Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzukọ nke Gosiri na Anyị Dị n’Otu ma Na-eme Ezigbo Atụmatụ

Nzukọ nke Gosiri na Anyị Dị n’Otu ma Na-eme Ezigbo Atụmatụ

Akụkọ Banyere Nzukọ A Na-enwe Kwa Afọ

Nzukọ nke Gosiri na Anyị Dị n’Otu ma Na-eme Ezigbo Atụmatụ

NZUKỌ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ na-abụkarị oge obi ụtọ. Nzukọ nke otu narị na iri abụọ na asaa, bụ́ nke e nwere na Satọdee, abalị mbụ n’ọnwa iri n’afọ 2011, tọkwara ezigbo ụtọ! Ndị si ebe dị iche iche n’ụwa bịa nzukọ ahụ gbakọrọ n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị na Jesi Siti, Niu Jesi, n’Amerịka.

Gerrit Lösch, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, nabatara ndị niile bịaranụ, bụ́ ndị si ihe dị ka iri mba asatọ na ise. Ọ gwara ha na ha so n’ezinụlọ kacha dịrị n’otu n’ụwa niile. Ụdị ịdị n’otu ahụ na-agbara ndị ọzọ àmà, na-enyekwa Jehova otuto. Ná nzukọ ahụ, e kwuru banyere ịdị n’otu ugboro ugboro.

AKỤKỌ ỌMA SI MEKSIKO

N’okwu mbụ e kwuru, e nyere ihe atụ ndị gosiri na ndị Jehova dị n’otu. Alaka ụlọ ọrụ dị na Meksiko na-elekọtazi mba isii dị n’Etiti Amerịka. Nwanna Baltasar Perla, bụ́ onye na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Meksiko, gbara ụmụnna atọ ndị ọzọ sikwa n’ezinụlọ Betel dị na Meksiko ajụjụ ọnụ banyere uru mgbanwe ahụ e mere bara. Ha kwuru na e nweziri ọtụtụ ụmụnna si mba dị iche iche n’ezinụlọ Betel dị na Meksiko nakwa na otú ha si arụkọ ọrụ na-agba ha niile ume. Ọ dị ka à ga-asị na Chineke wepụrụ ókè dị n’agbata mba ndị ahụ.

Mgbe e mechara mgbanwe ahụ, e nyere ọgbakọ ọ bụla ikike izitere alaka ụlọ ọrụ ozi iimel ka ndị nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ nwee ike iji aka ha na-ezitere alaka ụlọ ọrụ ozi. N’ihi ya, ụmụnna ndị alaka ụlọ ọrụ na-adịghịzi ná mba ha anaghị eche na e kewapụla ha ná nzukọ Jehova.

AKỤKỌ SI JAPAN

Nwanna James Linton, onye si alaka ụlọ ọrụ dị na Japan, kọwara ihe ala ọma jijiji na mmiri si n’oké osimiri mere ụmụnna anyị n’ọnwa atọ n’afọ 2011. Ngwongwo ọtụtụ ụmụnna anyị lara n’iyi, ndị ha hụrụ n’anya anwụọkwa. Ụmụnna ndị bi n’ebe ndị ọzọ nwetaara ụmụnna ndị ahụ puku ụlọ atọ na otu narị, nyekwa ha ọtụtụ narị ụgbọala. Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè zigara ndị ọrụ, ha ana-arụzi ụlọ ụmụnna ndị ahụ n’akwụsịghị akwụsị. Ndị ọrụ karịrị otu puku na narị asaa wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ n’ebe ọ bụla e nwere mkpa. E nwekwara ụmụnna si Amerịka gaa nye aka rụzie Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Ha dị narị ise na iri asaa na ise.

E mere ọtụtụ ihe iji kasie ndị ahụ ọdachi dakwasịrị obi, meekwa ka okwukwe ha sie ike. Ihe karịrị narị ndị okenye anọ gara gbaa ụmụnna ndị ahụ ume. Òtù Na-achị Isi mere ihe gosiri na ihe banyere ụmụnna ndị ahụ na-emetụ ha n’obi. Ha si n’isi ụlọ ọrụ anyị ziga ndị nlekọta zoonu abụọ ịgba ụmụnna ndị ahụ ume. Otú ụmụnna anyị n’ụwa niile si gosi na ha na-echeta ụmụnna ndị ahụ kasikwara ha obi.

