Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mara Ihe—Chọọ “Ezi Ntụziaka”

Mara Ihe—Chọọ “Ezi Ntụziaka”

Mara Ihe—Chọọ “Ezi Ntụziaka”

E ji ndụ tụnyere iji ụgbọ mmiri eme njem. Ma, o doola anya na ọtụtụ mgbe, amamihe mmadụ anaghị enyechara ndị mmadụ aka imeri nsogbu ndị na-abịara ha. Nsogbu ndị na-abịara ọtụtụ ndị na-eme ka ha yie ndị oké ebili mmiri mere ka ụgbọ ha kpuo. (Ọma 107:23, 27) Gịnị mere ihe atụ ahụ ji daba adaba?

N’oge ochie, ịkwọ ụgbọ mmiri anaghị adị mfe. A na-eji nkà eme ya. A na-amụta ya n’aka ndị rụrụla ọrụ n’ụgbọ mmiri ọtụtụ afọ, ikekwe onyeisi ụgbọ. (Ọrụ 27:9-11) Ọtụtụ ndị sere ihe n’oge ochie sere ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ka ha buo ibu karịa ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri iji gosi otú ọrụ ha si dị mkpa. Tupu ndị na-akwọ ụgbọ mmiri akwọrọ ụgbọ gawa, ha na-ebu ụzọ mụọ banyere kpakpando, ifufe, na ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ịgaru ebe ha na-aga. Baịbụl kpọrọ ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri “ndị nwere nkà,” nke nwere ike ịpụta ndị maara ihe.—Ezik. 27:8.

Nsogbu ndị na-abịara anyị taa nwere ike isi ike ka iji ụgbọ mmiri eme njem n’oge ochie. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka?

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NWETA “EZI NTỤZIAKA”?

Cheta na e ji ndụ tụnyere iji ụgbọ mmiri eme njem. Ugbu a, chee banyere eziokwu a e kwuru na Baịbụl, ya bụ: “Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka, ọ bụkwa onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka.” (Ilu 1:5, 6) E nwere ike iji okwu Hibru e si na ya sụgharịta “ezi ntụziaka” kọwaa ihe onyeisi ụgbọ mmiri na-eme n’oge ochie. Okwu ahụ pụtara na onyeisi ụgbọ ma otú e si eji nkà eduzi ụgbọ.

N’agbanyeghị na ọ dịghị mfe, anyị nwere ike inweta “ezi ntụziaka” ma mụta ime nke ọma n’ihe ndị anyị na-eme. Dị ka e kwuru n’akwụkwọ Ilu, anyị kwesịrị iji “amamihe” na “nghọta” na-ekpebi ihe ndị anyị na-eme. (Ilu 1:2-6; 2:1-9) Anyị kwesịrị ịchọ ka Chineke na-eduzi anyị, n’ihi na ndị ajọ omume nwere ike ịma otú ha ga-esi duhie mmadụ.—Ilu 12:5.

N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-amụsi Okwu Chineke ike. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị mụta ihe bara ezigbo uru banyere Jehova na onye kacha ṅomie ya, bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 14:9) Anyị na-enweta ọtụtụ ezigbo ndụmọdụ n’ọmụmụ ihe. Anyị nwekwara ike ịmụta ihe n’aka ndị mụrụ anyị nakwa n’aka ndị ọzọ.—Ilu 23:22.

CHEE ECHICHE MA KPEBIE IHE Ị GA-EME

“Ezi ntụziaka” dị mkpa karịchaa mgbe anyị nọ ná nsogbu ndị yiri oké ebili mmiri. Inwe obi abụọ mgbe nsogbu tara akpụ bịaara anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịma ihe anyị ga-eme, nke ga-akpatara anyị nnukwu nsogbu.—Jems 1:5, 6.

A na-ejikwa okwu ahụ e si na ya sụgharịta “ezi ntụziaka” akọwa ịlụ agha. Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi na ị ga-eji ezi ntụziaka buo agha gị, ọtụtụ ndị ndụmọdụ na-emekwa ka e nwee nzọpụta.”—Ilu 20:18; 24:6.

