Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Àgwà Ị Na-akpa?

Olee Ụdị Àgwà Ị Na-akpa?

Olee Ụdị Àgwà Ị Na-akpa?

“Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ unu na-egosi.”—FAỊ. 25.

Ị̀ GA-A2ZALI AJỤJỤ NDỊ A?

Gịnị mere anyị ji kwesị iche echiche banyere ụdị àgwà anyị na-akpa?

Olee ụdị àgwà anyị kwesịrị izere, oleekwa otú anyị ga-esi zere ya?

Gịnị ka anyị ga-eme iji na-agba ndị ọzọ ume n’ọgbakọ?

1. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ụmụnna ya, olee olileanya o kwuru na ya nwere?

MGBE Pọl onyeozi na-edegara ụmụnna ya akwụkwọ, o kwuru ugboro ugboro na ya nwere olileanya na ọgbakọ ndị ahụ ga na-akpa àgwà dị Chineke na Kraịst mma. Dị ka ihe atụ, o degaara ndị Galeshia akwụkwọ, sị: “Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ unu na-egosi. Amen.” (Gal. 6:18) Gịnị ka “mmụọ unu na-egosi” pụtara?

2, 3. (a) Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe ụfọdụ o kwuru “mmụọ”? (b) Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị banyere ụdị àgwà anyị na-akpa?

2 Ihe Pọl bu n’uche mgbe o kwuru “mmụọ” n’amaokwu ahụ bụ ihe na-eme ka anyị kwuo ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ mee ihe anyị na-eme. Mmadụ nwere ike ịdị nwayọọ, na-echebara ndị ọzọ echiche, dị obiọma, na-emesapụ aka, ma ọ bụ na-agbaghara ndị ọzọ. Baịbụl kwuru na ọ dị mma ka anyị nwee “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ.” (1 Pita 3:4; Ilu 17:27) N’aka nke ọzọ, onye ọzọ nwere ike na-akparị mmadụ, hụ akụnụba n’anya, na-ewe iwe ọsọ ọsọ, ma ọ bụ bụrụ eze onye agwala m. Nke ka njọ bụ na e nwere ndị na-eche echiche rụrụ arụ ma ọ bụ na-enupụrụ Chineke isi.

3 N’ihi ya, mgbe Pọl kwuru okwu ndị dị ka “ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ ị na-egosi,” ọ na-agba ụmụnna ya ume ka ha na-eṅomi Kraịst ma na-eche echiche otú Chineke chọrọ. (2 Tim. 4:22; gụọ Ndị Kọlọsi 3:9-12.) Taa, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ụdị àgwà m na-akpa? Olee otú m ga-esi na-akpa àgwà ọma nke ga-adị Chineke mma? Olee otú m ga-esi na-agba ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ume ịkpa àgwà dị Chineke mma?’ Dị ka ihe atụ, n’ebe okooko osisi juru, okooko osisi nke ọ bụla na-eso eme ka ebe ahụ maa ezigbo mma. Ànyị dị ka otu n’ime okooko osisi ndị ahụ na-eso eme ka ọgbakọ maa mma? N’eziokwu, anyị kwesịrị ịgba mbọ ịdị otú ahụ. Ka anyị lebazie anya n’ihe anyị nwere ike ime iji na-akpa àgwà dị Chineke mma.

ZERE MMỤỌ NKE ỤWA

4. Gịnị bụ “mmụọ nke ụwa”?

4 Akwụkwọ Nsọ gwara anyị, sị: “Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke si na Chineke, ka anyị wee mara ihe niile Chineke ji obiọma nye anyị.” (1 Kọr. 2:12) Gịnị bụ “mmụọ nke ụwa”? Ọ bụ otu mmụọ ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Efesọs 2:2, bụ́ ebe kwuru, sị: “Unu jere ije na ha n’otu mgbe dị ka usoro ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku si chọọ, bụ́ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” “Ikuku” e kwuru okwu ya bụ mmụọ nke ụwa, ma ọ bụ otú ndị ụwa si eche echiche. Ọ dị ebe niile dị ka ikuku. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị taa na-eche, sị, ‘O nweghị onye ga-agwa m ihe m ga-eme!’ ma ọ bụ ‘Ekwela ka a nara gị ihe ruuru gị!’ Ha bụ “ụmụ nnupụisi” ndị nọ n’ụwa Setan.

