e si nwee Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ gosiri na ihe e kwuru n’ebe a bụ eziokwu. Ndị ọkachamara n’ihe gbasara asụsụ kwuru na a na-asụ ihe dị ka puku asụsụ isii na narị asaa n’ụwa taa. E kee mmadụ niile bi n’ụwa ụzọ iri, ihe dị ka ụzọ itoolu na-aghọta otu narị n’ime asụsụ ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, a sụgharịala Baịbụl dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị anọ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ụwa nwere ike ịgụ Baịbụl zuru ezu ma ọ bụ nke na-ezughị ezu n’asụsụ nke ya.

10 Jizọs kwuru, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.” (Jọn 5:17) ‘Site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Jehova bụ Chineke.’ N’ihi ya, chegodị banyere ihe niile ọ rụrụ! (Ọma 90:2) Ọ bụ naanị Baịbụl na-agwa anyị ihe Chineke mere n’oge gara aga na ihe ndị ọ na-eme ugbu a nakwa ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu. Akwụkwọ Nsọ na-emekwa ka anyị mara ihe na-eme Chineke obi ụtọ na ihe na-ewe ya iwe. Ọ na-egosikwa anyị otú anyị ga-esi bịaruo ya nso. (Jems 4:8) Ka anyị ghara ikwe ka ihe ndị ọzọ anyị na-achụ ma ọ bụ ihe ndị na-echegbu anyị mee ka anyị hapụ Jehova.

11. Olee amamihe dị ukwuu e kwesịrị ịtụkwasị obi nke dị na Baịbụl?

11 Amamihe dị ukwuu e kwesịrị ịtụkwasị obi nke dị na Baịbụl na-egosikwa na o si n’aka Onye dị elu karịa ụmụ mmadụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ònye maara uche Jehova, ka o wee kụziere ya ihe?” (1 Kọr. 2:16) Ajụjụ ahụ Pọl jụrụ yiri ihe Aịzaya onye amụma jụrụ ndị bi n’oge ya. Ọ jụrụ ha, sị: “Ònye tụworo otú mmụọ Jehova hà, ònyekwa pụrụ ịbụ onye ndụmọdụ ya nke pụrụ ịkụziri ya ihe ọ bụla?” (Aịza. 40:13) Azịza ya bụ na o nweghị onye ọ bụ. Ka a sịkwa ihe mere ime ihe Baịbụl kwuru banyere alụmdi na nwunye, ịzụ ụmụaka, ntụrụndụ, mkpakọrịta, ịrụsi ọrụ ike, ịkwụwa aka ọtọ, na omume ọma ji eme ka anyị rite uru na-enweghị atụ! A naghị enweta ndụmọdụ na-adịghị mma na Baịbụl. Ma, ndị mmadụ enweghị amamihe ga-eme ka ndụmọdụ ha baa uru mgbe niile. (Jere. 10:23) Ha na-agbanwe ndụmọdụ ha mgbe niile ma ha chọpụta na ndụmọdụ ha nyeburu adabaghị adaba. Baịbụl kwuru na ‘ihe ụmụ mmadụ na-eche dị ka ume e kupụrụ ekupụ.’—Ọma 94:11.

12. Olee ihe ndị mmadụ merela iji bibie Baịbụl?

12 Ihe ọzọ mere anyị ga-eji kweta na Baịbụl si n’aka Chineke bụ na ihe mere eme gosiri na a gbaala mbọ ibibi Baịbụl. N’afọ 168 T.O.A., Eze Antiokọs nke Anọ, nke chịrị Siria, nyere iwu ka a chọta akwụkwọ Iwu Mozis ma kpọọ ha ọkụ. N’afọ 303 O.A., Eze Ukwu Dayọklishan (Diocletian), nke chịrị Rom, nyere iwu ka e bibie ebe Ndị Kraịst na-ezukọ ma kpọọ Akwụkwọ Nsọ ha ọkụ. E mere ya afọ iri. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị poopu mere ihe ọ bụla ha nwere ike ime ka a kwụsị ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ dị iche iche n’ihi na ha achọghị ka ndị mmadụ mụta eziokwu dị na Baịbụl. N’agbanyeghị ihe ahụ Setan na ndị òtù ya mere, Baịbụl ka dịkwa ruo taa. Jehova ekwebeghị ka onye ọ bụla bibie onyinye a o nyere ụmụ mmadụ.

IHE MERE ỌTỤTỤ NDỊ JI KWERE

13. Olee ihe ndị mere anyị ji kweta na Baịbụl si n’aka Chineke?

13 E nwere ihe ndị ọzọ mere ndị mmadụ ji kwere na Baịbụl si n’aka Chineke. Baịbụl anaghị emegide onwe ya. Ihe o kwuru banyere sayensị bụ eziokwu. Amụma ndị e buru na ya na-emezu. Ndị dere ya dere ihe ndị ha mejọrọ. Baịbụl nwekwara ike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ. Akụkọ ndị ọ kọrọ mere eme. Ọ zakwara ajụjụ ndị ahụ a jụrụ na paragraf nke mbụ. Ka anyị tụlee ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ikweta na Baịbụl si n’aka Chineke.

