Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwe Ka Jehova Mee Ka I Nwere Onwe Gị n’Ezie

Kwe Ka Jehova Mee Ka I Nwere Onwe Gị n’Ezie

Kwe Ka Jehova Mee Ka I Nwere Onwe Gị n’Ezie

“Na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe.”—JEMS 1:25.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

Olee iwu na-eme ka mmadụ nwere onwe ya n’ezie, oleekwa ndị ọ na-abara uru?

Gịnị ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’ezie?

Olee otú ndị niile na-erubere Chineke isi ga-esi nwere onwe ha n’ọdịnihu?

1, 2. (a) Gịnị mere ndị mmadụ ji chịrị obi n’aka? (b) Olee nnwere onwe ndị ohu Jehova ga-enweta n’ọdịnihu?

N’OGE anyị a, ndị mmadụ na-enwekwu anyaukwu, na-emebi iwu, na-emekwa ihe ike. (2 Tim. 3:1-5) N’ihi ya, ndị ọchịchị na-emekwu iwu, na-enyekwu ndị uwe ojii ngwá ọrụ, na-etinyekwa onyokomita e ji enyo ndị mmadụ. Ná mba ụfọdụ, ndị mmadụ na-etinye ihe ga-eme ka ha mata mgbe ndị ohi bịara n’ụlọ ha, rụnyekwuo ihe e ji akpọchi ụzọ. Ụfọdụ na-ejidị ihe nwere ike ịdọgbu mmadụ gbaa ụlọ ha ogige. Ọtụtụ ndị anaghị apụ apụ n’abalị, ha anaghịkwa ekwe ka ụmụ ha gwurie egwu n’èzí naanị ha, ma n’ehihie ma n’abalị. O doro anya na ndị mmadụ chị obi n’aka. O yighị ka nsogbu ahụ ọ̀ ga-akwụsị.

2 N’ogige Iden, Setan kwuru na ihe ga-eme ka mmadụ nwere onwe ya n’ezie bụ ịgbakụta Jehova azụ. Ihe ahụ o kwuru bụ ụgha chara acha! N’eziokwu, ka ndị mmadụ na-elegharakwu iwu Chineke anya, otú ahụ ka mmadụ niile na-atakwu ahụhụ. Nsogbu a na-emekwa ka anyị bụ́ ndị ohu Jehova na-ata ahụhụ. Ma, anyị nwere olileanya na otu ụbọchị, ndị mmadụ ga-akwụsị ịbụ ohu mmehie na ire ure ma nweta ihe Baịbụl kpọrọ “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) N’eziokwu, Jehova amalitela ịkwadebe ndị ohu ya maka ụdị nnwere onwe ahụ. Olee otú o si eme ya?

3. Olee iwu Jehova nyere ndị na-eso ụzọ Kraịst, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 Otú Jehova si akwadebe anyị bụ inye anyị ihe Jems kpọrọ ‘iwu zuru okè nke na-eweta nnwere onwe.’ (Gụọ Jems 1:25.) Nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ kpọrọ ya “iwu ahụ zuru oke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya” (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) na “iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe” (Bible Nsọ nke Union Version). Ma, e kwute okwu iwu, ndị mmadụ na-echekarị banyere ihe na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́, ọ bụghị ihe na-eme ka mmadụ nwere onwe ya. Gịnịzi bụ ‘iwu zuru okè nke na-eweta nnwere onwe’? Oleekwa otú iwu ahụ si eme ka anyị nwere onwe anyị?

IWU NKE NA-EME KA MMADỤ NWERE ONWE YA

4. Gịnị bụ “iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe,” oleekwa ndị ọ baara uru?

4 Ọ bụghị Iwu Mozis bụ “iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe,” n’ihi na iwu ahụ mere ka mmebi iwu pụta ìhè, Kraịst mezukwara ya. (Mat. 5:17; Gal. 3:19) Gịnịzi bụ iwu ahụ Jems kwuru okwu ya? Ihe o bu n’obi bụ “iwu nke Kraịst,” nke a kpọkwara “iwu nke okwukwe” na “iwu nke ndị nweere onwe ha.” (Gal. 6:2; Rom 3:27; Jems 2:12) N’ihi ya, “iwu ahụ zuru okè” bụ ihe niile Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Iwu ahụ baara Ndị Kraịst e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” uru.—Jọn 10:16.

