Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Pita na Ananayas Ghara Ụgha—Gịnị Ka Ihe Ha Mere Na-akụziri Anyị?

Pita na Ananayas Ghara Ụgha—Gịnị Ka Ihe Ha Mere Na-akụziri Anyị?

E kwuo na mmadụ ghara ụgha, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ ekwughị eziokwu. Ị̀ ghatụla ụgha? * E nweela ụfọdụ ndị toro eto ghara ụgha n’agbanyeghị na ha na-efe Chineke. O nwere ike ịbụ na ọ dị onye nke ị ma Baịbụl kọrọ akụkọ ya. Aha ya bụ Pita. Ọ bụ otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs. Ka anyị gụọ akụkọ ya ka anyị mara ihe mere o ji ghaa ụgha.

Mgbe e jidere Jizọs, a kpọ ya gaa n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà. Mgbe ahụ chi ejimiela. Ma Pita batara n’ogige ụlọ nnukwu onye nchụàjà ahụ. O nwekwanụghị onye matara onye ọ bụ. Ma ìhè ọkụ dị n’ogige ụlọ ahụ mere ka nwa agbọghọ na-eje ozi nke kpọbatara ya mata onye ọ bụ. Nwa agbọghọ ahụ gwara ya, sị, ‘Gị na Jizọs na-anọ.’ Ma ụjọ tụrụ Pita, ya asị na ihe nwa agbọghọ ahụ kwuru abụghị eziokwu.

Baịbụl kwuru na mgbe e mechara, “nwa agbọghọ ọzọ matara” onye Pita bụ ma kwuo, sị, ‘Nwoke a na Jizọs nọrọ.’ Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Mgbe obere oge gafere, ndị ọzọ gakwuuru Pita ma sị ya: “N’ezie, gị onwe gị kwa bụ otu n’ime ha.”

Ụjọ tụrụ Pita, ya aghaa ụgha nke ugboro atọ, sị: “Amaghị m nwoke ahụ!” Oké ọkpa kwara mgbe ahụ, Jizọs elee Pita anya. Pita chetaziri ihe Jizọs gwara ya awa ole na ole tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ, Jizọs gwara Pita, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.” Pita ejitelighị onwe ya, ya ebewe ákwá. N’eziokwu, ihe o mere wutere ya.

Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime gị?— N’ụlọ akwụkwọ unu, i nwere ike ịnụ ka ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ekwu gbasara Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ha nwere ike ịsị, “Ndịàmà Jehova anaghị agụ abụ e ji eto mba ha.” Onye nke ọzọ asị, “Ha anaghị alụrụ mba ha agha.” Onye ọzọ nwekwara ike ịsị, “Ha abụghị Ndị Kraịst n’ihi na ha anaghị agba Krịsmas.” Otu n’ime ha elee gị anya jụọ gị,  sị, “Ọ̀ bụ na ị bụghị Onyeàmà Jehova?” Gịnị ka ị ga-ekwu?

I kwesịrị ikwadebe ihe ị ga-aza tupu ndị mmadụ ajụọ gị ajụjụ ndị a. Pita akwadebeghị akwadebe. Ọ bụ ya mere o ji ghaa ụgha mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Ma Chineke gbaghaara ya n’ihi na ụgha ahụ ọ ghara wutere ya.

E nwere onye ọzọ na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie nke ghara ụgha. Aha ya bụ Ananayas. Ma Chineke agbagharaghị ya na nwunye ya Safaịra. Ya na nwunye ya kpara ya akpa na ha ga-agha ụgha. Ka anyị hụ ihe mere Chineke agbagharaghị Ananayas na Safaịra.

Abalị iri Jizọs hapụrụ ndịozi ya ma laghachikwuru Chineke n’eluigwe, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ baptizim na Jeruselem. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ e mere baptizim si ebe dị anya bịa Jeruselem maka Ememme Pentikọst. Ma ugbu a ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha chọrọ ịnọtụkwu na Jeruselem ka ha mụtakwuo banyere Chineke na Kraịst. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs wetara ego ka e jiri ya na-elekọta ndị ahụ.

Ananayas na nwunye ya rere ala ha ka ha nweta ego ha ga-eji enyere ndị ahụ e mere baptizim ọhụrụ aka. Ma mgbe Ananayas wetaara ndịozi Jizọs ego ahụ, o kwuru na ego o wetara bụ ego niile ha retara ala ahụ. Ma ọ bụghị eziokwu. O wetachaghị ha niile. Chineke mere ka Pita mara ihe Ananayas mere. Pita gwaziri Ananayas, sị: “Ị ghaworo Chineke ụgha, ọ bụghị mmadụ.” Mgbe Pita gwachara Ananayas okwu, Ananayas dara n’ala nwụọ! Mgbe ihe dị ka awa atọ gafere, nwunye Ananayas batara. Ebe ọ na-amaghị ihe mere di ya, ọ ghakwara ụgha otú di ya ghara, ya adaakwa n’ala nwụọ.

Akụkọ a na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa. Ọ na-akụziri anyị na ọ dị mkpa ka anyị na-ekwu eziokwu. Anyị kwesịrị ịmụta ịna-ekwu eziokwu. Ma o nwere mgbe anyị nwere ike ime ihe na-adịghị mma, karịchaa, mgbe anyị ka dị obere. Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ ga-agbaghara gị otú ahụ ọ gbaghaara Pita?— Ma cheta na anyị kwesịrị ịna-ekwu eziokwu. Ọ bụrụkwa na anyị aghaa ụgha, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị. Ọ ga-abụrịrị na Pita rịọrọ Chineke mgbaghara, Chineke agbaghara ya. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ka anyị ghara ịghakwa ụgha, Chineke ga-agbaghakwara anyị.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

^ para. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.