Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Amaghị Ụbọchị Ma Ọ bụ Oge Awa Ọ Ga-abụ”

“Unu Amaghị Ụbọchị Ma Ọ bụ Oge Awa Ọ Ga-abụ”

“Unu Amaghị Ụbọchị Ma Ọ bụ Oge Awa Ọ Ga-abụ”

“Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.”​—MAT. 25:13.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee uru ụfọdụ ọ baara anyị na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa Chineke ga-ebibi ụwa ochie a?

Olee otú ndị e tere mmanụ si gosi na ha na-eche nche?

Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na anyị dị njikere maka mgbe Kraịst ga-abịa?

1-3. (a) Olee ihe atụ ndị nwere ike ime ka anyị ghọta ilu abụọ Jizọs tụrụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịmata azịza ha?

KA E were ya na onye ọchịchị a ma ama gwara gị ka i jiri ụgbọala buga ya otu ebe dị mkpa ọ chọrọ ịga. Ma, nkeji ole na ole tupu gị agawa iburu ya, ị chọpụtara na mmanụ dị n’ụgbọala gị agaghị ezuru unu ịga ebe ahụ. Ị ga-aga zụta mmanụ ụgbọala ngwa ngwa. Ozugbo ị gawara, onye ahụ abịa. Mgbe o legharịrị anya, ọ hụghị gị. Ọ gaghị echeli gị. N’ihi ya, ọ kpọọrọ onye ọzọ ka o buga ya ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ị bịarutere ma hụ na onye ahụ ahapụla gị gawa. Olee otú obi ga-adị gị?

2 Ugbu a, ka e were ya na ọ bụ gị bụ onye ọchịchị ahụ, ya abụrụkwa na ị họrọla mmadụ atọ maara nke a na-akọ ka ha rụọ ọrụ dị mkpa. Ị kọwaara ha ọrụ ahụ, ha atọ ejirikwa obi ha niile kweta ịrụ ya. Ma, ka obere oge gachara, ị lọghachitere ma chọpụta na ọ bụ naanị mmadụ abụọ n’ime ha rụrụ ọrụ ahụ. Nke ka njọ bụ na onye nke ahụ na-arụghị ọrụ ahụ nọ na-ekwu ihe na-enweghị isi mere o ji ghara ịrụ ọrụ ahụ. Ọ gbalịghịdị ịrụ ọrụ ahụ. Olee otú obi ga-adị gị?

3 Ihe atụ ndị ahụ yiri ilu abụọ Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke na nke ọ tụrụ banyere talent. N’ilu abụọ ahụ, Jizọs kwuru ihe mere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-eji kwesị ntụkwasị obi ma nwee uche n’oge ikpeazụ, ma ụfọdụ agaghị eme otú ahụ. * (Mat. 25:1-30) O kwuru ihe mere o ji nye ihe atụ ndị ahụ, sị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ,” ya bụ, mgbe Jizọs ga-ebibi ụwa Setan. (Mat. 25:13) Ndụmọdụ ahụ nwere ike ịbara anyị uru taa. Olee otú iche nche otú ahụ Jizọs kwuru ka anyị mee ga-esi baara anyị uru? Olee ndị gosirila na ha dị njikere ịlanahụ ọgwụgwụ ụwa a? Gịnịkwa ka anyị ga-eme ugbu a iji na-eche nche?

NA-ECHE NCHE MA RITE URU

4. Gịnị mere na ‘iche nche’ apụtaghị ilewe anya n’elekere?

4 Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ịma ihe na-akụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ na dọkịta gwara gị mgbe ị ga-abịa, ma ọ bụkwanụ na ị chọrọ ịbanye n’ụgbọ okporo ígwè, i kwesịrị ịmata ihe na-akụ ka oge ghara ịganahụ gị. Ma, n’ihe ndị ọzọ, dị ka ịgbanyụ ọkụ ma ọ bụ inyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, ilewe anya n’elekere nwere ike ịdọpụ mmadụ uche, ma ọ bụdị kpata ọnwụ mmadụ. N’oge ndị ahụ, ihe na-akacha mkpa bụ mmadụ ilekwasị anya n’ihe ọ na-eme kama ilewe anya n’elekere. Ka ọgwụgwụ usoro ihe a na-erukwu nso, ọrụ anyị na-arụ nke bụ́ ime ka ndị mmadụ mara ndokwa Jehova mere ịzọpụta ha dị mkpa ugbu a karịa otú ọ dịtụrụla. Ndị Kraịst iche nche apụtaghị na ha ga na-ele anya n’elekere. N’eziokwu, ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ ise anyị si erite uru n’ihi na anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọgwụgwụ ga-abịa.