5. Gịnị mere na iwu nke nnwere onwe abụghị ibu arọ?

5 “Iwu ahụ zuru okè” adịghị ka iwu ọtụtụ mba. Ihe ndị e kwuru na ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị dị mfe. Ha esighị ike nghọta, ime ha anaghịkwa esi ike. (1 Jọn 5:3) Jizọs kwuru, sị: “Yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:29, 30) ‘N’iwu ahụ zuru okè,’ e kwughịkwa ọtụtụ ihe a ga-eme onye dara ya, n’ihi na ọ bụ iwu ịhụnanya. E dere ya n’uche ndị mmadụ nakwa n’obi ha, ọ bụghị ná mbadamba nkume.—Gụọ Ndị Hibru 8:6, 10.

OTÚ “IWU AHỤ ZURU OKÈ” SI EME KA ANYỊ NWERE ONWE ANYỊ

6, 7. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu banyere iwu Jehova, gịnịkwa mere iwu nke nnwere onwe ji eme ka anyị nwere onwe anyị?

6 Ihe mere Jehova ji nye ndị mmadụ iwu bụ ka ọ baara ha uru ma chebe ha. Chegodị banyere iwu na-achị ihe ndị e kere eke. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ esi n’ebe dị ezigbo elu wụtuo, o nwere ike ịgbaji ụkwụ ma ọ bụ nwụọ. Ndị mmadụ anaghị ekwu na iwu ndị ahụ na-enye ha nsogbu. Kama ikwu otú ahụ, ọ na-eme ha obi ụtọ n’ihi na ha ghọtara na iwu ndị ahụ na-abara ha uru. Otú ahụ ka iwu Jehova na-abara anyị uru. Anyị na-amụta ya ‘n’iwu ahụ zuru okè’ nke Kraịst.

7 Iwu nke nnwere onwe na-echebe anyị. Ọ na-emekwa ka anyị nwee ike ime ihe niile dị mma na-agụ anyị agụụ n’akpataraghị onwe anyị nsogbu ma ọ bụ napụ ndị ọzọ ihe ruuru ha ma ọ bụkwanụ mee ka ndị ọzọ ghara inwere onwe ha. N’ihi ya, ihe ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’ezie, ya bụ, nwee ike ime ihe na-agụ anyị agụụ, bụ inwe ọchịchọ ziri ezi, nke na-emegideghị àgwà Jehova na ụkpụrụ ya. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịmụta ịhụ ihe Jehova hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ọ kpọrọ asị asị. Iwu nke nnwere onwe ahụ na-enyere anyị aka ime otú ahụ.—Emọs 5:15.

8, 9. Olee ụfọdụ uru ndị na-erube isi n’iwu nke nnwere onwe na-erite? Nye ihe atụ.

8 Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-ezughị okè, ọ na-esiri anyị ike imeri ọchịchọ ọjọọ. Ma, ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike na-erube isi n’iwu nke nnwere onwe ahụ, ọ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị ugbu a. Dị ka ihe atụ, sịga riri otu nwoke aha ya bụ Jay ahụ́. Mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl, ọ chọpụtara na ihe ahụ ọ na-eme adịghị Chineke mma, nakwa na o kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eme. Ọ̀ ga na-eme ihe ahụ́ ya chọrọ ka ọ̀ ga-emewe ihe Jehova chọrọ? O mere ihe gosiri na ọ ma ihe, nke bụ́ ijere Chineke ozi n’agbanyeghị na ịṅụ sịga na-agụkarị ya. Olee otú obi dị ya mgbe o meriri àgwà ọjọọ ahụ? O kwuru, sị: “Enwerela m onwe m, ọṅụ jukwara m obi.”

