Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-abịaru Jehova Nso

Na-abịaru Jehova Nso

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMS 4:8.

1, 2. (a) Olee otú Setan si agbalị ịghọgbu ndị mmadụ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịbịaru Chineke nso?

JEHOVA CHINEKE kere ụmụ mmadụ ka ha na-achọ ịbịaru ya nso. Ma, Setan chọrọ ka anyị na-eme ka ya, ya bụ, ka anyị chee na e nweghị uru Jehova ga-abara anyị. Ọ bụ ihe Setan na-agbalị ime ka ụmụ mmadụ kweta kemgbe ọ ghọgburu Iv n’ogige Iden. (Jen. 3:4-6) Kemgbe ahụ, ọtụtụ ndị na-eche na ịbịaru Chineke nso abaghị uru.

2 Ma, ọnyà Setan ekwesịghị ịmata anyị n’ihi na “anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.” (2 Kọr. 2:11) Setan na-anwa anyị ka anyị kpebie ime ihe ga-eme ka anyị ghara ịnọ Jehova nso. Ma, ihe anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na anyị nwere ike ikpebi ihe ziri ezi banyere ndị ezinụlọ anyị, ọrụ anyị, na ihe anyị ji atụrụ ndụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ ọzọ Setan na-ejikarị anwa anyị, ya bụ, nkà na ụzụ, ahụ́ ike, ego na nganga. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ihe banyere ha nke ọma, anyị ga-enwe ike ‘ịbịaru Chineke nso.’—Jems 4:8.

NKÀ NA ỤZỤ

3. Nye ihe atụ gosiri na nkà na ụzụ nwere uru na ọghọm.

3 Ọtụtụ ndị na-ejizi kọmputa na ihe ndị yiri ya eme ihe dị iche iche. Ọ bụrụ na anyị ejiri ha na-eme ihe ziri ezi, ha nwere ike ịbara anyị uru. Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri ha na-eme ihe na-adịghị mma, ha nwere ike ime ka anyị na Nna anyị nke eluigwe ghara ịdị ná mma. Chegodị uru kọmputa bara. Ọ bụ ya ka e ji dee ma bie Ụlọ Nche a ị na-agụ. Kọmputa nwekwara ike inyere anyị aka ime nchọnchọ na izirịta ozi. E nwekwara ike iji ya tụrụ ndụ. Ma, kọmputa na ihe ndị yiri ya nwere ike ịna-agba mmadụ ara. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agbalị ime ka ndị mmadụ kweta na ha ga-enwerịrị ihe ndị pụtara ọhụrụ. E nwere ụdị kọmputa otu nwa okorobịa chọsiri ike ịzụ. N’ihi ya, o zooro ezoro gaa ree otu akụrụ ya ka o nweta ego ọ ga-eji zụta kọmputa ahụ. Ihe ahụ o mere ọ́ bụghị iberiibe?

4. Olee otú otu nwanna nke ịpị kọmputa na-agba ara si mechaa kwụsị ya?

4 Ihe kadị njọ bụ mmadụ ikwe ka kọmputa na ihe ndị  yiri ya mee ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe efe. Anyị nwekwara ike iji ha na-eme ihe na-adịghị mma. Otu nwanna nwoke nke dị ihe dị ka iri afọ abụọ na asatọ aha ya bụ Jon kwuru, sị: “Ama m na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ‘ịna-azụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị’ anyị ga-eji na-eme ihe gbasara ofufe Chineke. * Ma, kọmputa anaghị ekwe m zuru ike.” Jon na-anọkarị na kọmputa ruo ime abalị. O kwuru, sị: “Ka ike na-agwụ m ka ọ na-esikwuru m ike ịkwụsị ụka mụ na ndị mmadụ na-akparịta n’Ịntanet ma ọ bụ vidio ndị m na-ele na ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-adịghị mma.” Iji nyere onwe ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ, Jon mere ka kọmputa ya jiri aka ya na-anyụ mgbe oge ọ ga-alakpu ruru.—Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.

Ndị nne na nna, nyerenụ ụmụ unu aka iji ihe ndị dị ka kọmputa na-eme ihe bara uru

5, 6. (a) Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịna-emere ụmụ ha? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi mee ka ụmụ ha nwee ezi ndị enyi?

