Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Chineke—Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya

Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Chineke—Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya

Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Chineke​—Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya

JEHOVA bụ “Onye Ozizi Ukwu” anyị. (Aịza. 30:20) Ọ na-ezi ndị ọzọ ihe n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, n’ihi otú Jehova si hụ Jizọs n’anya, ọ na-egosi ya “ihe niile ya onwe ya na-eme.” (Jọn 5:20) Otú Jehova si hụ anyị bụ́ Ndịàmà ya n’anya na-eme ka o nye anyị “ire nke ndị a kụziiri ihe,” ka anyị na-agbasi mbọ ike ịsọpụrụ ya na inyere ndị ọzọ aka.—Aịza. 50:4.

Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi na-eṅomi ịhụnanya Jehova. N’ihi ya, ha na-eji ụlọ akwụkwọ iri e nwere ná nzukọ Chineke azụ ndị chọrọ ka a zụọ ha nakwa ndị ga-agali ha. Ị̀ ghọtara na ụlọ akwụkwọ ndị a na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya?

Ka anyị tụlee ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ugbu a ná nzukọ Jehova ma nụ ihe ụfọdụ ndị gara ha kwuru. Jụzie onwe gị, sị, ‘Olee otú m nwere ike isi rite uru n’ọzụzụ a si n’aka Chineke?’

RITE URU N’ỌZỤZỤ NZUKỌ CHINEKE NA-ENYE

Ebe ọ bụ na Jehova bụ “Chineke nke ịhụnanya,” ọ na-enye anyị ọzụzụ na-abara anyị uru, nke na-akwadebe anyị imeri nsogbu ma na-enyere anyị aka inweta ezigbo ọṅụ n’ozi anyị. (2 Kọr. 13:11) Otú ahụ a zụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ, a zụọla anyị nke ọma ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka, “na-ezi ha ka ha debe ihe niile” e nyere anyị n’iwu.—Mat. 28:20.

Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị agali ụlọ akwụkwọ a niile, anyị nwere ike irite uru n’otu n’ime ha ma ọ bụ karịa. Anyị ga-enwe ike ime ihe e si na Baịbụl kụziere anyị n’ụlọ akwụkwọ ndị ahụ. Ọ bụrụkwa na anyị na ndị Jehova zụrụ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ndị ahụ esoro na-aga ozi ọma, anyị ga-amụtakwu izi ozi ọma.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọnọdụ m ọ̀ ga-ekwe m ịga nke ọ bụla n’ụlọ akwụkwọ ndị a?’

Ndị na-efe Jehova ghọtara na ịkwado ụlọ akwụkwọ ndị a na ịga ha bụ ihe ùgwù. Ka ọzụzụ i nwetara mee ka gị na Chineke dịkwuo ná mma, meekwa ka ị dị njikere ịrụ ọrụ ndị o nyere gị, karịsịa ọrụ ahụ dị mkpa, nke bụ́ ikwusa ozi ọma.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 13-17]

ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ E NWERE NÁ NZUKỌ CHINEKE

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ iji nyere ndị nkwusa aka ka ha bụrụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma na ịkụzi Baịbụl.

Oge A Na-agụru Ya: A naghị agụcha ya agụcha.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị Na-aga Ya: Ndị niile na-abịachi ọmụmụ ihe anya, ndị kwetara ihe Baịbụl na-akụzi, na ndị na-agba mbọ ibi ndụ otú Chineke kwuru.

Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-edenye aha ndị chọrọ iso n’ụlọ akwụkwọ a.

Sharon, bụ́ onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, kwuru, sị: “Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke akụzierela m otú e si eme nchọnchọ na otú e si ekwu okwu otú ga-edo ndị mmadụ anya. Amụtakwala m ịna-elekwasị anya n’inyere ndị ọzọ aka ime ka ha na Chineke dị ná mma, ọ bụghị naanị ime ka okwukwe nke m sie ike.”

Arnie, onye bụrụla onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ruo ọtụtụ afọ, kwuru, sị: “Abụ m onye nsụ, ọ na-esikwara m ike ile ndị ọzọ anya n’ihu. Ụlọ akwụkwọ a enyerela m aka inwe obi ike ma ghọta na m bara uru. Jehova ejirila ụlọ akwụkwọ a nyere m aka ịmụta otú m ga-esi na-eku ume mgbe m na-ekwu okwu na otú m ga-esi mee ka uche m na-adị n’ihe a na-ekwu. M na-ekele Chineke maka ime ka m nwee ike ịna-eto ya ma n’ọgbakọ ma n’ozi ọma.”

Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Bịara Betel Ọhụrụ

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ iji nyere ndị bịara Betel ọhụrụ aka ka ha nwee ike ime nke ọma n’ọrụ ha na-arụ na Betel.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa anọ. Kwa izu, a na-eji nkeji iri anọ na ise akụziri ndị na-aga ya ihe.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ na Betel.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ ndị so n’ezinụlọ Betel. Ndị ọzọ na-aga ya bụ ndị bịara ịrụ ọrụ otu afọ ma ọ bụ karịa na Betel.

Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-eji aka ha edenye aha onye ọ bụla bịara ọhụrụ na Betel.

Demetrius, bụ́ onye gara ụlọ akwụkwọ ahụ n’ihe dị ka afọ 1980, kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ ahụ mere ka m mụta ịmụ ihe nke ọma, kwadebekwa m ije ozi Betel ruo ọtụtụ afọ. Otú ndị kụziri ihe na ya si kụziere anyị ihe, ihe ndị a kụziiri anyị, na ndụmọdụ bara uru ndị e nyere anyị mere ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya nakwa na ọ chọrọ ka ihe gaziere m n’ozi m na-eje na Betel.”

Kaitlyn kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ a nyeere m aka ilekwasị anya n’ihe kacha mkpa, ya bụ, ime uche Jehova. O nyekwaara m aka ịhụkwu Jehova n’anya na iji ụlọ ya na nzukọ ya kpọrọ ihe.”

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye, nakwa mgbe ụfọdụ, ndị ohu na-eje ozi otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha n’ọgbakọ nakwa ná nzukọ Jehova. (Ọrụ 20:28) A na-eleba anya n’ihe ndị na-eme n’ọgbakọ na nsogbu ndị ha na-enwe. A na-enwe ụlọ akwụkwọ a kwa afọ ole na ole, mgbe ọ bụla Òtù Na-achị Isi kwuru ka e nwee ya.

Oge Ọ Na-ewe: Ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya na-abụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ ụbọchị abụọ na ọkara maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, otu ụbọchị na ọkara maka ndị okenye, na otu ụbọchị maka ndị ohu na-eje ozi.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ naanị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi.

Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụ onye nlekọta sekit na-agwa ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi mgbe ha ga-aga ya. Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mgbe ha ga-aga nke ha.

Quinn (n’okpuru) kwuru, sị: “N’agbanyeghị na a na-akụzi ọtụtụ ihe n’ụlọ akwụkwọ a n’ụbọchị ole na ole, ọ na-enyere ndị okenye aka iji ọṅụ arụ ọrụ ha na ‘ime ka ndị dimkpa’ n’ozi Jehova. Ma ndị okenye ọhụrụ ma ndị bụrụla okenye ọtụtụ afọ na-amụta otú e si azụ atụrụ Chineke nke ọma ma dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị ‘n’otu echiche.’”

Michael kwuru, sị: “Ọzụzụ e nyere anyị n’ụlọ akwụkwọ ahụ kụziiri anyị ma otú anyị ga-esi ghọta ihe ndị ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sie ike, ma otú anyị ga-esi zere ihe ndị nwere ike imebi okwukwe anyị, ma otú anyị ga-esi na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. Jehova ji ụlọ akwụkwọ a na-enyere anyị aka n’ihi obiọma ya.”

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ọ bụ iji kụziere ndị ọsụ ụzọ otú ha ga-esi “jezuo ozi” ha.—2 Tim. 4:5.

Oge Ọ Na-ewe: Izu abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a na-anọ enwe ya; ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ ndị sụrụla ụzọ oge niile ruo otu afọ ma ọ bụ karịa. *

Otú E Si Edenye Aha: Ọ bụ onye nlekọta sekit na-ekpebi ndị ọsụ ụzọ ruru eru ga-aga ya, ọ bụkwa ya na-agwa ha mgbe ha ga-aga ya.

Lily (n’aka nri) kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ a enyerela m aka imeri nsogbu ndị m na-enwe n’ozi ọma nakwa ná ndụ m. Amụtakwuola m otú e si amụ ihe, otú e si akụzi ihe, na otú e si akọwa Baịbụl. Ụlọ akwụkwọ a emeela ka m nwee ike ịna-enyere ndị ọzọ aka, ịna-akwado ndị okenye, na iso na-eme ka a na-enwe ọganihu n’ọgbakọ.”

Brenda, bụ́ onye garala ụlọ akwụkwọ a ugboro abụọ, kwuru, sị: “O mere ka m jiri obi m niile na-efe Jehova, na-eme ka akọnuche m na-arụ ọrụ nke ọma, meekwa ka m lekwasị anya n’inyere ndị ọzọ aka. O doola m anya na Jehova na-emesapụ aka!”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 39 Ọ bụrụ na ndị malitere ịsụ ụzọ ọhụrụ agaghị eju otu klas, e nwere ike ịkpọ ụfọdụ ndị gara ụlọ akwụkwọ ahụ ihe karịrị afọ ise gara aga ka ha gaa nke ugboro abụọ.

Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Okenye Ọgbakọ

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma n’ọgbakọ, meekwa ka ha ghọtakwuo ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme.

Oge Ọ Na-ewe: Ụbọchị ise.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya; ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ naanị ndị okenye.

Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị okenye mgbe ha ga-aga ya.

Ụfọdụ ndị gara klas nke iri itoolu na abụọ n’Amerịka kwuru, sị:

“Ụlọ akwụkwọ a abaarala m ezigbo uru. O nyerela m aka ileru onwe m anya ma mata otú m nwere ike isi na-elekọta atụrụ Jehova.”

“Adị m njikere ime ka isi ihe ndị dị na Baịbụl doo anya, nke ga-eme ka m na-agbakwu onye ọ bụla ume.”

“Agaghị m echefu ihe a kụziiri m n’ụlọ akwụkwọ a echefu ná ndụ m niile.”

Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị na Nwunye Ha

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti otú ha ga-esi na-eleta ọgbakọ nke ọma ma “na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.”—1 Tim. 5:17; 1 Pita 5:2, 3.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a na-anọ enwe ya.

Ndị Na-aga Ya: Ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti.

Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti na ndị nwunye ha mgbe ha ga-aga ya.

Joel, bụ́ onye gara klas nke mbụ n’afọ 1999, kwuru, sị: “E mere ka anyị ghọtakwuo otú anyị ga-esi na-akwanyere Jizọs bụ́ onyeisi nzukọ Jehova ùgwù. Anyị mụtara na anyị kwesịrị ịna-agba ụmụnna ndị anyị na-elekọta ume, na-emekwa ka ọgbakọ ọ bụla dị n’otu. Ụlọ akwụkwọ ahụ nyekwaara anyị aka ịghọta na n’agbanyeghị na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-adụ ụmụnna ọdụ ma na-agbazi ha mgbe ụfọdụ, ihe kacha mkpa ha na-arụ bụ inyere ụmụnna aka ịghọta na Jehova hụrụ ha n’anya.”

Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-alụbeghị nwaanyị otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ndị e nyekwuru ha ná nzukọ Jehova. Ha gachaa ụlọ akwụkwọ a, a na-eziga ọtụtụ n’ime ha n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ná mba ha. A na-ezigakwa ụfọdụ n’ime ha ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịga. E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge, e ziga ha ịmalite ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo nakwa n’ebe dịpụrụ adịpụ.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya; ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ ụmụnna nwoke ndị na-alụbeghị nwaanyị, ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na iri isii na abụọ na-aga ya. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ije ozi n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ka ukwuu. (Mak 10:29, 30) Ha ga-abụrịrị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi jerela ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala, bụrụkwa ọsụ ụzọ jerela ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala.

Otú E Si Edenye Aha: Ndị nwere mmasị ịga ya na-aga nzukọ a na-enwe ná mgbakọ sekit, bụ́ ebe a na-akọwara ha ihe ndị ha kwesịrị ịma.

Rick, bụ́ onye gara klas nke iri abụọ na atọ e nwere n’Amerịka, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m ji obi m niile ṅaa ntị n’ụlọ akwụkwọ ahụ, mmụọ nsọ Jehova gbanwere obi m. Mgbe ọ bụla Jehova nyere mmadụ ọrụ, ọ na-akwado ya n’ọrụ ahụ. Amụtara m na ọ bụrụ na mụ elekwasị anya n’ime uche Chineke, kama ime uche nke m, ọ ga-enyere m aka.”

Andreas, bụ́ onye na-eje ozi na Jamanị, kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ ahụ kụziiri m ile nzukọ Jehova e nwere taa anya ka ọrụ ebube. Ọzụzụ e nyere m kwadebere m maka ọrụ ndị m ga-emecha rụọ. Ọtụtụ ihe atụ e si na Baịbụl nye anyị mere ka m mụta otu eziokwu dị mkpa, nke bụ́: Ijere Jehova na ụmụnna m ozi ga-eme ka m nwee ezi obi ụtọ.”

Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya enye ndị lụrụ di na nwunye ọzụzụ pụrụ iche, ka Jehova na nzukọ ya nwee ike iji ha rụọ ọrụ nke ọma. A ga-eziga ọtụtụ ndị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a n’ebe e nwere mkpa ná mba ha. E nwere ike iziga ụfọdụ ije ozi ná mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha ewepụta onwe ha. E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge, e ziga ha ịmalite ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo nakwa n’ebe dịpụrụ adịpụ.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: A na-enwe ụlọ akwụkwọ a n’Amerịka, ma malite na Septemba 2012, a ga na-enwekwa ya n’ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ. A ga na-enwekarị ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ ndị di na nwunye, ndị nọ n’agbata afọ iri abụọ na ise na iri ise na-aga ya. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ije ozi n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ka ukwuu. Ha ga-enwe ụdị àgwà ahụ Aịzaya nwere, bụ́ onye sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8) Ihe ọzọ bụ na ha ga-abụrịrị ndị di na nwunye lụrụla ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala, jeekwa ozi oge niile afọ abụọ n’akwụsịghị akwụsị. Nke nwoke ga-abụrịrị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala n’akwụsịghị akwụsị.

