Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mozis—Nwoke Hụrụ Ndị Ọzọ n’Anya

Mozis—Nwoke Hụrụ Ndị Ọzọ n’Anya

GỊNỊ KA MMADỤ ỊHỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA PỤTARA?

Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya anaghị eji ndị ahụ egwuri egwu. Ihe banyere ha na-emetụkwa ya n’obi. Omume ya na okwu ọnụ ya na-egosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ na-emere ha ihe ọma, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ dịrịghị ya mfe ime otú ahụ.

OLEE OTÚ MOZIS SI GOSI NA YA HỤRỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA?

Mozis gosiri na ya hụrụ Chineke n’anya. Olee otú o si gosi ya? Ì chetara ihe e dere na 1 Jọn 5:3? Ebe ahụ sịrị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.” Ebe ọ bụ na Mozis hụrụ Chineke n’anya, o rubeere Chineke isi. Mozis mere ihe niile Chineke gwara ya mee, ma ndị nke siri ezigbo ike ma ndị nke na-esighị ike. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke gwara ya ka ọ gaa gwa Fero ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha laa, ọ gara. Mgbe Chineke gwakwara ya setịpụ mkpara ya n’elu Osimiri Uhie, o rubeere Chineke isi. Baịbụl kwuru, sị: “O mere nnọọ otú ahụ.”—Ọpụpụ 40:16.

Mozis hụkwara ụmụ Izrel ibe ya n’anya. Ebe ha ma na Jehova ji Mozis na-edu ha, ha na-abịakwute Mozis ka o doziere ha nsogbu ha. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ụmụ Izrel wee guzoro n’ihu Mozis malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede.’ (Ọpụpụ 18:13-16) Chegodị otú ike ga-esi agwụcha Mozis ka ọ nọ na-ege ụmụ Izrel ntị ka ha na-akọrọ ya nsogbu ha, onye nke a kọchaa, ibe ya akọọ. Ma ebe ọ bụ na Mozis hụrụ ụmụ Izrel n’anya, o ji obi ụtọ gee ha ntị ma nyere ha aka.

Ma ihe Mozis mere abụghị naanị ige ụmụ Izrel ntị, o kpekwaara ha ekpere. O kpekwaara ndị mejọrọ ya ekpere. Dị ka ihe atụ, mgbe nwanne Mozis aha ya bụ Miriam tamuru ntamu megide Mozis, Jehova tiri Miriam ekpenta. Mozis agaghị ṅụrịwa ọṅụ na Jehova ataala Miriam ahụhụ. Kama ime otú ahụ, o kpere ekpere ozugbo n’ihi Miriam. Ọ rịọrọ Jehova, sị: “Biko, Chineke! Biko, gwọọ ya!” (Ọnụ Ọgụgụ 12:13) Mozis ọ̀ gaara arịọchitere Miriam arịrịọ ma a sị na ọ hụghị ya n’anya?

GỊNỊ KA NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ?

Ọ na-akụziri anyị na anyị nwere ike ịhụ Chineke n’anya nke ukwuu otú ahụ Mozis hụrụ ya. Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke n’anya otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị ‘si n’obi anyị na-erube isi’ n’iwu ya. (Ndị Rom 6:17) Ọ bụrụkwa na anyị esi n’obi anyị na-erubere Jehova isi, ọ ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Iji obi anyị niile na-erubere Jehova isi ga-abakwara anyịnwa uru. Ọ bụrụ na anyị na-efe Jehova maka na anyị hụrụ ya n’anya, anyị ga na-eme ihe dị mma, obi ga na-atọkwa anyị ụtọ na anyị na-eme otú ahụ.—Abụ Ọma 100:2.

Otú ọzọ anyị nwere ike isi na-eme ka Mozis bụ iji obi anyị niile hụ ndị ọzọ n’anya. Mgbe ndị enyi anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị bịara ịkọrọ anyị nsogbu ha, ebe ọ bụ na anyị hụrụ ha n’anya, anyị (1) ga-ege ha ntị nke ọma; (2) metara ha ebere; ma (3) mee ka ha mata na ọnọdụ ha na-emetụ anyị n’obi.

Anyị kwesịkwara ịna-ekpere ndị anyị hụrụ n’anya ekpere otú ahụ Mozis mere. Mgbe ụfọdụ, ha kọchaara anyị mkpa ha, ọ na-ewute anyị na anyị agaghị egboliri ha mkpa ahụ. Anyị nwedịrị ike ịsị ha, “Biko, tachie obi. Agaghị m egboliri gị mkpa gị a. Ma o nwere ihe m ga-emere gị. M ga-etinye gị n’ekpere.” Ma echefula na Baịbụl kwuru, sị: “Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.” (Jems 5:16) Ekpere anyị nwedịrị ike imetụ Jehova n’obi, ya emeere onye ahụ ihe ọ na-agabughị emere ya. Nke a ó gosighị na o nweghị ihe ka mma anyị nwere ike imere ndị anyị hụrụ n’anya karịa ịna-ekpere ha ekpere? *

Ọ̀ bụ na i kwetaghị na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Mozis? N’agbanyeghị na Mozis bụ mmadụ nkịtị otú anyị bụ, ọ bụ nwoke e ji ama atụ n’ihi okwukwe ya, ịdị umeala n’obi ya, na otú o si hụ ndị ọzọ n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịkwu ka anyị na-akpa àgwà ka Mozis, ndụ anyị ga-abakwuru ma anyịnwa ma ndị ọzọ uru.—Ndị Rom 15:4.

^ para. 8 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-anụ ekpere anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-erubere Chineke isi. Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere ekpere, gụọ isi nke 17 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.