5. Olee otú anyị si egosi ihe dị anyị n’obi n’ihi na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọgwụgwụ ga-abịa?

5 Nke mbụ bụ na anyị ga-enwe ike igosi ihe dị anyị n’obi n’ihi na anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. O gosiri na Jehova kwanyeere anyị ùgwù n’ihi na ọ hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie irubere ya isi. Ọ bụ ezie na anyị na-atụ anya ịlanahụ ọgwụgwụ usoro ihe a, anyị na-efe Jehova n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị naanị n’ihi na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi. (Gụọ Abụ Ọma 37:4.) Ime uche Chineke na-atọ anyị ụtọ, anyị ghọtakwara na Chineke na-akụziri anyị otú anyị ga-esi baara onwe anyị uru. (Aịza. 48:17) Anyị anaghị ele ihe Chineke nyere anyị n’iwu anya ka ibu arọ.—1 Jọn 5:3.

6. Ọ bụrụ na anyị na-efe Chineke n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, olee otú obi na-adị ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Uru nke abụọ anyị na-erite n’ihi na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọgwụgwụ ga-abịa bụ na ọ na-enye anyị ohere ime ka obi Jehova ṅụrịa. Ọ bụrụ na anyị na-efe ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị n’ihi na anyị bu otu ụbọchị n’obi ma ọ bụ naanị n’ihi na anyị chọrọ ka ọ kwụọ anyị ụgwọ ọrụ, anyị ga-eme ka Jehova nwekwuo ihe ọ ga-aza onye iro ya, bụ́ Setan, n’ihi ụta na-enweghị isi ọ na-ata ya. (Job 2:4, 5; gụọ Ilu 27:11.) N’ihi ahụhụ niile Ekwensu mere ka ndị mmadụ taa, anyị na-eji obi ụtọ akwado ọchịchị Jehova ma jụ ọchịchị obi ọjọọ Setan.

7. Gịnị ka i chere mere o ji dị mma ka anyị jiri ndụ anyị niile na-ejere Chineke ozi?

7 Nke atọ bụ na ọ bụrụ na anyị ebughị ụbọchị ọ bụla n’obi, ọ ga-adịkwuru anyị mfe iji ndụ anyị niile na-ejere Chineke ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka. Taa, ụfọdụ ndị na-amaghị Chineke kwetara na a ga-ebibi ụwa. Ebe ọ bụ na ụjọ na-atụ ha na a ga-ebibi ụwa n’oge na-adịghị anya, ihe ha na-agwa onwe ha bụ: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Kọr. 15:32) Ma, ụjọ anaghị atụ anyị. Anyị anaghị akpa iche iji mee ihe na-agụ naanị anyị. (Ilu 18:1) Kama nke ahụ, anyị ajụla onwe anyị ma jiri oge anyị, ume anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. (Gụọ Matiu 16:24.) Ife Chineke na-atọ anyị ụtọ, karịsịa inyere ndị ọzọ aka ịmata onye ọ bụ.

8. Olee ihe atụ si na Baịbụl nke na-egosi na anyị kwesịrị ịtụkwasịkwu Jehova na Okwu ya obi?

8 Uru nke anọ anyị na-erite n’ihi na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọgwụgwụ ga-abịa bụ na ọ na-eme ka anyị na-atụkwasịkwu Jehova obi ma na-agba mbọ irubere Okwu ya isi. Otu ihe anyị na-emekarị n’ihi na anyị ezughị okè bụ na anyị na-atụkwasịkarị onwe anyị obi. Pọl dụrụ Ndị Kraịst niile ọdụ, sị: “Ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.” O kwuru banyere iri puku ndị Izrel abụọ na atọ ndị nupụụrụ Jehova isi ma nwụọ mgbe ọ fọrọ obere ka Jọshụa duba ndị Chineke n’Ala Nkwa ahụ. Pọl kwuru, sị: “E dekwara [ihe ndị a] ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.”—1 Kọr. 10:8, 11, 12.