MMERI NDỊ ANYỊ NWERE N’ỤLỌIKPE

Ndị bịara nzukọ ahụ gere ntị nke ọma mgbe Nwanna Stephen Hardy, onye si alaka ụlọ ọrụ dị na Briten, na ụmụnna ndị ọzọ kparịtara banyere mmeri ndị anyị nwere n’ụlọikpe n’oge na-adịbeghị anya. Dị ka ihe atụ, ndị ọchịchị Frans chọrọ ka anyị kwụọ ụtụ isi ruru iri nde dọla asatọ na abụọ. Okwu ahụ biri mgbe Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri na ndị ọchịchị Frans chọrọ anyị okwu, kwuokwa na ha dara iwu e dere ná Nkebi nke Itoolu ná Nkwekọrịta Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, nke kwuru na mmadụ ga na-ekpe okpukpe masịrị ya. Ihe Ụlọikpe ahụ kpebiri gosiri na ihe Ndịàmà Jehova chọrọ izere abụghị ịtụ ụtụ isi. O kwuru, sị: “Ịjụ ịnabata òtù okpukpe, ime ka e kposaa ya, na ịgwa ya okwu ọjọọ megidechara ihe e kwuru ná Nkebi nke Itoolu ná Nkwekọrịta ahụ.”

Ụlọikpe ahụ kpelakwaara anyị ikpe n’ikpe anyị na mba Aminia. Kemgbe 1965, Ụlọikpe ahụ ekwuola na Nkwekọrịta Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop enyeghị mmadụ ikike inupụ isi ma ndị ọchịchị nye iwu ka onye ọ bụla gaa agha. Òtù Ikpe Kacha Elu n’Ụlọikpe ahụ kpebiri na Nkwekọrịta ahụ kwesịrị inye mmadụ ikike “ịjụ ije agha, ma ọ bụrụ n’ihi na ọ ga-enye ya ezigbo nsogbu n’obi.” N’ihi ihe Ụlọikpe ahụ kpebiri, ndị ọchịchị mba ndị dị ka Aminia, Azebaịjan, na Tọki kwesịrị inye ụmụ amaala ha ikike ahụ.

IHE NDỊ A NA-EWU

Onye ọzọ kwuru okwu bụ Nwanna Guy Pierce, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi. O kwuru na ndị niile bịara nzukọ ahụ chọrọ ịma banyere ihe a na-ewu na Steeti Niu Yọk. E gosiri vidio mere ka a mata ihe a rụrụla na ihe a ka ga-arụ na Wọlkil, Patasịn, nakwa n’ebe ndị anyị nwetara ọhụrụ na Wọwik nakwa na Tọksido dị na Niu Yọk. Na Wọlkil, a na-arụ ụlọ ọhụrụ ga-enwe ihe karịrị narị ọnụ ụlọ obibi atọ. E bu n’obi ịrụcha ya n’afọ 2014.

E bu n’obi ịmalite ọrụ n’ala anyị dị na Wọwik, nke dị otu narị hekta. Nwanna Pierce kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na anyị amabeghị ihe bụ́ uche Jehova banyere Wọwik, anyị ga-amalite ọrụ na ya, ebe anyị bu n’obi ibufe isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ.” Anyị nwere ala dị hekta iri abụọ n’ebe dị kilomita iri n’ebe ugwu Wọwik. Anyị chọrọ iji ya mere ebe a na-adọwa ngwá ọrụ na ihe ndị e ji ewu ụlọ. Nwanna Pierce kwuru, sị: “Ozugbo anyị nwetara ikike ịmalite iwu ihe n’ebe ahụ, anyị bu n’uche iwucha ya n’ime afọ anọ. Anyị ga-erezi ụlọ anyị ndị dị na Bruklin.”

Nwanna Pierce jụrụ ajụjụ, sị: “Ọ̀ pụtara na Òtù Na-achị Isi echeghịzi na oké mkpagbu dị nso?” Ọ zara ya, sị: “Mbanụ. Ọ bụrụ na oké mkpagbu amalite tupu anyị ewuchaa ihe anyị bu n’obi iwu, obi ga-atọgbu anyị atọgbu!”

KPACHARA ANYA MAKA ỌDỤM AHỤ NA-EBIGBỌ EBIGBỌ

Stephen Lett, bụ́ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, tụleziri ihe dị na 1 Pita 5:8, nke bụ́: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” Nwanna Lett kwuru na anyị chee echiche banyere otú ọdụm si akpa àgwà, anyị ga-aghọtakwu na otú ahụ Pita si kọwaa Ekwensu dabara adaba.

