Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Adala Mbà’

‘Adala Mbà’

“Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma.”—GAL. 6:9.

1, 2. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ, gịnị ka ọ ga-eme ka anyị mee?

MGBE ọ bụla anyị chetara na anyị na ndị mmụọ ozi nọ ná nzukọ Jehova, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ. Ọhụụ Ezikiel, nke dị n’isi nke mbụ n’akwụkwọ Ezikiel, na ọhụụ Daniel, nke dị n’isi nke asaa n’akwụkwọ Daniel, kọwaara anyị nke ọma otú Jehova si ahụ na e mezuru uche ya. Jizọs na-eduzi ndị ohu Jehova nọ n’ụwa. Ọ na-eme ka ọrụ ikwusa ozi ọma bụrụ ihe kacha mkpa nzukọ Jehova na-arụ. Ọ na-ahụ na a kụziiri ndị na-arụ ọrụ ahụ ihe dị na Baịbụl, na-agbakwa ha ume. Ọ na-ahụkwa na a na-enyere ndị ọzọ aka ka ha bịa fewe Jehova. Ihe a niile na-eme ka anyị tụkwasị nzukọ Jehova obi!—Mat. 24:45.

2 Ànyị ji ozi Jehova kpọrọ ihe otú nzukọ ya si jiri ya kpọrọ ihe? Ànyị na-ekwusasi ozi ọma ike ka ànyị na-ada mbà? Ọ bụrụ na anyị echebara ajụjụ abụọ a echiche, anyị ga-achọpụta ma ike ịga ozi ọma ọ̀ gwụwala anyị ma ọ bụkwanụ ma ànyị adawala mbà. Ụdị ihe a nwere ike ime Onye Kraịst. Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi Jizọs, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha cheta otú Jizọs si jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya. Ọ sịrị na ha mee otú ahụ, na ọ ga-enyere ha aka ‘ka ike ghara ịgwụ ha, ka ha gharakwa ịda mbà ná mkpụrụ obi ha.’ (Hib. 12:3) Icheta otú Kraịst si jee ozi nyeere ndị mbụ soro ụzọ Kraịst aka. Otú ahụkwa ka icheta otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ taa, nke bụ́ ihe anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, kwesịrị isi nyere anyị aka ịna-anụ ọkụ n’obi ma ghara ịda mbà.

3. Olee ihe anyị kwesịrị ime ka ike ghara ịgwụ anyị? Oleekwa ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Ma, Pọl kwuru na e nwere ihe ndị anyị kwesịrị ime ka ike ghara ịgwụ anyị. O kwuru na anyị kwesịrị ‘ịna-eme ihe dị mma.’ (Gal. 6:9) Ọ pụtara na anyị agaghị afanye aka n’ụkwụ. Ka anyị lebazie anya n’ihe ise ga-enyere anyị aka ịna-anụ ọkụ n’obi ma na-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ. Onye ọ bụla n’ime anyị ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla ga-enwezi ike ịchọpụta  ma è nwere nke ha kwesịrị ịna-emekwu nke ọma na ya.

NA-EZUKỌTANỤ MAKA ỊGBARỊTA IBE UNU UME NA IFE JEHOVA

4. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na izukọta ọnụ bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si efe Jehova?

4 Kemgbe ụwa, ndị ohu Jehova anaghị eji izukọ ọnụ egwuri egwu. N’eluigwe, a na-enwe oge ndị mmụọ ozi ji ezukọ n’ihu Jehova. (1 Eze 22:19; Job 1:6; 2:1; Dan. 7:10) N’oge ochie, Chineke gwara ndị Izrel ka ha na-ezukọta ‘ka ha wee gee ntị, ma mụtakwa ihe.’ (Diut. 31:10-12) N’oge Jizọs, e nwere ụbọchị ndị Juu ji aga n’ụlọ nzukọ ha ka a gụọrọ ha Akwụkwọ Nsọ. (Luk 4:16; Ọrụ 15:21) Mgbe e hiwekwara ọgbakọ Ndị Kraịst, ndị na-eso ụzọ Jizọs anaghị eji nzukọ ha egwu egwu. Taakwa, izukọta ọnụ bụ otu ụzọ dị mkpa Ndị Kraịst si efe Jehova. Mgbe ọ bụla ezi Ndị Kraịst zukọrọ, ha ‘na-echebara ibe ha echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ Anyị kwesịrị ‘ịna-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka anyị na-ahụ ụbọchị Jehova ka ọ na-eru nso.’—Hib. 10:24, 25.

