Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị bụ aha Chineke?

Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị nwere aha. Ụfọdụ anụmanụ anyị na ha bi n’ụlọ nwedịrị aha! Ebe ọ dị otú ahụ, o kwesịkwara ekwesị na Chineke ga-enwe aha nke ya. E nwere ọtụtụ aha e turu Chineke na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Ọkaakaa Onyenwe Anyị, na Onye Kere Ihe Niile. N’agbanyeghị ọtụtụ aha ndị a e turu ya, Chineke nwere otu ezigbo aha.—Gụọ Aịzaya 42:8.

Ebe e dere aha Chineke n’ọtụtụ Baịbụl bụ n’Abụ Ọma 83:18. Dị ka ihe atụ, na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, amaokwu ahụ kwuru, sị: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akpọ Chineke aha ya?

Chineke chọrọ ka anyị na-akpọ ya aha ya. Anyị na-akpọ ndị anyị hụrụ n’anya, dị ka ezigbo ndị enyi anyị, aha ha mgbe anyị na ha na-ekwurịta okwu, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka anyị na-akpọ ha aha ha. Ọ̀ bụzi Chineke ka anyị na-agaghị akpọ aha ya mgbe anyị na-agwa ya okwu. Ihe ọzọkwa bụ na Jizọs Kraịst chọrọ ka anyị na-akpọ Chineke aha ya.—Gụọ Matiu 6:9; Jọn 17:26.

Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke bụrụ enyi, ihe anyị ga-amata abụghị naanị aha ya, anyị ga-amatakwa ihe ndị ọzọ gbasara ya. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịmata azịza nke ajụjụ ndị dị ka, Olee ụdị onye Chineke bụ? Anyị na ya ò nwere ike ịdị ná mma? Ị ga-amata azịza nke ajụjụ ndị a ma ị gụọ Baịbụl.