Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Udo Nke Ga-adịru Otu Puku Afọ Nakwa Mgbe Ebighị Ebi!

Udo Nke Ga-adịru Otu Puku Afọ Nakwa Mgbe Ebighị Ebi!

Udo Nke Ga-adịru Otu Puku Afọ Nakwa Mgbe Ebighị Ebi!

“Ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”​—1 KỌR. 15:28.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

Olee uru ị ga-erite mgbe ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a ga-emezu?

Maịka 4:4

Aịzaya 11:6-9

Jọn 5:28, 29

1. Olee ihe ọma ga-emere “oké ìgwè mmadụ” ahụ?

CHEEDỊ ihe ọma niile ọchịchị siri ike ga-emere ndị ọ na-achị n’otu puku afọ ma ọ bụrụ na onye nọ n’isi ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi ma dị ọmịiko! Ọtụtụ ihe ọma ga-emere “oké ìgwè mmadụ” nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ. Ọ bụ ha ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ’ nke ga-ebibi ụwa ọjọọ a kpamkpam.—Mkpu. 7:9, 14.

2. Olee nsogbu ndị mmadụ nwerela kemgbe puku afọ isii?

2 Kemgbe puku afọ isii, ụmụ mmadụ agbalịala ịchị onwe ha. Nke a akpatarala ha ọtụtụ ihe mgbu na ahụhụ. Baịbụl buru amụma ogologo oge gara aga, sị: ‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekli. 8:9) Gịnị ka anyị na-ahụ taa? E nwere agha, nnupụisi, ịda ogbenye, ọrịa, mbibi a na-ebibi elu ala, oké okpomọkụ, oké mmiri ozuzo, na ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ. Ndị ọchịchị adọọla aka ná ntị na ọ bụrụ na anyị agbanweghị otú anyị si na-emebi elu ala na ihe ndị dị n’ime ya, anyị na-akpọ ọdachi òkù.

3. Gịnị ga-eme n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst?

3 Mgbe Jizọs Kraịst, bụ́ Mesaya na Eze, na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ga-amalite ịchị, Alaeze Chineke ga-eji nwayọọ nwayọọ mezie ihe ọjọọ niile e mere ụmụ mmadụ na ebe obibi ha bụ́ ụwa. Ọchịchị Puku Afọ ahụ ga-emezu ọmarịcha nkwa Jehova Chineke kwere, nke bụ́: “M na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịza. 65:17) Olee ihe ndị magburu onwe ha a na-adịghị ahụ anya ka ga-emenụ? Ka anyị jiri amụma ndị dị na Baịbụl chọpụta ihe ndị ahụ magburu onwe ha “a na-adịghị ahụ anya” ugbu a.—2 Kọr. 4:18.

‘HA GA-EWU ỤLỌ, KỌỌKWA UBI VAỊN’

4. Olee nsogbu ọtụtụ ndị na-enwe taa n’ihe banyere ụlọ?

4 È nwere onye na-achọghị inwe ụlọ nke ya, bụ́ ebe ya na ndị ezinụlọ ya ga-anọ, obi eruo ha ala? Ma n’ụwa ugbu a, inweta ezigbo ụlọ na-esiri ọtụtụ ndị ike. Ndị mmadụ na-akarị akarị n’ọtụtụ obodo. Ọtụtụ ndị bi ná mkpọkọrọ ụlọ ndị dị n’ebe ndị ruru unyi n’obodo. E nwekwara ọtụtụ ndị bi n’otu ọnụ ụlọ. Inweta ụlọ nke ha bụ naanị ná nrọ.

5, 6. (a) Olee otú amụma e buru n’Aịzaya 65:21 na Maịka 4:4 ga-esi mezuo? (b) Olee otú anyị ga-esi nweta ngọzi ahụ?

