Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Okwu Chineke Si Kpaa ike N’otu Ezinụlọ Na-ekpe Okpukpe Hindu

Otú Okwu Chineke Si Kpaa ike N’otu Ezinụlọ Na-ekpe Okpukpe Hindu

Otú Okwu Chineke Si Kpaa ike N’otu Ezinụlọ Na-ekpe Okpukpe Hindu

Akụkọ Nalini Govindsamy kọrọ

ENWEGHỊ M ike ichefu ihe mere n’otu ụtụtụ Mọnde mgbe ndị ezinụlọ anyị zukọtara iri nri ụtụtụ n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Ọgọst, n’afọ 2005. N’oge ahụ, anọ m n’ọnụ ọnwụ n’ihi otu nnukwu akpụ nke toro m n’ụbụrụ. Di m bụ́ Krishna kpere ekpere, mụ agwazie ndị ezinụlọ anyị okwu.

M gwara ha, sị, “M na-aga ụlọ ọgwụ ka a waa m ahụ́. Amakwanụghị m ma m̀ ga-adị ndụ ka m̀ ga-anwụ. Werenụ ihe ọ bụla unu hụrụ. M kwuola otú a ga-esi eli m, a dịghị ama ama mụ anwụọ. Ununwa ndị na-efe Jehova, biko, unu akwụsịkwala ife ya. Ma ununwa ndị na-amalitebeghị ife Jehova, m na-arịọ unu ka unu na Ndịàmà Jehova malite ịmụ Baịbụl. M na-arịọkwa unu ka unu gawa ọmụmụ ihe anyị. Ọ bụrụ na unu emee otú ahụ, unu ga-enwe okwukwe otú m nwere ma ghọta na oge na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. N’oge ahụ, ndị niile na-efe Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, o nweghịkwa onye ga-arịa ọrịa n’ime ha.”

Tupu mụ akọọ ihe mere mgbe a wachara m ahụ́, ka m kọgodị banyere ezinụlọ anyị na otú m si malite ife ezi Chineke.

Otú M Si Bụrụ Onye Hindu

Ezinụlọ anyị bi n’otu nnukwu ụlọ nke e ji osisi na ígwè rụọ. Ụlọ a dị n’otu ugwu nke dị n’ikpere oké osimiri dị n’obodo Dọban, na Saụt Afrịka. Ọ bụrụ na ị chọrọ irute n’ụlọ anyị, ị ga-esi n’okporo ụzọ rịa steepụ dị otu narị na iri abụọ na ise. I soro steepụ ndị ahụ, ị ga-erute n’ụzọ ọhịa e si aga n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ anyị. E ji ígwè rụọ ọnụ ụzọ ámá anyị ahụ. Ọ bụ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá ahụ ka nne nne m na-anọ efe chi ya dị iche iche otú ndị Hindu si eme. Chi ya ndị ahụ a kpụrụ akpụ nakwa foto ha juru ebe ahụ. Nne nne m gwara m na ọ bụ chi ndị ahụ mere ka a mụọ m. N’ihu ebe ahụ a na-efe chi ndị ahụ, e nwere steepụ ndị na-acha ọbara ọbara. Ọ bụrụ na mmadụ esoro steepụ ndị ahụ, ọ ga-erute n’ihu ọnụ ụzọ ụlọ anyị. Ụlọ anyị buru ezigbo ibu, nweekwa ogologo paseeji na nnukwu usekwu. Ọnụ ụlọ ebe anyị na-ehi ụra dị asaa. E nwekwara otu ọnụ ụlọ e wupụrụ iche. Anyị dị mmadụ iri abụọ na asaa biri n’ụlọ ahụ, ya bụ, nne na nna m ochie, papa m na mama m, ụmụ nwoke atọ ndị papa m tọrọ, na nwanne ha nwaanyị, bụ́ ọdụdụ nwa ha, nakwa ndị ezinụlọ ha.

Ịkpa afọ nnukwu ezinụlọ a adịghị mfe. Ma otú ahụ anyị si bikọta ọnụ mere ka anyị dịrị n’otu, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. Mama m, bụ́ Gargee Devi, na ndị nwunye ụmụnne papa m atọ na-arụ ọrụ ndị e nwere n’ụlọ. Ha na-eke ọrụ ndị ahụ eke. Onye o ruuru isi nri na idebe ụlọ ọcha, ya esie nri, debekwa ụlọ ọcha. Ọ bụ nna nna m bụ onyeisi ezinụlọ anyị, ọ bụkwa ya na-azụta ihe oriri anyị niile na-eri. N’ụbọchị Wenezdee ọ bụla, nne nne m na nna nna m na-aga ahịa azụta anụ, mkpụrụ osisi, na akwụkwọ nri ga-ezuru anyị n’otu izu. Anyị na-anọ n’okpuru otu osisi dị nso n’ụlọ anyị na-eche mgbe ha ga-alọta ahịa. Ozugbo anyị hụrụ ka ha bu nnukwu nkata si n’ụgbọala na-apụta, anyị na-eji ọsọ arịda steepụ ndị ahụ gaa nyere ha aka bulata ihe ndị ha zụtara.