5. Olee otú anyị nwere ike isi na-agba ibe anyị ume n’ọmụmụ ihe?

5 Otu ụzọ dị mkpa anyị si agba ibe anyị ume bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịza ajụjụ a jụrụ na paragraf ma ọ bụ kọwaa otú amaokwu Baịbụl a gụrụ si gbasa ihe a na-amụ. Anyị nwekwara ike ịkọ otu ihe mere eme nke gosiri na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara anyị uru. (Ọma 22:22; 40:9) Ihe ụmụnna anyị niile na-aza n’ọmụmụ ihe na-agba anyị ume, ma nke ndị agadi na-aza ma nke ụmụaka na-aza. N’agbanyeghị afọ ole anyị bụrụla Ndịàmà Jehova, ihe ọ bụla e kwuru n’ọmụmụ ihe na-agba anyị ume.

6. Olee otú ọmụmụ ihe si enyere anyị aka?

6 Olee ihe ọzọ mere Chineke anyị ji sị ka anyị na-ezukọta mgbe niile? Ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ na-enyere anyị aka iji obi ike na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ nwere ike ime anyị. (Ọrụ 4:23, 31) Okwu ndị a na-ekwu na ihe ngosi ndị a na-eme na-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Ọrụ 15:32; Rom 1:11, 12) Anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ, obi na-erukwa anyị ala ma anyị na ụmụnna anyị nọrọ. (Ọma 94:12, 13) Kọmitii Izi Ihe na-ahazi ihe a na-akụziri ndị ohu Jehova n’ụwa niile. Obi dị anyị ezigbo ụtọ n’ihi ihe ndị magburu onwe ha a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe kwa izu!

7, 8. (a) Olee ihe kacha mkpa mere anyị kwesịrị iji na-aga ọmụmụ ihe? (b) Olee otú ọmụmụ ihe si enyere gị aka?

7 Ma, e nwedịrị ihe kacha mkpa mere anyị kwesịrị iji na-aga ọmụmụ ihe. Ọ bụ ife Jehova. (Gụọ Abụ Ọma 95:6.) Ịbụku ezi Chineke anyị abụ bụ ezigbo ihe ùgwù! (Kọl. 3:16) Anyị na-eto Jehova ma anyị gaa ọmụmụ ihe nakwa ma anyị zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. N’eziokwu, anyị kwesịrị isi otú a na-efe Jehova. (Mkpu. 4:11) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na a gbara anyị ume “ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị.”—Hib. 10:25.

8 Ànyị ghọtara na ọmụmụ ihe anyị bụ ihe Jehova ji enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị tupu ya ebibie ụwa ọjọọ a? Ọ bụrụ na anyị ghọtara ya otú ahụ, ịgachi ọmụmụ ihe anya ga-eso “n’ihe ndị ka mkpa” anyị kwesịrị ịna-eme. (Fil. 1:10) Ihe ga-eme ka anyị ghara ịga ọmụmụ ihe kwesịrị ịbụ ihe siri ezigbo ike nke na anyị amaghịzi ihe ọzọ anyị ga-eme.

 JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA OZI ỌMA

9. Olee otú anyị si mara na ọrụ ikwusa ozi ọma dị mkpa?

9 Iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma ga-enyere anyị aka ịna-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ. Jizọs malitere ọrụ ikwusa ozi ọma mgbe ọ nọ n’ụwa. (Mat. 28:19, 20) Kemgbe ahụ, ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ọrụ kacha mkpa nzukọ Jehova na-arụ. Ọtụtụ ihe ndị merela n’oge anyị a egosila na ndị mmụọ ozi na-akwado ọrụ a anyị na-arụ nakwa na ha na-edu anyị aga na nke ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48; Mkpu. 14:6, 7) Nzukọ Jehova na-akwado ọrụ a, na-ahụkwa na a haziri ndị ohu Jehova nọ n’ụwa ka ha were ọrụ a ka ihe kacha mkpa. Ozi a ọ̀ bụ ihe kacha gị mkpa?

10. (a) Kọọ otu ihe mere eme nke na-egosi otú anyị nwere ike isi nọsie ike n’ọgbakọ. (b) Olee otú ịga ozi ọma si enyere gị aka ka ike ịnọ n’ọgbakọ ghara ịgwụ gị?