5 Ndị nne na nna, ọ pụtaghị na unu ga-eji onyokomita na-enyo ihe ọ bụla ụmụ unu na-eme, ma unu kwesịrị ịma ihe ha ji kọmputa eme. Unu ahapụla ha ka ha na-aga n’ebe a na-egosi omume rụrụ arụ n’Ịntanet ma ọ bụ na-egwu egwuregwu vidio ebe a na-eme ihe ike ma ọ bụ mgbaasị, ma ọ bụ ka ha na ndị ọjọọ na-akpa n’Ịntanet. Ọ bụrụ na unu ahapụ ha ka ha na-eme otú masịrị ha ka ha ghara inye unu nsogbu, ha nwere ike iche, sị, ‘Ebe ọ bụ na papa m na mama m hapụrụ m ka m na-eme ihe ndị a, ọ ga-abụrịrị na ha abụghị ihe ọjọọ.’ Ebe unu bụ ndị nne na nna, ọ bụ unu kwesịrị ichebe ụmụ unu, ma ndị nke ka na-eto eto. Unu ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ha ghara ịnọ Jehova nso. Unu ma na ụmụ anụmanụ na-echebe ụmụ ha ka ihe ghara ime ha. Chegodị ihe nne ọdụm ga-eme onye chọrọ imetụ ụmụ ya aka!—Tụlee Hosia 13:8.

6 Nyerenụ ụmụ unu aka ka ha nweta ezi Ndị Kraịst ha na ha ga na-akpa, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi. Chetakwa na unu na ụmụ unu kwesịrị ịna-anọrị! N’ihi ya, wepụtanụ oge ka unu na ha na-egwuri egwu, na-achị ọchị ma na-arụkọ ọrụ. Ọ ga-enyere unu na ha aka ịnọ Jehova nso. *

AHỤ́ IKE

7. Gịnị mere anyị niile ji achọ ka ahụ́ sie anyị ike?

7 Anyị na-ajụkarị ndị ọzọ “Olee otú i mere?” Mmadụ niile na-arịa ọrịa kemgbe Adam na Iv gere Setan ntị ma kewapụ onwe ha n’ebe Jehova nọ. Obi na-adị Setan ụtọ mgbe anyị na-arịa ọrịa n’ihi na ọ ma na ọrịa na-eme ka o sikwuoro anyị ike ife Jehova. Ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị agaghị efeli Chineke. (Ọma 115:17) Ọ bụ ya mere anyị ji agbalịsi ike ka ahụ́ sie anyị ike. * Anyị kwesịkwara ịna-eche otú ahụ́ ga-esi sie ụmụnna anyị ike, ihe adịkwara ha mma.

8, 9. (a) Olee otú anyị nwere ike isi zere ịna-eche naanị banyere ahụ́ ike mgbe niile? (b) Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ana-enwe ọṅụ?

8 Ma anyị ekwesịghị ikwe ka ọ bụrụ naanị  ihe gbasara ahụ́ ike ka anyị na-eche mgbe niile. Ihe ụfọdụ ndị na-eji oge ha niile eme bụ ịkọrọ ndị ọzọ ụdị nri ha kwesịrị ịna-eri, ma ọ bụ ụdị ọgwụ ha kwesịrị ịna-aṅụ na ihe ndị ha nwere ike iji na-achọ mma. Ịnụ ọkụ n’obi ha na-eji akọ ya na-akarịdị nke ha ji ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha nwere ike iche na ha na-enyere ndị ọzọ aka. Ma anyị ekwesịghị ịna-akọ banyere ọgwụ, ihe e ji achọ mma ma ọ bụ ihe anyị chere ga-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma tupu a malite ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ mgbe a gbasara, ma ọ bụkwanụ ná mgbakọ. N’ihi gịnị?

9 Ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe na mgbakọ bụ ka anyị mụọ Baịbụl, nwetakwa ọṅụ, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Gal. 5:22) Ọ bụrụ na anyị ejiri oge ahụ na-ekwu banyere ihe e ji agwọ ọrịa, ma è nwere onye jụrụ anyị ajụjụ banyere ya ma ọ bụ na e nweghị, o nwere ike ime ka anyị chefuo ihe mere anyị ji abịa ọmụmụ ihe na mgbakọ, meekwa ka ndị ọzọ ghara inwe ọṅụ. (Rom 14:17) Ọ bụ mmadụ kwesịrị iji aka ya kpebie otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa. Anyị kwesịkwara icheta na e nweghị mmadụ ga-agwọtali ọrịa niile. Ndị dọkịta bụ́ ndị ọkachamara na-akakwa nká, na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Ọ bụghị ichekasị onwe anyị banyere ahụ́ ike ga-eme ka anyị bie ogologo ndụ. (Luk 12:25) Kama, Baịbụl kwuru na “obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.”—Ilu 17:22.