N’ubi anyị, e nwere otu ogologo nkwụ nke nnụnụ rụrụ akwụ́ na ya. Anyị na-ahụ nnụnụ ndị ahụ ka ha na-efegharị na-ebe ubé. Nne nne m na-anọ ọdụ na steepụ dị n’ihu ọnụ ụzọ ụlọ anyị na-akọrọ anyị akụkọ. Otú o si akọ akụkọ ndị ahụ na-adị ka ọ̀ na-akọwara anyị ihe nnụnụ ndị ahụ na-ebe n’ubé. M ka na-echeta ọtụtụ ihe ndị anyị mere n’ụlọ anyị n’oge ndị ahụ. Anyị na-egwuri egwu, na-achị ọchị, na-enyerịta ibe anyị ihe, na-emekwa ihe ndị ọzọ. Otú ahụ anyị si bikọta ọnụ tọrọ anyị ezigbo ụtọ. Nke ka nke bụ na ọ bụ n’ụlọ anyị a ka anyị nọ bido ịmụ banyere Onye kere anyị, bụ́ Jehova, nakwa banyere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst.

Tupu anyị amalite ịmụ banyere Jehova, kwa ụbọchị, anyị na-eme ọtụtụ ihe ndị na-ekpe okpukpe Hindu na-emere chi ha. Mgbe ụfọdụ, anyị na-eme nnukwu ememme. Anyị na-akpọkwa ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị fee ọtụtụ chi ndị ahụ anyị na-efe. Ọ na-abụ anyị mewe ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ, nne nne m na-eme ka ọ̀ na-ahụ ọhụụ, ya na ndị mmụọ ọjọọ amalitekwa ikwurịta okwu. O ruo n’etiti abalị, anyị na-eji ụmụ anụmanụ achụrụ ndị mmụọ ọjọọ ahụ àjà ka obi jụrụ ha. Nna nna m bụkwa onye a ma ama n’obodo anyị n’ihi na ọ na-enye ego maka iwu ụlọ akwụkwọ na ebe dị iche iche ndị Hindu na-anọ efe chi ha nakwa ego e ji egbo mkpa e nwere n’ebe ndị ahụ.

Otú Anyị Si Mata Jehova

N’afọ 1972, nna nna m rịawara ọrịa ma mechaa nwụọ. Ọnwa ole na ole ọ nwụrụ, nwunye nwanne papa m aha ya bụ Indervathey, ma ọ bụ Jane, natara Ndịàmà Jehova Ụlọ Nche na Teta. Ma, o wutere ya na ọ kpọbataghị Ndịàmà Jehova ahụ n’ụlọ ka ya na ha kwurịta okwu. Tupu oge ahụ, anyị anaghị anabata Ndịàmà Jehova n’ụlọ anyị. Ma n’oge ọzọ ha bịara, Jane kpọbatara ha n’ụlọ ma kọọrọ ha na di ya na-aṅụ oké mmanya nakwa na mmanya ahụ ọ na-aṅụ na-esere ha okwu. Ndị ikwu na ibe anyị gwara Jane ka ọ gbaa di ya alụkwaghịm. Ma Ndịàmà Jehova ahụ gwara Jane ihe Chineke kwuru banyere alụmdi na nwunye. (Matiu 19:6) Obi tọrọ Jane ụtọ mgbe ọ nụrụ ihe Baịbụl kwuru banyere alụmdi na nwunye nakwa na ihe ga-emecha dị mma n’ụwa. * Ihe a ọ nụrụ mere ka o kpebie na ya agaghịzi ahapụ di ya, ya na Ndịàmà Jehova malitekwara ịmụsi Baịbụl ike. Ọ na-abụ ya na ha mụwa Baịbụl na palọ, mama m na ndị nwunye ụmụnne papa m ndị ọzọ anọrọ n’ime ụlọ na-ege ihe ha na-ekwu.

Mama m na ndị nwunye ụmụnne papa m ndị ahụ na Ndịàmà Jehova mechara mụwa Baịbụl. Jane na-akọrọ anyị ihe ndị ọ na-amụta. Ọtụtụ mgbe, ọ na-agụrụ anyị akwụkwọ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti * ma na-akọwara anyị ihe ọ gụrụ. Mgbe ụmụnne papa m matara na mama m na ndị nwunye ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ha malitere inye anyị nsogbu. Otu onye n’ime ha kpọrọ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ọkụ. Ha na-agwa anyị okwu ọjọọ ma na-eti anyị ihe ma anyị gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ọ bụ naanị papa m bụ onye na-enyeghị anyị nsogbu. O nweghị mgbe ọ gwara anyị ka anyị kwụsị ịmụ banyere Jehova. Mama m na ụmụ nwaanyị atọ ndị ọzọ ahụ akwụsịghị ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ha akwụsịghịkwa ịhụ Jehova Chineke n’anya.

