Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Gosiri Anyị Otú E Si Adị Umeala n’Obi

Jizọs Gosiri Anyị Otú E Si Adị Umeala n’Obi

Jizọs Gosiri Anyị Otú E Si Adị Umeala n’Obi

“M na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.”​—JỌN 13:15.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú Ọkpara Chineke si gosi na ọ dị umeala n’obi tupu ya abịa n’ụwa?

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, olee otú o si dị umeala n’obi?

Olee uru Jizọs na ndị ọzọ ritere n’ihi otú o si dị umeala n’obi?

1, 2. N’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa, gịnị ka ọ kụziiri ndịozi ya?

N’ABALỊ ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa, ya na ndịozi ya nọ n’otu ụlọ elu dị na Jeruselem. Mgbe ha na-eri nri anyasị, Jizọs biliri ma chịsa uwe elu ya n’akụkụ. O weere ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù, gbanye mmiri n’efere ma malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa ákwà ahụ na-ehicha ha. Mgbe o mechara, o yiiri uwe elu ya. Gịnị mere Jizọs ji mee ụdị ihe ahụ?—Jọn 13:3-5.

2 Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Ùnu maara ihe m meere unu? . . . Ọ bụrụ na mụ onwe m sara unu ụkwụ, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwe unu na Onye Ozizi, unu kwesịkwara ịsarịta ibe unu ụkwụ. N’ihi na m na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.” (Jọn 13:12-15) Jizọs ji ihe ahụ o meere ndịozi ya kụziere ha ihe ha na-agaghị echefu echefu, nke ga-enyekwara ha aka ịna-adị umeala n’obi n’ọdịnihu.

3. (a) Olee otú Jizọs si gosi ugboro abụọ na ịdị umeala n’obi dị mkpa? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Mgbe ahụ Jizọs sara ụkwụ ndịozi ya abụghị mgbe mbụ ọ na-akụziri ha na ịdị umeala n’obi dị mkpa. Tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ndịozi ya rụrụ ụka banyere onye kacha ukwuu n’ime ha. Jizọs kpọtara otu nwatakịrị ma mee ka o guzoro n’akụkụ ya. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m, onye ọ bụlakwa nke na-anabata m na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m. N’ihi na onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.” (Luk 9:46-48) Ndị Farisii chere na ha ka ndị ọzọ mma. N’ihi ya, Jizọs kwuru n’oge ọzọ, sị: “Onye na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Luk 14:11) O doro anya na Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya dị umeala n’obi. Ọ chọghị ka ha dị mpako ma ọ bụ chee na ha ka ndị ọzọ. Ka anyị tụlee otú Jizọs si dị umeala n’obi ka anyị nwee ike iṅomi ya. Anyị ga-amụtakwa otú ịdị umeala n’obi si abara ma onye dị umeala n’obi ma ndị ọzọ uru.

“ATỤGHARỊGHỊ M GAWA N’EBE ỌZỌ”

4. Olee otú Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya si gosi na ọ dị umeala n’obi tupu ya abịa n’ụwa?

4 Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, dị umeala n’obi tupu ọ bịa n’ụwa. Ya na Nna ya nọrọ ọtụtụ afọ n’eluigwe. Akwụkwọ Aịzaya kwuru banyere otú Ọkpara ahụ na Nna ya si dị n’ezigbo mma, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova enyewo m ire nke ndị a kụziiri ihe, ka m wee mata otú m ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu. Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova emeghewo ntị m, mụ onwe m enupụghịkwa isi. Atụgharịghị m gawa n’ebe ọzọ.” (Aịza. 50:4, 5) Ọkpara Chineke dị obi umeala ma gee ntị nke ọma n’ihe Jehova kụziiri ya. Ọ chọsiri ike ịmụta ihe n’aka ezi Chineke. Ọ ga-abụrịrị na o leruru anya n’otú Jehova si jiri obi umeala na-emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebere!

5. Mgbe Jizọs bụ Maịkel, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi, olee otú o si gosi na ọ dị umeala n’obi n’ụka ya na Ekwensu rụrịtara?