10. (a) Olee àgwà ndị na-eme ka mmadụ maa ezigbo mma n’anya Jehova? (b) Olee mgbe anyị na-agaghịzi arịa ọrịa?

10 Ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka anyị dị mma n’anya. Ma anyị ekwesịghị ịna-esi ọnwụ ka a ghara ịhụ ihe ọ bụla ga-egosi na anyị akawala. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị nwee ùgwù, mee ka a mata na anyị etoola nakwa na anyị ma ihe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.” (Ilu 16:31) Ọ bụ otú Jehova si ele anyị anya. Anyị kwesịkwara ịna-ele onwe anyị anya otú ahụ. (Gụọ 1 Pita 3:3, 4.) N’ihi ya, ànyị kwesịrị ikwe ka a waa anyị ahụ́ ma ọ bụ nye anyị ọgwụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu naanị n’ihi ịchọ mma? Ọ bụ “ọṅụ Jehova” ga-eme ka anyị maa mma na-abụghị nke elu ahụ́, n’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ otú ahụ́ anyị dị. (Nehe. 8:10) Ọ bụ naanị n’ụwa ọhụrụ ka anyị na-agaghị arịa ọrịa, anyị amaakwa mma okorobịa na agbọghọbịa. (Job 33:25; Aịza. 33:24) Ugbu a ọ na-abịabeghị, ezigbo amamihe na okwukwe ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso ma na-eme otú ike kwere anyị.—1 Tim. 4:8.

EGO

11. Olee otú ego nwere ike isi ghọọrọ mmadụ ọnyà?

11 Ego abụghị ihe ọjọọ. Ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị na-arụ ezigbo ọrụ iji na-akpata ego. (Ekli. 7:12; Luk 19:12, 13) Ma, “ịhụ ego n’anya” ga-eme ka anyị ghara ịnọ Jehova nso. (1 Tim. 6:9, 10) Anyị nwee “nchegbu nke usoro ihe a,” ya bụ, na-eche naanị banyere otú anyị ga-esi na-egbo mkpa anyị, o nwere ike ime ka anyị hapụ Jehova. Ọ bụkwa ihe “ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ime anyị, ya bụ, iche na ọ bụ akụnụba ga-eme ka obi dị anyị ụtọ ma ruo anyị ala ruo mgbe ebighị ebi. (Mat. 13:22) Jizọs mere ka o doo anya na “ọ dịghị onye” ga-efeli Chineke na akụnụba.—Mat. 6:24.

12. Olee ọnyà ndị na-ama ụfọdụ ndị taa n’achụmnta ego, oleekwa otú anyị nwere ike isi zere ha?

12 Ọ bụrụ na anyị echee na ọ bụ ego kacha mkpa, o nwere ike ime ka anyị mee ihe ọjọọ. (Ilu 28:20) Akpịrị ogologo emeela ka ụfọdụ ndị tinye aka n’ịgba chaa chaa ma ọ bụ n’achụmnta ego zụọ taa baa echi. Ha na-aratakwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ka ha soro ha. Otú e si arata ụfọdụ ndị bụ na a na-ekwe ha nkwa na ha ga-erite uru buru ezigbo ibu ma ha tinye ego ha n’achụmnta ego. Kpachara anya. Ekwela ka anyaukwu mee ka a ghọgbuo gị. Ọ bụrụ na uru a gwara  gị ị ga-erite dara gị ka ihe na-agaghị ekwe omume, o nwere ike ọ gaghị eme eme.

13. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-ele ego anya, nke dị iche n’ihe ndị ụwa chere?

