Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ịkpa Àgwà Ka Onye Ka Nta

Mụta Ịkpa Àgwà Ka Onye Ka Nta

Mụta Ịkpa Àgwà Ka Onye Ka Nta

“Onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”​—LUK 9:48.

Ị̀ GA-AZALI AJỤJỤ NDỊ A?

Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịkpa àgwà ka ndị ka nta?

Olee otú onye na-akpa àgwà ka onye ka nta si bụrụ “onye dị ukwuu”?

Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị umeala n’obi n’ezinụlọ anyị, n’ọgbakọ, nakwa mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe?

1, 2. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndịozi ya, gịnịkwa mere o ji nye ha ndụmọdụ ahụ?

MGBE Jizọs na ndịozi ya nọ n’obodo Galili n’afọ 32, ụfọdụ n’ime ha malitere ịrụ ụka banyere onye ga-abụ onye kasị ukwuu n’ime ha. Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, kwuru, sị: “Ha wee malite ịrụ ụka banyere onye ga-abụ onye kasị ukwuu n’ime ha. Ebe Jizọs maara ihe ha na-eche n’obi ha, ọ kpọọrọ otu nwatakịrị, mee ka o guzoro n’akụkụ ya, wee sị ha: ‘Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m, onye ọ bụlakwa nke na-anabata m na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m. N’ihi na onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.’” (Luk 9:46-48) Jizọs weturu obi nyere ndịozi ya aka ịghọta na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi.

2 Ihe ahụ Jizọs gwara ndịozi ya ka ha na-akpa àgwà ka ndị ka nta ọ̀ bụ otú ndị Juu si akpa àgwà n’oge ahụ? Ka ọ̀ dị iche n’àgwà ọtụtụ ndị Juu na-akpa? Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru otú ndị mmadụ si akpa àgwà n’oge ahụ. O kwuru, sị: “N’ihe ọ bụla ndị Juu na-eme, ha na-achọkarị ịma onye ka ibe ya. Ọ na-adịkwa ha ezigbo mkpa ka a na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù kwesịrị ya.” Jizọs dụrụ ndịozi ya ọdụ ka ha ghara ịna-akpa àgwà ka ndị Juu ndị ọzọ.

3. (a) Gịnị ka ịkpa àgwà ka onye ka nta pụtara, gịnịkwa nwere ike ime ka o siere anyị ike ịna-akpa àgwà otú ahụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere ịkpa àgwà ka onye ka nta?

3 Okwu Grik e si sụgharịta “onye ka nta” pụtara onye dị umeala n’obi, onye dị ala karịa ndị ọzọ, ma ọ bụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya. Jizọs ji nwatakịrị kụziere ndịozi ya na ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. Ndụmọdụ ahụ baara ezi Ndị Kraịst uru taa otú ahụ ọ baara ndịozi Jizọs. O nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịkpa àgwà ka ndị ka nta. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ịdị mpako ma chee na anyị ka ndị ọzọ mma. Ụwa Setan nwekwara ike ime ka onwe anyị na-ebu anyị isi, anyị na ndị ọzọ ana-amarịta aka, ma ọ bụ anyị achọọ ịna-atụrụ ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ka ndị ka nta? Gịnị mere Jizọs ji kwuo na “onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu”? Olee ebe ndị anyị kwesịrị igosi na anyị dị umeala n’obi?

‘NGỌZI NA AMAMIHE NA IHE ỌMỤMA NKE CHINEKE DỊ OMIMI!’

4, 5. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịmụta ịdị umeala n’obi? Nye ihe atụ.

4 Otu ihe ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi bụ icheta na o nweghị ihe anyị bụ ma e jiri anyị tụnyere Jehova. N’eziokwu, “nghọta ya enweghị nchọpụta.” (Aịza. 40:28) Pọl onyeozi dere banyere ịdị ukwuu Jehova, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!” (Rom 11:33) Ihe ahụ Pọl dere n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga ka bụ eziokwu n’agbanyeghị na ndị mmadụ amụtala ọtụtụ ihe kemgbe ahụ. Ihe ọ sọkwara anyị mara, o kwesịrị ime ka anyị ghọta na a ka nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta banyere Jehova, ọrụ ya, na ụzọ ya.

