Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: GỊNỊ GA-EME KA NDỤ ANYỊ BAA EZIGBO URU?

Gịnị Ga-eme Ka Ndụ Anyị Baa Ezigbo Uru?

Gịnị Ga-eme Ka Ndụ Anyị Baa Ezigbo Uru?

“Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa; ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ, ma ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ.”—Abụ Ọma 90:10.

IHE a e kwuru n’Abụ Ọma bụ eziokwu. Ndụ anyị dị n’ụwa a jupụtara ná “nsogbu na ihe ọjọọ.” O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe ị jụrụ onwe gị ma ò nwere ihe ị ga-eme ka ndụ gị baa ezigbo uru ugbu a.

Chebagodịrị ihe mere Maria echiche. Kemgbe ụwa ya, ahụ́ gbasiri ya ike. Ma ugbu a ọ dị afọ iri asatọ na anọ, ọ na-anọzi n’ụlọ. Ụbụrụ ya ka na-arụ ọrụ nke ọma, ma ahụ́ esikwaghị ya ike. Ndụ Maria ò nwere ike ịna-atọ ya ụtọ n’agbanyeghị ọnọdụ ya?

Oleekwanụ maka gịnwa? O nwere ike ịbụ na o nweela mgbe ị jụrụ onwe gị ma ndụ a ị dị ọ̀ badịrị uru. O nwere ike ịbụ na ọrụ ị na-arụ bụ ọrụ ike ma ọ bụkwanụ na ọ gbụla gị. O nwedịrị ike ịbụ na o nweghị onye na-aja gị mma n’agbanyeghị mbọ niile ị na-agba. Ọ bụrụgodị na ihe na-agazitụrụ gị, ụjọ nwekwara ike ịna-atụ gị maka na ị maghị ihe echi ga-abụ. Mgbe ụfọdụ, owu nwere ike ịna-ama gị ma ọ bụ obi ana-ajọ gị njọ. O nwekwara ike ịbụ na udo adịghị n’ezinụlọ gị ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị. Otu nwoke aha ya bụ André na nna ya dị n’ezigbo mma. Ma na mberede, nna ya dara ọrịa nwụọ. Ihe ahụ merenụ wutere André nke ukwuu. O chere na nke ya na-eme ná ndụ agwụla.

N’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị ná ndụ, o nwere ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ịmata azịza ya. Ajụjụ ahụ bụ: Gịnị ga-eme ka ndụ anyị baa ezigbo uru? Anyị ga-amata azịza ajụjụ a ma ọ bụrụ na anyị eleba anya ná ndụ otu nwoke nke dịrị ndụ n’ụwa n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. Aha nwoke ahụ bụ Jizọs Kraịst. N’agbanyeghị nsogbu niile bịaara ya, ndụ ya bara ezigbo uru. Ndụ anyị nwekwara ike ịdị ka nke ya ma ọ bụrụ na anyị ebie ndụ ka ya.