Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Chineke Ji Chọọ Ka Ndị Na-efe Ya Na-alụ Naanị Ndị Ha na Ha Na-efe Chineke?

Gịnị Mere Chineke Ji Chọọ Ka Ndị Na-efe Ya Na-alụ Naanị Ndị Ha na Ha Na-efe Chineke?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị Mere Chineke Ji Chọọ Ka Ndị Na-efe Ya Na-alụ Naanị Ndị Ha na Ha Na-efe Chineke?

▪ N’Iwu Chineke nyere mba Izrel, ọ gwara ha banyere mba ndị ọzọ, sị: “Gị na ha agọkwala ọgọ. Akpọrọla nwa gị nwaanyị kpọnye nwa ya nwoke, alụtarala nwa gị nwoke nwa ya nwaanyị.” (Diuterọnọmi 7:3, 4) Gịnị mere Chineke ji nye ha iwu a?

Ihe mere Jehova ji nye ha iwu ahụ bụ na ọ maara na Setan chọrọ ime ka ndị Izrel kwụsị ife Jehova ma fewe chi ụgha dị iche iche. Ọ bụ ya mere Chineke ji dọọ ndị Izrel aka ná ntị banyere ndị ahụ na-efe chi ụgha, sị: “[Ha] ga-eme ka nwa gị nwoke kwụsị iso m, ha ga-efekwa chi ọzọ dị iche iche.” Ọtụtụ ihe ga-emebi ma nke a mee. Ọ bụrụ na mba Izrel efewe chi ụgha, Chineke ga-akpọ ha asị, ọ ga-akwụsị ichebe ha, ha ga-aghọkwara ndị iro ha anụ oriri. Ọ bụrụ na ha efewe chi ụgha, Mesaya ahụ e kwere ná nkwa agaghịzi esi ná mba ahụ abịa. O doro anya na Setan ma ihe mere o ji chọọ ka ndị Izrel lụwa ndị na-efe chi ụgha.

Ihe ọzọ mere Chineke ji nye ụmụ Izrel iwu ahụ bụ na ọ hụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha n’anya. Chineke maara na onye Izrel ọ bụla ga-enwe obi ụtọ, ihe adịkwara ya ná mma ma ọ bụrụ na onye ahụ na Chineke adịrị ná mma. Ò nwere ezigbo ihe mere Jehova ji chọọ ka onye nke ọ bụla ghara ịlụ onye na-anaghị efe Jehova? Legodị ihe mere Eze Sọlọmọn. Sọlọmọn maara nsogbu Jehova kwuru na ndị Izrel ga-enwe ma ha lụọ ụmụ nwaanyị ndị na-anaghị efe Jehova. Jehova sịrị: “Ha ga-enweta obi unu iso chi ha.” Ebe ọ bụ na Sọlọmọn maara ihe nke ukwuu, o nwere ike ịbụ na o chere na iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel agbasaghị ya. O rubereghị Chineke isi. Gịnị meziri? “Ndị nwunye ya wee jiri nke nta nke nta mee ka obi ya chigharịa . . . soro chi ọzọ dị iche iche.” Ị̀ hụrụ nsogbu nke a kpataara ya? Jehova jụrụ Sọlọmọn, e kewakwara mba Izrel abụọ n’ihi nnupụisi ya.—1 Ndị Eze 11:2-4, 9-13.

Ma ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na e nwere ụfọdụ ndị Izrel lụrụ ndị na-efe chi ụgha ma ha efeghị chi ụgha. Dị ka ihe atụ, otu nwoke Izrel aha ya bụ Malọn lụrụ nwaanyị Moab aha ya bụ Rut, Rut emechaa ghọọ ezigbo onye na-efe Chineke. Ma ịlụ nwaanyị Moab nwere ike ibutere nwoke Izrel nsogbu. E nwekwanụghị ebe e kwuru na ihe ahụ Malọn mere dị mma. Malọn nwụchuru ọnwụ, ọ ga-abụdị na ọ nwụrụ tupu Rut amalite ife Jehova Chineke. Nwanne Malọn aha ya bụ Kilịọn lụkwara nwaanyị Moab aha ya bụ Ọpa. Ma, Ọpa akwụsịghị ife ‘chi ndị ọ na-efe.’ Mgbe Boaz lụrụ Rut, Rut aghọọla onye na-efe Chineke. Ndị Juu mechara were Rut ka ‘ezigbo onye na-efe Chineke ndị Juu.’ Jehova gọziri ọlụlụ Rut na Boaz lụrụ.—Rut 1:4, 5, 15-17; 4:13-17.

Mmadụ ò kwesịrị iche na ebe ọ bụ na Malọn lụrụ Rut, Rut emechaa fewe Jehova, na ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ lụọ onye na-anaghị efe Jehova? Iche otú ahụ ọ́ dịghị ka mmadụ ịsị na ịgba chaa chaa dị mma maka na e nwere otu onye gbara chaa chaa ma rite ego buru ibu?

Baịbụl gwara Ndị Kraịst taa ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” Ọ dọkwara ha aka ná ntị ka ha ‘na ndị na-ekweghị ekwe ghara ikekọta onwe ha, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ.’ Ọ bụ ezigbo Ndị Kraịst ndị na-achọ di ma ọ bụ nwunye ka e nyere ndụmọdụ a. Baịbụl nyekwara Ndị Kraịst ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ ndị na-anaghị efe Jehova ndụmọdụ ga-enyere ha aka n’ezinụlọ ha. (1 Ndị Kọrịnt 7:12-16, 39; 2 Ndị Kọrịnt 6:14) Ndụmọdụ a niile gosiri na Jehova Chineke, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, chọrọ ka ndị niile na-efe ya nwee obi ụtọ, ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ma ndị na-alụghị.