9. Olee otú ihe isi ike nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị bịarukwuo Chineke nso?

9 Uru nke ise anyị na-erite n’ihi na anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa bụ na ọ na-eme ka ihe isi ike ndị na-abịara anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Gụọ Abụ Ọma 119:71.) N’ezie, oge ikpeazụ nke usoro ihe a ‘dị oké egwu, taakwa akpụ.’ (2 Tim. 3:1-5) Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa Setan kpọrọ anyị asị. N’ihi ya, e nwere ike ịkpagbu anyị maka okwukwe anyị. (Jọn 15:19; 16:2) Ọ bụrụ na anyị ewetuo onwe anyị ala ma chọọ nduzi Chineke mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa, okwukwe anyị ga-esikwu ike, kakwa mma ka ihe e ji ọkụ nụchaa. Anyị agaghị ada mbà. Kama nke ahụ, anyị ga-abịarukwu Jehova nso otú anyị na-atụtụbeghị anya ya.—Jems 1:2-4; 4:8.

10. Olee ihe na-eme ka o yie ka oge ọ̀ na-agba ọsọ?

10 O nwere ike ịdị anyị ka oge ọ̀ na-agba ọsọ ma ọ bụ na-aga nwayọọ nwayọọ. Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile na-arụ ihe anyị na-arụ ma ghara ịna-ele anya n’elekere, ọ ga-adị anyị ka oge ọ̀ na-agba ọsọ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị etinye uche anyị niile n’ọrụ na-enye obi ụtọ Jehova nyere anyị, ụbọchị na oge awa ahụ nwere ike iyi ka ò ruru ọsọ ọsọ karịa otú anyị chere. Ọtụtụ ndị e tere mmanụ emeela otú ahụ. Ka anyị tụlee ihe mere mgbe e chisịrị Jizọs Eze n’afọ 1914 na otú ụfọdụ ndị sirila gosi na ha dị njikere ma ndị ọzọ adịghị.

NDỊ E TERE MMANỤ GOSIRI NA HA DỊ NJIKERE

11. Mgbe afọ 1914 gafere, gịnị mere ụfọdụ ndị e tere mmanụ ji chee na Onyenwe anyị egbuola oge?

11 Ì chetara ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke na nke ọ tụrụ banyere talent? A sị na ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke na ndị ohu ahụ maara mgbe onye ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ma ọ bụ nna ha ukwu ga-alọta, ọ garaghị adị mkpa ka ha chewe nche. Ma, ha amaghị. N’ihi ya, ha kwesịrị ịna-eche nche. Ọ bụ ezie na ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, ndị e tere mmanụ tụrụ anya na afọ ahụ ga-abụ afọ pụrụ iche, ha aghọtachaghị ihe ga-eme n’afọ ahụ. Mgbe ihe ha tụrụ anya ya na-emeghị, ọ ga-abụ na o yiri ha ka Onye ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ ò gbuola oge. Otu nwanna nwoke mechara kwuo, sị, “Ụfọdụ n’ime anyị kwenyesiri ike na anyị ga-aga eluigwe n’izu mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 1914.”

12. Olee otú ndị e tere mmanụ si gosi na ha kwesịrị ntụkwasị obi ma nwee uche?

12 Chegodị otú obi nwere ike isi daa Ndị Kraịst ahụ mbà mgbe ha tụrụ anya na ọgwụgwụ ga-abịa, ma ọ bịaghị! Ihe sikwaara ha ike n’ihi na a kpagburu ha mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Ọ fọrọ obere ka ha kwụsịchaa ikwusa ozi ọma. Ọ dị ka à ga-asị na ndị e tere mmanụ na-arahụ ụra. Ma, n’afọ 1919, a kpọrọ ha ka ha teta n’ụra! Jizọs bịara inyocha ndị niile kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst. Ma Jizọs chọpụtara na ụfọdụ ndị e tere mmanụ anaghị eme nke ọma, ha erughịzi eru ịrụrụ Nna ha ukwu bụ́ Jizọs ọrụ. (Mat. 25:16) Ha anaghị eche nche; ha dị ka ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ, bụ́ ndị na-agbanyeghị mmanụ n’oriọna ha. Ha mekwara ka ohu ahụ dị umengwụ, n’ihi na ha achọghị iji obi ha niile na-arụ ihe gbasara Alaeze Chineke. Ma, ọtụtụ ndị e tere mmanụ gosiri na okwukwe ha siri ezigbo ike nakwa na ọ na-agụsi ha agụụ ike ijere Nna ha ukwu ozi n’oge agha ahụ ihe siiri ha ike.