13 Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ “Alaeze ahụ na ezi omume Chineke,” Jehova ga-agọzi ezigbo mbọ anyị na-agba ka anyị gboo mkpa anyị. (Mat. 6:33; Efe. 4:28) Ọ chọghị ka anyị bịa ọmụmụ ihe anyị ana-ehi ụra n’ihi na anyị arụgbuola onwe anyị n’ọrụ, ma ọ bụ ka anyị nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eche banyere ego. Ma, ọtụtụ ndị n’ụwa taa chere na ọ bụrụ na ha ejiri oge ha niile na-achụ ego, ọ ga-eme ka ha bụrụ aka ji akụ̀ ma ghara ịta ahụhụ n’ọdịnihu. Ha na-agwakwa ụmụ ha ka ha were ịchụ akụnụba ka ihe kacha mkpa. Jizọs gosiri na onye na-eche otú ahụ enweghị uche. (Gụọ Luk 12:15-21.) Ihe ahụ o kwuru na-echetara anyị Gehezaị, bụ́ onye chere na ya nwere ike inwe anyaukwu ma ka bụrụ enyi Jehova.—2 Eze 5:20-27.

14, 15. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụkwasị ego obi n’ụwa ochie a? Nye ihe atụ.

14 E nwere ugo ndị mmiri na-eri n’ihi na ha siri ọnwụ na ha ga-eburịrị azụ̀ karịrị ha. Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime Onye Kraịst? Otu okenye aha ya bụ Alex kwuru, sị: “Anaghị m eji ego m egwu egwu. Ana m akpị ihe ọ bụla m nwere akpị.” Ma, Alex gara tinye aka n’otu achụmnta ego, buru n’obi na ya nwetatụ ego, na ya ga-akwụsị achụmnta ego ahụ ma malite ịsụ ụzọ. O ji oge ya niile na-amụ ihe gbasara achụmnta ego ahụ. O tinyere ego ndị o nwere na ndị ọ gbazitere n’achụmnta ego ahụ iji rite nnukwu uru. Ma ọ ghọrọ ya ahịa. Alex kwuru, sị: “Ekpebisiri m ike na m ga-enweta isi ego m.” O chere na ya gbakwuo mbọ, na ya ga-amalite irite uru.

15 Ruo ọtụtụ ọnwa, o nweghị ihe ọzọ Alex na-eche ma ọ bụghị achụmnta ego ya. Ọ malitere isiri ya ike ime ka obi ya dịrị n’ozi Jehova. Ọ naghịzi ehi ụra abalị. Ma, isi ego ya ekweghị ya nnweta. Ego niile Alex kpatara gwụrụ, ya emechaa ree ụlọ ya. O kwuru, sị: “Ihe m mere kpataara ezinụlọ m nsogbu.” Ma, ọ mụtara ihe n’ihe mere ya. O kwuru, sị: “Amatala m ugbu a na onye tụkwasịrị ụwa Setan obi ga-akwa mmakwaara.” (Ilu 11:28) N’eziokwu, anyị tụkwasị obi n’ego anyị dewere n’ụlọ akụ̀, n’achụmnta ego anyị, ma ọ bụ n’ihe ọzọ e ji akpata ego n’ụwa ochie a, ọ pụtara na olileanya anyị dị n’ebe Setan nọ, ya bụ, “chi nke usoro ihe a.” (2 Kọr. 4:4; 1 Tim. 6:17) Alex agbanweela ndụ ya ka o nwee ike iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma. Ị jụọ ya, ọ ga-agwa gị na mgbanwe ahụ o mere emeela ka ya na ezinụlọ ya nwekwuo obi ụtọ, meekwa ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.—Gụọ Mak 10:29, 30.

NGANGA

16. Olee otú nganga dị mma si dị iche na nganga na-adịghị mma?

16 Iji ihe dị mma akpa nganga abụghị ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị iji Ndịàmà Jehova anyị bụ na-anya isi mgbe niile. (Jere. 9:24) Ọ bụrụ na obi siri anyị ike n’ihe anyị ga-emeli, ọ ga-eme ka anyị kpebie ime ihe ziri ezi ma ghara ime ihe anyị ma na ọ dịghị mma. Ma, ọ bụrụ na ihe anyị chere ma ọ bụ ọrụ e nyere anyị ebuwe anyị isi, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.—Ọma 138:6; Rom 12:3.

17, 18. (a) Olee ndị Baịbụl kwuru na ha dị obi umeala? Olee ndị o kwuru na ha dị mpako? (b) Gịnị ka otu nwanna mere, ka mpako ghara ikewapụ ya n’ebe Jehova nọ?