Otú E Si Edenye Aha: Ndị nwere mmasị ịga ya na-aga nzukọ a na-enwe ná mgbakọ distrikti, bụ́ ebe a na-agwa ha ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ịma. Ọ bụrụ na a naghị enwe nzukọ ahụ ná mgbakọ distrikti ná mba unu, ya abụrụkwa na ị chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ ahụ, i nwere ike idegara alaka ụlọ ọrụ unu akwụkwọ ka ha gwa gị ihe ị ga-eme.

Eric na Corina, (n’okpuru) bụ́ ndị gara klas nke mbụ e nwere n’afọ 2011, kwuru, sị: “Izu asatọ anyị nọrọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ gbanwere ndụ anyị kpamkpam, ọ bụkwa ezigbo ihe ùgwù maka di na nwunye ndị chọrọ ijekwuru Jehova ozi! Anyị ekpebisiela ike na anyị agaghị ekwe ka ihe ndị ọzọ anyị na-eme mee ka anyị ghara iji oge anyị na-eme ihe bara uru.”

Ụlọ Akwụkwọ Gilied

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: A na-azụ ndị gara ya ịbụ ndị ozi ala ọzọ n’ebe ndị mmadụ bijuru ebiju, ịbụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ ịrụ ọrụ na Betel. Ihe mere e ji enwe ụlọ akwụkwọ a bụ ka e nwee ike ịhazikwu ozi ọma anyị na-eje na ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa ise.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka.

Ndị Na-aga Ya: Ọ bụ di na nwunye ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche, ya bụ, ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị ụlọ akwụkwọ a, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ ndị Betel. Ha ga-abụ ndị nọrọla n’ozi ahụ ruo afọ atọ n’akwụsịghị akwụsị. Ha ga-abụ ndị na-asụ Bekee nke ọma, na-agụ ya ma na-ede ya.

Otú E Si Edenye Aha: Kọmitii Alaka nwere ike ịgwa ndị di na nwunye ka ha dejupụta akwụkwọ ịga ya.

Lade na Monique, bụ́ ndị si Amerịka, na-eje ozi ugbu a n’Afrịka. Lade kwuru, sị: “Ụlọ Akwụkwọ Gilied mere ka anyị jikere ịga ebe ọ bụla n’ụwa ma soro ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya rụkọọ ọrụ.”

Monique kwukwara, sị: “Ka m na-eme ihe ndị m mụtara n’Okwu Chineke, m na-enwe ezigbo ọṅụ n’ozi m. Aghọtara m na ọṅụ ahụ m na-enwe gosiri na Jehova hụrụ m n’anya.”

Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E ji ya akụziri ndị so na Kọmitii Alaka otú ha ga-esi na-elekọta Betel, na-eleba anya ná nsogbu ọgbakọ dị iche iche na-enwe n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma, nakwa otú ha ga-esi na-elekọta sekit na distrikti dị iche iche. A na-akụzikwara ha ihe gbasara ọrụ nsụgharị, ibi akwụkwọ, na izipụ akwụkwọ.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, Niu Yọk, Amerịka.

Ndị Na-aga Ya: Nke nwoke ga-abụ onye so na Kọmitii Alaka ma ọ bụ Kọmitii Na-elekọta Mba ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na a chọrọ ka o soro n’otu n’ime ha.

Otú E Si Edenye Aha: Òtù Na-achị Isi na-agwa ụmụnna nwoke na nwunye ha mgbe ha ga-aga ya.

Lowell na Cara, bụ́ ndị gara klas nke iri abụọ na ise, na-eje ozi ugbu a na Naịjirịa. Lowell kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ ahụ chetaara m na n’agbanyeghị ụdị ọrụ e nyere m ma ọ bụ otú o si yie ka enweghị m ohere, ihe kacha amasị Jehova bụ ime ihe ọ chọrọ. Ihe anyị mụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ mere ka o doo anya na otú anyị si emeso ndị ọzọ kwesịrị igosi ụdị ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ.”

Cara kwuru, sị: “Otu ihe e kwuru n’ụlọ akwụkwọ ahụ m ka na-atụgharị n’uche bụ: Ọ bụrụ na mụ agaghị akọwali ihe otú ọ ga-edo anya, m kwesịrị ịmụ ya nke ọma tupu mụ akụziwere ya ndị ọzọ.”