Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyaukwu Kpataara Gehezaị Nsogbu

Anyaukwu Kpataara Gehezaị Nsogbu

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Anyaukwu Kpataara Gehezaị Nsogbu

Ò NWETỤLA mgbe ị chọrọ inweta otu ihe dị gị ezigbo mkpa? * Ọtụtụ ndị na-achọkwa inweta ihe dị ha ezigbo mkpa. Ma ì kwesịrị ịgha ụgha ka i nwee ike inweta ihe dị gị mkpa?— Mba, i kwesịghị. Onye ọ bụla nke mere otú ahụ bụ onye anyaukwu. Ka anyị hụ otú otu nwoke aha ya bụ Gehezaị si kpatara onwe ya nsogbu n’ihi anyaukwu. Gehezaị bụ onye na-ejere Ịlaịsha ozi. Ịlaịsha bụkwanụ onye amụma nke ezi Chineke bụ́ Jehova.

Ịlaịsha na Gehezaị dịrị ndụ n’oge ochie. Ha dịrị ndụ otu puku afọ tupu a mụọ Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, n’ụwa. Jehova si n’aka Ịlaịsha rụọ ọtụtụ ọrụ ebube. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọrọ na e nwere otu nwoke a ma ama bụ́ onyeisi ndị agha Siria. Ma, nwoke ahụ bụ onye ekpenta. Aha ya bụ Neaman. O nweghị onye gwọliri nwoke ahụ. Ma, Ịlaịsha mechara gwọọ ya.

Mgbe ọ bụla Chineke si n’aka Ịlaịsha gwọọ ndị mmadụ ọrịa, Ịlaịsha anaghị ana ha ego. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ maka na Ịlaịsha ma na ọ bụ Jehova na-arụ ọrụ ebube ndị ahụ, ọ bụghị yanwa. Mgbe a gwọrọ Neaman, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ nke na o nyere Ịlaịsha onyinye ndị dị ka ọlaedo, ọlaọcha, na uwe ndị mara mma. Ịlaịsha anaraghị ya ihe ọ bụla, ma Gehezaị chọsiri onyinye ndị ahụ ike.

Mgbe Neaman lawara, Gehezaị chụụrụ ya gawa. Ma Gehezaị agwaghị Ịlaịsha ebe ọ na-aga. Mgbe Gehezaị chụkwutere Neaman, ị̀ ma ihe ọ gwara Neaman?— Ọ gwara ya, sị: ‘Ịlaịsha zitere m ka m gwa gị na ụmụ okorobịa abụọ bịara n’ụlọ ya ugbu a ugbu a. Ọ chọrọ ka i nye ya uwe mgbanwe abụọ ka o nye ha.’

Ma ihe ahụ Gehezaị kwuru bụ ụgha! O nweghị ndị bịara n’ụlọ Ịlaịsha. Ihe mere o ji kwuo ya bụ ka o nwee ike ịnata Neaman uwe ndị ahụ Neaman nyere Ịlaịsha, Ịlaịsha ajụ ịnara. Neaman amakwanụghị na ọ bụ ụgha ka Gehezaị na-aghara ya, ya ewere obi ụtọ nye Gehezaị uwe ndị ahụ. Neaman nyekwara Gehezaị ihe ndị ọzọ Gehezaị na-agwaghị ya ka o nye ya. Ị̀ ma ihe mechara mee?

Mgbe Gehezaị lọtara, Ịlaịsha jụrụ ya, sị: ‘Olee ebe ị nọ kemgbe?’

Gehezaị zara ya: ‘Anọ m ya. O nweghị ebe m gara.’ Ma Jehova emeela ka Ịlaịsha mata ihe niile Gehezaị mere. Ọ bụ ya mere Ịlaịsha ji gwa Gehezaị, sị: ‘Ugbu a abụghị oge ịnara ego na uwe.’

Gehezaị anarala ego na uwe na-abụghị nke ya. Nke a mere ka Chineke mee ka ekpenta ahụ Neaman na-arịa rịawazie Gehezaị. Gịnị ka i chere anyị nwere ike ịmụta n’ihe a mere Gehezaị?— Otu ihe ọ na-akụziri anyị bụ na anyị ekwesịghị ịgha ụgha ma ọ bụ ịkọ akụkọ na-abụghị eziokwu.

Gịnị mere Gehezaị ji ghaa ụgha?— Ọ bụ n’ihi na ọ bụ onye anyaukwu. Ọ chọrọ inweta ihe na-abụghị nke ya, ọ ghakwara ụgha ka o nweta ya. Nke a mere ka ọ bụrụzie onye ekpenta ná ndụ ya niile.

Ma e nwere nsogbu ka njọ ihe ahụ kpataara Gehezaị. Ị̀ ma nsogbu ọ bụ?— Ya na Chineke kwụsịrị ịdị ná mma, Chineke ahụghịzi ya n’anya. Anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na Chineke kwụsị ịdị ná mma, ya agharazie ịhụ anyị n’anya. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

2 Ndị Eze 5:5, 20-27; Jud 21

Jọn 15:10

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.