5 Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Leo * mụtara ịdị umeala n’obi n’ihi na ọ chọpụtara na o nweghị ike ịmata ihe niile banyere ihe Jehova kere eke. Mgbe Leo bụ nwa okorobịa, o nwere mmasị na sayensị. Ọ chọrọ ịghọta ihe niile o nwere ike ịghọta banyere eluigwe na ụwa. Ọ bụ ya mere o ji kpebie ịga mụọ ya n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, ọ chọpụtara otu ihe dị mkpa. O kwuru, sị: “Ihe ndị m mụrụ mere ka m ghọta na ọ bụghị naanị sayensị ga-eme ka mmadụ ghọta ihe niile banyere eluigwe na ụwa. N’ihi ya, amalitere m ịmụ banyere iwu.” Ka oge na-aga, Leo ghọrọ ọkàiwu ma mechaa bụrụ ọkàikpe. N’ikpeazụ, Ndịàmà Jehova mụụrụ ya na nwunye ya Baịbụl, ha anata eziokwu, e meekwa ha baptizim. Gịnị nyeere Leo aka ịdị umeala n’obi n’agbanyeghị na ọ gụrụ akwụkwọ? O kwuru, sị: “Ọ bụ ịghọta na n’agbanyeghị ihe anyị ma banyere Jehova na eluigwe na ụwa, e nwere ọtụtụ ihe anyị ka ga-amụta.”

6, 7. (a) Olee otú Jehova si akụziri anyị ịdị umeala n’obi? (b) Olee otú obi umeala Chineke si eme ka mmadụ “dị ukwuu”?

6 Ihe ọzọ na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi bụ icheta na Jehova dị umeala n’obi. Chegodị banyere ihe Baịbụl kwuru, ya bụ: “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Chegodị echiche! Jehova Chineke bụ Onye Kasị Ihe Niile Elu, ma ọ chọrọ ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ. Otu ụzọ o si akwanyere anyị ùgwù bụ ikwe ka anyị jiri Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-ekwusa ozi ọma. N’agbanyeghị na ọ bụ Jehova na-eme ka mkpụrụ ndị anyị na-akụ na ndị anyị na-agba mmiri na-eto, o mere ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ, nke bụ́ ihe ùgwù o nyere anyị. (1 Kọr. 3:6, 7) Ihe ahụ Chineke mere ọ́ naghị akụziri anyị ịdị umeala n’obi? N’eziokwu, otú Jehova si dị umeala n’obi kwesịrị ịgba onye ọ bụla n’ime anyị ume ịna-akpa àgwà ka onye ka nta.

7 Otú Chineke si dị umeala n’obi metụrụ ọbụ abụ bụ́ Devid n’ahụ́. Ọ bụkuru Jehova abụ, sị: ‘Ị ga-enye m ọta nzọpụta gị, ọ bụkwa ịdị umeala n’obi gị na-eme ka m dị ukwuu.’ (2 Sam. 22:36) Devid ma na ihe mere o ji nwee ike ime ihe niile o mere n’Izrel bụ na Jehova dị umeala n’obi ma nyere ya aka. (Ọma 113:5-7) Ọ̀ bụ na o kwesịghị ịdị anyị otú ahụ? Olee ihe anyị nwere nke ọ na-abụghị Jehova nyere anyị, ma ihe anyị ma, ma ikike anyị nwere, ma ihe ùgwù anyị nwere? (1 Kọr. 4:7) Mgbe Jizọs kwuru na onye na-akpa àgwà ka onye ka nta “bụ onye dị ukwuu,” ọ pụtara na onye ahụ ga-abakwuru Jehova uru. (Luk 9:48) Ka anyị tụlee ihe mere o ji bụrụ eziokwu.

‘ONYE KA NTA N’ETITI UNU BỤ ONYE DỊ UKWUU’

8. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, olee otú anyị ga-esi na-ele nzukọ Jehova anya?

8 Obi na-adị ndị dị umeala n’obi ụtọ ná nzukọ Chineke. Ha na-akwadokwa ihe a na-eme n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otu nwaanyị aha ya bụ Petra. A mụrụ ya n’ọgbakọ. Ma, ọ chọrọ ịna-eme ihe sọrọ ya. N’ihi ya, ọ hapụrụ ọgbakọ. Mgbe afọ ụfọdụ gachara, ọ bataghachiri n’ọgbakọ. Obi dị ya ụtọ ugbu a na ọ nọ ná nzukọ Jehova ma na-akwado ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Gịnị mere àgwà ya ji gbanwee ugbu a? O kwuru, sị: “Achọpụtara m na ihe kacha mkpa nke ga-eme ka obi ruo m ala ná nzukọ Chineke bụ ịghọta ihe ịdị umeala n’obi pụtara na ịmụta ya.”

