Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Agbamume nke ‘Si n’Ọnụ Ụmụntakịrị’

Agbamume nke ‘Si n’Ọnụ Ụmụntakịrị’

Agbamume nke ‘Si n’Ọnụ Ụmụntakịrị’

Na Disemba 2009, Ụlọikpe Kasị Elu na Rọshịa kwadoro mkpebi ikpe nke mere ka a machibido Ndịàmà Jehova iwu na Taganrọg dị na Rọshịa. A naara Ndịàmà Jehova Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma kwuo na ndị mmadụ ekwesịghị ịgụ akwụkwọ iri atọ na anọ ha na-ebipụta. E dere akụkọ banyere ihe a dị mwute ma tinye ya n’ebe Ndịàmà Jehova na-edebe ihe n’Ịntanet, gosikwa foto ụmụnna ndị ihe ahụ ụlọikpe ahụ kpebiri gbasara, ma ụmụaka ha.

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Ụlọ Ọrụ Na-elekọta Ọrụ Ndịàmà Jehova na Rọshịa nwetara otu igbe na akwụkwọ ozi. Ndị zitere ihe ndị ahụ bụ otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova bi na Kwinsland dị n’Ọstrelia. Ha hụrụ ihe ahụ e tinyere n’ebe Ndịàmà Jehova na-edebe ihe n’Ịntanet. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ezi Ụmụnna Anyị, Okwukwe ụmụnna anyị nọ na Rọshịa na mkpagbu a na-akpagbu ha metụrụ ụmụ anyị, bụ́ Cody na Larissa, n’ahụ́. Unu ga-ahụ kaadị ndị ha dere ihe na ha nakwa akwụkwọ ozi ndị ha dere. Anyị tinyekwara obere ngwugwu onyinye anyị chọrọ izigara ụmụaka nọ na Taganrọg, iji mee ka ha mara na e nwere ụmụaka nọ n’ebe dị anya, bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Jehova, nakwa na ha na-eche banyere ha. Ha chọrọ ịgwa ha niile na ha hụrụ ha n’anya.”

Mgbe ụmụaka ahụ nọ na Taganrọg natara onyinye ahụ, ha degaara ezinụlọ ahụ bi n’Ọstrelia akwụkwọ ozi, seekwa ihe na ha iji kelee ha. Mgbe otu Onyeàmà nke na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rọshịa gụrụ okwu agbamume ahụ ‘si n’ọnụ ụmụntakịrị,’ o degaara Cody na Larissa akwụkwọ ozi, sị: “Unu ma na ọ na-ewute ma ụmụaka ma ndị toro eto n’ihi na a na-ata ha ahụhụ n’enweghị ihe ha mere. O nweghị ihe ụmụnna anyị nọ na Taganrọg mejọrọ, ma a naara ha Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọ na-ewute ha nke ukwuu. Obi ga-adị ha mma ịmata na onye nọ n’ebe ọzọ n’ụwa na-eche banyere ha. Ana m ekele unu maka ịhụnanya unu na obiọma unu!”—Ọma 8:2.

N’eziokwu, ụmụnna anyị niile bụ otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, otú anyị si hụ ibe anyị n’anya na-enyekwara anyị aka idi ọnwụnwa na nsogbu niile na-abịara anyị. E boro Ndịàmà Jehova ebubo na ha na-eme ka ndị ọzọ na-akpọ ibe ha asị. Ma ụmụaka anyị egosila na ha hụrụ ibe ha n’anya nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ha n’obi n’agbanyeghị obodo ma ọ bụ mba ebe ha si. Àgwà ha gosiri na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ eziokwu, nke bụ́: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

Ụmụaka nọ na Rọshịa (n’aka ekpe), bụ́ ndị natara onyinye ụmụaka nọ n’Ọstrelia (n’aka nri) ziteere ha