9 Jay si n’ihe mere ya mụta na ihe ndị ụwa na-akpọ nnwere onwe na-eme ka mmadụ ‘tụkwasị uche n’ihe anụ ahụ́,’ na-emekwa ka mmadụ bụrụ ohu. Ọ mụtakwara na nnwere onwe nke si n’aka Jehova, nke bụ́ ‘ịtụkwasị uche n’ihe mmụọ nsọ,’ na-eme ka mmadụ nwere onwe ya ma nweta “ndụ na udo.” (Rom 8:5, 6) Olee ebe Jay si nweta ike imeri àgwà ọjọọ ahụ? Ọ bụghị ya nyere onwe ya ike ahụ, kama ọ bụ Chineke. O kwuru, sị: “M na-amụchi Baịbụl anya, na-ekpe ekpere ka Chineke nye m mmụọ nsọ ya, ma kwe ka ụmụnna nọ n’ọgbakọ jiri obiọma na-enyere m aka.” Ihe ndị a nwekwara ike inyere anyị niile aka ná mbọ anyị na-agba inwere onwe anyị n’ezie. Ka anyị hụ otú ha nwere ike isi nyere anyị aka.

NA-ENYOCHA OKWU CHINEKE

10. Gịnị ka ‘inyocha’ Okwu Chineke pụtara?

10 Jems 1:25 kwuru, sị: “Onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme.” Okwu Grik e si sụgharịta “na-enyocha” pụtara “ihulata ala nyoo ihe,” nke pụtara ịgbasi mbọ ike. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka iwu nke nnwere onwe na-achị obi anyị na uche anyị, anyị kwesịrị ịna-amụsi Baịbụl ike, na-atụgharịkwa uche n’ihe anyị gụrụ.—1 Tim. 4:15.

11, 12. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru nke gosiri na anyị kwesịrị iji eziokwu Baịbụl na-ebi ndụ? (b) Dị ka e gosiri n’ihe e sere n’elu peeji a, gịnị ka ndị na-eto eto kwesịrị izere?

11 Anyị kwesịkwara ‘ịnọgịde’ ma ọ bụ tachie obi na-eme ihe Okwu Chineke kwuru, si otú ahụ jiri eziokwu Baịbụl na-ebi ndụ. Jizọs kwuru ihe yiri ya mgbe ọ gwara ụfọdụ ndị kweere na ya, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:31, 32) Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na n’amaokwu a, ‘ịmara’ pụtara mmadụ iji ihe ọ maara kpọrọ ihe n’ihi na “ihe ahụ baara ya uru ma ọ bụ dị ya mkpa.” N’ihi ya, otú anyị si egosi na anyị ‘maara’ eziokwu nke ọma bụ iji eziokwu Baịbụl na-ebi ndụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị nwere ike ikwu na “okwu Chineke” ‘na-arụ ọrụ’ n’ime anyị. Ọ ga-eme ka anyị na-agbanwe àgwà anyị ka anyị nwee ike ịna-eṅomi Nna anyị nke eluigwe.—1 Tesa. 2:13.

12 Jụọ onwe gị, sị: ‘Àma m eziokwu Baịbụl n’ezie? M̀ na-eji ya ebi ndụ? Ka ihe na-agụ m ọ̀ bụ ihe ndị ụwa kpọrọ “nnwere onwe”?’ Otu nwanna nwaanyị a mụrụ n’ezinụlọ Ndị Kraịst chetara mgbe ọ ka na-eto eto ma dee, sị: “Ọ bụrụ na a mụrụ mmadụ n’ọgbakọ, e nwere ike iche na ọ ma Jehova. Ma, o nweghị mgbe m matara Jehova n’ezie. Amụtaghị m ịkpọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị. Echeghị m na ihe m na-eme gbasara ya. Mgbe m nọ ná nsogbu, anaghị m arịọ ya ka o nyere m aka. Eji m nghọta m na-ekpebi ihe m ga-eme. Ma, achọpụtala m ugbu a na ọ bụ iberiibe n’ihi na o nweghị ihe m ma mgbe ahụ.” Ọ dị mma na nwanna nwaanyị ahụ mechara chọpụta na ihe o chere ezighị ezi, gbanweekwa àgwà ya. Ọ malitedịrị ịsụ ụzọ oge niile.