9. Olee otú onye dị umeala n’obi si ele ihe e si na Baịbụl akụziri anyị ná nzukọ Jehova anya, gịnịkwa mere onye dị otú ahụ ga-eji bakwuo uru?

9 Obi na-adị onye dị umeala n’obi ụtọ maka ihe niile Jehova na-enye anyị, ma ihe ndị ọ na-akụziri anyị. N’ihi ya, onye dị otú ahụ na-amụsi Baịbụl ike, na-agụ Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla e bipụtara. Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ọ na-agbalịsi ike ịgụ akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla tupu ya etinye ya n’ọ́bá akwụkwọ ya. Ọ bụrụ na anyị na-agụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-amụkwa ha, ọ ga-egosi na anyị dị umeala n’obi ma jiri ihe Jehova nyere anyị kpọrọ ihe. Anyị na Chineke ga-adịkwu ná mma, anyị abakwuoro ya uru n’ozi ya.—Hib. 5:13, 14.

10. Olee otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà ka ndị ka nta n’ọgbakọ?

10 O nwere ihe ọzọ mere onye na-akpa àgwà ka onye ka nta ji bụrụ “onye dị ukwuu.” N’ọgbakọ niile, e nwere ndị okenye e si n’ike mmụọ nsọ họpụta. Ha na-ahazi ọmụmụ ihe, ozi ọma, na nleta ọzụzụ atụrụ. Ọ bụrụ na anyị na-akpa àgwà ka ndị ka nta, anyị ga na-akwado ndị okenye n’ọrụ ndị a, si otú ahụ na-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ na-enwe ọṅụ, na-adị n’udo, dịkwa n’otu. (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.) Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ị̀ dị obi umeala ma na-ekele Jehova maka ihe ùgwù o nyere gị?

11, 12. Olee àgwà ga-eme ka anyị bakwuoro nzukọ Jehova uru, n’ihi gịnị?

11 Onye na-akpa àgwà ka onye ka nta bụ “onye dị ukwuu.” Ọ ga-abakwuru nzukọ Jehova uru n’ihi na àgwà ya ga-eme ka ọ bụrụ ezigbo ohu Chineke ma baara Jehova uru. Jizọs dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha kpawa àgwà ka ndị ka nta n’ihi na ụfọdụ n’ime ha dịwara mpako ka ọtụtụ ndị n’oge ahụ. Luk 9:46 kwuru, sị: “Ha wee malite ịrụ ụka banyere onye ga-abụ onye kasị ukwuu n’ime ha.” Ànyị nwere ike ịmalite iche na anyị ka ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị ọzọ mma? Ọtụtụ ndị ụwa dị mpako, na-echekwa naanị banyere onwe ha. Anyị ekwesịghị ime ka ha. Kama nke ahụ, ka anyị dị umeala n’obi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ ma mee ka ime uche Jehova bụrụ ihe kacha anyị mkpa, obi ga-erukwu ụmụnna anyị ala ma anyị na ha nọrọ.

12 Ọ bụrụ na anyị aghọta ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-akpa àgwà ka ndị ka nta, ọ ga-eme ka anyị dị umeala n’obi n’ihe niile anyị na-eme. Ka anyị leba anya n’ebe atọ anyị kwesịrị ime otú ahụ.

GBALỊA NA-AKPA ÀGWÀ KA ONYE KA NTA

13, 14. Olee otú di ma ọ bụ nwunye kwesịrị isi na-akpa àgwà ka onye ka nta, oleekwa uru ọ ga-abara ha?

13 N’ezinụlọ. Ihe bụ́ mkpa ọtụtụ ndị taa bụ inweta ihe ruuru ha, ha na-esikwa ọnwụ inweta ya ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ha mejọọ ndị ọzọ. Ma, onye na-akpa àgwà ka onye ka nta na-eme ihe Pọl gbara anyị ume ka anyị na-eme. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, ọ gwara ha, sị: “Ka anyị na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu.” (Rom 14:19) Onye na-akpa àgwà ka onye ka nta na-agba mbọ ịhụ na ya na mmadụ niile dị n’udo, karịsịa di ya ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya.