10 Ọ bụrụ na anyị ana-ekwusasi ozi ọma ike, ọ ga-eme ka anyị nọsie ike n’ọgbakọ. Legodị ihe otu nwanna nwoke aha ya bụ Mitchel kwuru. O teela nwanna a bụ okenye, o teekwala ọ sụwara ụzọ. Ọ sịrị: “Ọ na-atọ m ụtọ ịkọrọ ndị mmadụ eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ọ na-abụ, m gụọ Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ọhụrụ, obi ana-atọ m ụtọ maka ihe ndị bara uru m gụtara. M na-achọ ịma otú obi ga-adị ndị mmadụ ma m gwa ha gbasara ihe m gụtara. Ozi m na-eme ka m nọsie  ike n’ọgbakọ. O nweghị ihe m na-ekwe ka o gbochie m ịga ozi ọma.” Ọ bụrụkwa na anyị ana-ekwusasi ozi ọma ike, ọ ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ọgbakọ n’oge ikpeazụ a.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.

NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ DỊ ICHE ICHE

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agụ akwụkwọ nzukọ Jehova na-ebipụta ma na-echebara ha echiche?

11 Jehova na-eji akwụkwọ dị iche iche nzukọ ya na-ebipụta eme ka okwukwe anyị sie ike. O doro anya na o nweela mgbe ị gụrụ otu akwụkwọ anyị, ma kwuo ihe dị ka: ‘Ihe a ga-abara m ezigbo uru! Jehova, i meela. Ọ dị nnọọ ka ọ̀ bụ m ka e deere ihe a!’ E nwere ihe mere obi ji dị gị otú ahụ. Jehova na-eji akwụkwọ ndị a akụziri anyị ihe, jirikwa ha na-eduzi anyị. Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso.” (Ọma 32:8) Ànyị na-agbalisi ike ịgụ akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-anọsi ike n’ọgbakọ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’oge ikpeazụ a.—Gụọ Abụ Ọma 1:1-3; 35:28; 119:97.

12. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-eji akwụkwọ anyị akpọrọ ihe?

12 Ọ bụrụ na anyị echee echiche banyere mbọ a na-agba tupu e wepụta akwụkwọ anyị dị iche iche, ọ ga-abara anyị uru. A na-eme nchọnchọ nke ọma tupu e dee akwụkwọ ọ bụla. E dechaa ya, a gụgharịa ihe e dere, tinyekwa foto ndị dabara n’ihe a na-ekwu. E mechaa, a sụgharịa ya n’asụsụ dị iche iche ma ndị nke a ga-etinye n’adres Ịntanet anyị. Ọ bụ Kọmitii Ide Ihe na-ahụ maka ihe ndị a niile. Alaka ụlọ ọrụ ndị na-ebi akwụkwọ ga-ebi akwụkwọ ndị ahụ, bugaziere ha ọgbakọ dị iche iche. Gịnị mere e ji arụ ọrụ a niile? Ọ bụ ka e nwee ike inye ndị ohu Jehova nri ime mmụọ. (Aịza. 65:13) Ka anyị jiri obi anyị niile na-agụ akwụkwọ ndị a Jehova ji nzukọ ya na-enye anyị.—Ọma 119:27.

NA-AKWADO NZUKỌ JEHOVA

13, 14. Ole ndị na-akwado nzukọ Jehova n’eluigwe? Oleekwa otú anyịnwa nwere ike isi na-akwado ya?

13 N’ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi, ọ hụrụ ebe Jizọs nọ n’elu ịnyịnya ọcha, jiri ogologo mma agha na-egbu ndị na-enupụrụ Jehova isi. (Mkpu. 19:11-15) Jọn hụkwara ka ndị mmụọ ozi na ndị e tere mmanụ garala eluigwe gba ịnyịnya na-eso Jizọs. Ha niile na-akwado Jizọs. (Mkpu. 2:26, 27) Ihe anyị na-amụta n’ọhụụ a bụ na anyị kwesịrị ịna-akwado ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova.

14 Oké ígwè mmadụ ahụ jikwa obi ha niile na-akwado ọrụ ụmụnna Kraịst ndị ka nọ n’ụwa na-arụ. (Gụọ Zekaraya 8:23.) Olee otú i nwere ike isi na-akwado nzukọ Jehova? Otu ihe ị ga-eme bụ ịna-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi. (Hib. 13:7, 17) Bido ná ndị nke nọ n’ọgbakọ unu. Dị ka ihe atụ, ihe anyị na-ekwu gbasara ndị okenye ọ̀ na-eme ka ndị ọzọ na-akwanyere ha ùgwù ma na-erubere ha isi? Ànyị na-akụziri ụmụ anyị ka ha na-akwanyere ndị okenye ùgwù ma na-agakwuru ha ka ha nye ha ndụmọdụ? Ma, e nwekwara ihe ndị ọzọ anyị ga-eme iji na-akwado nzukọ a. Dị ka ihe atụ, anyị na ndị ezinụlọ anyị ànyị na-akparịta otú anyị nwere ike isi jiri ego anyị na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma? (Ilu 3:9; 1 Kọr. 16:2; 2 Kọr. 8:12) Ànyị na-eso edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, ma na-arụzi ihe ndị mebiri emebi na ya? Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya ma anyị na-akwado nzukọ ya. Mmụọ nsọ ya na-emekwa ka ike ghara ịgwụ anyị n’oge ikpeazụ a.—Aịza. 40:29-31.