MMỤỌ NSỌ GA-ENYERE GỊ AKA KA I NWERE ONWE GỊ

13. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si enyere anyị aka ka anyị nwere onwe anyị?

13 Ndị Kọrịnt nke Abụọ 3:17 kwuru, sị: “Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.” Olee otú mmụọ nsọ ga-esi nyere anyị aka ka anyị nwere onwe anyị? Otu ụzọ o si eme ya bụ ime ka anyị nwee àgwà ndị na-eme ka anyị nwere onwe anyị, ya bụ, “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” (Gal. 5:22, 23) Ndị na-enweghị àgwà ndị ahụ, karịsịa ịhụnanya, enweghị ike inwere onwe ha n’ezie. Ihe na-eme n’ụwa taa egosikwala na ihe a e kwuru bụ eziokwu. Anyị kwesịrị iburu n’obi na mgbe Pọl onyeozi kwuchara ihe ndị ahụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, o kwuru, sị: “Ọ dịghị iwu na-emegide ihe ndị dị otú a.” Gịnị ka okwu ya pụtara? Ọ dịghị iwu na-egbochi mkpụrụ nke mmụọ nsọ ma ọ bụ mee ka ọ ghara ito eto. (Gal. 5:18) A sị ka e kwuwe, olee uru ụdị iwu ahụ ga-aba? Jehova chọrọ ka anyị na-amụta àgwà Kraịst ruo mgbe ebighị ebi ma na-akpa ya n’enweghị ihe ga-egbochi anyị.

14. Olee otú mmụọ nke ụwa si eme ka ndị ọ na-achị ghọọ ohu?

14 Ndị mmụọ nke ụwa na-achị na ndị na-eme ihe ọ bụla anụ ahụ́ ha chọrọ nwere ike iche na ha nweere onwe ha. (Gụọ 2 Pita 2:18, 19.) Ma, ha amaghị na ha bụ ohu. Iji gbochie ha ịkpa àgwà ọjọọ na ime ihe anụ ahụ́ ha chọrọ, a na-emere ha ọtụtụ iwu. Pọl kwuru, sị: “A na-eme iwu, ọ bụghị n’ihi onye ezi omume, kama n’ihi ndị na-emebi iwu na ndị isi ike.” (1 Tim. 1:9, 10) Ha bụkwa ohu nke mmehie n’ihi na ha ‘na-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ.’ Anụ ahụ́ bụkwa nna ukwu obi tara mmiri. (Efe. 2:1-3) E nwere ike ikwu na ndị na-eme otú ahụ dị ka ahụhụ rịbara ná mmanụ aṅụ. Akpịrị ogologo na-eme ka ha ma n’ọnyà.—Jems 1:14, 15.

A NA-EME KA ANYỊ NWERE ONWE ANYỊ N’ỌGBAKỌ

15, 16. Olee uru ndị anyị na-erite n’ọgbakọ, oleekwa otú anyị si nwere onwe anyị?

15 Mgbe ị batawara n’ọgbakọ Ndị Kraịst, i bughị ụzọ deta akwụkwọ ozi otú ahụ onye chọrọ ịbanye na klọb na-eme. Kama, ị batara n’ọgbakọ n’ihi na Jehova dọtara gị. (Jọn 6:44) Gịnị mere o ji dọta gị? Ọ̀ bụ n’ihi na ị bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke? I nwere ike ịsị, “Mbanụ!” Oleezi ihe Chineke hụrụ n’ime gị? Ọ hụrụ na i nwere obi ga-anabata iwu ya nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, nakwa na obi gị ga-ekwe ka o jiri obiọma duzie ya. Kemgbe ị batara n’ọgbakọ, Jehova na-akụziri gị eziokwu dị n’Okwu ya, si otú ahụ na-elekọta gị. O meela ka ị hapụ ozizi ụgha dị iche iche okpukpe ụgha na-ezi, kụziekwara gị otú ị ga-esi na-amụta àgwà Kraịst. (Gụọ Ndị Efesọs 4:22-24.) N’ihi ya, ọ bụ ihe ùgwù na i so ná ndị naanị ha nweere onwe ha n’ụwa n’eziokwu.—Jems 2:12.