5. Olee àgwà ọjọọ ụfọdụ ndị Izrel nwere?

5 Ụdị àgwà ahụ abụghị ihe ọhụrụ. N’oge Mozis, Kora malitere imegide ndị Chineke gwara ka ha na-edu ndị Izrel. O kwuru okwu megide Erọn na ụmụ ya, ndị bụ́ ndị nchụàjà. O nwere ike ịbụ na ọ hụrụ ihe ha na-emejọ. O nwekwara ike ịbụ na o chere na ihe mere Mozis ji nye ha ihe ùgwù bụ na ọ na-emenyere nwanne ya. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, o doro anya na Kora kwụsịrị iche echiche otú Jehova si eche. Ọ kparịrị ndị Jehova họpụtara. Ọ gwara ha, sị: “O zuworo unu . . . Gịnịzi mere unu ji na-ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Jehova?” (Ọnụ Ọgụ. 16:3) N’otu aka ahụ, Detan na Abaịram kwuru okwu megide Mozis ma gwa ya na ọ ‘na-anwa ime onwe ya onyeisi ha gabiga ókè.’ Mgbe a gwara ha na Mozis na-akpọ ha, ha ji mpako zaa, sị: “Anyị agaghị abịa!” (Ọnụ Ọgụ. 16:12-14) O doro anya na ihe ha mere were Jehova iwe. O gburu ndị nnupụisi niile ahụ.—Ọnụ Ọgụ. 16:28-35.

6. Olee otú ụfọdụ ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ si gosi na ha nwere àgwà na-adịghị mma, oleekwa ihe o nwere ike ịbụ ya kpatara ya?

6 N’oge ndịozi Jizọs, ụfọdụ ndị malitekwara ‘ileda ndị isi anya.’ Ha nọ na-akatọ ndị na-edu ndú n’ọgbakọ. (Jud 8) Ọ ga-abụ na ihe ùgwù ha nwere ejughị ha afọ, ha agbalịakwa ime ka ndị ọzọ soro ha na-akatọ ndị okenye, bụ́ ndị ji obi ha niile na-arụ ọrụ Chineke nyere ha.—Gụọ 3 Jọn 9, 10.

7. Olee àgwà anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara inwe n’ọgbakọ?

7 O doro anya na e kwesịghị inwe ụdị àgwà ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara ịmalite ịkpa ụdị àgwà ahụ. Ndị okenye ọgbakọ ezughị okè, otú ahụ ndị okenye na-ezughị okè ma n’oge Mozis ma n’oge Jọn onyeozi. Ndị okenye nwere ike imejọ ihe, ya akpatakwara anyị nsogbu. Ụdị ihe ahụ mee, onye nọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịkpa àgwà ka ndị ụwa, siwe ọnwụ ka e kpee ihe o chere bụ́ ikpe ziri ezi ma ọ bụ kwuwe na “nwanna ahụ ekwesịghị ịbụ okenye.” Jehova nwere ike ikpebi ileghara obere ihe ụfọdụ ndị okenye mejọrọ anya. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ike ime otú ahụ? Ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ ajụla ịga hụ ndị òtù ndị okenye gwara gaa nyere ha aka n’ihi na ha chere na ndị okenye ahụ anaghị eme nke ọma. Ndị na-eme otú ahụ dị ka onye ọrịa na-ekweghị ka dọkịta gwọọ ya n’ihi na e nwere ihe dọkịta ahụ na-eme na-adịghị ya mma.

8. Olee amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere anyị aka ịna-ele ndị na-edu ndú n’ọgbakọ anya otú kwesịrị ekwesị?

8 Anyị nwere ike izere ụdị àgwà ahụ ma ọ bụrụ na anyị echeta na Baịbụl kwuru na Jizọs chị “kpakpando asaa n’aka nri ya.” “Kpakpando” ndị ahụ nọchiri anya ndị okenye e tere mmanụ. Ma ihe e kwuru ebe ahụ gbasakwara ndị okenye niile e nwere n’ọgbakọ taa. Jizọs nwere ike iduzi “kpakpando” ndị ahụ ọ chị n’aka ya otú o chere dị mma. (Mkpu. 1:16, 20) Ebe Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ ma ihe niile ndị okenye na-eme. Ọ na-ahụ ihe niile n’ihi na ‘anya ya dị ka ọkụ na-enwu enwu.’ N’ihi ya, e nwee okenye e kwesịrị ịgbazi, Jizọs ga-eme ka a gbazie okenye ahụ n’oge kwesịrị ekwesị nakwa otú kwesịrị ekwesị. (Mkpu. 1:14) Ma ugbu a, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị mmụọ nsọ họpụtara ùgwù, n’ihi na Pọl dere, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.”—Hib. 13:17.

9. (a) Gịnị ka Onye Kraịst nwere ike ime ma a gbazie ya? (b) A dọọ mmadụ aka ná ntị, gịnị ka o kwesịrị ime?