 NA-EME IHE ANYỊ NA-EKWUSA

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ na anyị na-emeri ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị?

15 Ihe ikpeazụ anyị ga-eleba anya na ya ugbu a, bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ọgbakọ ma na-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ, bụ ‘ịna-achọpụta ihe dị Onyenwe anyị mma,’ ya bụ, ịna-eme ihe anyị na-ekwusa. (Efe. 5:10, 11) Setan na ụwa ọjọọ ya nakwa ezughị okè na-eme ka ọ na-esiri anyị ike ime ihe dị mma. Ọnwụnwa na-esi n’elu esi n’ala abịara ụfọdụ n’ime anyị kwa ụbọchị, ma ha ana-agbasikwa mbọ ike ka ha ghara imejọ Jehova. Obi dị Jehova ụtọ maka mbọ ụmụnna anyị ndị a na-agba. Anyị na-asị unu, jidenụ nke unu ji! Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Jehova chọrọ, obi ga na-adị anyị ụtọ, obi ga-esikwa anyị ike na ofufe anyị na-efe Jehova agaghị abụ na nkịtị.—1 Kọr. 9:24-27.

Na-agbasi mbọ ike inyere ndị ọzọ aka ka ha bata ná nzukọ Jehova

16, 17. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mee mmehie dị oké njọ? (b) Olee ihe anyị na-amụta n’ihe mere Eberechi?

16 Ma, ọ́ bụrụkwanụ na anyị emee mmehie dị oké njọ? Anyị kwesịrị ịga ozugbo kọọrọ ya ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Anyị zochie ya, ọ ga-eme ka ihe ka njọ. Anyị kwesịrị icheta otú ọ dị Devid mgbe ọ nọ na-ezochi mmehie ya. Ọ sịrị: “Mgbe m gbara nkịtị, ike gwụrụ ọkpụkpụ m n’ihi ude m na-asụ ogologo ụbọchị dum.” (Ọma 32:3) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị ezochie mmehie anyị, anyị ga na-anwụ n’echiche, na-alakwa azụ n’ọgbakọ. Ma, ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị ma kwụsị ya, ‘a ga-emere anyị ebere.’—Ilu 28:13.

17 Ụdị ihe a mere otu nwanna nwaanyị anyị ga-akpọ Eberechi. * Ọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile mgbe ọ na-eruchabeghị afọ iri abụọ. Ma, o bidoro mewe ihe na-adịghị mma na nzuzo. Ọ sịrị: “Akọnuche m nọ na-apịa m ụtarị. Mgbe ọ bụla, obi ana-ajọ m njọ.” Olee ihe o mere nyeere ya aka? Ọ sịrị na e nwere ụbọchị a kọwara Jems 5:14, 15 n’ọmụmụ ihe, ya achọpụta na ya kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka. Ọ sịrị: “Ihe ahụ e kwuru n’akwụkwọ Jems dị ka mkpụrụ ọgwụ Jehova nyere m ka m ṅụọ. Ọ ratụrụ m ahụ́ nlofe, ma ọ gwọrọ m. Emere m ihe ahụ e kwuru n’akwụkwọ Jems, ọ bakwaara m uru.” O tetụla ihe a mere. Ugbu a, Eberechi ejirikwala ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi, akọnuche ya anaghịzikwa apịa ya ụtarị.

18. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

18 Anyị ekwesịghị ichefu na ịnọ ná nzukọ Jehova n’oge ikpeazụ a bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị jiri nzukọ a anyị nọ na ya na-egwu egwu. Kama, ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-agba mbọ abịachi ọmụmụ ihe anya, na-agachi ozi ọma anya, na-agụkwa akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl. Ka anyị na-akwanyekwara ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova ùgwù, ma na-eme ihe anyị na-ekwusa. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga na-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ, ike ime ihe dị mma agaghịkwa agwụ anyị!

^ para. 17 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.