16 Chegodị echiche: Ọ bụrụ na gị na ndị ji obi ha niile hụ Jehova n’anya anọrọ, ụjọ ọ̀ na-atụ gị? Ị̀ na-achagharị anya n’ihi na ahụ́ erughị gị ala? Mgbe gị na ụmụnna gị na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị̀ na-ejidesi ihe gị ike ka a ghara izuru ya? Mbanụ! Obi na-eru gị ala. Obi ọ̀ na-eru gị ala otú ahụ ma gị na ndị ụwa nọrọ? Mbanụ! Ma, otú anyị si nwere onwe anyị ná nzukọ Chineke ugbu a na-egosi otú anyị ga-esi nwere onwe anyị n’ọdịnihu.

“NNWERE ONWE DỊ EBUBE NKE ỤMỤ CHINEKE”

17. Olee otú “mkpughe nke ụmụ Chineke” ga-esi mee ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha?

17 Mgbe Pọl na-ekwu na Jehova ga-eme ka ndị ohu ya nọ n’ụwa nwere onwe ha n’ọdịnihu, o dere, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke.” O kwukwara, sị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:19-21) “Ihe e kere eke” e kwuru n’ebe a bụ ụmụ mmadụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ndị ga-erite uru ná “mkpughe” a ga-ekpughe ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Mgbe a ga-amalite ikpughe “ụmụ Chineke” bụ mgbe ha ga-esi n’eluigwe soro Kraịst bibie ndị ajọ omume niile ma mee ka “oké ìgwè mmadụ” banye n’ụwa ọhụrụ.—Mkpu. 7:9, 14.

18. Olee otú ndị rubeere Jehova isi ga-esi nwerekwuo onwe ha, oleekwa otú ha ga-esi nwere onwe ha n’ikpeazụ?

18 Ụmụ mmadụ ndị a gbapụtara ga-enwerezi onwe ha kpamkpam. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghịzi na-akpatara ha nsogbu. (Mkpu. 20:1-3) Mmadụ niile ga-enwere onwe ha mgbe ahụ! E mechaa, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ, bụ́ ndị ha na Kraịst ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà, ga-eji àjà mgbapụta ahụ Kraịst chụrụ na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha ruo mgbe mmehie Adam na ezughị okè ya ga-apụcha ha n’ahụ́. (Mkpu. 5:9, 10) E lechaa ụmụ mmadụ ule, ndị rubeere Chineke isi ga-enwerezi onwe ha kpamkpam otú Jehova zubere, ya bụ, “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” Chegodị echiche! Ọ gaghịzi na-esiri gị ike ime ihe ziri ezi n’anya Chineke, n’ihi na ahụ́ gị niile ezuola okè, ị ga-enwekwa ike iṅomi àgwà Chineke nke ọma.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ugbu a ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwere onwe anyị n’eziokwu?

19 Ị̀ na-atụ anya “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke”? Ọ bụrụ otú ahụ, kwe ka “iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe” na-achị obi gị na uche gị. Na-amụsi Baịbụl ike. Jiri eziokwu Baịbụl na-ebi ndụ. Na-arịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya. Na-erite uru nke ọma n’ọgbakọ Ndị Kraịst nakwa ná nri ime mmụọ Jehova na-enye anyị. Ekwela ka Setan duhie gị otú o duhiere Iv, mee ka i chee na iwu Chineke anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. N’eziokwu, Ekwensu dị aghụghọ. Ma, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, anyị ekwesịghị ikwe ka ‘Setan ghọgbuo anyị, n’ihi na anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.’—2 Kọr. 2:11.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ihe ụfọdụ ndị ụwa kpọrọ “nnwere onwe” hà ka na-agụ m agụụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

M̀ ji eziokwu Baịbụl ebi ndụ?