9 Ọ bụrụ na ndị okenye adụọ mmadụ ọdụ ma ọ bụ napụ ya ihe ùgwù o nwere n’ọgbakọ, ihe onye ahụ ga-eme nwere ike igosi otú àgwà ya dị. Ndị okenye ji akọ nye otu nwanna nwoke na-eto eto ndụmọdụ banyere igwu egwuregwu vidio ebe a na-eme ihe ike. Ọ dị mwute na ọ nabataghị ndụmọdụ ahụ nke ọma. Ebe ọ bụ na ọ naghịzi eme ihe Baịbụl chọrọ ka ndị ohu na-eje ozi na-eme, o rughịzi eru ịbụ ohu na-eje ozi. (Ọma 11:5; 1 Tim. 3:8-10) Nwanna nwoke ahụ mechara malite ịgwa ndị ọzọ na ya ekwetaghị ihe ndị okenye kpebiri. O degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi ugboro ugboro ma na-akatọ ndị okenye. Ọ gbalịkwara ime ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-edegara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ. Ma ọ bụrụ na anyị akpata ọgba aghara n’ọgbakọ n’ihi na anyị chọrọ igosi na ihe anyị mere ziri ezi, ọ gaghị abara anyị uru. A dọọ anyị aka ná ntị, ọ́ gaghị aka mma ile ya anya ka ihe ga-enyere anyị aka ịchọpụta ebe anyị na-anaghị eme nke ọma ma jiri nwayọọ nabata ihe a gwara anyị?—Gụọ Abụ Ákwá 3:28, 29.

10. (a) Gịnị ka anyị mụtara na Jems 3:16-18 banyere àgwà ọma na àgwà ọjọọ? (b) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe gosiri na anyị nwere “amamihe nke si n’elu”?

10 Ihe e dere na Jems 3:16-18 ga-enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ àgwà ọma na àgwà ọjọọ mmadụ nwere ike ịkpa n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “N’ebe e nwere ekworo na esemokwu, n’ebe ahụ ka ọgba aghara na ihe ọjọọ niile na-adị. Ma amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị akpa ókè n’ihi ile mmadụ anya n’ihu, ọ dịghị ihu abụọ. A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.” Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe gosiri na anyị nwere “amamihe nke si n’elu,” àgwà ọma ndị anyị ga na-akpa ga-agba ụmụnna ndị ọzọ ume ịkpakwa àgwà ọma, bụ́ nke ga-eme ka e nwee udo n’ọgbakọ.

NA-AKWANYERE NDỊ ỌZỌ ÙGWÙ N’ỌGBAKỌ

11. (a) Olee ihe inwe ezi àgwà ga-enyere anyị aka izere? (b) Gịnị ka anyị ga-amụta n’àgwà ọma Devid kpara?

11 Anyị kwesịrị icheta na Jehova nyere ndị okenye ọrụ ‘ịzụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.’ (Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:2) N’ihi ya, anyị maara na ọ ga-akacha mma ka anyị kwanyere ndokwa Chineke mere ùgwù, ma ànyị bụ ndị okenye ma ọ bụ na anyị abụghị. Inwe ezi àgwà mgbe niile ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere ihe ùgwù. Mgbe Eze Sọl nke Izrel chere na Devid na-aga ịnara ya ọchịchị ya, ọ “nọ na-ele Devid anya ọjọọ.” (1 Sam. 18:9) Eze ahụ malitere iche echiche ọjọọ ma chọọ igbu Devid. Kama ichegbuwe onwe anyị banyere ihe ùgwù dị ka Sọl, ọ ga-akara anyị mma ime ka Devid. N’agbanyeghị ihe ọjọọ niile e mere Devid, ọ kwanyeere onye Chineke họpụtara ùgwù.—Gụọ 1 Samuel 26:23.

12. Gịnị ka anyị ga-eme iji mee ka udo dị n’ọgbakọ?

12 Ebe ọ bụ na otú anyị si ele ihe anya na-adị iche iche, ihe anyị na-eme nwere ike ịgbakasị ndị ọzọ ahụ́ n’ọgbakọ. O nwedịrị ike ime n’etiti ndị okenye. Ndụmọdụ Baịbụl nwere ike inyere anyị aka imeri nsogbu a. Baịbụl kwuru, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ” nakwa “Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.” (Rom 12:10, 16) Kama ikwesi olu ike na ihe anyị na-ekwu ziri ezi, anyị kwesịrị ịghọta na ọtụtụ mgbe, a na-enwe ihe karịrị otu ụzọ ziri ezi isi lee ihe anya. Ọ bụrụ na anyị agbalịa ile ihe anya otú ndị ọzọ si na-ele ya, anyị nwere ike inye aka mee ka ọgbakọ dị n’otu.—Fil. 4:5.

13. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele echiche anyị anya, oleekwa ihe a kọrọ na Baịbụl nke gosiri ihe anyị kwesịrị ime?

