Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?

Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?

Ò Nwere Ebe Nrụrụ Aka Na-adịghị?

“Ụlọ ọrụ anyị na-arụrụ otu ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo ọrụ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-echere ruo ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ tupu ha akwụọ anyị ụgwọ ihe ndị anyị rụụrụ ha. Ma na nso nso a, otu onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti ahụ kpọrọ m n’ekwentị. Ọ gwara m na ya ga-eme ka a kwụọ anyị ụgwọ ahụ ọsọ ọsọ ma ọ bụrụ na anyị ga-esi na ya nye ya ego aka azụ.”—JOHN. *

ÒNWETỤLA mgbe mmadụ ibe gị rigburu gị? O nwere ike ịbụ na otú onye ahụ si rigbuo gị dị iche na nke a e kwuru n’elu. Ma, o doro anya na mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha akpatatụrụla gị nsogbu.

N’afọ 2011, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Nrụrụ Aka n’Ụwa bipụtara otu akwụkwọ nke gosiri ihe ndị ha chọpụtara n’otu narị mba na iri asatọ na atọ. Akwụkwọ ahụ kwuru na “nrụrụ aka akpaala ọtụtụ mba ndị ahụ aka ọjọọ.” N’akwụkwọ nke ha bipụtara n’afọ 2009, ha kwuru, sị: “O doro anya na o nweghị mba ị gara n’ụwa nrụrụ aka na-adịghị.”

Mgbe ụfọdụ, nrụrụ aka na-akpatara ndị mmadụ nsogbu dị oké njọ. Dị ka ihe atụ, magazin a na-akpọ Time kwuru na ihe so mee ka ọtụtụ ndị nwụọ mgbe ala ọma jijiji mere ná mba Heiti n’afọ 2010 bụ “nrụrụ aka na ejighị ihe kpọrọ ihe.” Magazin ahụ kwukwara, sị: “Ndị mmadụ na-ewu ụlọ aghara aghara. Ha anaghị ajụta ndị ọkachamara n’iwu ụlọ otú ha kwesịrị isi wuo ụlọ ha ha adị mma, o nwekwanụghị onye na-enye ha nsogbu maka na ha na-eji ego emechi ndị ọrụ gọọmenti ọnụ.”

Ò nwere ihe ga-eme ka nrụrụ aka a juru ebe niile kwụsị? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ndị mere nrụrụ aka ji ju ebe niile. Anyị ga-eleba ha anya n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Nrụrụ aka bụ mmadụ iji ọkwá e nyere ya na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru. Nrụrụ aka jọgburu onwe ya, o nweghị ụdị nsogbu ọ na-anaghị akpatara ndị mmadụ.”​—Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Nrụrụ Aka n’Ụwa