5 Ọ bụghị ndị mmụọ ozi niile dị umeala n’obi ka Ọkpara Chineke. Mmụọ ozi nke mechara ghọọ Setan bụ́ Ekwensu achọghị ịmụta ihe n’aka Jehova. Ọ malitere ịdị mpako ma chee na ya ka ndị ọzọ mma, nke gosiri na ọ dịghị umeala n’obi. N’ihi ya, o nupụụrụ Jehova isi. Ma, Jizọs emeghị ka ya. Ọ chọghị inweta ike karịrị nke Chineke nyere ya n’eluigwe. O jighịkwa ike ya mee ihe ọ na-ekwesịghị ime. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na e nwere mgbe Jizọs na Ekwensu ‘rụrịtara ụka banyere ozu Mozis.’ N’oge ahụ, Jizọs bụ Maịkel, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi. Ma, o meghị ihe a na-enyeghị ya ikike ime. Kama nke ahụ, Ọkpara Chineke gosiri na ọ dị umeala n’obi. O ji obi ụtọ hapụrụ Jehova, bụ́ Onyeikpe Kachanụ n’eluigwe na n’ụwa, okwu ahụ ka o lebara ya anya otú kwesịrị ekwesị mgbe oge ya ruru.—Gụọ Jud 9.

6. Olee otú Jizọs si gosi na ya dị umeala n’obi mgbe o kwetara ịbụ Mesaya?

6 Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ ma amụma niile e buru banyere ihe a ga-eme Mesaya n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ọ ma na ọ ga-ata ahụhụ. Ma, Jizọs kwetara ịbịa n’ụwa bụrụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ma nwụọ. Gịnị mere o ji kweta? Pọl onyeozi gosiri na ọ bụ obi umeala nyeere Jizọs aka ime otú ahụ. O dere, sị: ‘Ọ dịrị n’ụdị Chineke, ma o cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke. Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ.’—Fil. 2:6, 7.

MGBE JIZỌS BỤ MMADỤ, “O WEDARA ONWE YA ALA”

7, 8. Olee otú Jizọs si gosi na ya dị umeala n’obi ma mgbe ọ bụ nwata ma mgbe ọ na-eje ozi ya?

7 Pọl dere, sị: ‘Mgbe Jizọs hụrụ onwe ya n’ụdị mmadụ, o wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.’ (Fil. 2:8) Malite mgbe Jizọs bụ nwata, o gosiri anyị otú e si adị umeala n’obi. N’agbanyeghị na Josef na Meri, bụ́ nne na nna ya, ezughị okè, o ji obi umeala ‘doo onwe ya n’okpuru ha.’ (Luk 2:51) Ndị na-eto eto kwesịrị iṅomi ya. Chineke ga-agọzi ha ma ọ bụrụ na ha na-erubere nne ha na nna ha isi.

8 Mgbe Jizọs toro, o gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ihe kacha ya mkpa bụ ime uche Jehova, ọ bụghị ime uche nke ya. (Jọn 4:34) Mgbe Jizọs Kraịst na-eje ozi ya, o mere ka ndị mmadụ mara aha Chineke, nyekwara ndị nwere ezi obi aka ịmata àgwà Jehova na ihe o bu n’obi kee ndị mmadụ. Otú o si bie ndụ na ihe ọ kụziri banyere Jehova bụ otu ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ihe mbụ o kwuru bụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Jizọs si otú ahụ gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ido aha Jehova nsọ bụrụ ihe kacha ha mkpa. Jizọs mekwara otú ahụ. Mgbe ọnwụ ya na-eru nso, ọ gwara Jehova n’ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.” (Jọn 17:26) Mgbe Jizọs na-eje ozi ya, ọ na-ekwukarị na o nweghị ihe ọ ga-emeli ma ọ bụrụ na Jehova enyereghị ya aka.—Jọn 5:19.