14-16. (a) Gịnị mere ka onye Alakụba, onye Hindu, na onye obi na-esighị ike na Chineke dị kweta na Baịbụl si n’aka Chineke? (b) Gịnị ka ị ga-agwa ndị mmadụ n’ozi ọma iji gosi ha na Baịbụl si n’aka Chineke?

14 Otu nwoke aha ya bụ Anwar * bụ onye Alakụba. O toro n’otu obodo ọtụtụ ndị bi na ya bụ ndị Alakụba. Mgbe o bi n’Amerịka, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya. Anwar kwuru, sị: “N’oge ahụ, akpọrọ m ndị niile bụ́ Ndị Kraịst asị n’ihi ọbara niile ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst kwafuru n’oge gara aga. Ma, ebe ọ bụ na m na-achọkarị ịmụta ihe, m kwere ka a mụwara m Baịbụl.” N’oge na-adịghị anya, Anwar laghachiri n’obodo ha, ma o nweghị ike ịchọta Ndịàmà Jehova. Ka ọtụtụ afọ gachara, ọ kwagara Yurop, a malitekwara ịmụrụ ya Baịbụl. O mechara kwuo, sị: ‘Aghọtara m na amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu, na ndị niile so dee Baịbụl kwuru otu ihe, na Baịbụl anaghị emegide onwe ya, nakwa na ndị na-efe Jehova hụrụ ibe ha n’anya. Ihe a niile mere ka m kweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke.’ E mere Anwar baptizim n’afọ 1998.

15 Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Asha si n’ezinụlọ na-ekpe okpukpe Hindu. O kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere naanị mgbe m gara n’ụlọ nsọ ma ọ bụ mgbe ihe siiri m ike, ma anaghị m echeta Chineke mgbe ihe dịịrị m mma.” O kwukwara, sị: “Ndụ m gbanwere kpamkpam mgbe Ndịàmà Jehova kụụrụ m aka n’ọnụ ụzọ.” Asha mụrụ Baịbụl ma ghọọ enyi Chineke. Gịnị mere ka obi sie ya ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke? O kwuru, sị: “Baịbụl zara ajụjụ m niile. O nyeere m aka inwe okwukwe n’ahụghị Chineke anya, ya bụ, n’agaghị n’ụlọ nsọ kpọọrọ ihe a kpụrụ akpụ isiala.”

16 Otu nwaanyị aha ya bụ Paula toro n’ezinụlọ ndị Katọlik. Ma, mgbe o topụtara, obi esighị ya ike na Chineke dị. E nweziri ihe merenụ. O kwuru, sị: “Ahụrụ m otu enyi m m na-ahụbeghị kemgbe ọtụtụ ọnwa. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-ebu ogologo ntutu, na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ. Mgbe m hụrụ na ọ gbanwechaala, na ọ kpụchaala isi ya, na-enwekwa obi ụtọ, ajụrụ m ya, sị: ‘Gịnị mere gị, ebee ka ị nọ kemgbe?’ Ọ gwara m na ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ọ malitekwara izi m ozi ọma.” Mgbe Paula hụrụ otú eziokwu Baịbụl si mee ka enyi ya gbanwee, o nwere mmasị n’ozi Baịbụl ma kwere na Baịbụl si n’aka Chineke.

“OKWU GỊ BỤ ORIỌNA NKE NA-ENYE ỤKWỤ M ÌHÈ”

17. Olee uru ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na ịtụgharị uche na ya ga-abara gị?

17 Baịbụl bụ onyinye na-enweghị atụ Jehova ji mmụọ nsọ ya nye anyị. Ka ịgụ ya na-atọ gị ụtọ kwa ụbọchị, ị ga-ahụkwu ya n’anya, hụkwuokwa Onye nyere anyị ya n’anya. (Ọma 1:1, 2) Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịgụ Baịbụl, buru ụzọ kpee ekpere ma rịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya ka i nwee ike ịghọta ihe ị na-agụ. (Luk 11:13) Ihe dị na Baịbụl bụ uche Chineke. N’ihi ya, ka ị na-atụgharị uche n’ihe o kwuru, ị ga-amụta iche echiche ka Chineke.

18. Gịnị mere i ji chọọ ịnọgide na-amụ Baịbụl?

18 Ka ị na-amụtakwu eziokwu Baịbụl, na-eme ihe ị mụtara. (Gụọ Abụ Ọma 119:105.) Na-agụ Baịbụl ka à ga-asị na ị na-ele onwe gị anya n’enyo. Ị hụ ebe i kwesịrị ịgbanwe, gbanwee. (Jems 1:23-25) Jiri Okwu Chineke mere mma agha ị ga-eji na-agbachitere ihe i kweere, jirikwa ya na-ewepụ ozizi ụgha n’obi ndị dị umeala n’obi. (Efe. 6:17) Ka ị na-eme otú ahụ, na-ekele Chineke na ‘mmụọ nsọ ya duru’ ndị amụma na ndị ọzọ o ji dee Baịbụl.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Akwụkwọ bụ́ A Greek-English Lexicon of the New Testament and Other Early Christian Literature.

^ par. 14 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ị ga-ahụkwu Onye nyere anyị ya n’anya

[Foto dị na peeji nke 26]

Onye nwe akwụkwọ ozi bụ onye bịanyere aka na ya