5 Mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa, ndị mmadụ ga-enwe ụlọ nke ha, nke bụ́ ihe na-agụ onye ọ bụla agụụ. Chineke si n’ọnụ Aịzaya buo amụma, sị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.” (Aịza. 65:21) Ma, ihe ọma ga-emere ha abụghị naanị na ha ga-enwe ụlọ nke ha. A sị ka e kwuwe, ụfọdụ ndị nwere ụlọ nke ha taa. Ụfọdụ bidị ná nnukwu ụlọ ndị oké ozu. Ma, ha na-achịkarị obi n’aka na ihe nwere ike isiwere ha ike ma ọ bụ na ndị omekome ma ọ bụ ndị ọjọọ ndị ọzọ ga-achọrọ ha bịa. Mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa, o nweghị onye ga na-atụ ụdị ụjọ ahụ! Maịka onye amụma dere, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maị. 4:4.

6 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa? O doro anya na ezigbo ụlọ dị anyị niile mkpa. Ma, kama isiwe ọnwụ na anyị ga-enwetarịrị ụlọ anyị na-arọ nrọ ya ugbu a, nke nwere ike ime ka anyị koro nnukwu ụgwọ, ọ́ gaghị aka mma ka anyị lekwasị anya ná nkwa Jehova kwere anyị? Cheta na Jizọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọgbà, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ọ ga-atọgbọ isi ya.” (Luk 9:58) A sị na Jizọs chọrọ, ọ gaara ewu ma ọ bụ zụọ ụlọ ka nke onye ọ bụla mma. Ma, gịnị mere na o meghị otú ahụ? O doro anya na Jizọs achọghị ihe ga-adọpụ ya uche na ihe ga-eri ya oge ma mee ka ọ ghara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ànyị nwere ike iṅomi ya ma ghara ikwe ka akụnụba bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, meekwa ka anyị na-echegbu onwe anyị?—Mat. 6:33, 34.

“ANỤ ỌHỊA WOLF NA NWA ATỤRỤ GA-ATAKỌ NRI”

7. Olee iwu Jehova nyere nke gbasara otú mmadụ ga-esi na-emeso anụmanụ?

7 Mgbe Jehova na-eke ihe n’ụwa, ihe ikpeazụ o kere bụ mmadụ, nke bụ́ ihe kacha mkpa o kere n’ụwa. Jehova gwara Onye Ọkà Ọrụ ya, bụ́ Ọkpara ya, sị: “Ka anyị mee mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na anụ ụlọ nakwa ụwa dum na anụ ọ bụla ọzọ nke na-agagharị agagharị, bụ́ nke na-agagharị n’elu ala, nọrọ n’okpuru ya.” (Jen. 1:26) N’ihi ya, Chineke nyere Adam na Iv na ụmụ niile ha ga-amụ iwu ka ha lekọtawa ụmụ anụmanụ nakwa ka ụmụ anụmanụ nọrọ n’okpuru ha.

8. Olee ihe ụmụ anụmanụ na-emekarị taa?

8 Ma, ò nwere otú mmadụ ga-esi na-elekọta ụmụ anụmanụ, ya na ha adịkwa n’udo? Ọtụtụ ndị nwere nkịta na nwamba ha na ha na-egwuri egwu. Anụ ọhịa kwanụ? Ndị mere nchọpụta kwuru, sị: “Ndị ọkà mmụta sayensị ndị nọrọla ụmụ anụmanụ nso ma mụọ otú ha si akpa àgwà achọpụtala na ụmụ anụmanụ ndị na-enye nwa ara na-enwe obiọma, na-ewekwa iwe.” Anyị maara na e yie ụmụ anụmanụ egwu, ụjọ na-atụ ha ma ọ bụkwanụ ha ewee iwe. Ma, hà nwekwara ike inwe obiọma? Ndị ahụ mere nchọpụta kwukwara, sị: “Ebe ị ga-akacha ahụ otú ụmụ anụmanụ si nwee obiọma bụ mgbe ha na-elekọta ụmụ ha.”