9. Gịnị ka Zekaraya buru n’amụma banyere Mesaya, oleekwa otú Jizọs si mezuo ya?

9 Zekaraya buru amụma banyere Mesaya, sị: “Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị ada bụ́ Zayọn. Tie mkpu mmeri, gị ada bụ́ Jeruselem. Lee! Eze gị na-abịakwute gị. Ọ bụ onye ezi omume, ee, onye a zọpụtara azọpụta; ọ dị umeala n’obi, ọ nọkwa n’elu ịnyịnya ibu, ọbụna anụmanụ tojuru etoju, bụ́ nwa nke nne ịnyịnya ibu.” (Zek. 9:9) Amụma a mezuru mgbe Jizọs gara Jeruselem tupu e mee Ememme Ngabiga nke afọ 33. Ìgwè mmadụ gbasara uwe elu ha, tụsakwa alaka osisi n’okporo ụzọ. N’eziokwu, obodo ahụ dum malitere ịgba aghara mgbe ọ batara. Jizọs dịkwa umeala n’obi ọbụna mgbe ndị mmadụ toro ya na ọ bụ Eze.—Mat. 21:4-11.

10. Gịnị ka Jizọs mere ka o doo anya n’otú o si rubere Chineke isi ruo n’ọnwụ?

10 Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ dị umeala n’obi, rubekwa isi ruo mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ. O si otú ahụ mee ka o doo anya na ndị mmadụ nwere ike irubere Jehova isi ọ bụrụgodị na a nwaa ha ọnwụnwa tara akpụ. Setan kwuru na ndị mmadụ na-efe Jehova n’ihi ihe ha na-enweta n’aka ya. Ma, Jizọs gosiri na ihe ahụ Ekwensu kwuru abụghị eziokwu. (Job 1:9-11; 2:4) Otú Kraịst si kwesị ntụkwasị obi mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa nakwa na ọchịchị Chineke kacha mma. O doro anya na obi dị Jehova ụtọ ịhụ ka Ọkpara ya ji obi ya niile rubere ya isi.—Gụọ Ilu 27:11.

11. Olee olileanya abụọ ndị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst nwere n’ihi àjà ọ chụrụ?

11 Jizọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ, jiri ndụ ya chụọ àjà iji zọpụta ndị mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. (Mat. 20:28) N’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ, Jehova nwere ike ịgbaghara mmehie anyị dị ka iwu ezi omume ya si dị ma mee ka ndị mmadụ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Pọl dere, sị: “E si n’otu omume ziri ezi kpọọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.” (Rom 5:18) Ọnwụ Jizọs mere ka Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, meekwa ka “atụrụ ọzọ” nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Jọn 10:16; Rom 8:16, 17.

ADỊ M “UMEALA N’OBI”

12. Olee otú Jizọs si gosi na ya dị umeala n’obi ma dị nwayọọ mgbe ya na ndị mmadụ na-ezughị okè na-emekọ ihe?

12 Jizọs gwara ndị niile ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ’ ka ha bịakwute ya. Ọ gwara ha, sị: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.” (Mat. 11:28, 29) Jizọs dị umeala n’obi, dịkwa nwayọọ. Ọ bụ ya mere o ji meere ndị mmadụ na-ezughị okè obiọma n’akpaghị ókè. Ọ tụghị anya ka ndị na-eso ụzọ ya mee ihe ha na-agaghị emeli. Jizọs jara ha mma, gbaakwa ha ume. O meghị ka ha chee na ha abaghị uru ma ọ bụ na ha dị iberiibe. Jizọs adịghị aka ike, ọ naghịkwa emegbu ndị mmadụ. Kama, o mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike na ọ bụrụ na ha abịakwute ya, na-emekwa ihe ọ kụziiri ha, ha ga-enweta ume n’ihi na yok ya adịghị egbu mgbu, ibu ya dịkwa mfe. Ahụ́ na-eru onye ọ bụla nọ n’ebe Jizọs nọ ala, ma nwoke ma nwaanyị ma nwata ma okenye.—Mat. 11:30.

13. Olee otú Jizọs si metere ndị ihe na-esiri ike ebere?

13 Jizọs meteere ndị ihe na-esiri ike n’Izrel ebere, meekwa ihe o nwere ike ime iji nyere ha aka. Mgbe Jizọs si Jeriko na-apụ, ọ hụrụ ndị ìsì abụọ, bụ́ Batimiọs na enyi ya. Ha rịọsiri Jizọs ike ka o nyere ha aka, ma ndị nọ ebe ahụ gwara ha mechie ọnụ. A sị na Jizọs chọrọ, ọ gaara agbachi ndị ìsì ahụ nkịtị! Jizọs agbachighị ha nkịtị, kama o meteere ha ebere. Ọ kpọrọ ha ma gwọọ ha. N’eziokwu, Jizọs dị umeala n’obi, mekwaara ndị mmehie ebere, si otú ahụ ṅomie Nna ya, bụ́ Jehova.—Mat. 20:29-34; Mak 10:46-52.