N’afọ 1974, e mere Jane baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Obere oge e mechara ya baptizim, e mekwara mama m na ndị nwunye ụmụnne papa m ndị ahụ baptizim. Mgbe obere oge gafere, nne nne m kwụsịrị ikpe okpukpe Hindu. M so ha gaa ọmụmụ ihe ọtụtụ afọ. Ma, mgbe anyị gara otu mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova, otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Shameela Rampersad jụrụ m, sị, “Olee mgbe ị ga-eme baptizim?” M gwara ya, sị: “Amaghị m, n’ihi na o nweghị onye na-amụrụ m Baịbụl.” Ọ gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl. E mere m baptizim ná mgbakọ ọzọ e nwere n’abalị iri na isii n’ọnwa Disemba nke afọ 1977. N’ime ndị ezinụlọ anyị dị mmadụ iri abụọ na asaa, e mechara mee mmadụ iri na asatọ baptizim. Ma n’oge ahụ a wara m ahụ́, papa m, onye aha ya bụ Sonny Deva, ka na-ekpe okpukpe Hindu.

“Unu Echegbula Onwe Unu Banyere Ihe Ọ Bụla”

Ihe e dere n’akwụkwọ Ndị Filipaị 4:6, 7 nyeere m ezigbo aka. Mgbe ọ kacha nyere m aka bụ mgbe ahụ a wara m ahụ́. Amaokwu ndị ahụ kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” O siri ike mmadụ ịsị na ya agaghị ‘echegbu onwe ya,’ nke ka nke, ma ọ bụrụ na a gwara onye ahụ na ọrịa ọ na-arịa ga-egbu ya. Ihe mbụ m mere mgbe a gwara m na ọrịa ahụ ga-egbu m bụ na m bere ákwá. Ma m mechara kpee ekpere. Bido mgbe ahụ gawazie, m bịara nwee “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”

Enwere m ike ikwu na Jehova Chineke sekpụ m n’aka nri, o dokwara m anya na o nyeere m aka n’oge ahụ niile. (Aịzaya 41:13) O mere ka m gwa dọkịta na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ hoo haa na m ga-eme ihe Baịbụl kwuru nke bụ́ ka anyị ghara iri ọbara. (Ọrụ Ndịozi 15:28, 29) Dọkịta ga-awa m ahụ́ na nọọsụ ga-eso ya kwetara na ha ga-awa m ahụ́ n’amịnyeghị m ọbara. Mgbe dọkịta ahụ wachara m ahụ́, o kwuru na ihe niile gara nke ọma, nakwa na ha ewepụla akpụ niile ahụ toro m n’ụbụrụ. O kwukwara na ihe a bụ nke mbụ ya na-ahụ onye a wara ụdị ahụ́ a, ya agbakee ọsọ ọsọ otú a.

Izu atọ a wachara m ahụ́, m nọ n’ebe m dina kụziere mmadụ Baịbụl. Izu asaa a wachara m ahụ́, amalitekwara m ịnya ụgbọala, ịga ozi ọma, na ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Otú Ndịàmà Jehova ibe m si nyere m aka mgbe ọ bụla mụ na ha gara ozi ọma mere m obi ụtọ. Ha na-anọ m nso mgbe niile, ha na-edulatakwa m ma anyị zichaa ozi ọma. O doro m anya na ihe so mee ka m gbakee ngwa ngwa bụ na m na-ege Baịbụl e tinyere na teepụ, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe.

Ihe ọzọ mere m obi ụtọ bụ na mgbe a wachara m ahụ́, m nụrụ na papa m na Ndịàmà Jehova amụwala Baịbụl. E mere papa m baptizim mgbe ọ dị afọ iri asaa na atọ. Ọ ka jikwa obi ya niile na-efe Jehova. Ihe karịrị mmadụ iri anọ ná ndị ikwu m aghọọla Ndịàmà Jehova ugbu a. Ọ bụ eziokwu na anaghị m eji anya aka ekpe m ahụcha ụzọ nakwa na e ji ígwè jide okpokoro isi m, ana m atụ anya ịhụ mgbe Jehova ga-eme “ihe niile ka ha dị ọhụrụ” n’ụwa, bụ́ mgbe a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs.—Mkpughe 21:3-5.

Alụtara m ezigbo di, ọ bụkwa okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Anyị mụtara ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Clerista. Clerista na-enyere m ezigbo aka. M ka na-ekwusa ozi ọma oge niile. Jehova Chineke agọziela ozi ọma m na-ekwusa. Enyerela m ọtụtụ ndị m na-amụrụ Baịbụl aka ime ihe Okwu Chineke kwuru. Ihe karịrị mmadụ iri atọ n’ime ha enyefeela Chineke onwe ha, e meekwa ha baptizim.

Eji m obi m niile na-atụ anya mgbe Jehova Chineke ga-anapụta anyị n’ahụhụ niile anyị na-ata n’ụwa a ma mee ka anyị biri n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe bụ́ uche Chineke banyere ụwa, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ahụ, ma a naghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ebe mama m ku m n’aka

[Foto dị na peeji nke 10]

Ụlọ anyị

[Foto dị na peeji nke 10]

Ebe m nọ n’ihu ogologo steepụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 11]

Mụ na di m, nwa m nwaanyị, mama m na papa m