Ebe ọ bụ na ọdụm siri ezigbo ike, na-agbakwa ọsọ karịa mmadụ, anyị ekwesịghị ịgbalị ịlụso Setan ọgụ ma ọ bụ ịgbanahụ ya n’ike aka anyị. Enyemaka Jehova dị anyị mkpa. (Aịza. 40:31) Ọdụm na-ehere ehere achọ anụ ọ ga-ejide. N’ihi ya, anyị kwesịrị izere ọchịchịrị ime mmụọ nke Setan ji ejide ndị mmadụ. Otú ahụ ọdụm na-egbu ele nọọrọ onwe ya ma ọ bụ nwa ịnyịnya ọhịa na-ehi ụra, Setan anaghị eme ebere, ọ ga-amasịkwa ya ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Mgbe ọdụm dọgburu anụ ma rijuo afọ, anụ ahụ anaghịzi adị otú ọ dịbu. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na Onye Kraịst aghọọrọ Setan anụ oriri, ‘ọnọdụ onye ahụ n’ikpeazụ ga-adị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.’ (2 Pita 2:20) N’ihi ya, anyị kwesịrị iguzogide Setan ma jidesie ihe anyị mụtara na Baịbụl ike.—1 Pita 5:9.

JIRI IHE Ị NA-ARỤ N’ỤLỌ JEHOVA KPỌRỌ IHE

Onye ọzọ kwuru okwu bụ Nwanna Samuel Herd, bụ́ onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi. O kwuru, sị: “Anyị niile nwere ihe anyị na-arụ n’ụlọ Jehova.” Ndị Kraịst niile nwere ihe ha na-arụ “n’ụlọ” Chineke, nke bụ́ ụlọ nsọ ihe atụ ya, ya bụ, ndokwa o mere ka a na-efe ya n’ihi àjà mgbapụta Jizọs chụrụ. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù nke anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe. Dị ka Devid, anyị chọrọ ‘ibi n’ụlọ Jehova ụbọchị niile nke ndụ anyị.’—Ọma 27:4.

Nwanna Herd kwuru ihe e dere n’Abụ Ọma 92:12-14 ma jụọ, sị: “Olee otú Jehova si eme ka anyị na-ama pokopoko?” Ọ zara, sị: “Na paradaịs ime mmụọ, Chineke na-eme ka obi dị anyị ụtọ, na-echebe anyị, na-enyekwa anyị mmiri na-eme ka ahụ́ ruo anyị ala, ya bụ, eziokwu Baịbụl. Ka anyị na-ekele Chineke maka ya.” Nwanna Herd gbaziri ndị bịara nzukọ ahụ ume, sị: “Ka afọ ju anyị maka na anyị nọ n’ụlọ Jehova, ọ bụghị naanị ruo obere oge, kama na anyị ga-anọ na ya ruo mgbe ebighị ebi.”

NDỊ KRAỊST NA-AKWANYERE OKWU CHINEKE ÙGWÙ

Onye ọzọ kwuru okwu bụ David Splane, bụ́ onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi. Ọ kọwara na kemgbe ụwa, ezi Ndị Kraịst na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù. Na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst ji ya dozie okwu gbasara ibi úgwù. (Ọrụ 15:16, 17) Ma, na narị afọ nke abụọ, ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst malitere ịkwanyere amamihe ndị Grik ùgwù karịa Akwụkwọ Nsọ. Ndị ọzọ mechara were ozizi ndị a kpọrọ Ndị Nna Chọọchị n’oge ochie nakwa ozizi ndị eze ukwu Rom dochie ozizi Baịbụl. Ọ bụ otú ahụ ka ọtụtụ ozizi ụgha si malite.