9. Olee otú omume ụmụ anụmanụ ga-esi gbanwee n’ọdịnihu?

9 N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya mgbe anyị gụrụ na Baịbụl na udo ga-adị n’etiti ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ. (Gụọ Aịzaya 11:6-9; 65:25.) N’ihi gịnị? Cheta na mgbe Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta ka Iju Mmiri ahụ gachara, Jehova gwara ha, sị: “Egwu unu na ụjọ unu ga-ejide ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ n’ụwa.” Ọ bụ ya mere ụmụ anụmanụ ji agbara ndị mmadụ ọsọ ka ha ghara igbu ha. (Jen. 9:2, 3) Ọ̀ bụ na Jehova enweghị ike iwepụtụ egwu na ụjọ ahụ ka e nwee ike imezu ihe mbụ ahụ o kwuru banyere ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ? (Hos. 2:18) Oge ahụ ga-atọ ndị niile ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ ezigbo ụtọ!

“Ọ GA-EHICHAPỤKWA ANYA MMIRI NIILE”

10. Gịnị mere anya mmiri ji agbakarị ụmụ mmadụ?

10 Mgbe Sọlọmọn hụrụ “mmegbu niile a na-emegbu mmadụ n’okpuru anyanwụ,” ọ kwara arịrị, sị: “Lee! anya mmiri nke ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.” (Ekli. 4:1) Ihe ka dịkwa otú ahụ taa ma ọ bụrụdị na ọ kabeghị njọ. Ò nwere onye n’ime anyị nke na-enwetụbeghị ihe mere ka anya mmiri gbaa ya? Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, anya mmiri na-agba anyị bụ nke ọṅụ. Ma ọtụtụ mgbe, anya mmiri na-agba anyị n’ihi ihe na-ewute anyị.

11. Olee ihe a kọrọ na Baịbụl nke na-akacha emetụ gị n’ahụ́?

11 Chegodị banyere ọtụtụ akụkọ ndị na-emetụ n’ahụ́ a kọrọ na Baịbụl. Mgbe Sera nwụrụ mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri abụọ na asaa, ‘Ebreham batara ịkwara Sera ákwá arịrị na ibere ya ákwá.’ (Jen. 23:1, 2) Mgbe Neomi na-asị ndị nwunye ụmụ ya abụọ di ha nwụrụ laa nke ọma, ‘ha malitere ịkwa ákwá n’olu dara ụda.’ Mgbe Neomi gwakwuru ha okwu, ‘ha bewere ákwá ọzọ n’olu dara ụda.’ (Rut 1:9, 14) Mgbe Eze Hezekaya dara ọrịa, cheekwa na ya ga-anwụ, o kpegaara Chineke ekpere “wee malite ịkwasi ákwá ike.” Jehova hụrụ anya mmiri ya ma gwọọ ya. (2 Eze 20:1-5) È nwere onye ọ na-anaghị emetụ n’ahụ́ ma ọ gụọ ihe mere mgbe Pita gọnahụrụ Jizọs? Mgbe oké ọkpa kwara ákwá, Pita ‘pụrụ n’èzí, kwaa ákwá nke ukwuu.’—Mat. 26:75.

12. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka obi ruo ụmụ mmadụ ala?

12 N’ihi ụdị ọdachi dị iche iche na-adakwasị ụmụ mmadụ, ọ dị anyị ezigbo mkpa ka a kasie anyị obi ma mee ka obi ruo anyị ala. Ọ bụ ihe Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ga-emere ndị ọ ga-achị, n’ihi na “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpu. 21:4) N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ ịnụ na Chineke ga-ewepụrụ anyị iru uju, mkpu ákwá, na ihe mgbu. Ma, o kwere nkwa imere ụmụ mmadụ ihe karịrị nke ahụ, ya bụ, iwepụ ọnwụ, nke bụ́ onye iro kacha njọ. Olee otú ọ ga-esi mee ya?