17 Baịbụl gwara anyị banyere ndị dị mpako na ndị dị obi umeala. Eze Devid dị obi umeala. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Jehova ka o duzie ya. Jehova gọzikwara ya. (Ọma 131:1-3) Ma Jehova wedara Eze Nebukadneza na Eze Belshaza ala n’ihi na ha dị mpako. (Dan. 4:30-37; 5:22-30) Taa, e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka a mata ma ànyị dị umeala n’obi. E nwere otu ohu na-eje ozi dị afọ iri atọ na abụọ. Aha ya bụ Ryan. Ọ gafere n’ọgbakọ ọhụrụ. O kwuru, sị: “Atụrụ m anya na a ga-eme m okenye n’oge na-adịghị  anya. Ma mgbe otu afọ gachara, e meghị m okenye.” Iwe ò juru Ryan obi, ya echewe na ndị okenye akwanyereghị ya ùgwù kwesịrị ya? Ọ̀ kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe, kwe ka mpako mee ka ọ ghara ịnọ Jehova na Ndị Kraịst ibe ya nso? Ọ bụrụ gị, gịnị ka ị ga-eme?

Kama ịnọ na-echegbu onwe gị banyere ihe ùgwù a na-enyeghị gị n’ọgbakọ, gbalịa ka ozi ọma na-atọ gị ụtọ!

18 Ryan kwuru, sị: ‘Emere m nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ma gụọ ihe niile m hụrụ banyere otú mmadụ kwesịrị isi chere ihe ọ na-atụ anya ya.’ (Ilu 13:12) O kwukwara, sị: “Aghọtara m na m kwesịrị ịmụta inwe ndidi na ịdị umeala n’obi. M kwesịrị ikwe ka Jehova na-azụ m.” Ryan kwụsịrị iche banyere onwe ya, chewezie otú ọ ga-esi na-ejere ndị ọzọ ozi ma n’ọgbakọ ma n’ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, o nwetara ọtụtụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl, ha ana-eme nke ọma. O kwuru, sị: “Mgbe e mechara mee m okenye mgbe otu afọ na ọkara gachara, atụghị m anya ya. Ọ naghịzi echu m ụra mgbe ahụ n’ihi na ozi ọma m na-eje na-atọ m ezigbo ụtọ.”—Gụọ Abụ Ọma 37:3, 4.

NỌRỌ JEHOVA NSO!

19, 20. (a) Olee otú anyị ga-esi mee ka ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị ghara ikewapụ anyị n’ebe Jehova nọ? (b) Olee ndị anyị kwesịrị iṅomi n’ihi na ha nọrọ Jehova nso?

19 Ihe asaa ndị ahụ anyị tụlere n’isiokwu a nakwa na nke bu ya ụzọ bụcha ezigbo ihe. Anyị kwesịrị ịna-akpa nganga na anyị na-ejere Jehova ozi. Inwe obi ụtọ n’ezinụlọ nakwa inwe ahụ́ ike socha n’ezigbo onyinye Jehova nyere anyị. Anyị ghọtara na ọrụ anyị na-arụ na ego anyị na-akpata nwere ike inyere anyị aka ịna-egbo mkpa anyị. Anyị ma na ntụrụndụ nwere ike ime ka anyị nwee obi ụtọ, nkà na ụzụ nwekwara ike ịbara anyị uru. Ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị ahụ mgbe na-ekwesịghị ekwesị, na-emefe ya ókè, ma ọ bụ kwe ka o gbochie anyị ife Jehova, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.

Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịnọ Jehova nso!

20 N’eziokwu, ọ bụ ihe Setan chọrọ. Ma, i nwere ike izere ụdị ọdachi ahụ ka ọ ghara ịdakwasị gị na ezinụlọ gị! (Ilu 22:3) Bịaruo Jehova nso. Nọrọkwa ya nso. E nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị anyị kwesịrị iṅomi otú ha si nọrọ Jehova nso. Inọk na Noa ‘so ezi Chineke na-eje ije.’ (Jen. 5:22; 6:9) Mozis “guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Hib. 11:27) Chineke nyeere Jizọs aka mgbe niile n’ihi na o mere ihe dị Nna ya nke eluigwe mma mgbe niile. (Jọn 8:29) Na-eme otú ahụ ha mere. ‘Na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile. Na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Na-ekele Chineke banyere ihe ọ bụla.’ (1 Tesa. 5:16-18) Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịnọ Jehova nso!

^ para. 4 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Otú A Ga-esi Zụọ Ụmụaka Ha Abaa Uru” na Teta! Ọktoba–Disemba 2011.

^ para. 7 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ise Ndị Ga-eme Ka Ahụ́ Na-adịkwu Gị Mma” na Teta! Eprel–Jun 2011.