“ONYE Ọ BỤLA NKE NA-EWEDA ONWE YA ALA, A GA-EBULI YA ELU”

14. Olee uru ndị mmadụ riterela n’ihi otú Jizọs si dị umeala n’obi?

14 Otú Jizọs Kraịst si dị umeala n’obi baara ọtụtụ ndị uru, meekwa ka ha nwee ọṅụ. Jehova nwere obi ụtọ mgbe ọ hụrụ ka Ọkpara ya ji obi umeala na-erubere ya isi. Otú Jizọs si dị umeala n’obi mere ka ahụ́ ruo ndịozi ya na ndị na-eso ụzọ ya ala. Otú o si bie ndụ, ihe ndị ọ kụziiri ha, na otú o si aja ha mma mere ka ha gbakwuo mbọ ime uche Chineke. Obi umeala Jizọs baara ọtụtụ ndị ọzọ uru n’ihi na o mere ka o nyere ha aka, kụziere ha ihe, gbaakwa ha ume. N’eziokwu, ndị niile nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ ga-erite uru ruo mgbe ebighị ebi.

15. Olee uru Jizọs ritere n’ihi otú o si dị umeala n’obi?

15 Otú Jizọs si dị umeala n’obi ọ̀ baara yanwa uru? Ee. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Mat. 23:12) Pọl kwuru na e mere Jizọs otú ahụ. O kwuru, sị: ‘Chineke buliri Jizọs elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ, ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.’ N’ihi otú Jizọs si dị umeala n’obi ma kwesị ntụkwasị obi mgbe ọ nọ n’ụwa, Jehova Chineke buliri ya elu, nye ya ikike ịchị ihe niile e kere eke ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Fil. 2:9-11.

JIZỌS GA-AGBACHITERE “EZIOKWU NA ỊDỊ UMEALA N’OBI”

16. Olee ihe gosiri na Ọkpara Chineke ga na-adị umeala n’obi mgbe niile?

16 Ọkpara Chineke ga na-adị umeala n’obi mgbe niile. Otu ọbụ abụ buru amụma otú Jizọs ga-esi mesie ndị iro Chineke ike mgbe ọ ga-abụ Eze n’eluigwe. Ọ sịrị: “N’ịma mma gị, nwee ihe ịga nke ọma; gbaa ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume.” (Ọma 45:4) N’Amagedọn, Jizọs Kraịst ga-alụ ọgụ iji gbachitere ndị dị umeala n’obi, ndị ezi omume, na ndị hụrụ eziokwu n’anya. Gịnị ga-eme ná ngwụcha Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ya bụ, mgbe o merela “ka ọchịchị niile na ikike na ike niile ghara ịdị irè”? Ọ̀ ka ga-adị umeala n’obi? Ee. Baịbụl kwuru na “ọ ga-enyefe alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:24-28.

17, 18. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị na-efe Jehova ṅomie otú Jizọs si dị umeala n’obi? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Ànyịnwa kwanụ? Ànyị ga-eṅomi Jizọs ma dị umeala n’obi? N’Amagedọn, Eze ahụ bụ́ Jizọs Kraịst ga-azọpụta naanị ndị dị umeala n’obi na ndị ezi omume. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ zọpụta anyị. Ọ bụrụkwa na anyị adị umeala n’obi, ọ ga-abara anyị na ndị ọzọ ezigbo uru otú ahụ Jizọs Kraịst ritere uru n’ihi na ọ dị umeala n’obi.

18 Gịnị ga-enyere anyị aka iṅomi Jizọs ma dị umeala n’obi? Olee otú anyị ga-esi gbalịsie ike ịdị umeala n’obi ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Olee otú anyị ga-esi rite uru n’otú Jizọs si dị umeala n’obi?

[Foto dị na peeji nke 13]

Anyị kwesịrị ịmụta otú Jizọs si nweere ndị mmadụ ọmịiko