13 Ọ̀ pụtara na anyị ekwesịghị ikwu ihe dị anyị n’obi ma ọ bụrụ na anyị chere na e kwesịrị ịgbanwe ihe a na-eme n’ọgbakọ? Mbanụ. N’oge ndịozi Jizọs, e nwere okwu ọtụtụ ndị rụrụ ụka banyere ya. Ụmụnna “mere ndokwa ka Pọl na Banabas na ụfọdụ ndị ọzọ n’ime ha gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem banyere arụmụka a.” (Ọrụ 15:2) O doro anya na onye nke ọ bụla nwere ihe o chere banyere okwu ahụ nakwa otú o chere e nwere ike isi dozie ya. Ma, ozugbo onye nke ọ bụla kwuru obi ya, mmụọ nsọ enyekwara ha aka ikpebi ihe a ga-eme, ha niile esighị ọnwụ na-ekwu ihe ha bu n’obi. Mgbe akwụkwọ ozi e dere mkpebi ahụ na ya ruru ọgbakọ dị iche iche aka, “ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi agbamume ahụ,” e meekwa “ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe.” (Ọrụ 15:31; 16:4, 5) N’otu aka ahụ taa, ọ bụrụ na anyị agwa ndị okenye nsogbu anyị chọpụtara, obi kwesịrị iru anyị ala, anyị enwee obi ike na ha ga-eme ihe ha kwesịrị ime.

NA-AKPA ÀGWÀ ỌMA MGBE GỊ NA NDỊ ỌZỌ NA-EMEKỌ IHE

14. Olee otú anyị nwere ike isi kpaa àgwà ọma mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe?

14 Mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, e nwere ọtụtụ mgbe anyị kwesịrị ịkpa àgwà ọma. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime ka udo dị ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ ihe ha mere anyị. Okwu Chineke gwara anyị, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Kọl. 3:13) Okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa” na-egosi na ndị ọzọ nwere ike ime ihe ga-akpasu anyị iwe. Ma, kama ichegbuwe onwe anyị maka obere ihe ha na-emejọ, nke ga-eme ka anyị kpatawa nsogbu n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịgbalị ịna-eṅomi Jehova ma na-agbaghara ndị ọzọ kpamkpam, anyị na ha ana-efekọ Jehova.

15. (a) Gịnị ka ihe Job mere nwere ike ịkụziri anyị gbasara mgbaghara? (b) Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị?

15 Ihe Job mere nwere ike ịkụziri anyị ihe gbasara mgbaghara. Mmadụ atọ ndị bịara ịkasi ya obi gwara ya ọtụtụ okwu ọjọọ. Ma, Job gbaghaara ha. Gịnị nyeere ya aka ime otú ahụ? “O kpere ekpere maka ndị enyi ya.” (Job 16:2; 42:10) Ikpe ekpere maka ndị ọzọ nwere ike ịgbanwe otú anyị si ele ha anya. Ikpe ekpere maka ụmụnna anyị niile ga-enyere anyị aka ịna-ele ha anya otú Jizọs si ele ha anya. (Jọn 13:34, 35) Ihe ọzọ anyị kwesịrị ime bụ ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà Ndị Kraịst mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe.—Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.

ÀGWÀ ỌMA GỊ GA-ABARA ỌGBAKỌ DUM URU

16, 17. Olee ụdị àgwà i kpebiri ịna-akpa?

16 Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị agbalịsie ike ịkpa àgwà ọma, ọ ga-abara ọgbakọ dum uru! O nwere ike ịbụ na isiokwu a enyerela gị aka ikpebi na i nwere ike ịna-akpakwu àgwà ọma ma na-agbakwu ndị ọzọ ume. Ọ bụrụ otú ahụ, kwe ka Okwu Chineke nyere gị aka ịgbanwe. (Hib. 4:12) Pọl chọrọ ịna-akpa àgwà ọma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga na-eṅomi. N’ihi ya, o kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla m maara m mere. Ma nke a adịghị egosi na m bụ onye ezi omume, kama, onye na-enyocha m bụ Jehova.”—1 Kọr. 4:4.

17 Ka anyị na-agbalị ime ihe gosiri na anyị nwere amamihe si n’elu ma ghara ikwe ka onwe anyị ma ọ bụ ọrụ e nyere anyị na-ebu anyị isi, anyị ga-eso na-eme ka a na-akpa àgwà ọma n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ ma na-eche ihe ọma banyere ha, anyị na ụmụnna anyị ga na-adị n’udo. (Fil. 4:8) Ka anyị na-eme otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na àgwà anyị na-akpa ga-adị Jehova na Jizọs mma.—Faị. 25.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 14]

Olee otú ịtụgharị uche n’ọrụ Jizọs na-arụ ga-esi nyere gị aka ịnabata ndụmọdụ e nyere gị?