13. Olee otú ndị e tere mmanụ si lee ihe anya mgbe afọ 1914 gachara, oleekwa otú ha si ele ihe anya taa?

13 Mgbe afọ 1914 gachara, Ụlọ Nche kọwara otú obi dị ọtụtụ n’ime ndị e tere mmanụ. O kwuru na ndị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị adaghị mbà. O kwukwara, sị: “Anyị achọghị ka uche anyị mee; n’ihi ya, mgbe anyị chọpụtara na ihe anyị na-atụ anya ya n’Ọktoba 1914 ekwesịghị ekwesị, obi dị anyị ụtọ na Onyenwe anyị agbanweghị nzube ya ka obi wee dị anyị mma. Anyị achọghị ka o mee otú ahụ.” Naanị ihe ha chọrọ bụ ka ha ghọta nzube Chineke nke ọma. Taa, ndị e tere mmanụ dịkwa umeala n’obi otú ahụ ma na-agbalịsi ike ime uche Chineke. Ha anaghị ekwu na Chineke na-agwa ha okwu, ma ha kpebisiri ike ịrụ ọrụ Jizọs nyere ha ka ha rụọ n’ụwa. Ugbu a, ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ na-eṅomi otú ha si eche nche nakwa otú ha si anụ ọkụ n’obi.—Mkpu. 7:9; Jọn 10:16.

ATỤRỤ ỌZỌ NA-EGOSI NA HA DỊ NJIKERE

14. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-erube isi n’ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-akụzi?

14 Chineke họọrọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ka ọ na-enye ndị ya nri ime mmụọ, ya bụ, na-akụziri ha otú Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya ga-esi na-abara ha uru. Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị mụ anya, na-eṅomi Ndị Kraịst e tere mmanụ ma na-erube isi n’ihe ohu ahụ na-akụzi. Ọ dị ka à ga-asị na ha na-agbanye mmanụ n’oriọna ha. (Gụọ Abụ Ọma 119:130; Jọn 16:13.) A na-esi otú ahụ agba ha ume ka ha dịrị njikere maka ọgwụgwụ, bụ́ mgbe Kraịst ga-abịa, nakwa ka ha nwee ike ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara ha. Dị ka ihe atụ, n’otu ụlọ mkpọrọ ndị Nazi, ụmụnna nọ n’ebe ahụ nwere naanị otu Baịbụl. N’ihi ya, ha kpere ekpere ka ha nwetakwuo nri ime mmụọ. N’oge na-adịghị anya, ha nụrụ na otu nwanna nke bịara ọhụrụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ji Ụlọ Nche ọhụrụ ole na ole bata. O zoro ha n’ụkwụ ya nke e ji osisi rụọ. Otu n’ime ndị fọrọ ndụ n’ime ha, bụ́ onye e tere mmanụ, bụ Nwanna Ernst Wauer. O mechara kwuo, sị: “Jehova nyeere anyị aka n’ụzọ dị ebube iburu ihe ndị na-agba ume dị n’isiokwu ndị ahụ n’isi.” O kwukwara, sị: “Taa, ọ na-adịrị anyị mfe inweta nri ime mmụọ, ma ànyị na-eji ya akpọrọ ihe mgbe niile? Obi siri m ike na Jehova ga-agọzi ndị tụkwasịrị ya obi, na-erubere ya isi, na-erikwa nri na tebụl ya.”

15, 16. Olee otú Chineke si gọzie di na nwunye ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, gịnịkwa ka i nwere ike ịmụta n’ụdị akụkọ ahụ?