‘NDỊ NIILE NỌ N’ILI NCHETA GA-APỤTA’

13. Gịnị ka ọnwụ merela ụmụ mmadụ kemgbe Adam mehiere?

13 Kemgbe Adam mehiere, mmehie achịala ụmụ mmadụ dị ka eze. Ọ bụ onye iro ka mmadụ ike, nke na-emecha egburu ụmụ mmadụ niile na-ezughị okè, bụrụkwa onye iro nke na-akpata iru uju, na-emekwa ka obi gbawaa ndị mmadụ. (Rom 5:12, 14) N’ezie, “egwu ọnwụ” emeela ka ọtụtụ nde mmadụ “nọrọ n’ohu ná ndụ ha niile.”—Hib. 2:15.

14. Olee ihe ga-eme mgbe a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè?

14 Baịbụl kwuru banyere mgbe ‘a ga-eme ka ọnwụ, bụ́ onye iro ikpeazụ, ghara ịdị irè.’ (1 Kọr. 15:26) E nwere ike ikwu na e nwere ụzọ ndị abụọ ga-erite uru na ya. “Oké ìgwè mmadụ” ndị dị ndụ ugbu a ga-alanahụ baa n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa, nweekwa ike ịdị ndụ ebighị ebi. A ga-akpọlite ọtụtụ ijeri ndị nwụrụla anwụ. Cheedị ụdị obi ụtọ na ọṅụ oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enwe mgbe ha ga-anabata ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ịtụle ihe ụfọdụ Baịbụl kọrọ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ nwere ike inyere anyị aka ịghọta ụdị obi ụtọ ndị mmadụ ga-enwe mgbe ahụ.—Gụọ Mak 5:38-42; Luk 7:11-17.

15. Olee otú obi nwere ike ịdị gị mgbe ị hụrụ ka a kpọlitere onye ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ?

15 Chegodị banyere okwu ndị dị ka “ha nwere oké obi ụtọ” na “ha malitekwara inye Chineke otuto.” A sị na ị nọ mgbe ihe ndị ahụ mere, ikekwe obi gaara adịkwa gị otú ahụ. N’eziokwu, ịhụ ka a kpọlitere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-eme ka anyị nwee ezigbo ọṅụ. Jizọs kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) O nweghị onye n’ime anyị hụtụrụla ụdị ihe ahụ; ọ ga-abụ otu n’ime ‘ihe ndị a na-adịghị ahụ anya’ kacha mkpa.

CHINEKE GA-ABỤ “IHE NIILE N’EBE ONYE Ọ BỤLA NỌ”

16. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu banyere ngọzi ndị anyị na-anaghị ahụ anya ugbu a? (b) Olee ihe Pọl kwuru iji gbaa Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ume?

16 N’eziokwu, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova n’oge a dị oké egwu ga-enwe ezigbo ọṅụ n’ọdịnihu! Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịhụ nnukwu ngọzi ndị ahụ anya ugbu a, iburu ha n’obi ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’ezie ma ghara ikwe ka ihe ndị dị n’ụwa ochie a megharịa anyị anya. (Luk 21:34; 1 Tim. 6:17-19) Mgbe anyị na-enwe ofufe ezinụlọ, mgbe anyị na ụmụnna anyị na-ekwurịta okwu, nakwa mgbe anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na ndị nwere mmasị na-ekwurịta okwu, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu banyere olileanya magburu onwe ya anyị nwere. Ọ ga-eme ka anyị ghara ichefu ihe ndị ahụ. Ọ bụ ihe Pọl mere mgbe ọ na-agba Ndị Kraịst ibe ya ume. Okwu ya nyeere ha aka iche echiche banyere ihe ga-eme n’ọgwụgwụ Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Chegodị otú ọ ga-adị mgbe ihe a Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:24, 25, 28 ga-eme.—Gụọ ya.