Nwanna Splane kwuru na otu ihe atụ Jizọs mere gosiri na o nweghị mgbe a na-agaghị enwe ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ ga na-akwado eziokwu Baịbụl n’ụwa. (Mat. 13:24-30) Anyị amaghị ndị niile bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ochie. Ma kemgbe ọtụtụ narị afọ, e nweela ọtụtụ ndị katọrọ ihe okpukpe ụgha na-akụzi na ihe ha na-eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ Achịbishọp Agọbad nke Liọns, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke itoolu, Pita nke Bruwii, Henri nke Lozan, na Valdès (ma ọ bụ Waldo), bụ́ ndị dịrị ndụ na narị afọ nke iri na abụọ, Jọn Wiklif, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke iri na anọ, Wiliam Tindel, bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke iri na isii, na Henri Gruu, na Jọj Stọz, bụ́ ndị dịrị ndụ na narị afọ nke iri na itoolu. Taa, Ndịàmà Jehova na-akwadosi iwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ ike ma ghọta na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. Ọ bụ ya mere Òtù Na-achị Isi ji họrọ ihe Jizọs kwuru na Jọn 17:17 ka ọ bụrụ isiokwu afọ 2012, ya bụ, “Okwu gị bụ eziokwu.”

MGBANWE NDỊ NA-EME OBI ỤTỌ E MERE MAKA INYE ỌZỤZỤ NA IJE OZI

Nwanna Anthony Morris, bụ́ onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, mara ọkwa na a ga-eme mgbanwe ụfọdụ maka ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’ọnwa Septemba afọ 2012, a ga-amalite Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye ná mba ụfọdụ. A gbanweela ihe e ji Ụlọ Akwụkwọ Gilied eme. Malite n’ọnwa Ọktoba afọ gara aga, ndị niile a na-azụ na Gilied bụ ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche, ya bụ, ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị Gilied, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ ndị Betel. Ha gachaa Gilied, a ga-eziga ha n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ma ọ bụ n’ọrụ sekit ma ọ bụ n’obodo mepere emepe, bụ́ ebe ha ga-eso ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ na-ekwusa ozi ọma. Ha ga na-akwado ụmụnna ha na ha na-arụkọ ọrụ, na-agba ha ume, na-akụzikwara ha ihe.

A ga-ahọpụta ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ka ha malite ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo na n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Malite n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2012, ụfọdụ ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị na Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye ga-abụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo nwa oge. Ha ga na-ekwusa ozi ọma n’ebe e nwere ndị nkwusa ole na ole ma ọ bụ n’ebe a na-enweghị ndị nkwusa. Ha ga-abụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo otu afọ n’otu oge. Ha jee ozi ihe na-akarịghị afọ atọ, e nwere ike ịgwa ndị mere nke ọma ka ha bụrụzie ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Nzukọ ahụ e nwere n’afọ 2011 bụ oge obi ụtọ. Anyị na-atụ anya ka Jehova gọzie ndokwa ọhụrụ a e mere ka e nwee ike na-ekwusasi ozi ọma ike, meekwa ka ụmụnna anyị niile dịkwuo n’otu iji wetara ya otuto, meekwa ka ọ dị ebube.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18]

ỊMATAKWU HA

Ná nzukọ ahụ, a gbara ụmụnna nwaanyị ise di ha nwụrụ ajụjụ ọnụ. Ndị di ha sobu n’Òtù Na-achị Isi mgbe ha nọ ndụ. Ụmụnna nwaanyị ndị ahụ bụ Marina Sydlik, Edith Suiter, Melita Jaracz, Melba Barry, na Sydney Barber. Ha kọrọ otú ha si nata eziokwu na otú ha si banye n’ozi oge niile. Onye ọ bụla n’ime ha kọọrọ ndị bịara nzukọ ahụ ihe ndị na-eme ya obi ụtọ ọ na-echeta, ihe banyere di ya, na otú Jehova si gọzie ha abụọ. Abụ e ji mechie ajụjụ ọnụ ahụ bụ abụ nke 86, nke isiokwu ya bụ “Ndị Inyom Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Ụmụnna Nwaanyị.” O metụrụ ndị bịara nzukọ ahụ n’ahụ́ mgbe a na-abụ ya.

[Foto]

(N’elu) Daniel na Marina Sydlik; Grant na Edith Suiter; Theodore na Melita Jaracz

(N’okpuru) Lloyd na Melba Barry; Carey na Sydney Barber

[Map dị na peeji nke 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ Meksiko na-elekọtazi ọrụ a na-arụ ná mba isii

MEKSIKO

GỤATEMALA

HỌNDURAS

EL SALVADỌ

NIKARAGỤA

KỌSTA RIKA

PANAMA

[Foto dị na peeji nke 17]

Otú a na-atụ anya isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ga-adị mgbe e bufere ya na Wọwik, Niu Yọk