Dị ka ọchịagha nke na-ahazi ndị agha ya, anyị kwesịrị ịtụ anya ihe ndị nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (Ilu 22:3) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị chọrọ ikpebi ma ị̀ ga-ekweta ịrụ ọrụ ọhụrụ a chọrọ inye gị ma ọ bụ kwe ka e bugoo gị n’ọkwá. O doro anya na ị ga-atụle ego ole a ga-akwụ gị, oge ọ ga na-ewe gị ịga ọrụ na ịlọta, na ihe ndị ọzọ. Ma, ihe ndị ọzọ i kwesịrị ichebara echiche bụ: Ịrụ ụdị ọrụ ahụ ọ̀ ga-emegide ihe Baịbụl kwuru? Awa ole m ga-eji na-arụ ya na mgbe m kwesịrị ịrụ ya ò nwere ike ime ka m ghara ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma?—Luk 14:28-30.

Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Loretta na-arụ ọrụ na-enye ya ezigbo ego n’otu nnukwu ụlọ ọrụ. Mgbe a chọrọ ibuga ụlọ ọrụ ahụ ebe ọzọ, a gwara Loretta na a ga-enye ya nnukwu ọkwá n’ebe ahụ. Ndị isi ụlọ ọrụ ha gwara ya, sị: “Ọrụ a bụ ọrụ onye ọ bụla na-achọ achọ. Anyị achọpụtala na e nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ahụ.” Ma, Loretta chọrọ ịkwụsịlata ihe ndị na-eri ya oge ka o nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ọ chọpụtara na ọkwá ọhụrụ ahụ ga-eme ka ọ ghara inwecha ohere ịga ọmụmụ ihe. N’ihi ya, ọ gbara arụkwaghịm n’agbanyeghị na onyeisi ha gwara ya na ọ bụ naanị ya ka ha chọrọ ka ọ ka na-arụrụ ha ọrụ. Loretta asụọla ụzọ ihe dị ka afọ iri abụọ, obi sikwara ya ike na ihe mere ka o rite uru n’ozi ya bụ na o ji “ezi ntụziaka” hazie ihe ndị ọ chọrọ ime, ya bụ, iji ndụmọdụ Baịbụl kpebie ihe ọ ga-eme. O mere ka ya na Jehova dịkwuo ná mma, o nyekwarala ọtụtụ ndị aka ịnata eziokwu.

“Ezi ntụziaka” dị ezigbo mkpa n’ezinụlọ. Ịzụ ụmụ bụ ọrụ a na-arụ ọtụtụ afọ. Ihe ndị nne na nna kpebiri ime n’ihe gbasara ofufe Chineke ma ọ bụ otú ha ga-esi na-egbo mkpa ezinụlọ ha nwere ike ịbara ndị ezinụlọ ha niile uru ma ọ bụ kpatara ha nsogbu n’ọdịnihu. (Ilu 22:6) Dị ka ihe atụ, nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ike ịjụ onwe ha, sị: ‘Okwu anyị na omume anyị ọ̀ na-akụziri ụmụ anyị na ha kwesịrị ịbịaru Jehova nso ka ha nwee ike imeri nsogbu ndị ha ga-enwe ma ha too? Ụdị ndụ anyị na-ebi ọ̀ na-enyere ha aka ịghọta na ihe ha nwere kwesịrị iju ha afọ nakwa na mkpa ha kwesịrị ịbụ ozi Chineke?’—1 Tim. 6:6-10, 18, 19.

Ọ bụghị akụ̀ ma ọ bụ ọkwá ndị ụwa na-achụkarị ka e ji amata onye ihe na-agaziri n’eziokwu. Eze Sọlọmọn ghọtara na ihe a bụ eziokwu. O dere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu ezi Chineke mma, n’ihi na ha tụrụ egwu ya.” (Ekli. 8:12) Ihe ahụ o kwuru gosiri na onye maara ihe na-achọ “ezi ntụziaka” nke si n’Okwu Chineke.—2 Tim. 3:16, 17.

[Foto dị na peeji nke 30]

A na-ese ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ka ha buo ibu karịa ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri iji gosi otú ọrụ ha si dị mkpa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Su concessione del Ministero per i Beni e le Attività Culturali. E kwesịghị isi n’ụzọ ọ bụla ma ọ bụ jiri ihe ọ bụla seghachi ihe e sere n’ebe a.