14 Chegodị banyere ntụrụndụ. Ụdị ntụrụndụ na-adị di mma nwere ike ọ gaghị adị nwunye ya mma. O nwere ike ịbụ na di ya na-achọkarị ịnọ n’ụlọ na-agụ akwụkwọ mgbe ọ na-enweghị ihe ọ na-arụ. Ma o nwere ike ịbụ na nwunye ya chọrọ ịga leta ndị ikwu na ibe ha. Ọ ga-adịrị nwaanyị ahụ mfe ịkwanyere di ya ùgwù ma ọ bụrụ na ọ chọpụta na di ya dị umeala n’obi ma na-echebara ihe ndị na-amasị nwunye ya echiche kama iche naanị banyere onwe ya. Obi ga-atọkwa di ya ụtọ ma ọ chọpụta na nwunye ya anaghị esi ọnwụ ka e mee naanị ihe na-amasị ya kama na ọ na-echebara ihe na-amasị di ya echiche. Di na nwunye ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime ha ana-akpa àgwà ka onye ka nta.—Gụọ Ndị Filipaị 2:1-4.

15, 16. Gịnị ka Devid gbara ndị Izrel ibe ya ume ka ha mee n’Abụ Ọma nke 131, oleekwa otú ndụmọdụ ahụ nwere ike isi baara anyị uru n’ọgbakọ?

15 N’ọgbakọ. Ihe ọtụtụ ndị ụwa na-achọ bụ ime ihe na-agụ ha agụụ ozugbo. Ha anaghị enwe ndidi, ha anaghịkwa achọ ichere ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na anyị amụta ịkpa àgwà ka ndị ka nta, anyị ga na-echere Jehova. (Gụọ Abụ Ọma 131:1-3.) Anyị mụta ichere Jehova, obi ga-eru anyị ala, ya agọzie anyị, anyị ana-enwekwa obi ụtọ. Ka a sịkwa ihe mere Devid ji gbaa ndị Izrel ibe ya ume ka ha chere Chineke ha!

16 Obi ga-eru gị ala otú ahụ ma ọ bụrụ na i jiri obi umeala chere Jehova. (Ọma 42:5) “Agụụ ezi ọrụ” nwere ike ịna-agụ gị, gị ‘ana-agbalị ka i ruo eruo ịbụ onye nlekọta.’ (1 Tim. 3:1-7) N’eziokwu, i kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime ka mmụọ nsọ nyere gị aka ịmụta ịkpa àgwà onye nlekọta kwesịrị ịna-akpa. Ọ́ bụrụkwanụ na ọ dị gị ka è gbuola oge inye gị ihe ùgwù? Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà ka onye ka nta ma chere mgbe oge ruru ka e nye gị ihe ùgwù, ị ga-eji ọṅụ na-ejere Jehova ozi, obi ga-adịkwa gị ụtọ ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị ugbu a.

17, 18. (a) Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-arịọ ndị ọzọ mgbaghara ma na-agbaghara ndị ọzọ? (b) Gịnị ka Ilu 6:1-5 gbara anyị ume ka anyị mee?

17 Mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe. Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịrịọ mgbaghara. Ma, ndị ohu Chineke na-ekweta ihe ha mejọrọ, rịọkwa mgbaghara, si otú ahụ gosi na ha na-akpa àgwà ka ndị ka nta. Ha na-agbaghakwara ndị mejọrọ ha. Mpako na-akpata nkewa na esemokwu n’ọgbakọ. Ma, mgbaghara na-eme ka udo dị n’ọgbakọ.

18 O nwere ike ịdị mkpa ka anyị “daa n’ala,” ma ọ bụ dị umeala n’obi ma si n’ala ala obi anyị rịọ mmadụ mgbaghara ma ọ bụrụ na nsogbu ndị karịrị anyị mere ka anyị ghara imezu ihe anyị na onye ahụ kwekọrịtara. Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ịchọta ihe anyị ga-akụdo aka taa onye ahụ ụta, ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ihe ga-abụ mkpa anyị bụ ihe anyị mejọrọ na ịrịọ mgbaghara maka ya.—Gụọ Ilu 6:1-5.

19. Olee ihe ndị mere onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji na-ekele Chineke maka ndụmọdụ ahụ Baịbụl nyere anyị ka anyị na-akpa àgwà ka ndị ka nta?

19 Anyị na-ekele Chineke maka iji Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ ka anyị mụta ịkpa àgwà ka ndị ka nta! Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isiri anyị ike ime otú ahụ mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na anyị echeta na o nweghị ihe anyị bụ ma e jiri anyị tụnyere Chineke, chetakwa na ọ dị umeala n’obi, anyị ga-agba mbọ ịmụta ịdị umeala n’obi. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị ga-abakwuru Jehova uru. N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị na-akpa àgwà ka onye ka nta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ihe ùgwù Jehova nyere anyị

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Olee ebe ndị i nwere ike igosi na ị na-akpa àgwà ka onye ka nta?