15 Atụrụ ọzọ ahụ na-arụsikwa ọrụ Nna ha ukwu ike, jirikwa obi ha niile na-akwado ụmụnna Kraịst. (Mat. 25:40) Ha adịghị ka ohu ọjọọ ahụ dị umengwụ Jizọs kọwara n’ilu ya. Ha dị njikere ịrụsi ọrụ ike ma hapụ ọtụtụ ihe iji buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, e nwere di na nwunye aha ha bụ Jon and Masako. A kpọrọ ha ka ha kwaga Kenya, bụ́ ebe ha ga-enyere ndị na-asụ Chaịniiz aka. Ná mmalite, o mere ha obi abụọ. Ma mgbe ha chebaara ọnọdụ ha echiche, kpeekwa ekpere banyere ya, ha kpebiri ịkwaga ebe ahụ.

16 Chineke gọziri mgbalị ha nke ukwuu. Ha kwuru, sị: “Ozi ọma anyị na-eje ebe a na-atọ anyị ụtọ.” Ha malitere ịmụrụ mmadụ asaa Baịbụl. E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ka obi tọọ ha ụtọ. Ha kwukwara, sị: “Anyị na-ekele Jehova kwa ụbọchị n’ihi na o kwere ka anyị kwafeta ebe a.” N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, bụ́ ndị gosiri na ha kpebisiri ike iji obi ha niile na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. Chegodị banyere ọtụtụ puku ụmụnna ndị gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma ghọọ ndị ozi ala ọzọ. Ọ ga-adị mma ka ị gụkwuo banyere ozi ahụ pụrụ iche n’isiokwu bụ́ “Anyị Na-eme Ihe Kasị Mma Anyị Pụrụ Ime!” n’Ụlọ Nche October 15, 2001. Ka ị na-agụ isiokwu ahụ na-atọ ụtọ nke kọrọ banyere ozi ala ọzọ, chee banyere ụzọ ndị i nwere ike isi wepụtakwuo oge maka ozi Chineke iji nye ya otuto, nke ga-emekwa ka i nwekwuo ọṅụ.

NA-ECHEKWA NCHE

17. Olee uru ọ baara anyị na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa Chineke ga-ebibi ụwa ochie a?

17 O doro anya na ọ baara anyị uru na anyị amaghị kpọmkwem ụbọchị ma ọ bụ oge awa Chineke ga-ebibi ụwa ochie a. Kama ikwe ka ọ na-ewe anyị iwe ma ọ bụ mee ka anyị daa mbà, ọ na-eme ka anyị na Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, dịkwuo ná mma, ka anyị ji obi anyị niile na-eme uche ya. Ebe ọ bụ na anyị ejidela aka n’ọ́gụ̀, dị ka Jizọs kwuru, ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya, anyị ji obi ụtọ na-ejere Nna anyị ukwu ozi.—Luk 9:62.

18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịda mbà n’okwukwe?

18 Ụbọchị Chineke ga-ekpe ụwa ochie a ikpe adịla ezigbo nso. E nweghị onye n’ime anyị chọrọ ime ihe ga-ewute Jehova ma ọ bụ Jizọs. Ha enyela anyị ihe ùgwù pụrụ iche n’oge ikpeazụ a, nke bụ́ ijere ha ozi. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ha tụkwasịrị anyị obi!—Gụọ 1 Timoti 1:12.

19. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị njikere?

19 Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịdị ndụ n’eluigwe ma ọ bụ ibi na Paradaịs n’ụwa, ka anyị kpebisie ike iji obi anyị niile na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere anyị, nke bụ́ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Anyị amabeghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ụbọchị Jehova ga-abịa. Ànyị kwesịdịrị ịma? Anyị nwere ike ịdị njikere maka ụbọchị ahụ, anyị ga-adịkwa njikere. (Mat. 24:36, 44) Obi siri anyị ike na ọ bụrụhaala na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile ma buru ụzọ na-achọ Alaeze ya, a gaghị emechu anyị ihu.—Rom 10:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Gụọ Ụlọ Nche March 1, 2004, peeji nke 14-18.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ọ bụrụgodị na ihe esie ike, na-achọ nri ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 27]

Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-ejere Chineke ozi, oge ga na-agba ọsọ