17, 18. (a) Olee otú Jehova si bụrụ “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ” mgbe e kere mmadụ? (b) Olee ihe Jizọs ga-eme iji weghachi udo na ịdị n’otu?

17 O nweghị otú ka mma Pọl gaara esi kọwaa ihe ga-eme n’ikpeazụ karịa ikwu “ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.” Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Chegodị echiche banyere mgbe ahụ Adam na Iv zuru okè n’Iden, sorokwa n’ezinụlọ Jehova nke dị n’udo, dịkwa n’otu. Ọ bụ Jehova, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ala, na-achị ihe niile o kere eke, ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ. Ndị niile o kere eke nwere ike iji aka ha gwa ya okwu, fee ya ofufe, ya ana-agọzikwa ha. N’oge ahụ, Chineke bụ “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”

18 Mgbe Setan mere ka ụmụ mmadụ nupụrụ ọchịchị Jehova isi, udo adịghịzi n’etiti Chineke na ihe niile o kere eke. Ma, kemgbe afọ 1914, Alaeze Mesaya amalitela iji nwayọọ nwayọọ na-eweghachi udo na ịdị n’otu ahụ dịbu n’etiti Chineke na ndị o kere eke. (Efe. 1:9, 10) N’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha “a na-adịghị ahụ anya” ugbu a ga-eme. Mgbe ahụzi, “ọgwụgwụ ga-abịa,” ya bụ, ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Gịnị ga-eme mgbe ahụ? N’agbanyeghị na e nyere Jizọs “ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa,” o nweghị oké ọchịchọ. Ọ dịghị mgbe o bu n’obi ịnara Jehova ọkwá ya. Ọ ga-eji obi umeala ‘nyefee alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya.’ Ọ ga-eji ọkwá pụrụ iche na ikike e nyere ya ‘wetara Chineke otuto.’—Mat. 28:18; Fil. 2:9-11.

19, 20. (a) Olee otú ndị niile Alaeze Chineke ga-achị ga-esi gosi ma hà na-akwado ọchịchị Jehova? (b) Olee olileanya magburu onwe ya anyị nwere?

19 N’oge ahụ, ndị Alaeze ahụ na-achị n’ụwa ga-ezu okè. Ha ga-eṅomi Jizọs ma jiri obi umeala na-erubere ọchịchị Jehova isi. Ha ga-egosi na ha ji obi ha niile na-erubere Jehova isi ma ha gafee ule ikpeazụ ahụ. (Mkpu. 20:7-10) Mgbe nke ahụ gachara, a ga-ebibi ndị nnupụisi niile, ma ụmụ mmadụ ma ndị mmụọ ọjọọ, ruo mgbe ebighị ebi. Oge ahụ ga-abụ oge oké ọṅụ! Ndị niile nọ n’ezinụlọ Jehova ma n’eluigwe ma n’ụwa ga-eji obi ụtọ too Jehova, ọ ga-abụkwa “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—Gụọ Abụ Ọma 99:1-3.

20 Ọmarịcha ihe ndị a Alaeze Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya hà ga-eme ka i lekwasị anya n’ime uche Chineke? Ị̀ ga-ekpebisi ike na ị gaghị ekwe ka olileanya ụgha na nkwa ụgha ụwa Setan na-ekwe na ya ga-eme ka ihe dịrị onye ọ bụla mma megharịa gị anya? Ị̀ ga-ekpebisikwu ike ịkwado ọchịchị Jehova? Ka omume gị gosi na ị chọrọ ime otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-enwe udo, ihe ga-agazikwara gị, ọ bụghị naanị ruo otu puku afọ, kama ruo mgbe ebighị ebi!

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Mgbe Jizọs ga-achịcha ma rụchaa ọrụ e nyere ya, ọ ga-eji obi umeala nyeghachi Nna ya Alaeze ahụ