Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ihe Jizọs kwuru na Matiu 19:10-12 ọ̀ pụtara na ndị kpebiri ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye si n’ụzọ pụrụ iche nweta onyinye ahụ?

▪ Chegodị banyere ihe mere Jizọs ji kwuo ihe gbasara mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Mgbe ndị Farisii bịakwutere Jizọs, kwuo banyere ịgba alụkwaghịm, ọ gwara ha hoo haa iwu Jehova nyere banyere ịlụ di na nwunye. N’agbanyeghị na Iwu Mozis kwuru na nwoke nwere ike inye nwunye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ chọpụta “ihe na-ekwesịghị ekwesị” n’ebe nwunye ya nọ, ọ bụghị otú ahụ ka Chineke chọrọ ka ha na-eme mgbe o kere mmadụ. (Diut. 24:1, 2) Jizọs kwuziri, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Mat. 19:3-9.

Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a, ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ otú a ka ọ dị n’etiti nwoke na nwunye ya, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ịlụ nwunye.” Jizọs zara ha, sị: “Ọ bụghị mmadụ niile ga-emeli ihe ahụ e kwuru, kama ọ bụ naanị ndị nwere onyinye ya. N’ihi na e nwere ndị ọnaozi ndị a mụrụ otú ahụ site n’afọ nne ha, e nwekwara ndị ọnaozi ndị mmadụ mere ndị ọnaozi, nweekwa ndị ọnaozi ndị mere onwe ha ndị ọnaozi n’ihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla nke ga-emeli ya, ya mee ya.”—Mat. 19:10-12.

Ndị ọnaozi bụ ndị a mụrụ otú ahụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ na e nwere ihe mere ha ma mebie ihe ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ma, e nwere ndị ji aka ha mee onwe ha ndị ọnaozi. N’agbanyeghị na ha etoruola ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ha kpebiri ijide onwe ha ma nọrọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye “n’ihi alaeze eluigwe.” Dị ka Jizọs, ha kpebiri na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ka ha nwee ike iji ndụ ha niile jeere Jehova ozi. Ha esighị n’afọ nne ha bụrụ ọnaozi, ọ bụghịkwa mmadụ mere ha ọnaozi. Ha ji aka ha kpebie ịbụ ọnaozi, nke pụtara na ha mere ihe ahụ Jizọs kwuru.

N’ihi ihe ahụ Jizọs kwuru, Pọl onyeozi kọwara na n’agbanyeghị na Ndị Kraịst niile nwere ike ijere Chineke ozi nke ọma ma hà lụrụ di na nwunye ma ọ̀ bụ na ha alụghị, ndị ‘kpebiri n’obi ha’ na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye “ga-eme nke ọma karị.” Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị ịna-eke oge ha na ike ha eke iji mee di ha ma ọ bụ nwunye ha obi ụtọ ma na-elekọta ya. Ma, Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike iji ike ha niile na-ejere Onyenwe anyị ozi n’enweghị ihe ga-emegharị ha anya. Ha na-ewere ọnọdụ ha ka “onyinye” si n’aka Chineke.—1 Kọr. 7:7, 32-38.

N’ihi ya, Baịbụl ekwughị na Chineke na-esi n’ụzọ pụrụ iche enye Onye Kraịst onyinye nke bụ́ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Kama, Onye Kraịst na-amụta ya mgbe o kpebiri na ya agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye, ka o nwee ike iji obi ya niile na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke. Taa, ọtụtụ ekpebiela na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye iji mee otú ahụ. Ndị ọzọ kwesịrị ịna-agba ha ume.